Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Ijizi Okwu nke Eziokwu ahụ Ejizi?

Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Ijizi Okwu nke Eziokwu ahụ Ejizi?

Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Ijizi Okwu nke Eziokwu ahụ Ejizi?

N’OTU oge, otu onye nke na-emere ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ntụle nke ihe nkiri gara ikiri otu egwuregwu. O nwechaghị mmasị n’egwuregwu ahụ, o mechakwara dee, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ikiri ihe na-enweghị isi, gbalịa jee kirie egwuregwu a.” Ka oge na-aga, ndị na-ahazi egwuregwu ahụ bipụtara otu mkpọsa ozi nke hotara ihe nwoke ahụ kwuru ná ntụle ahụ o mere. Ihe e hotara bụ: “Gbalịa jee kirie egwuregwu a”! Mkpọsa a hotara n’ụzọ ziri ezi ihe nwoke ahụ na-eme ntụle kwuru, kama o hotara ya n’ekwughị ihe ndị ọzọ gbara ya gburugburu, si otú a kwuo ihe nwoke ahụ na-ebughị n’uche ma ọlị.

Ihe atụ ahụ na-egosi otú ihe gbara okwu gburugburu dịruru ná mkpa. Iwere okwu ụfọdụ n’akọwaghị ihe ndị gbara ha gburugburu pụrụ ịgbanwe ihe ha pụtara, dị ka Setan gbanwere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mgbe ọ gbalịrị iduhie Jizọs. (Matiu 4:1-11) N’aka nke ọzọ, iburu ihe ndị gbara okwu gburugburu n’uche na-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe okwu ahụ pụtara n’ụzọ ziri ezi. N’ihi nke a, mgbe anyị na-amụ otu amaokwu Bible, ọ na-abụ ihe amamihe dị na ya mgbe nile ile anya n’ihe ndị gbara ya gburugburu na ịhụ ọnọdụ gbara ya gburugburu iji ghọtakwuo ihe onye dere ya na-ekwu.

Jizie Ya Ejizie

A pụrụ ịkọwa ihe gbara okwu gburugburu dị ka ihe e dere ede ma ọ bụ ihe e kwuru ekwu tupu otu okwu ma ọ bụ nke na-esote ya n’azụ, bụ́ nke na-emetụtakarị ihe ọ pụtara. Ihe gbara okwu gburugburu pụkwara ịbụ ọnọdụ ma ọ bụ ihe ndị mere eme nke gbara otu ihe omume, ọnọdụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ gburugburu. Ịtụle ihe gbara otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ gburugburu dị mkpa karịsịa n’ihi ihe Pọl onyeozi degaara Timoti: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) Iji na-ejizi Okwu Chineke ejizi, ọ dị anyị mkpa ịghọta ya nke ọma nakwa iji obi eziokwu kọwaara ya ndị ọzọ n’ụzọ ziri ezi. Inwe nkwanye ùgwù maka Jehova, bụ́ onye Chepụtara Bible, ga-akwali anyị ịgbalị ime nke ahụ, ịtụle ihe gbara ya gburugburu ga-enyekwa aka nke ukwuu.

Ihe Ndị Gbara Timoti nke Abụọ Gburugburu

Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee akwụkwọ Bible bụ́ Timoti nke Abụọ. * Iji malite nnyocha ahụ, anyị pụrụ ịjụ ọnọdụ gbara akwụkwọ ahụ gburugburu. Ònye dere Timoti nke Abụọ? Olee mgbe? N’ọnọdụ dị aṅaa? Mgbe ahụ, anyị pụrụ ịjụ, sị, Gịnị bụ ọnọdụ “Timoti” ahụ akwụkwọ a bu aha ya? N’ihi gịnị ka ihe ọmụma dị n’akwụkwọ a ji dị ya mkpa? Azịza nye ajụjụ ndị a ga-eme ka anyị matakwuo uru akwụkwọ a bara ma nyere anyị aka ịhụ otú anyị pụrụ isi rite uru na ya taa.

