Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Dị Ibe Ha Mkpa

Ndị Kraịst Dị Ibe Ha Mkpa

Ndị Kraịst Dị Ibe Ha Mkpa

“Anyị bụ akụkụ [ahụ́] nke dịịrị ibe anyị.”—NDỊ EFESỌS 4:25.

1. Gịnị ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru banyere ahụ́ mmadụ?

AHỤ́ mmadụ bụ ihe e kere eke nke dị ebube! Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-akpọ ahụ́ mmadụ ígwè ọrụ—nke kasị dị egwu e mepụtatụrụla. N’ezie, ahụ́ mmadụ abụghị ígwè ọrụ. Ma a pụrụ iji ya tụnyere ígwè ọrụ n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ọ dị n’ígwè ọrụ, ahụ́ mmadụ bụ nke ọtụtụ akụkụ mejupụtara. Akụkụ ahụ́ ọ bụla, dị ka akụkụ ọ bụla nke ígwè ọrụ, na-arụ ọrụ pụrụ iche. Ma akụkụ ya nile na-arụkọ ọrụ ọnụ ma si otú ahụ na-eme ka ahụ́ ma ọ bụ ígwè ọrụ na-arụ ọrụ nke ọma.”

2. N’ụzọ dị aṅaa ka ahụ́ mmadụ na ọgbakọ Ndị Kraịst si yie?

2 Ee, ahụ́ mmadụ nwere ọtụtụ akụkụ, nke ọ bụla na-arụkwa ihe ndị dị mkpa. Ọ dịghị akwara, uru ahụ́, ma ọ bụ akụkụ ahụ́ ọ bụla ọzọ nke na-abaghị uru. N’ụzọ yiri nke ahụ, onye ọ bụla so n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụrụ ịtụnye ụtụ n’ahụ́ ike na ịma mma ime mmụọ ya. (1 Ndị Kọrint 12:14-26) Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nke kwesịrị iche na ya karịrị ndị ọzọ, ọ dịghịkwa onye kwesịrị iche na ya adịghị mkpa.—Ndị Rom 12:3.

3. Olee otú Ndị Efesọs 4:25 si egosi na Ndị Kraịst dị ibe ha mkpa?

3 Dị ka akụkụ ọ bụla nke ahụ́ mmadụ si dabere n’ibe ha, Ndị Kraịst dị ibe ha mkpa. Pọl onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, sị: “Ebe unu wepụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu, n’ihi na anyị bụ akụkụ [ahụ́] nke dịịrị ibe anyị.” (Ndị Efesọs 4:25) Ebe ọ bụ na ha ‘dịịrị ibe ha,’ ndị so n’Izrel ime mmụọ—“ahụ́ nke Kraịst ahụ”—na-agwarịta ibe ha eziokwu ma na-emekọrịta nnọọ ihe ọnụ. Ee, onye ọ bụla n’ime ha dịịrị ndị ọzọ nile. (Ndị Efesọs 4:11-13) Ha na Ndị Kraịst na-ekwu eziokwu ma na-arụkọ ọrụ ọnụ, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, dị n’otu n’ụzọ na-enye obi ụtọ.

4. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka a pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ aka?

4 Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ puku ndị nwere olileanya ibi n’ụwa paradaịs baptizim. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-eji obi ụtọ enyere ha aka ‘ijisi ike ruo ntozu okè.’ (Ndị Hibru 6:1-3) Enyemaka a pụrụ ịgụnye ịza ajụjụ ha ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ inyere ha aka n’ụzọ bara uru n’ozi. Anyị pụrụ inyere ndị ọhụrụ aka site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya site n’ikerechi òkè anya ná nzukọ Ndị Kraịst. N’oge nsogbu, anyị pụkwara inye ha agbamume ma ọ bụ ikekwe gụgụọ ha obi. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14, 15) Anyị kwesịrị ịchọ ụzọ isi na-enyere ndị ọzọ aka ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’ (3 Jọn 4) Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi, ndị ka malitere ije ije n’eziokwu ahụ ma ọ bụ ndị jeworo ije na ya ruo ọtụtụ afọ, anyị pụrụ ịkwalite ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị—anyị dị ha mkpa n’ezie.

