Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Chineke, n’Ihi Gịnị Ka I Ji Kwere Ka nke A Mee?’

‘Chineke, n’Ihi Gịnị Ka I Ji Kwere Ka nke A Mee?’

‘Chineke, n’Ihi Gịnị Ka I Ji Kwere Ka nke A Mee?’

RICARDO ka na-echeta mgbe ya na nwunye ya, bụ́ Maria, nọ ọdụ n’ọnụ ụlọ a na-anọ echere dọkịta. * Ọ dịghị onye n’ime ha obi kara ịgụ ihe dị n’akwụkwọ e dere ọrịa a chọpụtara n’ahụ́ a ka lepụrụ Maria. Mgbe ahụ, Ricardo meghere envelopu ahụ, ha lekwara anya ngwa ngwa n’okwu ndị dọkịta ji eme ihe nke dị n’akwụkwọ ahụ e dere ihe na-arịa Marịa. Ha hụrụ okwu bụ́ “cancer,” ha abụọ malitekwara ibe ákwá ebe ha ghọtara kpọmkwem ihe okwu ahụ pụtara.

“Dọkịta ahụ nwere nnọọ obiọma,” ka Ricardo na-echeta, “ma o doro anya na ọ ghọtara otú ọnọdụ ahụ dịruru ná njọ n’ihi na ọ nọgidere na-agwa anyị na anyị aghaghị ịtụkwasị Chineke obi.”

Tupu a malite iji ígwè e ji achakpọ anụ ahụ́ gwọwa Maria, dọkịta ya chọpụtara na ọ pụghị ịchịkwa mmegharị nke ụkwụ aka nri ya. Nnyocha ndị ọzọ e mere gosiri na cancer ahụ agbasawo ruo n’ụbụrụ ya. Mgbe a gwọsịrị ya ruo nanị otu izu, a kwụsịrị ịchakpọ anụ ahụ́ ya. Maria tụbọrọ ma nwụọ mgbe ọnwa abụọ gasịrị. “Obi dị m ụtọ na ọ kwụsịwo ịta ahụhụ,” ka Ricardo na-akọwa, “ma ọ na-agụsi m nnọọ ike ịhụ ya anya nke na ọ na-adị m ka ndụ m bịakwuo ná njedebe. Mgbe mgbe, m na-etiku Chineke mkpu, sị: ‘N’ihi gịnị ka i ji kwere ka nke a mee?’”

Mgbe Ọdachi Mere, Ọtụtụ Ajụjụ Na-ebilite

Dị ka Ricardo, imerime mmadụ n’ụwa nile na-ahụjukwa anya n’ihi ọnọdụ ndị ha na-apụghị izere ezere. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndị aka ha dị ọcha na-ahụju anya. Cheedị banyere ihe mwute ndị na-agbawa obi agha ndị na-emekpa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ́ bụ́ ndị a na-alụ n’esepụghị aka, na-akpata. Ma ọ bụ chee banyere ihe mgbu ọtụtụ ndị e dinara n’ike, ụmụaka ndị a na-emegbu emegbu, ndị a na-eti ihe n’ebe obibi ha, na ndị ụmụ mmadụ na-emeso omume ọjọọ ndị ọzọ, na-enwe. N’akụkọ ihe mere eme nile, o yiri ka mmegbu na ihe mgbu ndị ikom na ndị inyom kpachawooro anya na-akpatara ibe ha enweghị nsọtụ. (Eklisiastis 4:1-3) E wezụga nke ahụ, e nwere oké ihe mgbu nke ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ ọrịa mmetụta uche, nke uche, na nke anụ ahụ́ metụtara na-enwe. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji ajụ, sị, “N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dị otú ahụ dịrị?”

Ọbụna nye ndị nwere nkwenkwe okpukpe, nhụjuanya adịghị mgbe ọ na-adịrị ha mfe nnagide. Gị onwe gị pụkwara ịdị na-eche ihe pụrụ nnọọ ime ka Chineke na-ahụ n’anya na nke nwere ike nile kwere ka ụmụ mmadụ na-ahụju anya. Inweta azịza na-eju afọ na nke bụ́ eziokwu nye ajụjụ a dị mgbagwoju anya dị oké mkpa maka udo nke uche anyị na mmekọrịta anyị na Chineke. Bible na-enye azịza dị otú ahụ. Biko tụlee ihe o nwere ikwu dị ka a tụlere n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ndị ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Dọkịta ahụ nọgidere na-agwa anyị na anyị aghaghị ịtụkwasị Chineke obi