Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inyegide Ihe Ruo Mgbe Akpa Tọgbọrọ Chakoo

Inyegide Ihe Ruo Mgbe Akpa Tọgbọrọ Chakoo

Inyegide Ihe Ruo Mgbe Akpa Tọgbọrọ Chakoo

“Ị PỤRỤ ịkpọ m onye arịrịọ; nke ahụ adịghị ewute m. Ana m arịọrọ Jizọs arịrịọ.” Okwu ndị ahụ na-ekpughe ihe nke onye ụkọchukwu Protestant kwuru na-eme ka esemokwu a na-enwe banyere otú e si enweta ego e ji akwado okpukpe pụta ìhè. Okpukpe ndị gbanyere mkpọrọgwụ yiri ka ha na-adịgide nanị ma ọ bụrụ na ha na-enweta ego buru ibu. A chọrọ ego iji kwụọ ụgwọ ọnwa, iji wuo ụlọ okpukpe ma lekọta ha, na iji kwado ọrụ ịgbasa ozi ọma. Olee otú a ga-esi enweta ego dị mkpa maka ihe ndị a?

Nye ọtụtụ chọọchị, azịza ya bụ site n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri. * “Inye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ụzọ Chineke si akwado alaeze Ya n’ụwa,” ka onye okwuchukwu bụ́ Norman Robertson na-ekwu. “Ọ bụ usoro O si enweta ego iji mee ka o kwe omume ikwusa Oziọma ahụ.” N’emeghị ihere ichetara ụmụazụ ya banyere ibu ọrụ ha nke inye onyinye, ọ na-ekwusi ike, sị: ‘Otu ụzọ n’ụzọ iri abụghị ihe ị na-enye n’ihi na i nwere ike ime ya. Ọ bụ ihe na-egosi nrubeisi. Ịghara inye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ nnọọ imebi iwu Chineke. Ọ bụ iri ego Chineke.’—Tithing—God’s Financial Plan (Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri—Ịgba Ọnya Ego nke Chineke).

Eleghị anya, i kweere nnọọ na inye ihe kwesịrị ịbụ akụkụ nke ofufe Onye Kraịst. Otú ọ dị, ọ̀ na-enye gị nsogbu n’obi, ikekwe ọbụna na-ewe gị iwe, ịdị na-anụ ka a na-ekwu okwu ego mgbe nile? Ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Brazil bụ́ Inácio Strieder boro chọọchị ebubo iji otu ụzọ n’ụzọ iri “edozi nsogbu ndị ha nwere na chọọchị ha” ma kpọọ omume ndị dị otú ahụ “ihe iwu na-akwadoghị, nrụrụaka, na ime ihe na-ekwekọghị na nkwenkwe okpukpe.” Ihe si na ya pụta, ka ọ na-ekwu, bụ na “ndị na-enweghị ọrụ, ndị inyom di ha nwụrụ, ndị bi n’ógbè dara ogbenye, na ndị na-adịghị nkọ n’iche echiche na-ekwubi na Chineke agbahapụwo ha nakwa na a na-amanye ha inye ‘ụkọchukwu’ ihe dị ukwuu nke na ezinụlọ ha na-anọ agụụ.”

Ị pụrụ iche sị: ‘Chọọchị ndị na-amanye mmadụ inye otu ụzọ n’ụzọ iri hà na-etinye ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ọrụ n’ụzọ ziri ezi? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na ụfọdụ okpukpe na-erigbu ìgwè atụrụ ha site n’iji Chineke eyi ha egwu? N’ezie, Chineke ọ̀ na-achọ ka anyị na-enye ihe ruo mgbe akpa anyị tọgbọrọ chakoo?’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A kọwawo otu ụzọ n’ụzọ iri dị ka pasent 10 nke ihe nile mmadụ na-akpata.