Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-enwe Ọmụmụ Ihe Onwe Onye nke Okwu Chineke

Na-enwe Ọmụmụ Ihe Onwe Onye nke Okwu Chineke

Na-enwe Ọmụmụ Ihe Onwe Onye nke Okwu Chineke

“M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.”—ABỤ ỌMA 77:12.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji na-ewepụta oge maka ntụgharị uche? (b) Gịnị ka ịtụgharị uche pụtara?

DỊ KA ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, anyị kwesịrị ịdị na-enwe nchegbu miri emi banyere mmekọrịta anyị na Chineke na ihe ndị mere anyị ji na-ejere Ya ozi. Otú ọ dị, taa, ọtụtụ mmadụ ji nnọọ ọrụ n’aka nke na ha adịghị ewepụta oge maka ntụgharị uche. Ha mikpuru onwe ha kpam kpam ná ndụ gbalụ gbalụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, nke ịbụ ndị ịzụ ihe riri isi, na nke ịchụso ihe ụtọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ànyị pụrụ isi aṅaa zere nchụso ndị dị otú ahụ na-enweghị isi? Ọbụna dị ka anyị si ewepụta oge a kapịrị ọnụ kwa ụbọchị maka ihe omume ndị dị mkpa, dị ka iri nri na ihi ụra, n’otu aka ahụ, anyị aghaghị iwepụta oge kwa ụbọchị iji tụgharịa uche n’ihe ndị Jehova mere na n’otú o si mesoo ndị ọzọ ihe.—Deuterọnọmi 8:3; Matiu 4:4.

2 Ọ̀ dịtụwo mgbe ị kwụsịrị iji tụgharịa uche? Gịnị ka ịtụgharị uche pụtara? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa okwu ahụ dị ka mmadụ itinye uche n’ihe: karịsịa iji nwayọọ chebara ihe echiche n’ụzọ siri ike ma mie emie. Gịnị ka nke a pụtara nye anyị?

3. Gịnị ka ya na inwe ọganihu ime mmụọ nwere nnọọ njikọ?

3 Otu ihe bụ na o kwesịrị ichetara anyị ihe Pọl onyeozi degaara ohu ibe ya bụ́ Timoti n’akwụkwọ: “Ruo mgbe m ga-abịa, nọgide na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. . . . Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè nye mmadụ nile.” Ee, a tụrụ anya ka a na-enwe ọganihu, okwu Pọl gosikwara na e nwere nnọọ njikọ n’etiti ichebara ihe ime mmụọ echiche na inwe ọganihu. Otú ahụ ka ọ dị taa. Iji na-enweta afọ ojuju nke inwe ọganihu ime mmụọ na-akpata, anyị aghaghị ịnọgide ‘na-echeba echiche’ ma ‘na-etinye obi anyị dum’ n’ihe ndị metụtara Okwu Chineke.—1 Timoti 4:13-15.

4. Olee ngwá ọrụ ndị ị pụrụ iji mee ihe bụ́ ndị ga-enyere gị aka ichebara Okwu Jehova echiche mgbe nile?

4 Oge ga-akasị adịrị gị mma iji tụgharịa uche na-adabere n’ebe ị nọ na n’usoro ihe omume nke ezinụlọ gị. Ọtụtụ ndị na-echebara otu akụkụ Bible echiche n’isi ụtụtụ mgbe ha na-agụ akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. N’ezie, ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 20,000 nọ n’ebe obibi Betel ndị dị gburugburu ụwa na-amalite ụbọchị ha site n’iji minit 15 tụlee ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị. Ka nanị mmadụ ole na ole so n’ezinụlọ Betel na-aza ajụjụ kwa ụtụtụ, ndị ọzọ na-echebara ihe ndị a na-ekwu ma na-agụ echiche. Ndịàmà ndị ọzọ na-echebara Okwu Jehova echiche mgbe ha na-aga ọrụ. Ha na-ege kaseti Bible na nke magazin Ụlọ Nche na Teta! bụ́ ndị e nwere n’asụsụ ụfọdụ. Ọtụtụ ndị odozi akụ̀ na-eme nke a ka ha na-arụ ọrụ n’ụlọ. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha na-eṅomi ọbụ abụ bụ́ Esaf, bụ́ onye dere, sị: “M ga-ehota omume nile nke Jaa; n’ihi na m ga-echeta oké ọrụ Gị nile site na mgbe ochie. M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.”—Abụ Ọma 77:11, 12.

