Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Amamihe Atọ Ahụ”—Hà Bụ Ole Ndị?

“Ndị Amamihe Atọ Ahụ”—Hà Bụ Ole Ndị?

“Ndị Amamihe Atọ Ahụ”—Hà Bụ Ole Ndị?

N’ihe ngosi nke Ọmụmụ Jizọs, a na-egosikarị ndị ikom atọ yi uwe mwụda na kamel ha ka ha nọ na-erute n’otu ụlọ anụ ụlọ bụ́ ebe nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. A na-akpọkarị ndị nleta ahụ jiri ejiji ndị oké ozu ndị amamihe atọ. Gịnị ka Bible nwere ikwu banyere ha?

Dị ka Bible si kwuo, ndị ahụ a sị na ha bụ ndị amamihe “sitere n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ,” ọ bụkwa ebe ahụ ka ha nọ mara banyere ọmụmụ Jizọs. (Matiu 2:1, 2, 9) Ọ ghaghị iwewo ndị ikom a ogologo oge iji rute Judia. Mgbe ha mesịrị chọta Jizọs, ọ bụghịzi nwa ọhụrụ nke nọ n’ụlọ anụ ụlọ. Kama nke ahụ, ndị ikom ahụ hụrụ Meri na “nwatakịrị ahụ” ka ha bi n’ụlọ.—Matiu 2:11.

Bible na-akpọ ndị ikom a “ndị na-agụ kpakpando,” o kwughịkwa ole ha dị. Akwụkwọ bụ́ The Oxford Companion to the Bible na-akọwa, sị: “A na-ahụ njikọ dị n’etiti majik na ịgụ kpakpando n’oké mmasị ndị nleta ahụ nwere n’ebe kpakpando nke dutere ha Betlehem dị.” Bible na-akatọ ụdị majik nile na omume ndị Babilọn nke ịnwa isi na kpakpando nweta ihe ọmụma.—Deuterọnọmi 18:10-12; Aịsaịa 47:13.

Ihe ọmụma ndị ikom a nwetara arụpụtaghị ezi ihe ọ bụla. Ọ kpaliri iwe ekworo nke ajọ Eze Herọd. N’aka nke ya, nke a mere ka Josef, Meri, na Jizọs gbaga Ijipt, meekwa ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke nile nọ na Betlehem “malite ná ndị dị afọ abụọ gbadaa.” Herọd ji nlezianya chọpụta oge a mụrụ Jizọs site n’ihe ọ nụrụ n’ọnụ ndị ahụ na-agụ kpakpando. (Matiu 2:16) N’iburu n’uche nsogbu nleta ha kpatara, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na kpakpando ahụ ha hụrụ na ozi banyere “onye ahụ a mụrụ ịbụ eze ndị Juu,” si n’aka onye iro Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, onye chọrọ igbu Jizọs.—Matiu 2:1, 2.