Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mpempe Akwụkwọ nke Gbanwere Ndụ M

Mpempe Akwụkwọ nke Gbanwere Ndụ M

Akụkọ Ndụ

Mpempe Akwụkwọ nke Gbanwere Ndụ M

DỊ KA IRENE HOCHSTENBACH SI KỌỌ

O mere n’otu uhuruchi Tuesday na 1972. Adị m afọ 16, esokwa m ndị mụrụ m gaa otu nzukọ okpukpe n’Eindhoven, bụ́ obodo nke dị n’ógbè Brabant, na Netherlands. Ahụ́ erughị m ala, ọ dịkwa m ka ya bụrụ na m nọ n’ebe ọzọ. Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ abụọ nyere m mpempe akwụkwọ nke e dere ihe a na ya: “Ezigbo enyi anyị bụ́ Irene, ọ ga-amasị anyị inyere gị aka.” Amataghị m ókè mpempe akwụkwọ ahụ gaje ịgbanweru ndụ m. Ma tupu m kọwa ihe mezirinụ, ka m kọọrọ gị otú e si zụlite m.

A MỤRỤ m n’àgwàetiti Belitung, n’Indonesia. Ana m echeta ụfọdụ n’ime ụda ndị m nụrụ n’àgwàetiti ebe okpomọkụ ahụ—ụda nke nkwụ ifufe na-efegharị, ụda nke mmiri ji nwayọọ na-asọ n’ebe dị nso, ọchị nke ụmụaka na-egwuri egwu na mbara èzí anyị, nakwa ụda nke egwú na-akụ n’ebe obibi anyị. Na 1960, bụ́ mgbe m dị afọ anọ, ezinụlọ anyị si Indonesia kwaga Netherlands. Anyị ji ụgbọ mmiri mee njem ahụ dị ogologo, ụda m na-echeta karịsịa bụ nke nwa bebi m ji mee njem ahụ—nwa bebi na-akpa ọchị nke a rụnyere ịgba na ya. Mgbe m dị afọ asaa, akwụsịrị m ịnụ ihe n’ihi otu ọrịa m rịara, kemgbe ahụkwa, enwebeghị m ike ịnụ ụda nke ihe ọ bụla na-eme gburugburu m. Ụda ndị m maara bụ nanị ndị ahụ m na-echeta.

Itolite Dị Ka Onye Ntị Chiri

N’ihi nlekọta ịhụnanya nke ndị mụrụ m, na mbụ, aghọtachaghị m ihe ọ pụtara ịbụ onye ntị chiri. Dị ka nwatakịrị, echere m na nnukwu ihe m na-akwụnye ná ntị iji nwee ike ịnụ ihe bụ ihe egwuregwu, ọ bụ ezie na o nyechaghịrị m aka. Iji gwa m okwu, ụmụaka bi n’agbata obi anyị na-eji chọọkụ ede ihe ha chọrọ ịgwa m n’ala, m na-azaghachikwa ha, ọ bụ ezie na apụghị m ịnụ olu m.

Ka m na-etolite, abịara m mata na mụ na ndị nọ m gburugburu dị iche. Amalitekwara m ịchọpụta na ụfọdụ ndị na-achị m ọchị n’ihi na ntị chiri m, ebe ndị ọzọ na-adịghị achọ ka mụ na ha na-akpakọrịta. Amalitere m inwe mmetụta nke ịbụ onye nanị ya nọ na onye owu na-ama. Abịara m ghọtawa ihe ịbụ onye ntị chiri pụtara, ka m na-etolitekwa, otú ahụ ka m na-atụkwu egwu ịnọnyere ndị na-anụ ihe.

Iji nyere m aka ịga ụlọ akwụkwọ pụrụ iche maka ndị ntị chiri, ndị mụrụ m kpọọrọ ezinụlọ anyị nile si n’ime obodo dị n’ógbè Limburg kwaga n’obodo ukwu bụ́ Eindhoven. N’ebe ahụ, papa m chọwara ọrụ, nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị banyekwara ụlọ akwụkwọ ọhụrụ. Enwere m ekele maka mgbanwe nile ha mere n’ihi m. N’ụlọ akwụkwọ, a kụziiri m ka m na-ebelata ụda olu m nakwa ka m na-ekwu okwu nke ọma karị. Ọ bụkwa ezie na ndị nkụzi adịghị eji asụsụ ogbi eme ihe, ụmụ klas m kụziiri m asụsụ ndị ogbi.