Àgwà Ziri Ezi Na-arụpụta Ihe Ndị Dị Mma

5. Gịnị mere ọmụmụ ihe onwe onye ji kwesị ịdị anyị mkpa?

5 N’ọgbọ anyị a e nwere TV, vidio, na kọmputa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ adịghịzi agụ ihe otú ha sibu agụ. N’ezie, o kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. E kwuwerị, ịgụ Bible dị ka eriri nchebe nke anyị si na ya abịakwute Jehova. Ọtụtụ puku afọ gara aga, Jọshụa nọchiri Mozis dị ka onye ndú Izrel. Iji nweta ngọzi Jehova, Jọshụa aghaghị ịgụ Okwu Chineke n’onwe ya. (Joshua 1:8; Abụ Ọma 1:1, 2) Nke ahụ ka bụkwa ihe a chọrọ taa. Otú ọ dị, n’ihi amachaghị akwụkwọ, ịgụ ihe pụrụ ịdị na-esiri ụfọdụ ndị ike ma ọ bụ na-agwụ ha ike. Ya mere, gịnị pụrụ inyere anyị aka ịchọ ịgụ na ịmụ Okwu Chineke? A pụrụ ịchọta azịza ya n’okwu Eze Solomọn ndị e dekọrọ n’Ilu 2:1-6. Biko sapee Bible gị ma gụọ amaokwu ndị a. E mesịa, anyị ga-atụlekọta ha ọnụ.

6. Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe n’ebe ihe ọmụma Chineke dị?

6 Iji malitegodị, anyị na-ahụ ndụmọdụ a: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; . . . ” (Ilu 2:1, 2) Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu ndị a? Ọ bụ na ibu ọrụ ahụ dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị. Rịba ama okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile.” Okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ” bụ okwu gbara ọkpụrụkpụ n’ihi na ihe ka ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ adịghị atọrọ Okwu Chineke ntị ha n’ala. Ka anyị wee na-enweta ọṅụ n’ịmụ Okwu Chineke, anyị aghaghị ịdị njikere ịnara okwu Jehova ma na-ewere ha dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke anyị na-achọghị ka o funahụ anyị. Anyị ekwesịghị ma ọlị ikwe ka ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị mee ka anyị jiri nnọọ ọrụ n’aka ma ọ bụ bụrụ ndị a dọpụrụ uche ha nke na anyị agaghịzi na-enwe mmasị n’Okwu Chineke, ọbụna na-enwe obi abụọ banyere ya.—Ndị Rom 3:3, 4.

7. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-anọ ya ma na-atọ ntị anyị n’ala ná nzukọ Ndị Kraịst mgbe ọ bụla o kwere mee?

7 Ànyị ‘na-atọ ntị n’ala’ n’ezie ma na-ege ntị nke ọma mgbe a na-akọwa Okwu Chineke ná nzukọ Ndị Kraịst anyị? (Ndị Efesọs 4:20, 21) Ànyị ‘na-ewezụga obi’ anyị iji nweta nghọta? Ikekwe ọkà okwu abụghị onye kasị nwee ahụmahụ, ma ka o ji Okwu Chineke na-eme ihe, o kwesịrị ka anyị gee ya ntị nke ọma. N’ezie, iji tọọrọ amamihe Jehova ntị n’ala, anyị aghaghị ịdị na-anọ ná nzukọ Ndị Kraịst mgbe ọ bụla o kwere mee. (Ilu 18:1) Cheedị banyere ndakpọ olileanya onye ọ bụla ọ pụrụ ịbụ na ọ ghara nzukọ ahụ e nwere n’ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem na Pentikọst 33 O.A., ga-enwewo! Ọ bụ ezie na nzukọ anyị adịghị akpali akpali dị ka nke ahụ, anyị na-atụle Bible, bụ́ akwụkwọ ọgụgụ anyị bụ́ isi, na ya. N’ihi ya, nzukọ ọ bụla pụrụ ịbụrụ anyị ngọzi ma ọ bụrụ na anyị atọọ ntị anyị n’ala ma na-esonye mgbe a na-agụ Bible.—Ọrụ 2:1-4; Ndị Hibru 10:24, 25.