Amaokwu ndị mbụ nke Timoti nke Abụọ na-egosi na akwụkwọ ahụ bụ akwụkwọ ozi Pọl degaara Timoti. Amaokwu ndị ọzọ na-egosi na mgbe Pọl dere ya, ọ nọ n’agbụ n’ihi oziọma ahụ. N’ịbụ onye ọtụtụ ndị gbahapụrụ, Pọl chere na ọnwụ ya eruola. (2 Timoti 1:15, 16; 2:8-10; 4:6-8). N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na o dere akwụkwọ a n’oge ọ nọ mkpọrọ nke abụọ ya na Rom, ma eleghị anya n’ihe dị ka 65 O.A. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, o yiri ka Nero ọ mara ya ikpe ọnwụ.

Nke a bụ ọnọdụ gbara Timoti nke Abụọ gburugburu. Ma, ọ dị mkpa ịrịba ama na Pọl edegaraghị Timoti akwụkwọ iji meere ya mkpesa banyere nsogbu ndị nke ya. Kama nke ahụ, ọ dọrọ Timoti aka ná ntị banyere oge nsogbu nke ga-abịakwasị ya ma gbaa enyi ya ume ka o zere ihe ndọpụ uche dị iche iche, ka ọ nọgide “na-enweta ike,” nakwa ka ọ kọọrọ ndị ọzọ ntụziaka ndị Pọl nyere. Ndị a kwa ga-abụ ndị a kwadebere nke ọma inyere ndị ọzọ aka. (2 Timoti 2:1-7) Lee ihe atụ magburu onwe ya nke inwe nchegbu maka ndị ọzọ n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị ọbụna n’oge ihe isi ike nke a bụ! Leekwa ndụmọdụ magburu onwe ya ọ bụ nye anyị taa!

Pọl kpọrọ Timoti “nwa a hụrụ n’anya.” (2 Timoti 1:2) N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a kpọrọ nwa okorobịa a aha ọtụtụ ugboro dị ka onye ibe kwesịrị ntụkwasị obi nke Pọl. (Ọrụ 16:1-5; Ndị Rom 16:21; 1 Ndị Kọrint 4:17) O yiri ka Timoti ọ nọ n’afọ 30 na ụma mgbe Pọl degaara ya akwụkwọ ozi a—ma a ka na-ele ya anya dị ka nwa okorobịa. (1 Timoti 4:12) Ma, o nweelarị ihe ndekọ magburu onwe ya nke ikwesị ntụkwasị obi, n’ihi na o ‘sorowo Pọl bụrụ ohu’ ruo ihe dị ka afọ 14. (Ndị Filipaị 2:19-22) N’agbanyeghị na Timoti bụtụ nwa okorobịa, Pọl nyere ya ọrụ ịdụ ndị okenye ndị ọzọ ọdụ “ka ha ghara ịlụ ọgụ banyere okwu” kama ka ha lekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa, dị ka okwukwe na ntachi obi. (2 Timoti 2:14) E nyekwara Timoti ikike ịhụ maka nhọpụta nke ndị nlekọta ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi. (1 Timoti 5:22) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na obi esichaghị ya ike iji ikike e nyere ya eme ihe.—2 Timoti 1:6, 7.

Okenye ahụ bụ́ nwa okorobịa chere ihe ịma aka ndị siri oké ike ihu. Otu n’ime ha bụ na mmadụ abụọ, bụ́ Haịmenịọs na Faịlitọs, nọ “na-ekpukwa okwukwe nke ụfọdụ ndị ihu,” na-akụzi “na mbilite n’ọnwụ ewereworị ọnọdụ.” (2 Timoti 2:17, 18) Dị ka ihe àmà na-egosi, ha kwenyere na nanị mbilite n’ọnwụ e nwere bụ mbilite n’ọnwụ n’ụzọ ime mmụọ nakwa na o wereworị ọnọdụ nye Ndị Kraịst. Ikekwe ha nọ na-ehota ihe Pọl kwuru nke bụ́ na Ndị Kraịst anwụwo ná mmehie ha ma e mee ka ha dị ndụ site na mmụọ Chineke n’atụleghị ihe ndị gbara ya gburugburu. (Ndị Efesọs 2:1-6) Pọl dọrọ aka ná ntị na mmetụta dị otú ahụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ ga-amụba. O dere, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, . . . ha ga-ewepụkwa ntị ha n’ebe eziokwu ahụ dị, ebe a ga-eme ka ha chigharịa gaa n’akụkọ ụgha.” (2 Timoti 4:3, 4) Ịdọ aka ná ntị Pọl nyere tupu oge eruo gosiri na ọ dị oké mkpa ka Timoti ṅaa ntị na ndụmọdụ onyeozi ahụ.

