Ihe Ndị A Na-amụta Site n’Ihe Ndekọ Banyere Ọmụmụ Jizọs
Ihe Ndị A Na-amụta Site n’Ihe Ndekọ Banyere Ọmụmụ Jizọs
IHE omume ndị gbara ọmụmụ Jizọs gburugburu na-akpali mmasị ọtụtụ nde mmadụ. A na-ahụ nke a site n’imerime ihe osise nke Ọmụmụ Jizọs ndị a na-ahụ na ihe ngosi ya ndị a na-eme gburugburu ụwa n’oge Krismas. Ọ bụ ezie na ihe omume ndị gbara ọmụmụ Jizọs gburugburu na-akpali mmasị, e dekọghị ha na Bible ka ọ bụrụ ihe ụmụ mmadụ ga-eji na-atụrụ ndụ. Kama nke ahụ, ha so n’Akwụkwọ Nsọ dum nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke maka izi ihe na ime ka ihe guzozie.—2 Timoti 3:16.
A sị na Chineke chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme ememe ncheta ọmụmụ Jizọs, mgbe ahụ, Bible gaara ekwu kpọmkwem ụbọchị ọ bụ. Ò kwuru ya? Mgbe o kwusịrị na a mụrụ Jizọs n’oge ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’èzí n’abalị na-eche ìgwè atụrụ ha nche, ọkà mmụta Bible nke narị afọ nke 19 bụ́ Albert Barnes kwubiri, sị: “Nke a mere ka o doo anya na a mụrụ Onye Nzọpụta anyị tupu December 25 . . . A na-enwe oké oyi n’oge ahụ, karịsịa n’ógbè ndị bụ́ ugwu ugwu dị nso na Betlehem. Chineke ekpuchiwo oge a mụrụ [Jizọs]. . . . Ọ dịghịkwa mkpa ịmara oge ọ bụ; a sị na ọ dị mkpa, Chineke gaara ahụ na e dekọrọ ya.”
N’ụzọ dị iche, mmadụ anọ dere Oziọma ndị ahụ gwara anyị n’ụzọ doro anya ụbọchị Jizọs nwụrụ. Ọ bụ n’ụbọchị Ememe Ngabiga, nke a na-eme n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa ndị Juu bụ́ Naịsan, n’oge opupu ihe ubi. Ọzọkwa, Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu kpọmkwem ime ememe ụbọchị ahụ iji na-echeta Ya. (Luk 22:19) Ọ dịghị ebe ọ bụla e nyere iwu dị otú ahụ na Bible ka a na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ Jizọs, ma ọ bụkwanụ nke onye ọ bụla ọzọ. N’ụzọ dị mwute, arụmụka ndị a na-enwe banyere ụbọchị a mụrụ Jizọs pụrụ ikpuchi ihe ndị dị ịrịba ama karị bụ́ ndị mere gburugburu oge ahụ.
Nne na Nna Chineke Họọrọ
N’ime ọtụtụ puku ezinụlọ e nwere n’Izrel, olee ụdị nne na nna Chineke họọrọ ka ha zụlite Ọkpara ya? Ò weere ihe ndị dị ka ịbụ onye a ma ama na akụ̀ na ụba dị ka ihe ndị dị mkpa? Ee e. Kama nke ahụ, Jehova rịbara àgwà ime mmụọ nke nne na nna ahụ ama. Nyochaa abụ otuto Meri, dị ka e dekọrọ ya na Luk 1:46-55, bụ́ nke ọ bụrụ mgbe a gwasịrị ya banyere ihe ùgwù ya nke ịghọ nne Mezaịa ahụ. Tinyere ihe ndị ọzọ, o kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova . . . n’ihi na o lekwasịwo anya n’ọnọdụ dị ala nwa agbọghọ bụ́ ohu ya.” O ji obi umeala were onwe ya dị ka onye nọ “n’ọnọdụ dị ala,” nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova. Nke ka mkpa bụ na ọmarịcha okwu otuto ndị dị n’abụ Meri ahụ na-eme ka a mara na ọ bụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ bụ ezie na ọ bụ nwa na-eme mmehie nke Adam, ọ bụ onye kasị mma a pụrụ ịhọrọ dị ka nne elu ala nke Ọkpara Chineke.
Gịnị banyere di Meri, bụ́ onye ghọrọ nna nkuchi Jizọs? Josef bụ nwoke maara nke a na-akọ n’ọrụ ịkwa nkà. N’ihi njikere ọ dị iji aka ya rụsie ọrụ ike, ọ bịara nwee ike igbo mkpa nke ezinụlọ mesịrị nwee ụmụ ndị ikom ise na, ma ọ dịkarịa ala, ụmụ ndị inyom abụọ. (Matiu 13:55, 56) Josef abaghị ọgaranya. Mgbe oge ruru ka Meri kute nwa nwoke mbụ ya n’ụlọ nsọ Chineke, Josef aghaghị inwewo ndakpọ olileanya na ọ pụghị iweta atụrụ iji chụọ àjà. Kama nke ahụ, ha aghaghị iweta ihe e nyere ohere ka ndị ogbenye jiri na-achụ àjà. Iwu Chineke kwuru banyere nne mụrụ nwa nwoke ọhụrụ, sị: “Ọ bụrụ na aka ya erughị ihe ga-ezu nwa atụrụ, ọ ga-ewerekwa nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ; otu ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, ibe ya ka ọ bụrụkwa àjà mmehie: onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie ya, a ga-emekwa ya ka ọ dị ọcha.”—Levitikọs 12:8; Luk 2:22-24.
