Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

RUO ọtụtụ narị afọ, okwu banyere ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị agbagwojuwo ọtụtụ ndị ọkà ihe ọmụma na ndị ọkà mmụta okpukpe anya. Ụfọdụ ekwuwo na ebe ọ bụ na Chineke pụrụ ime ihe nile, mee elu mee ala ọ ghaghị ịbụ ya na-akpata nhụjuanya. Onye dere akwụkwọ bụ́ The Clementine Homilies, bụ́ akwụkwọ apọkrịfa nke e dere na narị afọ nke abụọ, kwuru na Chineke ji aka ya abụọ achị ụwa. O ji “aka ekpe” ya, bụ́ Ekwensu, akpata nhụjuanya na nsogbu, jirikwa “aka nri” ya, bụ́ Jizọs, azọpụta ma na-agọzi.

Ndị ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị ike ikwere na Chineke pụrụ ikwe ka nhụjuanya dịrị ọbụna ma a sị na ọ bụghị ya na-akpata ya, ahọrọwo ịghara ikwe na nhụjuanya dị adị. “Ihe ọjọọ bụ nanị echiche efu, o nweghịkwa ezi ihe ndabere,” ka Mary Baker Eddy dere. “Ọ bụrụ na e were ya na mmehie, ọrịa, na ọnwụ adịghị ihe ha bụ, ha ga-apụ n’anya.”—Science and Health With Key to the Scriptures.

N’ihi ọdachi ndị meworonụ, karịsịa site n’oge Agha Ụwa Mbụ ruo n’oge anyị, ọtụtụ ndị ekwubiwo na Chineke enweghị nnọọ ike igbochi nhụjuanya. “N’echiche m, Oké Mgbukpọ ahụ mere nnọọ ka ọ ghara ikwesị ekwesị ikwu n’ụzọ dị mfe na Chineke bụ onye pụrụ ime ihe nile,” ka ọkà mmụta bụ́ onye Juu bụ́ David Wolf Silverman dere. “Ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi ghọta ihe banyere Chineke,” ka ọ na-agbakwụnye, “mgbe ahụ ọ ghaghị ịbụ na ịdị mma Ya na ịdị adị nke ihe ọjọọ nwere nkwekọ, nke a bụkwa nanị ma ọ bụrụ na Ọ bụghị onye pụrụ ime ihe nile.”

Otú ọ dị, ihe ndị a a na-ekwu bụ́ na Chineke so akpata nhụjuanya n’ụzọ ụfọdụ, na o nweghị ike nke igbochi ya, ma ọ bụ na nhụjuanya bụ nnọọ echiche efu, adịchaghị akasi ndị na-ahụju anya obi. Nke kakwa mkpa, nkwenkwe ndị dị otú ahụ ekwekọtụghị n’àgwà nke Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, dị ike ma na-ahụ n’anya bụ́ onye e kwuru banyere ya na Bible. (Job 34:10, 12; Jeremaịa 32:17; 1 Jọn 4:8) Gịnịzi ka Bible na-ekwu banyere ihe mere e jiworo kwere ka nhụjuanya dịrị?

Olee Otú Nhụjuanya Si Malite?

Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-ahụju anya. N’ụzọ megidere nke ahụ, o nyere di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ, bụ́ Adam na Iv, uche na ahụ́ zuru okè, kwadebe ọmarịcha ubi a gbara ogige ịbụ ebe obibi ha, ma nye ha ọrụ nwere nzube ma na-eju afọ. (Jenesis 1:27, 28, 31; 2:8) Otú ọ dị, ha ịnọgide na-enwe obi ụtọ dabeere na ha ịnakwere ịchịisi Chineke na oruru o ruuru ya ikpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. Otu osisi a kpọrọ ‘osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ’ nọchitere anya iwu ahụ Chineke nyere. (Jenesis 2:17) Adam na Iv ga-egosipụta na ha na-edo onwe ha n’okpuru Chineke ma ọ bụrụ na ha erube isi n’iwu o nyere ka ha ghara iri mkpụrụ osisi ahụ. *

N’ụzọ dị mwute, Adam na Iv erubereghị Chineke isi. Otu mmụọ e kere eke nke nupụrụ isi, bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Setan bụ́ Ekwensu, mere ka Iv kwenye na irubere Chineke isi abụghị maka ọdịmma ya kasịnụ. N’ezie, ọ sịrị na Chineke na-anapụ ya ihe a na-achọsi ike: nnwere onwe, ikike nke ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Setan zọọrọ na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ osisi ahụ, ‘a ga-emeghe anya ya, o wee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.’ (Jenesis 3:1-6; Mkpughe 12:9) N’ịbụ onye e ji atụmanya nke inwere onwe ya rafuo, Iv riri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, Adam mekwara otú ahụ n’oge na-adịghị anya.

