Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ka Oge Ndụ Anyị Baa Uru n’Anya Jehova?

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ka Oge Ndụ Anyị Baa Uru n’Anya Jehova?

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ka Oge Ndụ Anyị Baa Uru n’Anya Jehova?

“Awa abụọ dị ka ọlaedo, ndị nke ọ bụla n’ime ha nwere minit iri isii dị ka daịamọnd, furu ụnyaahụ n’agbata anwụ ọwụwa na anwụ ọdịda. Ọ dịghị ihe e kwuru a ga-enye onye chọtara ha, n’ihi na ha efunyụwo anya.” —Lydia H. Sigourney, onye edemede bụ́ onye America (1791-1865).

AFỌ ndụ anyị yiri ka ha dị mkpụmkpụ ma na-agabiga ngwa ngwa. Ọbụ abụ bụ́ Devid tụgharịrị uche n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ, a kpalikwara ya ikpe ekpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ọgwụgwụ m, na ọ̀tụ̀tụ̀ ụbọchị m nile, ihe ọ bụ; ka m mara ka m si bụrụ ihe na-akwụsị akwụsị. Lee, I mewo ụbọchị m nile dị ka ntụ̀ ọbụ aka; mgbe ndụ m dịkwa ka ihe na-abụghị ihe n’ihu Gị.” Nchegbu Devid bụ ibi ndụ n’ụzọ ga-eme ka ọ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ma n’okwu ọnụ ya ma n’omume ya. N’ikwu banyere ndabere ọ dabeere n’ebe Chineke nọ, ọ sịrị: “Nchere m, n’ebe Ị nọ ka ọ dị.” (Abụ Ọma 39:4, 5, 7) Jehova gere ya ntị. N’ezie, ọ tụrụ ihe omume nile nke Devid n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma kwụghachi ya ụgwọ dị ka ha si dị.

Ọ dị mfe iji ọrụ n’aka na minit ọ bụla kwa ụbọchị na ịbụ ndị na-ebi ndụ gbalụ gbalụ na nke jupụtara n’ihe omume. Nke a pụrụ ime ka anyị na-enwe nchekasị, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị nwere ọtụtụ ihe ime na ọtụtụ ihe ịgabiga, nweekwa oge dị nnọọ nta iji mezuo ha. Nchegbu anyị na nke Devid ọ̀ bụ otu—ibi ndụ n’ụzọ ga-eme ka anyị nweta ihu ọma Chineke? N’ezie, Jehova na-ahụ ma jiri nlezianya na-enyocha onye ọ bụla n’ime anyị. Job, bụ́ nwoke tụrụ egwu Chineke, kwetara ihe dị ka afọ 3,600 gara aga na Jehova hụrụ ụzọ ya nile ma gụkọọ nzọụkwụ ya nile. Job jụrụ ajụjụ a na-achọghị ọsịsa, sị: “Mgbe Ọ na-eletakwa, gịnị ka m ga-azaghachi Ya?” (Job 31:4-6, 14) O kwere omume ime ka oge ndụ anyị baa uru n’anya Chineke site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ, irube isi n’iwu ya, na iji oge anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ka anyị lebakwuo anya n’okwu ndị a.

Ime Ka Ihe Ime Mmụọ Bụrụ Nchegbu Anyị Bụ́ Isi

Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ na-agba anyị ume n’ụzọ ziri ezi ibute ihe ime mmụọ ụzọ mgbe ọ sịrị: “Jide ihe ndị ka mkpa n’aka.” Gịnị bụ ihe ndị a ka mkpa? Azịza ya na-agụnye ‘ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.’ (Ndị Filipaị 1:9, 10) Inweta ihe ọmụma banyere nzube Jehova na-achọ anyị iji oge anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Otú ọ dị, ime ka ihe ime mmụọ bụrụ nchegbu anyị bụ́ isi ga-eme ka anyị jide n’aka na anyị ga-ebi ndụ nke na-enye ụgwọ ọrụ na afọ ojuju.

