Unu Ahapụla Ịdị Na-ezukọ Ọnụ
Unu Ahapụla Ịdị Na-ezukọ Ọnụ
“Ka anyị ghara ịhapụ ịdị na-ezukọ ọnụ, dị ka ọ bụ àgwà maara ụfọdụ ndị ahụ́,” ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume—ka anyị na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ Ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:25, New International Version) N’ụzọ doro anya, iwu ji ndị na-efe ezi ofufe izukọ ọnụ n’ebe a na-anọ efe ofufe iji ‘na-echebara ibe ha echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’—Ndị Hibru 10:24.
MGBE Pọl onyeozi dere okwu ndị ahụ dị n’elu na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, ọmarịcha ụlọ nsọ dị na Jeruselem bụ ebe ndị Juu na-anọ efe ofufe. E nwekwara ụlọ nzukọ dị iche iche. Jizọs ‘kụziri ihe n’ime ụlọ nzukọ na n’ime ụlọ nsọ, bụ́ ebe ndị Juu nile na-ezukọ.’—Jọn 18:20.
Ebe ndị dị aṅaa a na-anọ efe ofufe ka Pọl bu n’uche mgbe ọ dụrụ Ndị Kraịst ọdụ izukọ ọnụ iji gbarịta ibe ha ume? Ò nwere ụzọ ọ bụla nnukwu ụlọ okpukpe dị iche iche nke Krisendọm si yie ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem? Olee mgbe e mere ka ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malite iwu ụlọ okpukpe ndị buru oké ibu?
‘Ụlọ nke Dịịrị Aha Chineke’
A na-ahụ ntụziaka mbụ e nyere banyere ebe a ga-anọ efe Chineke ofufe n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọpụpụ. Jehova Chineke nyere ndị ọ họọrọ—ụmụ Izrel—ntụziaka iwu “ebe obibi,” ma ọ bụ “ụlọikwuu nzute.” A gaje idebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Ọpụpụ, isi 25-27; 40:33-38) Bible na-ezokwa aka n’ebe ụlọikwuu a dị dị ka “ụlọukwu Jehova” na ‘ụlọ Jehova.’—1 Samuel 1:9, 24.
arịa nsọ dịgasị iche iche n’ebe ahụ. ‘Ebube Jehova jupụtara ebe obibi ahụ’ mgbe a rụchara ya na 1512 T.O.A. Ruo ihe karịrị narị afọ anọ, ụlọikwuu ahụ a na-ebugharị ebugharị ghọrọ ihe bụ́ isi ná ndokwa Chineke mere maka ịbịakwute ya. (E mesịa, mgbe Devid bụ eze na Jeruselem, o gosipụtara ọchịchọ siri ike o nwere iwu ụlọ na-adịgide adịgide iji nye Jehova otuto. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Devid bụ onye agha, Jehova gwara ya, sị: “Ị gaghị ewuru aha m ụlọ.” Kama nke ahụ, Ọ họọrọ nwa Devid bụ́ Solomọn iwu ụlọ nsọ ahụ. (1 Ihe E Mere 22:6-10) Solomọn raara ụlọ nsọ ahụ nye na 1026 T.O.A., mgbe e jisịrị afọ asaa na ọkara wuchaa ya. Jehova nakweere ụlọ a, na-asị: “Edowo m ụlọ a, nke i wuworo, nsọ, itinye aha m n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi; anya m abụọ na obi m ga-adịkwa n’ebe ahụ ụbọchị nile.” (1 Ndị Eze 9:3) Ọ bụrụhaala na ụmụ Izrel anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-egosi ihu ọma ya n’ebe ụlọ ahụ dị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha esi n’ime ihe dị mma wezụga onwe ha, Jehova ga-eme ka ihu ọma ya ghara ịdị n’ebe ahụ, ‘ụlọ ahụ n’onwe ya ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe.’—1 Ndị Eze 9:4-9, NW; 2 Ihe E Mere 7:16, 19, 20.
Ka oge na-aga, ụmụ Izrel si n’ezi ofufe wezụga onwe ha n’ezie. (2 Ndị Eze 21:1-5) Jehova “wee mee ka eze Kaldea rịgokwasị ha, o wee . . . suree ụlọ Jehova ọkụ, kwatuokwa mgbidi Jeruselem, sureekwa ụlọ elu ya nile n’ọkụ, na ihe ya nile a na-achọsi ike, ibibi ha. O mee ndị fọdụrụ site ná mma agha ka ha jee biri na Babilọn; ha wee ghọọrọ ya, ghọọkwara ụmụ ya, ndị ohu.” Dị ka Bible si kwuo, nke a mere na 607 T.O.A.—2 Ihe E Mere 36:15-21; Jeremaịa 52:12-14.