N’otu ụbọchị ahụ, Adam na Iv malitere ịta ahụhụ n’ihi nnupụisi ha. N’ihi ịjụ ịchịisi Chineke, ha kwụsịrị inweta nchebe na ngọzi ha na-enwetabu mgbe ha na-edo onwe ha n’okpuru Chineke. Chineke chụpụrụ ha na Paradaịs ma gwa Adam, sị: “Ihe a na-abụ ọnụ ka ala bụ n’ihi gị; n’ihe mgbu ka ị ga-eri ihe sitere na ya ụbọchị nile nke ndụ gị; n’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alọta n’ala.” (Jenesis 3:17, 19) Adam na Iv malitere ịrịa ọrịa, inwe ihe mgbu, ịka nká, na ịnwụ anwụ. Nhụjuanya ghọrọ ihe ụmụ mmadụ ga na-enweta.—Jenesis 5:29.

Idozi Ihe Iseokwu Ahụ

Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ̀ bụ na Chineke agaaraghị eleghara mmehie Adam na Iv anya?’ Ee e, n’ihi na nke ahụ gaara emekwu ka a ghara ịkwanyere ịbụisi ya ùgwù, ikekwe mee ka ọtụtụ mmadụ nupụ isi n’ọdịnihu ma na-akpata ọbụna nhụjuanya ka ukwuu. (Eklisiastis 8:11) Tụkwasị na nke ahụ, ịgbachi nnupụisi dị otú ahụ nkịtị gaara eme ka Chineke bụrụ onye na-akwado ihe ọjọọ. Onye so dee Bible bụ́ Mozis na-echetara anyị, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ [Chineke] bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Iji mee ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya, Chineke aghaghị ikwere ka Adam na Iv taa ahụhụ ihe nnupụisi ha kpatara.

Gịnị mere Chineke ebibighị di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ tinyere Setan, bụ́ onye a na-adịghị ahụ anya nke kpalitere nnupụisi ahụ, ozugbo ahụ? O nwere ike nke ime otú ahụ. Adam na Iv agaaraghị amụta ụmụ ndị ga-eketa nhụjuanya na ọnwụ. Otú ọ dị, Chineke igosipụta ike ya n’ụzọ dị otú ahụ agaraghị egosipụta na o ruuru ya ịchị ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi. Ọzọkwa, a sị na Adam na Iv nwụrụ n’amụghị ụmụ, nke ahụ gaara apụta na nzube Chineke iji ụmụ ha zuru okè mejupụta ụwa agaghị emezu. (Jenesis 1:28) ‘Chineke adịghịkwa ka mmadụ. Ihe ọ bụla o kwere ná nkwa, ọ na-emezu ya; ihe ọ bụla o kwuru, ọ na-emekwa.’—Ọnụ Ọgụgụ 23:19, Today’s English Version.

Jehova Chineke ji amamihe ya zuru okè kpebie ikwe ka nnupụisi ahụ dịgide ruo nwa oge. Ndị nnupụisi ahụ ga-enwe ohere zuru ezu ịta ahụhụ ihe ndị si na mmadụ inwere onwe ya pụọ n’ebe Chineke nọ pụta. Ihe ndị meworonụ ga-egosipụta n’ụzọ na-enweghị mgbagha na nduzi Chineke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa, gosipụtakwa na ịchịisi Chineke karịrị nke mmadụ ma ọ bụ nke Setan. N’otu oge ahụ, Chineke mere ihe iji hụ na nzube mbụ ya maka ụwa ga-emezu. O kwere nkwa na “mkpụrụ,” ma ọ bụ “nwa,” ga-abịa, bụ́ onye ‘ga-echipịa Setan n’isi,’ na-ewepụ kpam kpam nnupụisi ya nile na mmetụta ya ndị na-emebi ihe.—Jenesis 3:15.

Jizọs Kraịst bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Na 1 Jọn 3:8, anyị na-agụ na “e mere ka Ọkpara Chineke pụta ìhè . . . iji tipịasịa ọrụ Ekwensu.” O mere nke a site n’ịtọgbọ ndụ mmadụ ya zuru okè nakwa site n’ịkwụ ọnụ ahịa àjà mgbapụta iji gbapụta ụmụ Adam ná mmehie na ọnwụ ha ketara eketa. (Jọn 1:29; 1 Timoti 2:5, 6) E kwere ndị na-egosipụta okwukwe n’ezie n’àjà Jizọs chụrụ nkwa nnwere onwe na-adịgide adịgide pụọ ná nhụjuanya. (Jọn 3:16; Mkpughe 7:17) Olee mgbe nke a ga-eme?