Ịnọrọ Onwe M

Ka m na-etolite, ndị mụrụ m gbalịsiri ike iso m kwurịta okwu, ma ọ dị ọtụtụ ihe m na-aghọtaghị. Dị ka ihe atụ, aghọtaghị m na ndị mụrụ m so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ma echetara m na otu ụbọchị, ezinụlọ anyị gara n’otu ebe ọtụtụ mmadụ nọ ọdụ n’oche. Ha nile na-ele anya n’ihu, na-akụ aka mgbe ụfọdụ, na-eguzokwa ọtọ site n’oge ruo n’oge—ma amaghị m ihe mere ha ji mee ihe a nile. Ogologo oge ka e mesịrị, amatara m na ọ bụ mgbakọ Ndịàmà Jehova ka m gara ihe ahụ. Ndị mụrụ m na-akpọkwa m aga n’otu ụlọ nzukọ nta dị n’obodo Eindhoven. Ahụ́ na-eru m ala n’ebe ahụ n’ihi na mmadụ nile nọ n’ebe ahụ nwere obiọma, o yikwara ka obi ọ na-adị ezinụlọ m ụtọ, ma amaghị m ihe mere anyị ji aga ebe ahụ mgbe nile. Ugbu a amatala m na ụlọ nzukọ nta ahụ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.

N’ụzọ dị mwute, ọ dịghị onye nọ ná nzukọ ahụ nke pụrụ ịtụgharịrị m ihe ndị e kwuru na ya. Aghọtara m ugbu a na ndị nọ n’ebe ahụ chọrọ inyere m aka ma ha amaghị otú ha ga-esi eme ya n’ihi ntị chiri m. Ná nzukọ ndị a, owu na-ama m, ana m echekwa sị, ‘Ọ dị m ka ya bụrụ n’ụlọ akwụkwọ ka m nọ kama ịnọ n’ebe a.’ Ma kpọmkwem mgbe m nọ na-eche nke ahụ, ụmụ agbọghọ abụọ dere ihe ná mpempe akwụkwọ ma nye m ya. Nke a bụ mpempe akwụkwọ ahụ m kwuru banyere ya ná mmalite. Amaghị m na mpempe akwụkwọ a ga-abụ mmalite nke ọbụbụenyi dị oké ọnụ ahịa bụ́ nke ga-eme ka m gharazie ịbụ onye owu na-ama.

Ịzụlite Ọbụbụenyi Dị Oké Ọnụ Ahịa

Colette na Hermine, bụ́ ndị nyere m mpempe akwụkwọ ahụ e dere ihe, nọ ná mmalite afọ ndị 20 ha. Mgbe e mesịrị, amatara m na ha bịara n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ahụ m na-eso ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ ndị ozi oge nile. Ọ bụ ezie na Colette na Hermine amaghị asụsụ ndị ogbi n’ezie, agbalịrị m ịghọta ihe ha na-ekwu site n’ịnọ na-ele otú egbugbere ọnụ ha si emegharị ka ha na-agwa m okwu, n’ụzọ dịkwa otú a, anyị kwurịtara okwu n’ụzọ dị nnọọ mma.

Ndị mụrụ m nwere obi ụtọ mgbe Colette na Hermine jụrụ ha ma ọ bụ ha mụwara m Bible, ma ụmụ agbọghọ a mere ihe karịrị nke ahụ. Ha gbalịsiri ike ịtụgharịrị m ihe e kwuru ná nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ime ka m soro ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akpakọrịta. Ha sooro m mụgharịa ụzọ iche ozi Bible n’ihu mmadụ nke m ga-eji na-eme ihe n’ọrụ nkwusa, ha nyekwaara m aka ịkwadebe ihe omume ndị mmụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Cheedị banyere nke ahụ, ugbu a obi na-aka m ọbụna ikwu okwu n’ihu ìgwè ndị na-anụ ihe!

Ọzọkwa, Colette na Hermine mere ka m nwee mmetụta na m pụrụ ịtụkwasị ha obi. Ha na-enwe ndidi ma na-ege m ntị. Ọ bụ ezie na anyị na-achịkarị ọchị ma m mehie ihe, ọ dịghị mgbe ha ji m mee ihe ọchị; ọ dịghịkwa mgbe ihere mere ha ma mụ na ha nọrọ. Ha gbalịrị ịghọta mmetụta m na-enwe ma mesoo m ihe dị ka onye ha na ya ha. Ụmụ agbọghọ a dị obiọma nyere m onyinye magburu onwe ya—ịhụnanya na ọbụbụenyi ha.