Dị ka Aịzaịa onye amụma buru n’amụma, Chineke mere ka Eze Saịrọs nke Peasia bilie iji tọhapụ ndị Juu n’aka Babilọn. (Aịsaịa 45:1) Mgbe ha nọsịrị ná ndọrọ n’agha ruo afọ 70, ha laghachiri Jeruselem na 537 T.O.A. iji wughachi ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 1:1-6; 2:1, 2; Jeremaịa 29:10) Ka e gbusịrị oge n’iwu ụlọ nsọ ahụ, e mesịrị wughachichaa ya na 515 T.O.A., e weghachikwara ofufe dị ọcha nke Chineke. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ebube dị ka ụlọ nsọ Solomọn, ihe owuwu ahụ dịgidere ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 600. Otú ọ dị, a hapụkwara ụlọ nsọ a ka o mebie n’ihi na ụmụ Izrel leghaara ofufe Jehova anya. Mgbe Jizọs Kraịst bịara n’ụwa, Eze Herọd ji nke nta nke nta na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ. Gịnị gaje ime ụlọ nsọ a?
“A Gaghị Ahapụ Otu Nkume n’Elu Nkume Ibe Ya”
N’izo aka n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya ma ọlị n’ebe a n’akwatughị ya.” (Matiu 24:1, 2) N’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị ahụ, na 70 O.A., usuu ndị agha Rom, bụ́ ndị bịara ịkwụsị nnupụisi nke ndị Juu, bibiri ebe ahụ a maara eri ọtụtụ narị afọ dị ka ebe ofufe Chineke hiwere isi. * E wughachighị ụlọ nsọ ahụ ma ọlị. Na narị afọ nke asaa, e wuru ụlọ okpukpe ndị Alakụba a maara dị ka Dome of the Rock, ruokwa taa, o guzo n’ebe ahụ ndị Juu na-anọbu efe ofufe.
Ndokwa dị aṅaa maka ofufe ka a gaje imere ụmụazụ Jizọs? Ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị Juu hà ga-anọgide na-efe Chineke ofufe n’ụlọ nsọ ahụ a gaje ibibi n’oge na-adịghị anya? Ebee ka Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu ga-anọ na-efe Chineke ofufe? Ụlọ okpukpe ndị Krisendọm hà gaje ịnọchi anya ụlọ nsọ ahụ? Mkparịta ụka Jizọs na nwanyị Sameria nwere na-eme ka anyị ghọta okwu a.
Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Sameria fere Chineke ofufe n’otu nnukwu ụlọ nsọ dị n’Ugwu Geraịzim nke dị na Sameria. “Ndị nna nna anyị ha fere ofufe n’ugwu a,” ka nwanyị Sameria gwara Jizọs, “ma unu na-ekwu na ọ bụ na Jeruselem ka ndị mmadụ kwesịrị ife ofufe.” Jizọs zaghachiri ya, sị: “Kwere m, nwanyị, Oge awa na-abịa mgbe ọ na-agaghị abụ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem ka unu ga-efe Nna m ofufe.” Ụlọ nsọ nkịtị agaghịzi adị mkpa n’ofufe Jehova, n’ihi na Jizọs kọwara, sị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:20, 21, 24) Pọl onyeozi mesịrị gwa ndị Atens, sị: “Chineke nke mere ụwa na ihe nile dị n’ime ya, n’ịbụ, dị ka Onye a bụ, Onyenwenụ nke eluigwe na ala, adịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka mee.”—Ọrụ 17:24.
N’ụzọ doro anya, ụlọ okpukpe nke Krisendọm enweghị ihe ọ bụla jikọrọ ya na ụlọ nsọ ahụ e nwere tupu Oge Ndị Kraịst. Ndị Kraịst narị afọ mbụ enweghịkwa ihe mere ha ga-eji wuo ụlọ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, mgbe ndịozi nwụsịrị, mkpapụ ahụ e buru n’amụma na a ga-esi n’ozizi bụ́ eziokwu kpapụ—ndapụ n’ezi ofufe—weere ọnọdụ. (Ọrụ 20:29, 30) Ọtụtụ afọ tupu mgbe a sị na a tọghatara Eze Ukwu Constantine nke Rom n’Iso Ụzọ Kraịst na 313 O.A., ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malitere ịhapụ ihe Jizọs kụziri.
Constantine keere òkè n’ịgwakọta “Iso Ụzọ Kraịst” na okpukpe Rom nke ndị ọgọ mmụọ. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Constantine n’onwe ya nyere ikike ka e wuo nnukwu chọọchị basilika atọ nke Ndị Kraịst na Rom: chọọchị basilika nke St. Peter, nke S. Paolo Fuori le Mura, na nke S. Giovanni dị na Laterano. Ọ . . . tụpụtara ụkpụrụ ụlọ yiri obe nke ghọrọ ụkpụrụ e ji wuo ụlọ chọọchị dị iche iche n’ebe ọdịda anyanwụ Europe n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya.” A ka na-ewere chọọchị St. Peter’s Basilica dị na Rom, bụ́ nke a rụzigharịrị arụzigharị, dị ka ebe Chọọchị Roman Katọlik hiwere isi.