8, 9. (a) Gịnị ka ọmụmụ ihe onwe onye na-achọ n’aka anyị? (b) Olee otú ị ga-esi jiri uru ọlaedo bara tụnyere ịghọta ihe ọmụma Chineke?

8 Ihe ọzọ eze ahụ maara ihe kwuru bụ: “Ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; . . . ” (Ilu 2:3) Àgwà ma ọ bụ mmụọ dị aṅaa ka okwu ndị ahụ na-eme ka anyị mara? Ọ bụnụ ọchịchọ siri ike nke ịghọta Okwu Jehova! Ha na-egosi ịdị njikere ịmụ ihe na-eburu n’uche inweta nghọta, ịghọta ihe uche Jehova bụ. N’ezie, nke a na-achọ mgbalị, nke a na-edugakwa anyị n’ihe ọzọ Solomọn kwuru na ihe atụ o nyere.—Ndị Efesọs 5:15-17.

9 Ọ gara n’ihu, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ ya [nghọta] dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: . . . ” (Ilu 2:4) Nke a na-echetara anyị ihe ndị na-egwupụta akụ̀ dị n’ala, bụ́ ndị chọworo ọla ndị ahụ a sị na ha dị oké ọnụ ahịa bụ́ ọlaọcha na ọlaedo, gwupụtaworo n’ime narị afọ ndị gafeworonụ. Ndị mmadụ egbuwo ibe ha n’ihi ọlaedo. Ndị ọzọ ejiriwo afọ ndụ ha nile gbalịa ịchọta ya. Otú ọ dị, uru dị aṅaa ka ọlaedo bara n’ezie? Ọ bụrụ na i furu ụzọ n’ọzara ma na-anwụ n’akpịrị ịkpọ nkụ, olee nke ị ga-ahọrọ: ọkpụrụkpụ ọlaedo ka ọ̀ bụ otu iko mmiri? N’agbanyeghị nke ahụ, lee ịnụ ọkụ n’obi ndị mmadụ jiworo chọọ ọlaedo n’agbanyeghị ọnụ ahịa ya sitere n’aka ụmụ mmadụ ma bụrụ nke na-akwụsighị ike! * Lee ka anyị si kwesị iji ịnụ ọkụ n’obi karịrị nnọọ nke ahụ na-achọ amamihe, mmata, na nghọta banyere Chineke na uche ya! Ma olee uru ịchọ ihe ndị dị otú ahụ bara?—Abụ Ọma 19:7-10; Ilu 3:13-18.

10. Gịnị ka anyị pụrụ ịchọta ma ọ bụrụ na anyị amụọ Okwu Chineke?

10 Solomọn gara n’ihu n’okwu ya: “Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.” (Ilu 2:5) Lee echiche na-ebu isi ọ bụ—na anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ ịchọta “ihe ọmụma Chineke,” bụ́ Jehova, Eze Onyenwe eluigwe na ala! (Abụ Ọma 73:28; Ọrụ 4:24) Ndị ọkà ihe ọmụma na ndị a sị na ha bụ ndị amamihe nke ụwa agbalịwo ruo ọtụtụ narị afọ ịghọta ihe omimi ndị e nwere banyere ndụ nakwa banyere eluigwe na ala. Otú ọ dị, ha achọtabeghị “ihe ọmụma Chineke.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbanyeghị na ọ dịwo n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, eri ọtụtụ puku afọ, ha leghaara ya anya dị ka ihe dị nnọọ mfe ma si otú ahụ jụ ịnakwere na ịghọta ya.—1 Ndị Kọrint 1:18-21.