Ha Nyere Aka Mgbe Ọ Dị Mkpa

5. Olee otú Akwịla na Prisila si nyere Pọl aka?

5 Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye so ná ndị na-enweta afọ ojuju n’inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka. Dị ka ihe atụ, Akwịla na nwunye ya, bụ́ Prisila (Priska), nyeere Pọl aka. Ha nabatara ya n’ụlọ ha, soro ya rụọ ọrụ dị ka ndị na-akpa ákwà ụlọikwuu, ma nyere ya aka wulite ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Kọrint. (Ọrụ 18:1-4) Ha tinyere ọbụna ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi Pọl n’ụzọ ụfọdụ a na-emeghị ka anyị mara. Ha bi na Rom mgbe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ, sị: “Keleerenụ m Priska na Akwịla bụ́ ndị ọrụ ibe m n’ime Kraịst Jizọs, ndị tinyeworo ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi mkpụrụ obi m, bụ́ ndị, ọ bụghị nanị mụ onwe m, kamakwa ọgbakọ nile nke ndị mba ọzọ na-enye ekele.” (Ndị Rom 16:3, 4) Dị ka Akwịla na Prisila, ụfọdụ Ndị Kraịst nke oge a na-ewulite ọgbakọ dị iche iche ma na-enyere ndị ha na ha na-efekọ ofufe aka n’ụzọ dịgasị iche iche, ọbụna na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ mgbe ụfọdụ iji hụ na ndị mmegide emekpọghị ndị ohu Chineke ndị ọzọ ọnụ ma ọ bụ gbuo ha.

6. Enyemaka dị aṅaa ka Apọlọs nwetara?

6 Akwịla na Prisila nyekwaara Onye Kraịst bụ́ ọkà n’ikwu okwu bụ́ Apọlọs aka, bụ́ onye nọ na-akụziri ndị bi n’Efesọs banyere Jizọs Kraịst. N’oge ahụ, nanị ihe Apọlọs maara bụ banyere baptizim Jọn mere ná ngosipụta nke nchegharị n’ihi mmehie e mere megide ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. N’ịghọta na Apọlọs chọrọ enyemaka ụfọdụ, Akwịla na Prisila “kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.” O yiri nnọọ ka ha kọwaara ya na baptizim Ndị Kraịst gụnyere ịbụ onye e mikpuru ná mmiri na ịbụ onye a wụsara mmụọ nsọ. Apọlọs tinyere ihe ọ mụtara n’ọrụ. Ka e mesịrị n’Akea, “o nyeere ndị kweworo ekwe n’ihi obiọma n’erughịrị mmadụ nke Chineke aka n’ụzọ dị ukwuu; n’ihi na n’ụzọ dị ike, ọ nwapụtara nke ọma n’ihu ọha na ndị Juu mejọrọ ihe, ebe o sitere n’Akwụkwọ Nsọ gosipụta na Jizọs bụ Kraịst ahụ.” (Ọrụ 18:24-28) Ọtụtụ mgbe, ihe ndị anyị na ha na-efekọ ofufe kwuru pụrụ inyere anyị aka ịghọtakwu Okwu Chineke. N’akụkụ a kwa, anyị dị ibe anyị mkpa.

Inye Aka n’Ụzọ Ihe Onwunwe

7. Gịnị ka ndị Filipaị mere mgbe Ndị Kraịst ibe ha chọrọ enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe?

7 Ndị so n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Filipaị hụrụ Pọl n’anya nke ukwuu ma zigara ya ihe onwunwe mgbe ọ nọ na Tesalonaịka. (Ndị Filipaị 4:15, 16) Mgbe ụmụnna ndị nọ na Jeruselem chọrọ enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe, ndị Filipaị gosipụtara njikere ha dị inye onyinye afọ ofufo ọbụna karịa ihe ha na-akpata. Pọl nwere ekele nke ukwuu maka àgwà ọma nke ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Filipaị nke na ọ kpọtụrụ ha aha dị ka ndị nlereanya nye ndị ọzọ kwere ekwe.—2 Ndị Kọrint 8:1-6.