Uru Akwụkwọ ahụ Bara Taa

Site n’ihe a tụlere n’elu, anyị na-ahụ na Pọl dere Timoti nke Abụọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ n’ihi ihe ndị na-esonụ: (1) Ọ maara na ọnwụ ya na-eru nso, ya achọọkwa ịkwadebe Timoti maka oge ọ na-agakwaghị anọ ya inyere Timoti aka. (2) Ọ chọrọ ịkwadebe Timoti maka ichebe ọgbakọ ndị ọ na-elekọta pụọ ná ndapụ n’ezi ofufe na mmetụta ndị ọzọ na-adịghị mma. (3) Ọ chọrọ ịgba Timoti ume ịdị na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova na ịdabere n’ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee ná nguzo ya megide ozizi ụgha.

Ịghọta ihe ndị a gbara ya gburugburu na-eme ka anyị ghọtakwuo Timoti nke Abụọ. Taakwa, e nwere ndị dị ka Haịmenịọs na Faịlitọs, bụ́ ndị na-akwalite echiche nke ha, ha ga-achọkwa ikpu okwukwe anyị ihu. Ọzọkwa, e nweela “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” nke Pọl buru n’amụma ugbu a. Ọtụtụ ndị ahụwo ịbụ eziokwu nke ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:1, 12) Olee otú anyị pụrụ isi guzosie ike? Dị ka Timoti, ọ dị anyị mkpa ịṅa ntị na ndụmọdụ nke ndị jewooro Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Sitekwa n’ọmụmụ ihe onwe onye, ekpere, na mkpakọrịta Ndị Kraịst, anyị pụrụ “ịnọgide na-enweta ike” site n’obiọma Jehova na-erughịrị anyị. Ọzọkwa, site n’inwe obi ike n’ike ezi ihe ọmụma nwere, anyị pụrụ ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl, bụ́: “Nọgide na-ejide ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ.”—2 Timoti 1:13.

“Ụkpụrụ nke Okwu Na-enye Ezi Ndụ”

Gịnị bụ “okwu na-enye ezi ndụ” nke Pọl kwuru okwu maka ya? O ji okwu ahụ mee ihe n’izo aka n’ozizi ezi Ndị Kraịst. N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara Timoti, Pọl kọwara na “okwu na-enye ezi ndụ” bụ, n’ụzọ bụ́ isi, okwu “ndị nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst” kwuru. (1 Timoti 6:3) Iṅomi ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ na-eme ka mmadụ nwee uche zuru okè, mmụọ ịbụ onye na-ahụ n’anya, na ichebara ndị ọzọ echiche. Ebe ọ bụ na ozi Jizọs jere nakwa ihe ndị ọ kụziri kwekọrọ n’ozizi ndị ọzọ nile dị n’ime Bible dum, okwu bụ́ “ozizi na-enye ezi ndụ” pụrụ izo aka ma a gbatịkwuo ya n’ebe ozizi nile nke Bible dị.

Nye Timoti nakwa Ndị Kraịst nile bụ́ ndị okenye, ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ bụ ‘ezi ihe nke e nyefere n’aka ha’ nke ha na-aghaghị iche nche. (2 Timoti 1:13, 14) Timoti “[ga-ekwusa] okwu ahụ, nọgidesie ike na ya n’oge dị mma, n’oge nsogbu, dọọ aka ná ntị, baa mba, gbaa ume, na-eji ogologo ntachi obi nile na nkà izi ihe.” (2 Timoti 4:2) Mgbe anyị matara na ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na-agbasa ebe nile n’oge Timoti, anyị ga-aghọta ihe mere Pọl ji mesie ya ike bụ́ mkpa ọ dị izi ozizi na-enye ezi ndụ. Anyị ga-ahụkwa na Timoti ga-echebe ìgwè atụrụ ahụ site n’iji ogologo ntachi obi ‘na-adọ aka ná ntị, na-aba mba, na-agba ume,’ na-egosipụta nkà izi ihe.

