Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke”

“Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke”

“Bịakwutenụ m, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nwee Ume Ọhụrụ”

“Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke”

“Unu nọ ya mgbe nile ige anyị ntị na ịgwa anyị okwu ndị sitere na Bible bụ́ ndị na-agba anyị ume.”—Pamela.

“Unu emeela maka ihe nile unu na-eme n’ihi anyị. Ọ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ anyị n’ezie.”—Robert.

A KPALIRI Pamela na Robert idegara ndị okenye Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ ha dị iche iche okwu ekele ndị ahụ. Ndị ọzọ bụ́ ndị ohu Chineke n’ụwa nile na-enwekwa ekele maka nkwado na nlekọta ndị ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke’ nọgidere na-enye ha. (1 Pita 5:2) N’ezie, ndị Jehova na-enwe ekele maka ọtụtụ ihe ndị okenye na-eme n’ihi ha nakwa maka ụzọ ha si eme ha.

‘Inwe Ọtụtụ Ihe Ime’

E nyefere Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ọtụtụ ibu ọrụ. (Luk 12:48) Ha na-akwadebe ihe omume maka nzukọ ọgbakọ ma na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihu ọha. Ọrụ ha na-agụnye ime nleta ọzụzụ atụrụ n’ụlọ ndị kwere ekwe ibe ha. Ndị okenye na-ewepụta oge maka ndị chọrọ nlebara anya pụrụ iche—ndị agadi na ndị ọzọ—na-eme ha nile n’elegharaghị ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ́ nke ezinụlọ ha anya. (Job 29:12-15; 1 Timoti 3:4, 5; 5:8) Ndị okenye ụfọdụ na-enye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị ọzọ na-eje ozi na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ ma ọ bụ soro n’Ìgwè Na-aga Eleta Ndị Ọrịa. Ọtụtụ n’ime ha na-arụkwa ọrụ afọ ofufo ná mgbakọ dị iche iche. Ee, ndị okenye nwere ‘ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 15:58) Ka a sịkwa ihe mere ndị e nyefere n’aka ndị okenye dị otú ahụ na-arụsi ọrụ ike ilekọta ji eji ha akpọrọ ihe nke ukwuu!—1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13.

Ndị okenye bụ́ ndị na-eleta Ndị Kraịst ibe ha mgbe nile n’ebe obibi ha ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ iji wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ, bụ isi iyi nke agbamume. “A sị na ọ bụghị nkwado ịhụnanya na agbamume m nwetara n’aka ndị okenye,” ka Thomas kwuru, bụ́ onye tolitere n’ezinụlọ na-enweghị nna, “echeghị m na aga m na-ejere Jehova ozi taa dị ka onye ozi oge nile.” Ọtụtụ ndị ntorobịa a zụlitere n’ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna na ha na-ekweta na anya ndị okenye lebaara ha nyeere ha aka iso Chineke na-enwe mmekọrịta onwe onye.

Ndị agadi nọ n’ọgbakọ na-ejikwa nleta ọzụzụ atụrụ akpọrọ ihe. Mgbe ndị okenye abụọ letasịrị di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ dị afọ 80 na ụma, ha dere, sị: “Anyị chọrọ igosipụta ekele anyị nwere maka nleta unu nke masịrị anyị nnọọ. Mgbe unu lara, anyị gụghachiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ unu sooro anyị tụlee. Anyị agaghị echefu okwu agbamume unu echefu ma ọlị.” Otu nwanyị di ya nwụrụ nke dị afọ 70 degaara ndị okenye akwụkwọ, sị: “Anọwo m na-ekpeku Jehova ekpere maka enyemaka, o zitekwara unu ụmụnna abụọ n’ụlọ m. Nleta unu bụ ngọzi sitere n’aka Jehova!” Ì ritewo uru n’oge na-adịbeghị anya site ná nleta ndị okenye nọ n’ọgbakọ gị letara gị? N’ezie, anyị nile na-enwe ekele maka mgbalị ha na-etinye n’ịzụ atụrụ e nyere ha ilekọta!

Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ́ Ndị Na-eṅomi Chineke na Kraịst

Jehova bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya. (Abụ Ọma 23:1-4; Jeremaịa 31:10; 1 Pita 2:25) Jizọs Kraịst bụkwa Onye Ọzụzụ Atụrụ ime mmụọ pụrụ iche. N’ezie, a na-akpọ ya “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ,” na “onyeisi ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:11; Ndị Hibru 13:20; 1 Pita 5:4) Olee otú Jizọs si mesoo ndị chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya ihe? Ọ kpọrọ ha òkù a na-ekpo ọkụ: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.”—Matiu 11:28.