8. Mmụọ dị aṅaa ka Epafrọdaịtọs gosipụtara?

8 Mgbe Pọl nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ, ọ bụghị nanị na ndị Filipaị zigaara ya onyinye ihe onwunwe kamakwa ha zigara onye nnọchianya ha bụ́ Epafrọdaịtọs. “Ọ bụ maka ọrụ Onyenwe anyị ka [Epafrọdaịtọs] bịaruru nnọọ ọnwụ nso, na-ekpughe mkpụrụ obi ya nye ihe ize ndụ,” ka Pọl kwuru, “ka o wee nọchite anya ọnụnọ unu na-anọghị n’ebe a ijere m ozi.” (Ndị Filipaị 2:25-30; 4:18) A gwaghị anyị ma Epafrọdaịtọs ọ̀ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Otú o sina dị, ọ bụ Onye Kraịst nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ma na-enye aka, ọ dịkwa Pọl mkpa n’ezie. È nwere onye dị ka Epafrọdaịtọs n’ọgbakọ gị?

Ha Bụ ‘Ndị Enyemaka Na-eme Ka A Dị Ike’

9. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Arịstakọs setịpụụrụ anyị?

9 E ji ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-ahụ n’anya, dị ka Akwịla, Prisila, na Epafrọdaịtọs, akpọrọ ihe nke ukwuu n’ọgbakọ ọ bụla. Ụfọdụ n’ime ndị anyị na ha na-efekọ ofufe pụrụ ịdị nnọọ ka Onye Kraịst nke narị afọ mbụ bụ́ Arịstakọs. Ya na ndị ọzọ bụ ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike,’ ikekwe ndị na-agụgụ obi ma ọ bụ ndị na-enye aka n’ihe ndị bụ́ isi bara uru. (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Site n’inyere Pọl aka, Arịstakọs gosipụtara na ya bụ ezigbo enyi n’oge mkpa. Ọ bụ ụdị onye ahụ e kwuru banyere ya n’Ilu 17:17, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Ọ̀ bụ na anyị nile ekwesịghị ịgbalịsi ike ịbụrụ Ndị Kraịst ibe anyị ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’? Anyị kwesịrị inyere ndị na-ata ahụhụ aka karịsịa.

10. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pita setịpụụrụ Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye?

10 Karịsịa Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye aghaghị ịbụrụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ha ndị enyemaka na-eme ka a dị ike. Kraịst gwara Pita onyeozi, sị: “Mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32) Pita mere otú ahụ n’ihi na o gosipụtara àgwà ndị siri ike ka nkume, karịsịa mgbe mbilite n’ọnwụ Jizọs gasịrị. Ndị okenye, jirinụ ọchịchọ obi na-agbalịsi ike ime otu ihe ahụ n’ụzọ dị nro, n’ihi na unu dị ndị kwere ekwe ibe unu mkpa.—Ọrụ 20:28-30; 1 Pita 5:2, 3.

11. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụle àgwà Timoti?

11 Onye ya na Pọl so na-eme njem bụ́ Timoti bụ okenye nke nwere nchegbu miri emi banyere Ndị Kraịst ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na Timoti nwere nsogbu ahụ́ ike ụfọdụ, o gosipụtara okwukwe siri ike ma ‘soro Pọl bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma ahụ na-aga n’ihu.’ N’ihi ya, onyeozi ahụ bịara nwee ike ịgwa ndị Filipaị, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke ọchịchọ obi ya dị ka nke ya bụ́ onye ga-elekọta ihe ndị metụtara unu nke ọma.” (Ndị Filipaị 2:20, 22; 1 Timoti 5:23; 2 Timoti 1:5) Anyị pụrụ ịbụrụ ndị anyị na ha na-efekọ Jehova ofufe ngọzi site n’igosipụta mmụọ yiri nke Timoti. N’eziokwu, anyị aghaghị ịnagide adịghị ike mmadụ nke anyị na ọnwụnwa dịgasị iche iche, ma anyị onwe anyị pụrụ ma kwesị igosipụta okwukwe siri ike na nchegbu ịhụnanya maka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị. Anyị kwesịrị icheta mgbe nile na anyị dị ha mkpa.

Ndị Inyom Bụ́ Ndị Lekọtara Ndị Ọzọ

12. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke Dọkas?