“Chọọchị nakweere ụfọdụ omenala na usoro okpukpe a gbasoro na Rom [na-ekpere arụsị] tupu oge Ndị Kraịst,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-ekwu. Nke a gụnyere “iwu chọọchị basilika.” Site na narị afọ nke 10 ruo nke 15, e nwere mmụba dị ukwuu n’owuwu nke ụlọ chọọchị na katidral dị iche iche, e lekwasịkwara anya nke ukwuu n’ọdịdị ha. Ọ bụ mgbe ahụ ka e wuru ọtụtụ n’ime ụlọ okpukpe Krisendọm ndị e weere ugbu a dị ka ihe ndị e ji echeta ọrụ nkà.
Ndị mmadụ hà na-enweta ume ọhụrụ ime mmụọ na agbamume mgbe nile site n’ife ofufe n’ụlọ chọọchị? “Chọọchị bụụrụ m nanị ihe na-akpata ike ọgwụgwụ n’okpukpe,” ka Francisco bụ́ onye si Brazil na-ekwu. “Mas bụ ihe omume na-enweghị isi a na-emeghachi mgbe nile nke na-adịghị egbo mkpa m n’ezie. Ana m enwe ahụ́ efe mgbe ọ bụla a gbasara.”
Otú o sina dị, e nyere ezi ndị kwere ekwe iwu izukọ ọnụ. Olee ndokwa ha kwesịrị ịgbaso maka nzukọ?“Ọgbakọ nke Dị n’Ụlọ Ha”
A na-ahụ ụkpụrụ maka ụzọ Ndị Kraịst si ezukọ ọnụ site n’inyocha otú ndị kwere ekwe na narị afọ mbụ si zukọọ ọnụ. Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ha na-ezukọtakarị n’ebe obibi ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Keleerenụ m Priska na Akwịla bụ́ ndị ọrụ ibe m n’ime Kraịst Jizọs, keleekwanụ ọgbakọ nke dị n’ụlọ ha.” (Ndị Rom 16:3, 5; Ndị Kọlọsi 4:15; Faịlimọn 2) A sụgharịrị okwu Grik e ji eme ihe maka “ọgbakọ” (ek·kle·siʹa) ịbụ “chọọchị” ná nsụgharị ụfọdụ, dị ka King James Version. Ma okwu ahụ na-ezo aka n’ìgwè mmadụ gbakọtara maka otu nzube, ọ bụghị ụlọ. (Ọrụ 8:1; 13:1) Ofufe nke ezi Ndị Kraịst adịghị achọ ụlọ okpukpe a chọbigara mma ókè.
Olee otú e si duzie nzukọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ? Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems ji otu ụdị nke okwu Grik bụ́ sy·na·go·geʹ mee ihe iji zoo aka n’ebe nzukọ Ndị Kraịst dị. (Jems 2:2) Okwu Grik a pụtara “iwekọta ọnụ,” a na-agbanwerịtakwa ya na okwu ahụ bụ́ ek·kle·siʹa. Otú ọ dị, ka oge na-aga, okwu ahụ bịara pụta ebe ma ọ bụ ụlọ a na-anọ enwe mgbakọ ahụ. Ndị Juu mbụ bụ́ Ndị Kraịst maara nke ọma ihe a na-anọ n’ụlọ nzukọ eme. *
Ọ bụ ezie na ndị Juu zukọrọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem maka ememe ndị ha na-eme kwa afọ, ụlọ nzukọ bụ ebe ndị ha na-anọ amụ banyere Jehova na Iwu ahụ n’ógbè dị iche iche. O yiri ka ihe ndị e mere n’ụlọ nzukọ ọ gụnyere ekpere na ịgụ Akwụkwọ Nsọ, tinyere nkọwa na agbamume. Mgbe Pọl na ndị ọzọ ya na ha so gara n’otu ụlọ nzukọ dị n’Antiọk, “ndị isi oche ụlọ nzukọ zigaara ha ozi, na-asị: ‘Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na e nwere okwu agbamume ọ bụla unu nwere maka ndị a, kwuonụ ya.’” (Ọrụ 13:15) Mgbe ndị Juu mbụ bụ́ Ndị Kraịst zukọrọ n’ebe obibi ndị mmadụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha gbasoro otu ụkpụrụ ahụ, na-eme ka nzukọ ha bụrụ nke na-enye ihe ọmụma dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ.
