Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị: “N’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a”?

N’izo aka ná nguzobe nke Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs, Pọl dere, sị: “N’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.” (1 Ndị Kọrint 11:25, 26) Ụfọdụ ndị chere na okwu ahụ bụ́ ‘oge nile’ nke e ji mee ihe n’ebe a na-egosi na e kwesịrị ịdị na-eme ememe ncheta ọnwụ Kraịst ugboro ugboro, n’echiche nke ime ya ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, ha na-eme ya ihe karịrị otu ugboro n’afọ. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe Pọl bu n’uche?

Ọ fọziri nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 eri Jizọs guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya. N’ihi ya, ime Ememe Ncheta ahụ ọbụna otu ugboro n’afọ pụtara na e mewo ya ọtụtụ ugboro kemgbe afọ 33 O.A. Otú ọ dị, ihe Pọl na-ekwu ná 1 Ndị Kọrint 11:25, 26 abụghị ugboro ole e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta ahụ, kama ọ bụ otú e kwesịrị isi na-eme ya. Na Grik mbụ, o jighị okwu bụ́ pol·laʹkis, bụ́ nke pụtara “mgbe mgbe” ma ọ bụ “ugboro ugboro” mee ihe. Kama nke ahụ, o ji okwu bụ́ ho·saʹki, bụ́ nke pụtara ‘n’oge nile a na-eme,’ bụ́ okwu nke pụtara “mgbe ọ bụla,” “oge ọ bụla a na-eme.” Ihe Pọl na-ekwu bụ: ‘Oge ọ bụla unu na-eme nke a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị.’ *

Ya mere, ugboro ole ka e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs? O kwesịrị ekwesị ka a na-eme ya nanị otu ugboro n’afọ. Ọ bụ ememe ncheta n’ezie, a na-emekarịkwa ememe ncheta otu ugboro n’afọ. Tụkwasị na nke ahụ, Jizọs nwụrụ n’ụbọchị Ememe Ngabiga nke ndị Juu, bụ́ nke a na-eme otu ugboro n’afọ. N’ụzọ dabara adaba, Pọl kpọrọ Jizọs “Kraịst bụ́ àjà ememe ngabiga anyị,” ebe ọ bụ na ọnwụ ịchụ àjà Jizọs megheere Izrel ime mmụọ ụzọ ịbanye ná ndụ, dị nnọọ ka àjà Ngabiga mbụ ahụ chebere ndụ nke ụmụ e buru ụzọ mụọ nke Izrel anụ ahụ́ n’Ijipt ma meghee ụzọ maka ịnapụta mba ahụ n’ịbụ ohu. (1 Ndị Kọrint 5:7; Ndị Galeshia 6:16) Njikọ a dị n’etiti ya na Ememe Ngabiga nke ndị Juu bụ́ nke a na-eme otu ugboro n’afọ bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na e kwesịrị ime Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs nanị otu ugboro n’afọ.

Ọzọkwa, Pọl ji ọnwụ Jizọs tụnyere ememe ọzọ ndị Juu na-eme otu ugboro n’afọ, bụ́ Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ná Ndị Hibru 9:25, 26, anyị na-agụ, sị: “Ọ bụghịkwa ka [Jizọs] wee chụọ onwe ya n’àjà mgbe mgbe, dị nnọọ ka nnukwu onye nchụàjà na-eji ọbara na-abụghị nke ya abanye n’ebe nsọ kwa afọ [n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie]. . . . Ma ugbu a, o mewo onwe ya ka ọ pụta ìhè nanị otu ugboro ná ngwụsị nke usoro ihe dị iche iche iji wepụ mmehie site n’ịchụ onwe ya n’àjà.” Ebe ọ bụ na àjà Jizọs nọchiri anya àjà Ụbọchị Mkpuchi Mmehie nke a na-achụ otu ugboro n’afọ, Ememe Ncheta ọnwụ ya kwesịrị ka a na-eme ya otu ugboro n’afọ. Ọ dịghị ihe ọ bụla dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere a ga-eji na-eme Ememe Ncheta ihe karịrị otu ugboro.

N’ikwekọ na nke a, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ John Laurence von Mosheim kọrọ na ọ bụ ihe maara Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ n’Asia Minor ahụ́ ime Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs “n’ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ nke ndị Juu [bụ́ Naịsan].” Ọ bụ nanị n’afọ ndị sochirinụ ka ọ ghọrọ ihe a na-emekarị na Krisendọm bụ́ ime ya ihe karịrị otu ugboro n’afọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Tụlee ihe ndekọ dị na 1 Samuel 1:3, 7. N’ebe ahụ, “mgbe ọ bụla” (ná nsụgharị ọgbara ọhụrụ nke Hibru) na-ezo aka n’ihe ndị e mere “site n’afọ ruo n’afọ,” ma ọ bụ otu ugboro n’afọ, bụ́ mgbe Elkana na ndị nwunye ya abụọ na-aga n’ụlọikwuu dị na Shaịlo.