12 Otu n’ime ndị inyom na-asọpụrụ Chineke bụ́ ndị lekọtara ndị ọzọ bụ́ Dọkas. Mgbe ọ nwụrụ, ndị na-eso ụzọ kpọrọ Pita ma duru ya baa n’ọnụ ụlọ dị n’elu. N’ebe ahụ, “ndị inyom nile di ha nwụrụ pụtara n’ihu ya na-akwa ákwá ma na-egosi ọtụtụ uwe ime na uwe elu ndị Dọkas na-adị akwa mgbe ya na ha nọ.” E mere ka Dọkas dịghachi ndụ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ nọgidere ‘na-ejupụta n’ezi ọrụ na onyinye ebere.’ N’ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a, e nwere ndị inyom dị ka Dọkas bụ́ ndị pụrụ ịkwara ndị nọ ná mkpa uwe ma ọ bụ meere ha ihe ndị ọzọ na-egosipụta ịhụnanya. N’ezie, n’ụzọ bụ́ isi, ezi ọrụ ha metụtara ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.—Ọrụ 9:36-42; Matiu 6:33; 28:19, 20.

13. Olee otú Lidia si gosi nchegbu maka Ndị Kraịst ibe ya?

13 Otu nwanyị na-atụ egwu Chineke nke aha ya bụ Lidia lekọtara ndị ọzọ. Ọ bụ onye Taịataịra nke bi na Filipaị mgbe Pọl kwusara ozi ọma n’ebe ahụ n’ihe dị ka afọ 50 O.A. Eleghị anya, Lidia bụ onye na-eso ụzọ ndị Juu, ma ọ pụrụ ịbụwo na e nwere ndị Juu ole na ole na Filipaị, e nweghịkwa ụlọ nzukọ n’ebe ahụ. Ya na ndị inyom ndị ọzọ na-anụ ọkụ n’obi zukọrọ n’akụkụ mmiri maka ife ofufe mgbe onyeozi ahụ kwusaara ha ozi ọma. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Jehova wee meghepụ obi [Lidia] ịṅa ntị n’ihe ndị Pọl nọ na-ekwu. Ma mgbe e mesịrị ya na ezinụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ arịrịọ, sị: ‘Ọ bụrụ na unu ewerewo m dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, batanụ n’ime ụlọ m nọrọ.’ O wee mee nnọọ ka anyị bịa.” (Ọrụ 16:12-15) Ebe ọ bụ na Lidia chọrọ imere ndị ọzọ ihe ọma, o nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka Pọl na ndị ha na ya so kwenye ịnọnyere ya. Lee ka anyị si enwe ekele mgbe Ndị Kraịst nwere obiọma ma na-ahụ n’anya gosipụtara omume ile ọbịa dị otú ahụ taa!—Ndị Rom 12:13; 1 Pita 4:9.

Unu Ndị Na-eto Eto Dịkwa Anyị Mkpa

14. Olee otú Jizọs Kraịst si mesoo ndị na-eto eto ihe?

14 Ọgbakọ Ndị Kraịst malitere site n’aka Ọkpara Chineke nke nwere obiọma na ọmịiko, bụ́ Jizọs Kraịst. Ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala ma ha na ya nọrọ n’ihi na ọ na-ahụ n’anya ma dị ọmịiko. N’otu oge, mgbe ụfọdụ ndị malitere ịkpọtara Jizọs ụmụntakịrị ha, ndị na-eso ụzọ ya gbalịrị ịchụpụ ha. Ma Jizọs sịrị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ. N’ezie asị m unu, Onye ọ bụla nke na-anabataghị alaeze Chineke dị ka nwatakịrị ga-esi anabata ya agaghị aba n’ime ya ma ọlị.” (Mak 10:13-15) Iji nweta ngọzi nke Alaeze ahụ, anyị aghaghị ịdị umeala n’obi ma bụrụ ndị a pụrụ izi ihe dị ka ụmụntakịrị. Jizọs gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụntakịrị nọ site n’ikuru ha n’aka ya na ịgọzi ha. (Mak 10:16) Gịnị banyere unu ndị na-eto eto taa? Jidenụ n’aka na a hụrụ unu n’anya nakwa na unu dị mkpa n’ọgbakọ.