Ọgbakọ Bụ Maka Iwuli Elu
Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, Ndịàmà Jehova taa na-ezukọ ọnụ n’ebe ndị a na-achọghị oké mma a na-anọ efe ofufe iji nweta ntụziaka dabeere na Bible na iji nwee mkpakọrịta dị mma. Ruo ọtụtụ afọ, ha zukọrọ nanị n’ebe obibi ndị mmadụ, ha ka na-emekwa otú ahụ n’ebe ụfọdụ. Ma ugbu a, ọnụ ọgụgụ ọgbakọ amụbaala ruo ihe karịrị 90,000, a na-akpọkwa ebe bụ́ isi ha na-ezukọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụlọ ndị a abụghị ndị a chọbigara mma ókè ma ọ bụ ndị yiri ụlọ chọọchị n’ọdịdị. Ha bụ ụlọ ndị bara uru ma dị otú kwesịrịnụ bụ́ ndị na-eme ka o kwe ọgbakọ 100 mmadụ ruo mmadụ 200 mejupụtara omume ịgbakọta maka nzukọ ha na-enwe kwa izu iji gee ntị ma mụta Okwu Chineke.
Ihe ka ukwuu n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-ezukọ ugboro atọ n’izu. Otu nzukọ bụ okwu ihu ọha nke na-adabere n’isiokwu na-akpali mmasị n’oge a. Ihe ọmụmụ nke dabeere n’isiokwu ma ọ bụ n’amụma Bible na-esochi ya, bụ́ nke e ji magazin Ụlọ Nche amụ. Nzukọ ọzọ bụ ụlọ akwụkwọ nke e dokwara iji nye ọzụzụ n’izi ozi Bible. Nzukọ nke ihe a na-eme na ya karịsịa bụ ịtụ aro ndị dị irè maka ozi Ndị Kraịst na-esochi ya. Otu ugboro n’izu, ìgwè nta dị iche iche nke Ndịàmà na-agbakọtakwa maka ọmụmụ Bible n’ebe obibi ndị mmadụ. Ọha na eze nweere onwe ha ịbịa nzukọ a nile. A dịghị ana ego ọ bụla ma ọlị.
Francisco, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’elu, hụtara nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ka ndị bara oké uru. Ọ na-ekwu, sị: “Ebe mbụ m gara nzukọ bụ n’otu ụlọ dị ntụsara ahụ́ nke dị n’etiti obodo ukwu, obi dịkwa m ụtọ mgbe m si n’ụlọ ahụ na-apụ. Ndị bịara nzukọ ahụ nwere omume enyi, achọpụtakwara m na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bịara dị m ka nzukọ ọzọ ruwe eruwe. N’ezie, aghabeghị m nzukọ kemgbe ahụ. Nzukọ Ndị Kraịst a na-akpali mmasị, ha na-egbokwa mkpa ime mmụọ m. Ọbụna mgbe m na-enwe nkụda mmụọ n’ihi ihe ụfọdụ, ana m aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-enwe obi ike na m ga-enweta agbamume tupu m laghachi n’ebe obibi m.”
Nkụzi Bible, mkpakọrịta na-ewuli elu, na ohere nke ito Chineke na-echerekwa gị ná nzukọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke kasị dịrị nso n’ebe i bi. Obi ga-adị gị ụtọ ma i mee otú ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Ndị Rom bibiri ụlọ nsọ ahụ kpam kpam. Mgbidi Ákwá, bụ́ nke ọtụtụ ndị Juu na-esi n’ebe dị anya abịa na ya ikpe ekpere, abụghị akụkụ nke ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ nanị akụkụ nke mgbidi ogige ụlọ nsọ ahụ.
^ par. 20 O yikarịrị ka mgbe e guzobere ụlọ nzukọ ọ bụ n’afọ 70 nke ndọrọ n’agha gaa Babilọn bụ́ mgbe a na-enweghị ụlọ nsọ ọ bụla ma ọ bụkwanụ n’oge na-adịghị anya mgbe ụmụ Izrel sisịrị ná ndọrọ n’agha lọta bụ́ mgbe a nọ na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ. Ka ọ na-erule narị afọ mbụ, obodo ọ bụla dị na Palestaịn nwere ụlọ nzukọ nke ya, obodo ndị buru ibu karị nwere ihe karịrị otu.
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Ebe obibi ahụ, nakwa mgbe e mesịrị ụlọ nsọ ndị ahụ, bụ ebe ndị mara mma ofufe Jehova hiwere isi
[Foto dị na peeji nke 6]
Chọọchị St. Peter’s Basilica nke dị na Rom
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị Kraịst oge mbụ zukọrọ ọnụ n’ebe obibi ndị mmadụ
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Ndịàmà Jehova na-enwe nzukọ Ndị Kraịst n’ebe obibi ndị mmadụ nakwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze