Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ànyị kwesịrị ikwubi n’ihi ihe e dere ná Mkpughe 20:8 na Setan ga-eduhie imerime mmadụ n’ule ikpeazụ ahụ?

Mkpughe 20:8 na-akọwa mwakpo ikpeazụ Setan ga-awakpo ndị bi n’ụwa ná ngwụsị nke ọchịchị otu puku afọ nke Alaeze Mezaịa. N’ikwu banyere Setan, amaokwu ahụ na-asị: “Ọ ga-apụkwa iduhie mba ndị ahụ dị na nkuku anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg, iji chịkọta ha ọnụ maka agha ahụ. Ọnụ ọgụgụ nke ndị a dị ka ájá nke oké osimiri.”

N’agbanyeghị ọganihu ndị e nwere n’usoro nkà mmụta sayensị na n’iji ngwá ọrụ eme ihe, “ájá nke oké osimiri” nọgidere bụrụ ihe a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ya. Ya mere, a pụrụ ikwu na okwu ahụ na-egosi ọnụ ọgụgụ a na-amaghị ama. Ma ọ̀ na-egosi ọnụ ọgụgụ karịrị akarị nke a na-apụghị ọbụna ịgụta agụta, ka ọ̀ bụ nnọọ nke a na-amaghị ama bụ́ nke buru ibu?

Na Bible, e ji okwu ahụ bụ́ “dị ka ájá nke oké osimiri” mee ihe n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, na Jenesis 41:49, anyị na-agụ, sị: “Josef wee kwakọba ọka dị ka ájá nke oké osimiri, na-eme ka ọ baa ụba nke ukwuu, ruo mgbe ọ hapụrụ ịgụ ya ọnụ; n’ihi na ọ dịghị ngụta.” N’ebe a, ihe e mesiri ike bụ na a pụghị ịgụta ya ọnụ. N’otu aka ahụ, Jehova kwuru, sị: “Otú a gaghị agụ usuu ihe dị n’eluigwe ọnụ, na otú a gaghị atụ̀ta ájá nke oké osimiri; otú a ka M ga-eme ka mkpụrụ Devid, bụ́ ohu m . . . baa ụba.” Dị nnọọ ka a na-enweghị ike ịgụta kpakpando dị n’eluigwe na ájá nke dị n’oké osimiri agụta, otú ahụ ka Jehova na-aghaghị nnọọ imezu nkwa o kwere Devid.—Jeremaịa 33:22.

Mgbe mgbe, okwu ahụ bụ́ “ájá nke oké osimiri” na-ezo aka n’ihe ọnụ ọgụgụ ma ọ bụ ọdịdị ya buru nnọọ ibu. Ndị Izrel nọ na Gilgal nwere oké nchegbu n’ihi usuu ndị agha Filistịa zukọrọ na Mikmash, bụ́ ndị “dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri n’ụba.” (1 Samuel 13:5, 6; Ndị Ikpe 7:12) “Chineke nyekwara Solomọn amamihe na nghọta hiri nne nke ukwuu, na obi sara mbara, dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (1 Ndị Eze 4:29) Ọ bụ ezie na ihe e kwuru banyere ya n’ọnọdụ nke ọ bụla buru ibu, a kpaara ya ókè.

“Ájá nke oké osimiri” pụkwara ịpụta ọnụ ọgụgụ a na-amaghị ama, n’apụtaghị na ọ karịrị akarị. Jehova gwara Ebreham, sị: “M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jenesis 22:17) N’ikweghachi nwa Ebreham bụ́ Jekọb nkwa a, Jehova ji okwu bụ́ “ájá ala” mee ihe, bụ́ nke Jekọb kwughachiri dị ka “ájá nke oké osimiri.” (Jenesis 28:14; 32:12) “Mkpụrụ” Ebreham, ma e wezụga Jizọs Kraịst, mesịrị dịrị 144,000, bụ́ nke Jizọs kpọrọ “ìgwè atụrụ nta.”—Luk 12:32; Ndị Galeshia 3:16, 29; Mkpughe 7:4; 14:1, 3.

Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe atụ ndị a? Ọ bụ na okwu ahụ bụ́ “dị ka ájá nke oké osimiri” adịghị apụta mgbe nile ọnụ ọgụgụ karịrị akarị nke a na-apụghị ịgụta agụta; a dịghịkwa eji ya akọwa ihe ọdịdị ya buru oké ibu ma ọ bụ karịa akarịa. Mgbe mgbe, ọ na-apụta ọnụ ọgụgụ a na-amaghị ama nke butụrụ ibu. Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikweta na ìgwè mmadụ ahụ na-enupụ isi bụ́ ndị ga-akwado Setan ná mwakpo ikpeazụ ọ ga-awakpo ndị Chineke agaghị akarị akarị, kama ha ga-adị nnọọ ukwuu nke ịbụ ihe iyi egwu. Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, ọnụ ọgụgụ ha nọgidere bụrụ ihe a na-amaghị ama.