15. Ihe ndị dị aṅaa bụ́ eziokwu banyere ndụ Jizọs ka e dekọrọ na Luk 2:40-52, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka o setịpụụrụ ndị na-eto eto?

15 Mgbe Jizọs ka na-eto eto, o gosipụtara ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na n’ebe Akwụkwọ Nsọ dị. Mgbe ọ dị afọ 12, ya na ndị mụrụ ya, bụ́ Josef na Meri, si obodo ha bụ́ Nazaret gaa Jeruselem ịga mee Ememe Ngabiga. Mgbe ha na-alọta, nne na nna Jizọs chọpụtara na ọ nọghị n’ìgwè ndị ahụ na-emekọ njem ọnụ. Ha mesịrị hụ ya ka ọ nọ ọdụ n’otu n’ime ụlọ nzukọ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ, na-ege ndị nkụzi ndị Juu ntị ma na-ajụ ha ajụjụ. N’ịbụ onye o juru anya na Josef na Meri amaghị ebe ha ga-achọta ya, Jizọs jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na aghaghị m ịnọ n’ụlọ Nna m?” O sooro ndị mụrụ ya laghachi, nọgide na-edo onwe ya n’okpuru ha, nọgidekwa na-aga n’ihu n’amamihe na n’uto anụ ahụ́. (Luk 2:40-52) Lee ihe nlereanya dị mma Jizọs setịpụụrụ ụmụaka anyị! N’ezie, ha kwesịrị ịdị na-erubere ndị mụrụ ha isi ma na-enwe mmasị n’ịmụta ihe ime mmụọ.—Deuterọnọmi 5:16; Ndị Efesọs 6:1-3.

16. (a) Gịnị ka ụfọdụ ụmụ okoro tiri ná mkpu mgbe Jizọs na-agba àmà n’ụlọ nsọ? (b) Ihe ùgwù dị aṅaa ka ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst nwere taa?

16 Dị ka onye na-eto eto, ị pụrụ ịdị na-agba àmà banyere Jehova n’ụlọ akwụkwọ ma soro ndị mụrụ gị na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Aịsaịa 43:10-12; Ọrụ 20:20, 21) Mgbe Jizọs nọ na-agba àmà ma na-agwọ ndị ọrịa n’ụlọ nsọ obere oge tupu ya anwụọ, ụfọdụ ụmụ okoro tiri mkpu, sị: “Biko, zọpụta Nwa Devid!” N’ịbụ ndị nke a were iwe, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ mere mkpesa, sị: “Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?” “Ee,” ka Jizọs zara. “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị nke a, ‘Site n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara ka i meworo ka otuto pụta’?” (Matiu 21:15-17) Dị ka ụmụaka ndị ahụ, unu ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ nwere ihe ùgwù dị ebube nke ito Chineke na Ọkpara ya. Anyị chọrọ ka unu soro anyị na-arụkọ ọrụ dị ka ndị nkwusa Alaeze.

Mgbe E Nwere Ọdachi

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka Pọl ji hazie ka a tụkọta ihe a ga-enye Ndị Kraịst nọ na Judia? (b) Mmetụta dị aṅaa ka onyinye afọ ofufo e nyere maka ndị kwere ekwe bụ́ ndị Judia nwere n’ebe ndị Juu na ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst nọ?

17 N’agbanyeghị ọnọdụ anyị nọ na ya, ịhụnanya na-akpali anyị inyere Ndị Kraịst ibe anyị nọ ná mkpa aka. (Jọn 13:34, 35; Jems 2:14-17) Ọ bụ ịhụnanya Pọl nwere n’ebe ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Judia nọ kpaliri ya ịhazi ka ọgbakọ ndị dị n’Akea, Galeshia, Masedonịa, na n’ógbè Eshia tụkọta ihe ndị a ga-enye ha. Mkpagbu, ọgba aghara obodo, na ụnwụ nri nke dakwasịrị ndị ahụ na-eso ụzọ nọ na Jeruselem pụrụ ịkpatawo ihe Pọl kpọrọ “ahụhụ,” ‘mkpagbu,’ na “mbukọ e bukọọrọ ihe [ha] nwere.” (Ndị Hibru 10:32-34; Ọrụ 11:27–12:1) N’ihi ya, ọ hụrụ maka ịnakọta onyinye maka Ndị Kraịst dara ogbenye nọ na Judia.—1 Ndị Kọrint 16:1-3; 2 Ndị Kọrint 8:1-4, 13-15; 9:1, 2, 7.

18 Onyinye afọ ofufo e nyere maka ndị nsọ nọ na Judia gosiri na e nwere njikọ nke òtù ụmụnna n’etiti ndị Juu na ndị Jentaịl na-efe Jehova ofufe. Inye onyinye ndị dị otú ahụ nyekwaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl aka igosi obi ekele ha nwere n’ebe ndị Juu ha na ha na-efekọ ofufe nọ maka akụ̀ ime mmụọ ha si n’aka ha nweta. N’ihi ya, ha kerịtara ihe ma n’ụzọ ihe onwunwe ma n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Rom 15:26, 27) Ọ bụkwa afọ ofufo ka e ji enye onyinye ndị a na-enye maka ndị kwere ekwe ibe anyị nọ ná mkpa taa, ọ bụkwa ịhụnanya na-akpali ha. (Mak 12:28-31) Anyị dị ibe anyị mkpa n’akụkụ a kwa ka e wee nwee ịha nhata, “onye nwere ihe dị nta enweghị ihe dị oké nta.”—2 Ndị Kọrint 8:15.

19, 20. Nye ihe atụ iji gosi otú ndị Jehova si enye aka mgbe e nwere ọdachi.

19 N’ịmara na Ndị Kraịst dị ibe ha mkpa, anyị na-adị ngwa n’ịgbatara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’okwukwe ọsọ enyemaka. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere mgbe ala ọma jijiji na-ebibi ihe na ala mbuze mere n’El Salvador ná mmalite afọ 2001. Otu akụkọ kwuru, sị: “Ụmụnna ndị nọ n’akụkụ nile n’El Salvador haziri ihe enyemaka. Ìgwè dị iche iche nke ụmụnna ndị si Guatemala, United States, na Canada bịara nyere anyị aka. . . . E wuru ihe karịrị ụlọ 500 na Ụlọ Nzukọ Alaeze 3 mara mma n’oge na-adịghị anya. Ịrụsi ọrụ ike na imekọ ihe ọnụ nke ụmụnna ndị a, bụ́ ndị nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, agbawo àmà dị ukwuu.”

20 Otu akụkọ e si South Africa nweta kwuru, sị: “Idei mmiri dị egwu nke kpara akụkụ dị ukwuu nke Mozambique aka ọjọọ metụtakwara ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị Ndị Kraịst. Alaka ụlọ ọrụ dị na Mozambique mere ndokwa ịhụ maka ihe ka ukwuu ná mkpa ha. Ma ha rịọrọ ka anyị wetara ụmụnna ndị nọ ná mkpa ezigbo efe ndị e yiworo eyi. Anyị wekọtara uwe buru ibu ma bugara ụmụnna anyị nọ na Mozambique ákwà juru n’igbe dị mita 12 [ihe ha ka ọnụ ụlọ atọ].” Ee, n’ụzọ a kwa, anyị dị ibe anyị mkpa.

21. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Dị ka e kwuru na mbụ, akụkụ nile nke ahụ́ mmadụ dị mkpa. Otú ahụ ka ọ dịkwa nnọọ banyere ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị òtù ya nile dị ibe ha mkpa. Ọ dịkwa ha mkpa ịnọgide na-eje ozi n’ịdị n’otu. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ụfọdụ na-eme ka nke a kwe omume.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú ahụ́ mmadụ na ọgbakọ Ndị Kraịst si yie?

• Gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe enyemaka dị ndị kwere ekwe ibe ha mkpa?

• Olee ihe atụ ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-egosi na Ndị Kraịst dị ibe ha mkpa nakwa na ha na-enyerịtara ibe ha aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Akwịla na Prisila lekọtara ndị ọzọ

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ndị Jehova na-enyere ibe ha na ndị ọzọ aka mgbe e nwere ọdachi