Pọl onyeozi na-echetara anyị ‘ịnọgide na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma.’ Anyị ijide n’aka aghaghị ịgụnye anyị iji aka anyị nyochaa ebumnobi anyị na ọchịchọ obi anyị. Onyeozi ahụ gara n’ihu, sị: “Nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.” (Ndị Efesọs 5:10, 17) Ya mere, gịnị ka Jehova na-anara nke ọma? Otu ilu Bible na-aza, sị: “Isi ihe ka amamihe bụ; nweta amamihe: ee, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Tụkọba ya elu, ọ ga-ebulikwa gị.” (Ilu 4:7, 8) Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’ebe onye na-enweta amamihe Chineke ma jiri ya na-eme ihe nọ. (Ilu 23:15) Mma amamihe dị otú ahụ mara bụ na a pụghị ịnapụ ya mmadụ ma ọ bụ bibie ya. N’ezie, ọ na-aghọ ihe nchebe pụọ “n’ụzọ onye ọjọọ, n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ.”—Ilu 2:10-15.

Ya mere, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya iguzogide ọchịchọ ọ bụla nke ịzụlite àgwà ejighị ihe kpọrọ ihe n’ebe ihe ime mmụọ dị! Ọ dị anyị mkpa ịzụlite àgwà inwe ekele n’ebe okwu Jehova dị ma na-atụ ya egwu kwesịrị ekwesị. (Ilu 23:17, 18) Ọ bụ ezie na a pụrụ inweta echiche uche a n’oge ọ bụla ná ndụ, ọ kasị mma ịzụlite echiche a ziri ezi ma mee ka ụkpụrụ Bible gbanye mkpọrọgwụ n’àgwà anyị n’oge ntorobịa. “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa,” ka Eze Solomọn maara ihe na-ekwu.—Eklisiastis 12:1.

Ụzọ kasị mie emie isi zụlite obi ekele maka Jehova bụ ikpeku ya ekpere kwa ụbọchị. Devid ghọtara mkpa ịkọrọ Jehova izu nzuzo dị, n’ihi na ọ rịọrọ, sị: “Nụrụ ekpere m, Jehova, ṅaakwa ntị ntiku m; agbala nkịtị n’anya mmiri m.” (Abụ Ọma 39:12) Otú mmekọrịta anyị na Chineke chiruru anya ọ̀ na-emetụ anyị n’obi mgbe ụfọdụ ruo n’ókè nke ime ka anya mmiri gbaa anyị? N’ezie, ka anyị na-agwakwu Jehova banyere ihe nzuzo ndị dị anyị n’obi ma na-atụgharị uche n’Okwu ya, otú ahụ ka ọ na-abịarukwu anyị nso.—Jems 4:8.

Mụta Nrubeisi

Mozis bụ nwoke ọzọ nwere okwukwe nke ghọtara na ndụ ya dabeere n’ebe Chineke nọ. Dị ka Devid, Mozis chọpụtara na ndụ jupụtara ná nsogbu. N’ihi ya, ọ rịọrọ Chineke ka o mee ka ya mara ‘ịgụta ụbọchị ya, ka ya wee mee ka obi amamihe bịa.’ (Abụ Ọma 90:10-12) Obi amamihe pụrụ ịbịa nanị site n’ịmụta na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ Jehova. Mozis maara nke a ma gbalịsie ike mgbe e mesịrị ịkụbanye eziokwu ahụ dị oké mkpa n’obi mba Izrel site n’ịgwa ha iwu na iwu nchịkwa nke Chineke ugboro ugboro tupu ha abịa biri n’Ala Nkwa ahụ. Eze ọ bụla bụ́ mmadụ nke Jehova ga-emesị họrọ ka ọ chịa Izrel gaje idere onwe ya Iwu ahụ ma na-agụ ya ụbọchị nile nke ndụ ya. N’ihi gịnị? Ka o wee mụta ịtụ egwu Chineke. Nke a ga-abụ ihe a ga-eji nwalee ma eze ahụ ọ na-erube isi. Ọ ga-egbochi ya ime ka obi ya dị elu karịa ụmụnne ya, ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị anya n’alaeze ya. (Deuterọnọmi 17:18-20) E kweghachiri nkwa a mgbe Jehova gwara nwa Devid bụ́ Solomọn, sị: “Ọ bụrụkwa na i jee ije n’ụzọ m nile, idebe ụkpụrụ m nile na ihe nile M nyere n’iwu dị ka nna gị, bụ́ Devid, jere, M ga-emekwa ka ụbọchị gị dị ogologo.”—1 Ndị Eze 3:10-14.