Nke kasị mkpa, Colette na Hermine kụziiri m na aghaghị m ịmara Chineke anyị, bụ́ Jehova, dị ka enyi nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Ha kọwaara m na Jehova ahụwo m ka m na-anọ ọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa na ọ ghọtara ihe ịbụ onye ntị chiri pụtara. Lee ka m si nwee ekele na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ jikọtara anyị atọ dị ka ndị enyi! Nlekọta Jehova na-enye m kpaliri m, n’ihi ịhụnanya m nwekwara n’ebe ọ nọ, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye ya site na baptizim ime mmiri na July 1975.

Isonyere Enyi Pụrụ Iche

N’afọ ndị sochirinụ, amatakwuru m ọtụtụ ụmụnna nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst. Otu nwanna nwoke ghọrọ enyi m pụrụ iche, anyị lụkwara na 1980. Nwa oge ka nke ahụ gasịrị, amalitere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ, na 1994 kwa, e kenyere mụ na di m, bụ́ Harry, ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ókèala e ji Asụsụ Ogbi nke Dutch eme ihe na ya. N’afọ sochiri ya, echere m ọrụ tara akpụ ihu. Esonyeere di m, bụ́ onye na-anụ ihe, ka ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche dị ka onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ.

Otú a ka m si eme ya. Mgbe anyị letara otu ọgbakọ na nke mbụ ya, ana m agakwuru ọtụtụ ụmụnna nwoke na ndị nwanyị ozugbo o kwere mee ma kọwaara ha onye m bụ. Ana m agwa ha na ntị chiri m, gwakwa ha ka ha na-ele m anya ka ha ji nwayọọ nwayọọ na-agwa m okwu. Ana m agbalịkwa ịza ajụjụ n’egbughị oge ná nzukọ ọgbakọ. Ana m ajụkwa ase ma o nwere onye ga-achọ ịtụgharịrị m ihe e kwuru ná nzukọ na n’ozi ubi n’izu ahụ.

Usoro a dị nnọọ irè nke na mgbe ụfọdụ, ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị na-echefu na ntị chiri m, bụ́ nke na-akpata ọnọdụ ndị na-atọ ọchị. Dị ka ihe atụ, ha na-agwa m na mgbe ha hụrụ m ka m na-aga n’okporo ụzọ, ha na-egbu opi ụgbọala ha iji kelee m, ma adịghị m azaghachi. Mgbe ụfọdụ ana m echefukwa erughị eru m—dị ka oge m chọrọ ịtakwụnyere di m ihe nzuzo. Mgbe m hụrụ otú ihu ya si gbarụọ na mberede, ana m amata na “ihe m takwụnyeere ya” dasiri ụda ike.

Ụmụaka nyekwaara m aka n’ụzọ ndị m na-atụghị anya ha. N’otu ọgbakọ nke anyị letara nke mbụ ya, otu nwa okoro dị afọ itoolu chọpụtara na ụfọdụ ndị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ala azụ ịgwa m okwu, o wee kpebie ime ihe banyere ya. Ọ bịakwutere m, sekpụrụ m n’aka gaa n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma were oké olu kwuo sị, “Ka m kọwaara unu onye Irene bụ—ntị chiri ya!” Ndị nọ ya bịakwutere m ma kọwaa onwe ha.

Ka m na-esonyere di m n’ọrụ sekit, anọgidere m na-enwe ọtụtụ ndị enyi. Lee ka ndụ m si dị iche taa n’otú ọ dị n’afọ ndị ahụ ọ dị m ka m bụ onye e kewapụrụ ekewapụ na onye nọ nanị ya! Kemgbe uhuruchi ahụ Colette na Hermine nyere m mpempe akwụkwọ ahụ, ahụwo m otú ọbụbụenyi si akpa ike ma zute ọtụtụ ndị ghọrọ ndị pụrụ nnọọ iche nye m. Nke ka nke, abịawo m mara Jehova, bụ́ Enyi kasị dịrị oké ọnụ ahịa. (Ndị Rom 8:38, 39) Lee ka mpempe akwụkwọ ahụ si gbanwee ndụ m!

[Foto dị na peeji nke 24]

Ana m echeta ụda nke nwa bebi m nwere mmasị na ya

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

N’ozi nakwa mụ na di m, bụ́ Harry