Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Aka Gị Dị Ike

Mee Ka Aka Gị Dị Ike

Mee Ka Aka Gị Dị Ike

N’IME Bible, a kpọtụrụ aka aha ihe karịrị ugboro 1,800. E ji akpaala okwu ndị metụtara aka mee ihe n’ụzọ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, aka dị ọcha na-apụta ịbụ onye ikpe na-amaghị. (2 Samuel 22:21; Abụ Ọma 24:3, 4) Ịsaghe aka pụtara inye ndị ọzọ ihe n’ụba. (Deuterọnọmi 15:11; Abụ Ọma 145:16) A na-asị na onye tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ tinyere ndụ ya n’aka ya. (1 Samuel 19:5) Mmadụ ikwe ka aka ya kụdaa pụtara inwe nkụda mmụọ. (2 Ihe E Mere 15:7) Mmadụ imekwa ka aka ya dị ike pụtara ịbụ onye e wusiri ike na onye e mere ka ọ dị ike ịrụ ọrụ.—1 Samuel 23:16.

Taa, e nwere mkpa dị ngwa maka anyị ime ka aka anyị dị ike. Anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Mgbe anyị nwere nkụda mmụọ, ọchịchọ mmadụ na-abụ ịda mbà n’obi, ikwe ka aka anyị kụdaa. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ka ndị nọ n’afọ iri na ụma na-akwụsị ịga akwụkwọ, ka ndị di na-ahapụ ezinụlọ ha, na ka ndị nne na-agbahapụ ụmụ ha. Dị ka Ndị Kraịst, ọ dị anyị mkpa ime ka aka anyị dị ike iji wee na-atachi obi n’ọnwụnwa ndị anyị na-eche ihu n’ozi anyị na-ejere Chineke. (Matiu 24:13) Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Otú E Si Eme Ka Aka Dị Ike

Ọ dị ndị Juu nke oge Ezra mkpa ime ka aka ha dị ike iji wuchaa ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem nke ha na-ewughachi. Olee otú e si mee ka aka ha dị ike? Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ha wee were ọṅụ mee ememe achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa: n’ihi na Jehova mere ka ha ṅụrịa ọṅụ, O mekwara ka obi eze Asiria chigharịa n’ebe ha nọ, ime ka aka ha dị ike n’ije ozi nke ụlọ Chineke, bụ́ Chineke [Izrel].” (Ezra 6:22) N’ụzọ doro anya, ọ bụ ike ya no n’ọrụ ka Jehova ji kpalie “eze Asiria” ikwe ka ndị Chineke laghachi, Ọ kpalikwara mmụọ nke ndị ahụ, nke mere ka ha rụchaa ọrụ ahụ ha malitere.

Ka e mesịrị, mgbe mgbidi Jeruselem chọrọ nrụzi, Nehemaịa mere ka aka ụmụnna ya dị ike maka ọrụ ahụ. Anyị na-agụ, sị: “M wee gosi ha aka Chineke nke dị mma n’ahụ́ m; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwara m. Ha wee sị, Ka anyị bilie rụọ mgbidi. Ha wee mee ka aka ha dị ike ime ezi ihe a.” Ebe e meworo ka aka ha dị ike, n’ụzọ dị ịrịba ama, Nehemaịa na ndị Juu ibe ya wughachiri mgbidi Jeruselem n’ime ụbọchị 52!—Nehemaịa 2:18; 6:9, 15.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova na-eme ka aka anyị dị ike ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Ọ na-eme otú ahụ site ‘n’iji ihe ọma ọ bụla kwadebe anyị ime uche ya.’ (Ndị Hibru 13:21) O tinyewo ngwá ọrụ ndị kasị mma n’aka anyị. Anyị nwere Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, magazin, broshuọ, traktị, na kaseti a na-ege ege na nke vidio ndị anyị ga-eji mee ihe n’iru ndị mmadụ gburugburu ụwa. N’ezie, e nwere akwụkwọ anyị n’ihe dị ka asụsụ 380. Tụkwasị na nke ahụ, site ná nzukọ ọgbakọ na mgbakọ dị iche iche, Jehova na-akụziri anyị ihe ma na-enye anyị ọzụzụ banyere ụzọ isi jiri ọmarịcha ngwá ọrụ ndị a na-ejezu ozi anyị.

