Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Kasị Mma Ịdị Ndụ

Oge Kasị Mma Ịdị Ndụ

Oge Kasị Mma Ịdị Ndụ

MGBE ọnọdụ ndị tara akpụ chere gị ihu, ọ na-adị gị ka ya bụrụ “mgbe elu bụ ala ọsa”? Ya bụrụ otú ahụ, tụlee ihe Eze Solomọn maara ihe kwuru: “Asịla, Gịnị kpatara ụbọchị mbụ ji dị mma karịa ụbọchị ndị a? n’ihi na i siteghị n’amamihe jụọ ajụjụ banyere nke a.”—Eklisiastis 7:10.

N’ihi gịnị ka Solomọn ji nye ndụmọdụ a? Ọ bụ n’ihi na ọ maara na ile oge gara aga anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-enye nnọọ aka ịnagide ọnọdụ ndị na-adịghị mma dị ugbu a. Ndị ọ na-adị ka ya bụrụ “mgbe elu bụ ala ọsa” pụrụ n’ezie ichefu na nsogbu na ihe isi ike jupụtara n’oge ndị ahụ, nakwa na ọ dịghị mgbe ihe dịcha mma n’ezie. Ọ pụrụ ịbụ na ọ dị ihe ụfọdụ ndị dị mma n’oge gara aga, ma ikekwe ndị ọzọ adịghị otú ahụ. Dị ka Solomọn kwuru, amamihe adịghị n’iche banyere ihe gara aga n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, ebe ọ bụ na o doro anya na anyị apụghị ịdọghachi aka elekere azụ.

È nwere ihe ize ndụ pụrụ ịdị n’ịrọ nrọ efu banyere ịlaghachi n’oge ndị gara aga? Ee, ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka anyị ghara ime mgbanwe ma nagide ọnọdụ ndị dị ugbu a, ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ na-egbochi anyị inwe ekele maka oge anyị bi n’ime ya nakwa maka olileanya nke anyị pụrụ inwe.

N’ezie, ugbu a bụ oge kasị mma ịdị ndụ, n’agbanyeghị nsogbu ụwa nke na-amụba amụba. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị na-eru nso mmezu nke nzube Chineke banyere ụwa anyị na ngọzi nke ọchịchị udo nke Alaeze ya ga-eweta. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Mgbe ahụ, ka ọnọdụ ga-adị nnọọ mma karị, ọ dịghị onye ga-enwe ihe mere ọ ga-eji dị ya ka ya bụrụ “mgbe elu bụ ala ọsa.”