Ònye ka Timoti ga-ekwusara okwu ahụ? Ihe ndị gbara ya gburugburu na-egosi na Timoti, dị ka okenye, ga-ekwusa okwu ahụ n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ihi nrụgide ndị mmegide na-eweta, Timoti aghaghị ịkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ na iji obi ike na-akpọsa okwu Chineke, ọ bụghị nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ, echiche nke ya, ma ọ bụ ịkọ nkọ na-enweghị isi. N’ezie, nke a pụrụ ime ka ndị nwere echiche na-ezighị ezi megide ya. (2 Timoti 1:6-8; 2:1-3, 23-26; 3:14, 15) Otú ọ dị, site n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl, Timoti ga-anọgide na-abụ ihe mgbochi megide ndapụ n’ezi ofufe, ọbụna dị ka Pọl n’onwe ya bụworo.—Ọrụ 20:25-32.

Ihe Pọl kwuru banyere ikwusa okwu ahụ, ò metụtakwara ikwusa ya n’ebe na-abụghị n’ime ọgbakọ? Ee, o metụtara ya, dị ka ihe gbara ya gburugburu na-egosi. Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ma gị onwe gị, nọgide na-enwe uche ziri ezi n’ihe nile, hụjuo anya, rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jee ozi gị n’ụzọ zuru ezu.” (2 Timoti 4:5) Izisa ozi ọma—izi ndị na-ekweghị ekwe ozi ọma nke nzọpụta—bụ isi sekpụ ntị nke ozi Ndị Kraịst. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Dịkwa nnọọ ka a na-ekwusa okwu Chineke n’ime ọgbakọ ọbụna “n’oge nsogbu,” otú a ka anyị na-anọgide na-ekwusa okwu ahụ nye ndị na-anọghị n’ọgbakọ ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ.—1 Ndị Tesalonaịka 1:6.

Ebe nkwusa anyị nile na ihe nile anyị na-ezi gbakwasịrị ụkwụ bụ n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Anyị nwere ntụkwasị obi zuru nnọọ ezu na Bible. Pọl gwara Timoti, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) A na-ehotakarị okwu ndị ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji gosi na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ. Ma gịnị ka Pọl bu n’uche wee dee ha?

Pọl na-agwa okenye okwu, bụ́ onye nwere ibu ọrụ nke ‘ịdọ aka ná ntị, ime ka ihe guzozie, inye ọzụzụ n’ezi omume’ n’ime ọgbakọ. N’ihi ya, ọ na-echetara Timoti ka o nwee ntụkwasị obi n’amamihe dị n’Okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke e jiworo zie Timoti ihe malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ. Dị ka Timoti, mgbe ụfọdụ ndị okenye aghaghị ịdọ ndị mmehie aka ná ntị. Mgbe ha na-eme nke a, ha kwesịrị inwe obi ike mgbe nile na Bible. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, ịdọ aka ná ntị nile dabeere na ya bụ ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke n’ezie. Onye ọ bụla nke jụrụ ịdọ aka ná ntị sitere na Bible na-ajụ, ọ bụghị echiche ụmụ mmadụ, kama ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova n’onwe ya.

Lee otú akwụkwọ Timoti nke Abụọ si jupụta n’amamihe sitere n’aka Chineke! Leekwa ka o si enwe ihe mmụta buru ibu karị mgbe anyị na-atụle ndụmọdụ dị n’ime ya, na-eburu ihe ndị gbara ya gburugburu n’uche! N’isiokwu a, anyị atụlewo nanị ná mkpirikpi, ihe ọmụma magburu onwe ya, nke sitere n’ike mmụọ nsọ, nke dị n’ime akwụkwọ a, ma o zuru iji gosi otú ịtụle ihe ndị gbara ihe anyị na-agụ n’ime Bible gburugburu si enye aka. Nke a ga-enye aka ime ka anyị jide n’aka na anyị “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi” n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, Mpịakọta nke 2, peeji nke 1105-1108.

[Foto dị na peeji nke 27]

Pọl chọrọ ịkwadebe Timoti maka ichebe ọgbakọ

[Foto dị na peeji nke 30]

Pọl chetaara Timoti ka o nwee ntụkwasị obi n’amamihe dị n’Okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