Ọ bụ ezie na Jehova na-eme ka aka anyị dị ike n’ọtụtụ ụzọ, ọ na-atụkwa anya ka anyị na-etinyesi mgbalị ike. Cheta ihe Ịlaịsha gwara Eze Joash, bụ́ onye bịakwutere ya maka enyemaka iji lụso ndị agha Siria bịara ịwakpo ya agha. Ịlaịsha gwara eze ahụ ka o were akụ́ ụfọdụ ma tie ha n’ala. Ihe ndekọ Bible ahụ na-ekwu, sị: “O wee tie ugboro atọ, guzo. Onye nke Chineke ahụ wee wesa ya iwe, sị, A sị na i tiri ugboro ise ma ọ bụ ugboro isii; mgbe ahụ ị ga-eti Siria ruo mgbe ị ga-eme ka ọ gwụsịa: ma ugbu a ị ga-eti Siria nanị ugboro atọ.” (2 Ndị Eze 13:18, 19) N’ihi ejighị ịnụ ọkụ n’obi tinyesie mgbalị ike, Joash meriri ndị Siria n’agha nanị ugboro ole na ole.

Otu ụkpụrụ ahụ metụtakwara anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụzu ihe Jehova nyere anyị ịrụ. Kama inwe nchegbu banyere ihe mgbochi ndị ga-anọchiri anyị ụzọ ma ọ bụ banyere otú ọrụ ahụ pụrụ isiru ike, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na obi dum na-arụ ya. Ọ dị anyị mkpa ime ka aka anyị dị ike ma legara Jehova anya maka enyemaka.—Aịsaịa 35:3, 4.

Jehova Ga-eme Ka Aka Anyị Dị Ike

Jehova agaghị ahapụ inyere anyị aka na ime ka aka anyị dị ike ime uche ya. N’ezie, Chineke agaghị arụ ọrụ ebube ma meere anyị ihe nile. Ọ na-atụ anya ka anyị mee òkè anyị—ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịkwadebe mgbe nile maka nzukọ na ịgachi ya anya, ikere òkè mgbe mgbe n’ozi dị ka o kwere mee, na ikpegara ya ekpere mgbe nile. Ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi na ịdị uchu na-eme òkè anyị mgbe anyị ka nwere ohere ya, Jehova ga-enye anyị ume ime ihe ọ chọrọ n’aka anyị.—Ndị Filipaị 4:13.

Tụlee ihe metụtara otu Onye Kraịst nke nwunye ya na nne ya nwụnahụrụ n’ime otu afọ. Ọ ka nọ n’ihe mgbu ahụ mgbe nwunye nwa ya hapụrụ nwa ya ma gbahapụ ụzọ ndụ nke Ndị Kraịst. “Amụtara m na anyị apụghị ịhọrọ ule ga-abịara anyị, anyị apụghịkwa ịhọrọ mgbe ha ga-abịa ma ọ bụ ugboro ole ha ga-abịa,” ka nwanna nwoke a kwuru. Olee otú o si nweta ume iji gaa n’ihu? “Ekpere na ọmụmụ ihe onwe onye abụwo jaket nchebe nke mere ka m ghara imikpu ná mmiri. Nkwado nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ m akasiwo m obi nke ukwuu. Karịsịa, abịawo m ghọta mkpa ọ dị isoro Jehova na-enwe mmekọrịta onwe onye dị mma tupu ọnọdụ ndị siri ike ebilite.”

N’agbanyeghị ụdị ahụmahụ ị na-enwe ná ndụ, kpebisie ike ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam na iji ndokwa nile ọ na-eme iji mee ka aka gị dị ike na-eme ihe nke ọma. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ike ijere Jehova ozi kasị mma ma si otú ahụ wetara aha ya dị oké ọnụ ahịa otuto na nsọpụrụ.—Ndị Hibru 13:15.

[Foto dị na peeji nke 31]

N’ihi ejighị ịnụ ọkụ n’obi gbalịsie ike, Joash meriri ndị Siria n’agha nanị ugboro ole na ole