Chineke ejighị nrubeisi egwuri egwu. Ọ bụrụ na anyị ewere akụkụ ụfọdụ nke ihe ndị Jehova chọrọ n’aka anyị na ihe ndị o nyere n’iwu dị ka ihe ndị na-adịchaghị mkpa, ọ ga-arịba àgwà dị otú ahụ ama n’ezie. (Ilu 15:3) Ịmara nke a kwesịrị ịkpali anyị ịnọgide na-eji ntụziaka Jehova akpọrọ ihe, n’agbanyeghị na ime otú ahụ nwere ike ọ gaghị adị mfe mgbe nile. Setan na-eme ike ya nile ‘ịnọchiri anyị ụzọ’ ka anyị na-agbalịsi ike ịṅa ntị n’iwu nile nke Chineke.—1 Ndị Tesalonaịka 2:18.

Ọ dị mkpa karịsịa irube isi na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ izukọ ọnụ maka ofufe na mkpakọrịta. (Deuterọnọmi 31:12, 13; Ndị Hibru 10:24, 25) Ya mere, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ nwere mkpebi siri ike na nnọgidesi ike dị mkpa iji na-eme ihe dị mma n’ezie?’ Ileghara mkpakọrịta na ntụziaka a na-enweta ná nzukọ Ndị Kraịst anya n’ihi ịgbalị inweta ego zuru ezu ga-emebi mmekọrịta anyị na Jehova. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na [Jehova ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’” (Ndị Hibru 13:5) Iji ọchịchọ obi na-erube isi n’iwu Jehova na-egosi na anyị nwere ntụkwasị obi zuru ezu na ọ ga-elekọta anyị.

Jizọs mụtara nrubeisi ma rite uru. Anyị onwe anyị pụkwara ime otú ahụ. (Ndị Hibru 5:8) Ka anyị na-azụlitekwu nrubeisi, otú ahụ ka ọ ga na-adịkwuru anyị mfe irube isi, ọbụna n’ihe ndị dị nta. N’eziokwu, n’ihi iguzosi ike n’ihe anyị, ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị ịnagide mmeso na-adịghị mma na ọbụna nke obi ọjọọ site n’aka ndị ọzọ. Nke a pụrụ ịdị otú a karịsịa n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Ma, anyị na-enweta nkasi obi n’okwu a gwara ụmụ Izrel na ọ bụrụ na ha ‘ahụ Jehova n’anya site n’ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ Ya: ọ ga-abụ ndụ ha, na ogologo nke ụbọchị ha.’ (Deuterọnọmi 30:20) A na-ekwe anyị otu nkwa a.

Jiri Oge Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya

Iji oge anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya ga-enyekwara anyị aka ime ka oge ndụ anyị baa uru n’anya Jehova. N’adịghị ka ego bụ́ nke a pụrụ ichekwa, a ghaghị iji oge mee ihe, ma ọ́ bụghị ya ya efuo. Awa ọ bụla gaferenụ agaala. Ebe ọ bụ na ihe ndị dịịrị anyị ime mgbe nile karịrị ihe ndị anyị pụrụ ime, ànyị na-eji oge anyị eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nzube anyị ná ndụ? Nzube bụ́ isi nke Ndị Kraịst nile kwesịrị ịbụ ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Anyị na-eji oge anyị eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya nanị mgbe anyị maara nke ọma uru ọ bara. N’ụzọ dabara adaba, Ndị Efesọs 5:16 na-agba anyị ume ‘ịzụpụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị,’ nke a na-enyekwa echiche nke “ịzụta” ya, ịhapụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Ọ pụtara iwebilata nchụso ndị na-eri oge. Ikiribiga telivishọn ókè ma ọ bụ inyochabiga Intanet ókè, ịgụ akwụkwọ ụwa ndị na-abaghị uru, ma ọ bụ ịchụsobiga ntụrụndụ ókè pụrụ ime ka ike gwụ anyị. Ọzọkwa, ịkpakọba ihe onwunwe n’ụzọ a na-akpaaraghị ókè pụrụ iri oge a chọrọ iji nweta obi amamihe.