Ọgwụgwụ nke Nhụjuanya

Ịjụ ịchịisi Chineke akpatawo ọtụtụ nhụjuanya. Ya mere, o kwesịrị ekwesị Chineke igosipụta ike ya n’ụzọ pụrụ iche iji weta nhụjuanya nke ụmụ mmadụ ná njedebe ma mezuo nzube mbụ ya maka ụwa. Jizọs kpọtụrụ uche ná ndokwa a Chineke mere mgbe ọ kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, . . . ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:9, 10.

Oge Chineke nyeworo ụmụ mmadụ iji nwalee ịchị onwe ha eruwela ná njedebe. Ná mmezu nke amụma Bible, e guzobere Alaeze ya n’eluigwe na 1914 na-enwe Jizọs Kraịst dị ka Eze ya. * N’oge na-adịghị anya, ọ ga-etipịa ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ ma mee ka ha gwụsịa.—Daniel 2:44.

N’oge ozi elu ala ya nke na-adịteghị aka, Jizọs mere ka a hụpete ngọzi ụmụ mmadụ ga-enweta ma ọ bụrụ na Chineke amaliteghachi ịchị. Oziọma ndị ahụ na-enye ihe àmà gosiri na Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ọha mmadụ dara ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ na-agụ nri, ma kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọbụna ikike ndị sitere n’okike rubeere ya isi. (Matiu 11:5; Mak 4:37-39; Luk 9:11-16) Cheedị banyere ihe Jizọs ga-arụzu mgbe ọ ga-eji ikike àjà mgbapụta ya nwere ime ka a dị ọcha mee ihe ga-abara ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi uru! Bible na-ekwe nkwa na site n’ịchịisi Kraịst, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya [ihe a kpọrọ mmadụ], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya

Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Chineke anyị na-ahụ n’anya nke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, na-eche banyere anyị nakwa na ọ ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ha n’isi nso! Dị ka ọ na-adịkarị, onye na-arịasi ọrịa ike na-eji obi ya anakwere ọgwụgwọ nke ga-eme ka ọ gbakee ọbụna ma a sị na ọ na-egbu oké mgbu. N’otu ụzọ ahụ, ọ bụrụ na anyị amara na ụzọ Chineke si eme ihe ga-eweta ngọzi ebighị ebi, ihe ọmụma dị otú ahụ pụrụ ịkwagide anyị n’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-adịghị adịte aka anyị na-eche ihu.

Ricardo, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’isiokwu bu ụzọ, bụ otu onye nke mụtaworo inweta nkasi obi site ná nkwa ndị dị na Bible. “Mgbe nwunye m nwụsịrị, achọsiri m ike ịnọrọ onwe m,” ka ọ na-echeta, “ma n’oge na-adịghị anya aghọtara m na nke a agaghị akpọghachi nwunye m nakwa na nanị ihe ọ ga-eme bụ ime ka ọnọdụ mmetụta uche m ka njọ.” Kama nke ahụ, Ricardo nọgidere na-agbaso usoro ihe omume ya nke ịga nzukọ Ndị Kraịst na iso ndị ọzọ na-ekerịta ozi Bible. “Ka m na-enwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova ji ịhụnanya na-akwado ma chọpụta otú o si na-aza ekpere m n’ihe ndị yiri ka ha dị nta, abịaruru m ya nso karị,” ka Ricardo na-ekwu. “Ọ bụ ọmụma a m maara na Chineke hụrụ m n’anya nyeere m aka ịtachi obi n’ihe bụ n’ezie ọnwụnwa kasị njọ m chetụworo ihu.” Ọ na-ekweta, sị: “Ọ ka na-agụsi m agụụ ike ịhụ nwunye m, ma ekwenyesiri m ike ugbu a na ọ dịghị ihe ọ bụla Jehova kwere ka o mee nke ga-akpatara anyị mmerụ ahụ́ na-adịgide adịgide.”

Dị ka Ricardo na ọtụtụ nde ndị ọzọ, ị̀ na-atụsi anya ike ịhụ oge mgbe nhụjuanya ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe ugbu a ga-abụ ihe a ‘na-agaghị echetakwa, ha agaghị abatakwa n’obi’? (Aịsaịa 65:17) Jide n’aka na ị pụrụ inweta ngọzi nke Alaeze Chineke ma ọ bụrụ na ị gbasoo ndụmọdụ Bible bụ́: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso.”—Aịsaịa 55:6.