11. Olee uru ụfọdụ a na-erite site n’ọmụmụ ihe onwe onye?

11 Lee ihe mkpali ọzọ Solomọn mere ka ọ pụta ìhè: “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.” (Ilu 2:6) Jehova ji ọchịchọ obi na mmesapụ aka ewere amamihe, ihe ọmụma, na nghọta enye onye ọ bụla dị njikere ịchọ ha. N’ezie, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke kpọrọ ihe, ọbụna ma a sị na ọ chọrọ mgbalị, ọzụzụ, na ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, anyị nwere Bible e biri ebi, ọ dịghịkwa anyị mkpa iji aka anyị na-edepụtaghachi Bible, dị ka ụfọdụ ndị mere n’oge ochie!—Deuterọnọmi 17:18, 19.

Iji Na-eje Ije n’Ụzọ Kwesịrị Jehova

12. Gịnị kwesịrị ịbụ nzube anyị ji na-achụso ihe ọmụma Chineke?

12 Gịnị kwesịrị ịbụ nzube anyị ji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye? Ọ̀ bụ iji yie ndị ka ndị ọzọ mma? Ka ọ̀ bụ iji gosipụta ihe ọmụma ka ukwuu? Ka ọ̀ bụkwanụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji ghọọ akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible na-aga ije? Ee e. Nzube anyị bụ iji bụrụ Ndị Kraịst na-aga ije, na-ekwu okwu, ma na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha na-ekwu, na-adị njikere mgbe nile iji mmụọ nke Kraịst bụ́ nke na-enye ume ọhụrụ enyere ndị ọzọ aka. (Matiu 11:28-30) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ihe ọmụma na-afụli elu, ma ịhụnanya na-ewuli elu.” (1 Ndị Kọrint 8:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe àgwà obi umeala ahụ Mozis gosipụtara mgbe ọ gwara Jehova, sị: “Biko, mee m ka m mara ụzọ Gị nile, m ga-amarakwa Gị, ka m wee hụta amara n’ihu Gị.” (Ọpụpụ 33:13) Ee, anyị kwesịrị ịchọ ihe ọmụma iji na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ọ bụghị iji na-adọta mmasị ndị mmadụ n’ebe anyị onwe anyị nọ. Anyị chọrọ ịbụ ndị ohu Chineke kwesịrị ekwesị ma dị umeala n’obi. Ànyị pụrụ isi aṅaa ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ?

13. Gịnị ka a chọrọ ka mmadụ wee bụrụ ohu Chineke kwesịrị ekwesị?

13 Pọl dụrụ Timoti ọdụ banyere ụzọ e si eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, na-asị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) E si na ngwaa Grik nke pụtara na mbụ “igbubi n’ụzọ kwụ ọtọ” ma ọ bụ ‘ịchabi n’ụzọ kwụ ọtọ,’ nweta okwu bụ́ ‘ijizi ejizi.’ (Kingdom Interlinear) Dị ka ụfọdụ ndị kwuru, nke a na-enye echiche nke ọkwá ákwà ịcha ákwà n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ e nyere, na nke onye ọrụ ugbo ịkọ ubi ya n’ụzọ kwụ ọtọ, na ihe ndị ọzọ. Ka o sina dị, ihe si na ya pụta aghaghị ịbụ ihe ziri ezi, ma ọ bụ ihe kwụ ọtọ. Ihe a na-ekwu bụ na ka Timoti wee bụrụ ohu Chineke kwesịrị ekwesị na nke a nwapụtara anwapụta, ọ ghaghị ‘ime ike ya nile’ iji jide n’aka na ozizi ya na omume ya kwekọrọ n’okwu nke eziokwu ahụ.—1 Timoti 4:16.

14. Olee otú ọmụmụ ihe onwe onye anyị kwesịrị isi na-emetụta ihe anyị na-eme ma na-ekwu?

14 Pọl mere ka otu ihe ahụ pụta ìhè mgbe ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọlọsi ume “[ije] ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu,” site “[n’ịmị] mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla ma na-aba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke.” (Ndị Kọlọsi 1:10) N’ebe a, Pọl na-ejikọta ịbụ ndị kwesịrị Jehova na ‘ịmị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla’ nakwa ‘ịba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke.’ N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe Jehova weere dị ka ihe dị mkpa abụghị nanị ókè anyị jiruru ihe ọmụma kpọrọ ihe kamakwa ókè anyị na-agbasoru Okwu Chineke n’ihe anyị na-eme ma na-ekwu. (Ndị Rom 2:21, 22) Nke a pụtara na ọmụmụ ihe onwe onye anyị aghaghị imetụta echiche na omume anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.