Bible na-ekwu na Josef “bụ onye ezi omume.” (Matiu 1:19) Dị ka ihe atụ, o soghị nwunye ya na-amaghị nwoke nwee mmekọahụ ruo mgbe a mụsịrị Jizọs. Nke a mere ka a ghara inwe nghọtahie ọ bụla banyere onye bụ́ Nna Jizọs n’ezie. Ọ pụghị ịdịworo ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ mfe ịghara inwe mmekọahụ ka ha bi n’otu ụlọ, ma o gosiri na ha abụọ ji ihe ùgwù nke ịbụ ndị a họọrọ ịzụlite Ọkpara Chineke kpọrọ ihe.—Matiu 1:24, 25.
Dị ka Meri, Josef ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ọ na-akwụsị ọrụ kwa afọ ma kpọrọ ezinụlọ ya mee njem na-ewe ụbọchị atọ site na Nazaret ruo Jeruselem maka Ememe Ngabiga a na-eme kwa afọ. (Luk 2:41) Ọzọkwa, ọ ghaghị ịbụwo na Josef zụrụ Jizọs na-eto eto ime omenala ahụ a na-eme kwa izu bụ́ ikere òkè n’ofufe n’ụlọ nzukọ dị n’ógbè ha, bụ́ ebe a na-anọ agụ ma na-akọwa Okwu Chineke. (Luk 2:51; 4:16) N’ihi ya, a pụghị inwe obi abụọ ma ndị Chineke họọrọ dị ka nne elu ala na nna nkuchi nke Ọkpara ya hà bụkwa ndị kwesịrị ekwesị.
Ngọzi Dị Ebube A Gọziri Ndị Ọzụzụ Atụrụ Dị Ala
N’agbanyeghị ihe isi ike nwunye ya, bụ́ onye dị ime ọnwa itoolu ugbu a, nwere, Josef gara n’obodo nna nna ya hà ka e deba aha ya n’akwụkwọ, n’ikwekọ n’iwu Siza. Mgbe di na nwunye ahụ bịarutere Betlehem, ha apụghị ịchọta ebe ha ga-anọ ọnọdụ abalị n’obodo ahụ ndị mmadụ jupụtara. N’ihi ya, ọnọdụ ha nọ na
ya manyere ha ịnọ n’ụlọ anụ ụlọ, bụ́ ebe a nọ mụọ Jizọs ma nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Iji wusikwuo okwukwe ha ike, Jehova nyere nne na nna ahụ dị ala ihe obi ga-eji sie ha ike na nwa a ha mụrụ bụ uche Chineke n’ezie. Ọ̀ bụ ndị nnọchiteanya sitere n’etiti ndị okenye a ma ama na Betlehem ka o zigara iji mesighachi di na nwunye ahụ obi ike? Ee e. Kama nke ahụ, ndị Jehova Chineke kpugheere okwu ahụ bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-arụsi ọrụ ike bụ́ ndị nọ n’èzí na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.Mmụọ ozi Chineke pụtara n’ihu ha ma gwa ha ka ha gaa Betlehem, bụ́ ebe ha ga-ahụ Mezaịa ahụ a mụrụ ọhụrụ ka o ‘dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.’ Ndị ikom a dị ala hà kụjara ma ọ bụ mee ihere ịnụ na Mezaịa ahụ a mụrụ ọhụrụ nọ n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri? Ọ dịghị ma ọlị! N’egbughị oge, ha hapụrụ ìgwè atụrụ ha ma gawa Betlehem. Mgbe ha chọtara Jizọs, ha kọọrọ Josef na Meri ihe mmụọ ozi Chineke kwuru. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a wusikwuru okwukwe di na nwunye ahụ ike na ihe nile na-aga otú Chineke si zube ya. “Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ,” n’aka nke ha, “wee laghachi, na-enye Chineke otuto ma na-aja ya mma maka ihe nile ha nụrụ ma hụ.” (Luk 2:8-20) Ee, Jehova mere nhọrọ dị mma n’ikpughere ya ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-atụ egwu Chineke.
Site n’ihe ndị a e kwuru n’elu, anyị na-amụta ụdị mmadụ ọ dị mkpa ka anyị bụrụ iji na-enweta ihu ọma Jehova. Ọ dịghị anyị mkpa ịchọ ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị nwere akụ̀ na ụba. Kama nke ahụ, dị ka Josef, Meri, na ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, ọ dị anyị mkpa irubere Chineke isi ma gosipụta na anyị hụrụ ya n’anya site n’ibute ihe ndị metụtara ihe ime mmụọ ụzọ karịa ihe onwunwe. N’ezie, e nwere ihe ndị dị mma anyị ga-amụta site n’ịtụgharị uche n’ihe ndekọ nke ihe ndị mere gburugburu oge a mụrụ Jizọs.
[Foto dị na peeji nke 7]
Gịnị ka mweta Meri wetara kpalakwukwu abụọ na-egosi?
[Foto dị na peeji nke 7]
Chineke họọrọ ime ka ndị ọzụzụ atụrụ ole na ole dị ala mara banyere ọmụmụ Jizọs