Iji nyere gị aka ime nke a, mee ka ọgụgụ nke Okwu Chineke na iji nlezianya na-amụ ya bụrụ ihe dị oké mkpa ná ndụ gị. Mata Chineke na onye ahụ o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst. Gbalịsie ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ma si otú ahụ na-egosi na ị dị njikere ido onwe gị n’okpuru ọbụbụeze ya. Ụzọ ndụ dị otú ahụ ga-ewetara gị obi ụtọ ka ukwuu ugbu a n’agbanyeghị ule ndị ị pụrụ iche ihu. N’ọdịnihu kwa, ọ ga-eme ka ị dị ndụ n’ụwa nke nhụjuanya na-agaghị adị na ya.—Jọn 17:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’ihe odide ala ala peeji ya maka Jenesis 2:17, The Jerusalem Bible na-akọwa “ịma ezi ihe na ihe ọjọọ” dị ka ‘ikike nke ikpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ nakwa nke ime ihe kwekọrọ na ya, mmadụ ịzọrọ inwere onwe ya n’ụzọ zuru ezu n’ihe banyere omume bụ́ nke na-eme ka ọ ghara ịghọta ọnọdụ ya dị ka onye e kere eke.’ Ọ na-agbakwụnye, sị: “Mmehie mbụ ahụ bụ imegide ọbụbụeze Chineke.”

^ par. 17 Maka ntụle zuru ezu banyere amụma Bible nke metụtara 1914, lee isi 10 na nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 6, 7]

OLEE OTÚ ANYỊ PỤRỤ ISI NAGIDE NHỤJUANYA?

“Na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe [Chineke] nọ.” (1 Pita 5:7) Ọ bụ nnọọ ihe e bu pụta ụwa inwe mgbagwoju anya, iwe iwe, na inwe mmetụta nke ịbụ onye a gbahapụrụ agbahapụ mgbe anyị na-anagide nhụjuanya ma ọ bụ na-ahụ ka onye anyị hụrụ n’anya na-ahụju anya. N’agbanyeghị nke ahụ, jide n’aka na Jehova na-aghọta mmetụta anyị. (Ọpụpụ 3:7; Aịsaịa 63:9) Dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, anyị pụrụ ịgwa ya ihe nile dị anyị n’obi ma kwupụta obi abụọ na nchegbu ndị anyị na-enwe. (Ọpụpụ 5:22; Job 10:1-3; Jeremaịa 14:19; Habakuk 1:13) O nwere ike ọ gaghị ewepụ ọnwụnwa anyị n’ụzọ ọrụ ebube, ma n’ịza ekpere anyị ndị sitere n’obi, ọ pụrụ inye anyị amamihe na ume ịnagide ha.—Jems 1:5, 6.

“Unu enwela ihe ijuanya n’ọnwụnwa na-egbu mgbu unu na-enwe, dị ka a ga-asị na ihe na-emetụbeghị mbụ na-eme unu.” (1 Pita 4:12, New International Version) Pita na-ekwu n’ebe a banyere mkpagbu, ma okwu ya metụtakwara nnọọ nhụjuanya ọ bụla onye kwere ekwe pụrụ inwe. Ndị mmadụ na-ahụju anya n’ihi ụkọ ihe e ji ebi ndụ, ọrịa, na ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Bible na-ekwu na “mgbe na ihe ndapụta” na-adabara mmadụ nile. (Eklisiastis 9:11) Ihe ndị dị otú ahụ so n’ọnọdụ ụmụ mmadụ nọ na ya n’oge a. Ịghọta nke a ga-enyere anyị aka ịnagide nhụjuanya na ihe ndabara ọjọọ ma ọ bụrụ na o mee. (1 Pita 5:9) Karịsịa, icheta mmesi obi ike ahụ bụ́ na “anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku ya” ga-akasi anyị obi karịsịa.—Abụ Ọma 34:15; Ilu 15:3; 1 Pita 3:12.

“Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ.” (Ndị Rom 12:12) Kama ịdị na-eche banyere oge ndị gara aga anyị nwere obi ụtọ, anyị pụrụ ịdị na-atụgharị uche ná nkwa Chineke kwere iweta nhụjuanya nile ná njedebe. (Eklisiastis 7:10) Olileanya a nke nwere ihe ndabere siri ike ga-echebe anyị dị ka okpu ígwè si echebe isi. Olileanya na-ebelata ihe mgbu ndị a na-enwe ná ndụ ma na-enyere anyị aka ịhụ na ha emerụghị uche anyị, mmetụta uche anyị, ma ọ bụ ahụ́ ike ime mmụọ anyị n’ụzọ na-adịgide adịgide.—1 Ndị Tesalonaịka 5:8.

[Foto dị na peeji nke 5]

Adam na Iv jụrụ ịchịisi Chineke

[Foto dị na peeji nke 7]

Chineke na-ekwe nkwa maka ụwa nke nhụjuanya na-agaghị adị na ya