15. Olee otú anyị pụrụ isi chebe ma chịkwaa uche na echiche anyị?

15 Taa, Setan kpebisiri ike imebi ọnọdụ ime mmụọ anyị site n’ime ka anyị na uche anyị na-alụ mgbe nile. (Ndị Rom 7:14-25) Ya mere, anyị aghaghị ichebe ma chịkwaa uche na echiche anyị iji gosi na anyị kwesịrị Chineke anyị, bụ́ Jehova. Ngwá agha anyị nwere bụ “ihe ọmụma Chineke,” bụ́ nke nwere ike “[ịdọrọ] echiche ọ bụla n’agha ime ka ọ na-erubere Kraịst ahụ isi.” Nke a bụ ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-atọrọ ọmụmụ Bible kwa ụbọchị ntị n’ala, ebe anyị chọrọ iwepụ echiche anụ ahụ́ na nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’uche anyị.—2 Ndị Kọrint 10:5.

Ihe Ndị Na-enye Aka n’Ịghọta Ihe

16. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’onwe anyị ka Jehova na-ezi anyị ihe?

16 Izi ihe Jehova na-eweta abamuru ime mmụọ na nke anụ ahụ́. Ọ bụghị nkà mmụta okpukpe nke na-adịghị akpali mmasị, na nke na-abaghị uru. N’ihi ya, anyị na-agụ, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Olee otú Jehova si eme ka anyị na-eje ije n’ụzọ ya bara uru? Nke mbụ, anyị nwere Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ. Nke a bụ akwụkwọ ọgụgụ anyị bụ́ isi, bụ́ nke anyị na-ezo aka na ya n’esepụghị aka. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka anyị na-asape Bible anyị ma na-esonye mgbe a na-agụ ya ná nzukọ Ndị Kraịst. A pụrụ ịhụ uru ndị a na-erite na ya n’akụkọ banyere ọnaozi Etiopia, bụ́ nke e dekọrọ n’Ọrụ isi 8.

17. Gịnị mere n’ihe banyere ọnaozi Etiopia, gịnịkwa ka nke a na-egosi?

17 Ọnaozi Etiopia ahụ bụ onye a tọghatara n’okpukpe ndị Juu. Ọ bụ onye ji ezi obi kwere na Chineke, ọ mụkwara Akwụkwọ Nsọ. Ka o ji ụgbọ ịnyịnya ya na-eme njem, ọ nọ na-agụ ihe odide nke Aịzaịa mgbe Filip gbakwutere ya ma jụọ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Olee otú ọnaozi ahụ si zaghachi? “‘N’ezie, olee nnọọ otú m ga-esi mara, ma ọ́ bụghị ma mmadụ ò duziri m?’ O wee rịọsie Filip ike ka ọ rịgota ma soro ya nọdụ ala.” Mgbe ahụ, Filip, n’ịbụ onye mmụọ nsọ duziri, nyeere ọnaozi ahụ aka ịghọta amụma Aịzaịa. (Ọrụ 8:27-35) Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ bụ na anyị ịgụ Bible n’onwe anyị ezughị. Jehova, site ná mmụọ ya, na-eji òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche enyere anyị aka ịghọta Okwu ya n’oge kwesịrị ekwesị. Olee otú e si eme nke a?—Matiu 24:45-47; Luk 12:42.