Ndị na-akwado ịhazi oge ahazi na-ekwu, sị: “Ọ gaghị ekwe omume iji oge anyị mee ihe nke ọma ma ọ bụrụ na anyị enweghị ihe mgbaru ọsọ ndị doro anya.” Ha tụrụ aro ụzọ ihe ise e kwesịrị ilebara anya mgbe a na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ: o kwesịrị ịbụ nke a kapịrị ọnụ, nke a pụrụ ịgụkọ agụkọ, nke a pụrụ iru eru, nke ezi uche dị na ya, na nke e setịpụụrụ oge.

Otu ihe mgbaru ọsọ dị mma bụ ime ka ọgụgụ Bible anyị ka mma. Nzọụkwụ mbụ bụ ịkapị ihe mgbaru ọsọ anyị ọnụ—ịgụchapụ Bible. Nzọụkwụ na-esonụ bụ ịgụkọ ihe mgbaru ọsọ anyị. N’ime nke a, anyị pụrụ ịmata ọganihu anyị na-enwe. Ihe mgbaru ọsọ kwesịrị ime ka anyị tinyesie mgbalị ike ma na-eto eto. Ha aghaghịkwa ịbụ ndị a pụrụ iru eru na ndị ezi uche dị na ha. A ghaghị iburu ikike onwe onye, nkà, na oge e nwere n’uche. Ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ oge ka ukwuu iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ. Nke ikpeazụ, ọ dị mkpa isetịpụ oge maka ihe mgbaru ọsọ anyị. Isetịpụ oge maka ịrụzu ihe pụrụ ime ka e nwekwuo mkpali imecha ya.

Ndị nile so n’ezinụlọ Betel zuru ụwa ọnụ, bụ́ ndị na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ya ndị dị gburugburu ụwa, nwere ihe mgbaru ọsọ a kapịrị ọnụ nke ịgụchapụ Bible n’afọ mbụ ha nọrọ na Betel. Ha na-aghọta na ọgụgụ Bible bara uru na-atụnye ụtụ n’uto ime mmụọ ha, na o sokwa eme ka ha na Jehova, bụ́ onye na-ezi ha ime ihe na-aba uru, na-enwe mmekọrịta chiri anya karị. (Aịsaịa 48:17) Ànyị pụrụ ime ka ịgụchi Bible anya bụrụ ihe mgbaru ọsọ anyị n’otu aka ahụ?

Abamuru nke Ime Ka Oge Ndụ Anyị Baa Uru

Ilebara ihe ime mmụọ anya n’ụzọ bụ́ isi ga-eweta ngọzi bara ụba. Nke mbụ, ọ na-eme ka e nwekwuo ọṅụ nke ịrụpụta ihe na inwe nzube ná ndụ. Ịgwa Jehova okwu mgbe nile n’ekpere sitere n’obi na-eme ka anyị na-abịarukwu ya nso. Ikpe ekpere n’onwe ya na-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi. Ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye kwa ụbọchị na-egosi njikere anyị dị ige Chineke ntị ka ọ na-agwa anyị okwu. (Matiu 24:45-47) Nke a na-enyere anyị aka inweta obi amamihe iji na-eme mkpebi na nhọrọ ndị ziri ezi ná ndụ.—Abụ Ọma 1:1-3.

Obi na-adị anyị ụtọ irube isi n’ihe ndị Jehova nyere n’iwu, n’ihi na ime otú ahụ abụghị ibu arọ. (1 Jọn 5:3) Ka anyị na-eme ka ụbọchị nke ọ bụla baa uru n’anya Jehova, anyị na-eme ka mmekọrịta anyị na ya sikwuo ike. Anyị na-aghọkwa ndị na-enye Ndị Kraịst ibe anyị nkwado ime mmụọ n’ezie. Omume dị otú ahụ na-eme ka Jehova Chineke na-enwe aṅụrị. (Ilu 27:11) Ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ karịrị inweta ihu ọma Jehova ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi!

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị Kraịst na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ì ji oge gị eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya?

[Foto dị na peeji nke 23]

Anyị na-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova na-esikwu ike ka anyị na-eme ka ụbọchị ọ bụla baa uru n’anya ya