Taa, ndị okenye na-agbalịsi ike n’otu aka ahụ ịbụ ndị ìgwè atụrụ ahụ ga-esi n’aka ha na-enweta ume ọhụrụ na nchebe. Ndị ikom dị otú ahụ ‘dị ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.’ (Aịsaịa 32:2) Ndị nchebe dị otú ahụ nwere obiọma na-eme ka e nwee ume ọhụrụ, na-abụ ndị ìgwè atụrụ ahụ na-akwanyere ùgwù, ma na-enweta nnwapụta Chineke.—Ndị Filipaị 2:29; 1 Timoti 5:17.

Nkwado Bara Ezigbo Uru Site n’Aka Ndị Nwunye Ha

Ndị Chineke na-enwe ekele maka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nakwa maka nkwado ịhụnanya ndị ikom ndị a na-enweta site n’aka ndị nwunye ha. Ọtụtụ mgbe, inye nkwado na-achọ ịchụ ihe dị iche iche n’àjà n’aka ndị inyom dị otú ahụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-anọ n’ụlọ, ebe ndị di ha nọ na-ahụ maka ihe ndị metụtara ọgbakọ ma ọ bụ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-agbanwe atụmatụ ndị ha ji nlezianya mee n’ihi na nsogbu ụfọdụ chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa maka ha bilitere n’ọgbakọ. “N’agbanyeghị nke ahụ,” ka Michelle kwuru, “mgbe m hụrụ otú di m si jiri ọrụ n’aka n’ịkwadebe maka nzukọ ma ọ bụ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ, ana m eburu n’uche na ọ na-arụ ọrụ Jehova, ana m agbalịkwa ịkwado ya dị ka m nwere ike.”

Cheryl, bụ́kwa nwunye onye okenye, kwuru, sị: “Amaara m na ọ dị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị nọ n’ọgbakọ mkpa ịgwa ndị okenye okwu, ana m achọkwa ime ka ha ghọta na ha pụrụ ịbịakwute di m mgbe ọ bụla ọ dị ha mkpa.” Ndị inyom na-enye nkwado, dị ka Michelle na Cheryl, na-eji obi ha achụ ihe dị iche iche n’àjà ka di ha wee nwee ike ilekọta atụrụ Chineke. A na-enwe ekele maka ndị nwunye ndị okenye n’ihi mmụọ inye nkwado ha.

N’agbanyeghị nke ahụ, okenye ji ọrụ n’aka agatụghị eleghara mkpa ime mmụọ na mkpa ndị ọzọ nke nwunye ya na ụmụ ya anya. Okenye lụrụ nwunye aghaghị ịbụ onye a “na-adịghị ebo ebubo, di nke otu nwunye, onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-adịghị ebo ebubo ibi ndụ ịla n’iyi, ndị na-adịghịkwa isi ike.” (Taịtọs 1:6) Ọ ghaghị ilekọta ezinụlọ ya n’ụzọ nke Chineke nke bụ́ ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ n’aka Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta.—1 Timoti 3:1-7.

Nye okenye ji ọrụ n’aka, nwunye na-enye nkwado enweghị atụ! Ọ bụ otú ahụ ka ọ na-adị ndị okenye na-enwe mmetụta bụ́ ndị lụrụ nwunye. Ọ bụ nnọọ dị ka Bible na-ekwu, sị: “Mmadụ ọ̀ chọtawo ezi nwunye? Onye ahụ achọtawo ezi ihe.” (Ilu 18:22, NW) Site n’okwu ọnụ na n’omume, ndị okenye dị otú ahụ na-egosi ndị nwunye ha na ha nwere ekele sitere n’obi. Tụkwasị n’ikpekọ ekpere na ịmụkọ ihe ọnụ n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị di na nwunye ndị a bụ́ Ndị Kraịst na-ewepụta oge ime ihe ndị dị ka, ịga n’ụsọ osimiri, ịzụ okwe, ma ọ bụ ime mkpagharị n’ogige mara mma. Ee, ndị okenye na-enweta ọṅụ n’iji ịhụnanya elekọta ndị nwunye ha.—1 Pita 3:7.

Ndị okenye bụ́ ndị na-eji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke, bụ ebe ndị Jehova si enweta ume ọhụrụ ime mmụọ. N’ezie, ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” ngọzi nye ọgbakọ!—Ndị Efesọs 4:8, 11-13.