“I Kwuru Eziokwu, Ndụ Dị Nnọọ Ụtọ!”
“I Kwuru Eziokwu, Ndụ Dị Nnọọ Ụtọ!”
Ị̀ GA-ACHỌ ịma ihe bụ́ ezi nzube nke ndụ? Magdalena dị afọ 18, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke bi na Szczecin, Poland, nyeere nwa klas ya n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị bụ́ Katarzyna aka ime otú ahụ. Katarzyna sịrị na ya ekweghị na Chineke dị, ma mgbe Magdalena gwara ya okwu banyere Bible, o gosiri ezi mmasị.
Ọ bụ ezie na Katarzyna nwere mmasị n’ihe Magdalena gwara ya site na Bible, ọ pụghị ikwerecha ihe nile o kwuru. Ka ya na Magdalena na-ekwurịta banyere ezi ndị enyi, Katarzyna kwuru otu mgbe, sị: “I nwere Bible; ị maara ụkpụrụ ị ga-agbaso na ebe ị ga-achọta ndị enyi. Ma gịnị banyere ndị, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ka ọ dị ugbu a, na-apụghị ịnakwere ụkpụrụ ndị ahụ?”
Oge mgbanwe bịara mgbe Katarzyna gara London, England. O letara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ, obiọma e gosiri ya kpalikwara mmasị ya. Omume ndị na-abụghị oké ihe, dị ka imeghere ya ụzọ na igosi ezi mmasị n’ihe ọ na-ekwu, kpaliri mmasị ya.
Mgbe afọ agụmakwụkwọ ọhụrụ malitere na September 2001, Katarzyna kpebiri ikwe ka a na-eduziri ya ọmụmụ Bible mgbe nile. Ọ nọgidewo na-eji ụkpụrụ Bible akpọrọ ihe, ọ malitewokwa itinye ha n’ọrụ ná ndụ ọ na-adị kwa ụbọchị. N’oge na-adịbeghị anya, ọ gbanyeere Magdalena izu, sị: “Ọ dị m ka m na-amalite ndụ ọhụrụ.” O zigakwaara ya ozi dị mkpirikpi na fon na-enweghị eriri, sị: “I meela nnọọ maka ọmụmụ ihe anyị taa! I kwuru eziokwu, ndụ dị nnọọ ụtọ! Ọ bụ ihe magburu onwe ya ịmara onye anyị kwesịrị ikele maka ya.”