18. Olee otú òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche si enyere anyị aka?

18 Ọ bụ ezie na a kọwara òtù ohu ahụ dị ka onye “na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” Jizọs asịghị na ọ pụghị imehie ihe. Ọ ka bụ Ndị Kraịst na-ezughị okè mejupụtara ìgwè ụmụnna a na-ekwesị ntụkwasị obi e tere mmanụ. N’agbanyeghị na ha nwere ebumnobi kasị mma, ha pụrụ imehie ihe, dị ka ndị ikom dị ka ha mere mgbe ụfọdụ na narị afọ mbụ. (Ọrụ 10:9-15; Ndị Galeshia 2:8, 11-14) Otú ọ dị, ha ji ezi ebumnobi na-eme ihe, Jehova na-ejikwa ha enye anyị ihe ndị na-enye aka n’ịmụ Bible iji na-ewulite okwukwe anyị nwere n’Okwu nakwa ná nkwa Chineke. Ihe enyemaka bụ́ isi ohu ahụ nyeworo anyị iji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye bụ New World Translation of the Holy Scriptures. Ọ dị ugbu a, n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ 42, e bipụtawokwa ya nde 114, n’ụdị dị iche iche. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ya na-eme ihe n’ụzọ dị irè n’ọmụmụ ihe onwe onye anyị?—2 Timoti 3:14-17.

19. Olee ihe ụfọdụ ndị dị na New World Translation—With References bụ́ ndị pụrụ inye aka n’ọmụmụ ihe onwe onye?

19 Were, dị ka ihe atụ, New World Translation of the Holy Scriptures—With References. O nwere kọlụm ndị bụ́ maka ntụaka, ihe odide ala ala peeji, ndepụta okwu dị nta bụ́ nke a kpọrọ “Ndepụta nke Okwu Ndị Dị na Bible” na “Ndepụta nke Okwu Ndị Dị ná Nkọwa Ala Ala Peeji,” na Ihe Odide Ntụkwasị bụ́ nke a tụlere isiokwu 43 na ya n’ụzọ sara mbara, gụnyere map na chaatị dị iche iche. E nwekwara “Okwu Mmalite,” na nkọwa e nyere na ya banyere ọtụtụ ebe ndị e si nweta ihe ndị a sụgharịrị ná nsụgharị Bible a pụrụ iche. Ọ bụrụ na ọ dị n’asụsụ ị pụrụ ịghọta, gbalịsie ike ịmara ihe ndị a dị na ya nke ọma ma jiri ha na-eme ihe. Ka o sina dị, ọ bụ Bible ka anyị ji amalite usoro ihe ọmụmụ anyị, na New World Translation kwa, anyị nwere nsụgharị nke mere ka aha Chineke pụta ìhè n’ụzọ kwesịrị ekwesị ka ọ na-eme ka ịchịisi Alaeze Chineke pụta ìhè.—Abụ Ọma 149:1-9; Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.

20. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ọmụmụ ihe onwe onye dị mkpa ugbu a ka a zaa ha?

20 Ugbu a, anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee ihe enyemaka ọzọ dị anyị mkpa iji ghọta Bible? Olee otú anyị pụrụ isi na-ewepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye? Olee otú anyị pụrụ isi na-eme ka ọmụmụ ihe anyị na-adịkwu irè? Olee otú ihe anyị na-amụ kwesịrị isi na-emetụta ndị ọzọ?’ Isiokwu na-esonụ ga-atụle akụkụ ndị a dị oké mkpa nke ọganihu anyị dị ka Ndị Kraịst.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Kemgbe 1979, ọlaedo anọwo na-eme ya dịtụ ọnụ ya adalata, o siwo na $850.00 maka gram 31 na 1980 daa nnọọ ruo $252.80 maka gram 31 na 1999.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka ịtụgharị uche pụtara?

• Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe n’ebe ịmụ Okwu Chineke dị?

• Olee nzube anyị kwesịrị iji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye?

• Olee ihe ndị anyị nwere bụ́ ndị na-enye aka n’ịghọta Bible?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị ezinụlọ Betel na-ahụta ya dị ka ihe na-ewusikwu ha ike n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ịmalite ụbọchị site n’ịtụle otu akụkụ Bible

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Anyị pụrụ ime ka oge bara uru ghara ịla n’iyi site n’ịdị na-ege teepu Bible mgbe anyị na-eme njem

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndị mmadụ rụsiri ọrụ ike ruo ogologo oge iji nweta ọlaedo. Mgbalị ha aṅaa ka ị na-etinye iji na-amụ Okwu Chineke?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’aka California State Parks, 2002

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Bible bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi