Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?

Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?

Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?

“Alaeze Chineke eruwokwa nso. Chegharịanụ, nweekwanụ okwukwe n’ozi ọma ahụ.”—MAK 1:15.

1, 2. Olee otú ị ga-esi kọwaa Mak 1:14, 15?

Ọ BỤ n’afọ 30 O.A. Jizọs Kraịst amalitela ozi ya dị oké mkpa na Galili. Ọ nọ na-ekwusa “ozi ọma Chineke,” okwu ya kpalikwara mmasị ọtụtụ ndị Galili: “Oge ahụ a kara aka ezuwo, alaeze Chineke eruwokwa nso. Chegharịanụ, nweekwanụ okwukwe n’ozi ọma ahụ.”—Mak 1:14, 15.

2 “Oge ahụ a kara aka” eruwo ka Jizọs malite ozi ya nakwa ka ndị mmadụ mee mkpebi nke ga-eme ka ha nweta ihu ọma Chineke. (Luk 12:54-56) ‘Alaeze Chineke eruwo nso’ n’ihi na Jizọs, dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, nọ ya. Ọrụ nkwusa ya kpaliri ndị obi ha ziri ezi ichegharị. Ma olee otú ha si gosipụta “okwukwe n’ozi ọma ahụ,” oleekwa otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?

3. Site n’ime gịnị ka ndị mmadụ gosipụtaworo na ha nwere okwukwe n’ozi ọma ahụ?

3 Dị ka Jizọs, Pita onyeozi gbara ndị mmadụ ume ichegharị. N’ịgwa ndị Juu nọ na Jeruselem okwu na Pentikọst 33 O.A., Pita sịrị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst maka mgbaghara mmehie unu, unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.” Ọtụtụ puku mmadụ chegharịrị, e mee ha baptizim, ha aghọọkwa ụmụazụ Jizọs. (Ọrụ 2:38, 41; 4:4) Na 36 O.A., ndị Jentaịl chegharịrịnụ mere ihe yiri nke ahụ. (Ọrụ 10:1-48) N’oge anyị, okwukwe n’ozi ọma ahụ na-akpali ọtụtụ puku mmadụ ichegharị site ná mmehie ha, rara onwe ha nye Chineke ma bụrụ ndị e mere baptizim. Ha anakwerewo ozi ọma nke nzọpụta, ha na-egosipụtakwa okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. Ọzọkwa, ha na-eme ezi omume, ha ewerewokwa nguzo ha n’akụkụ nke Alaeze Chineke.

4. Gịnị bụ okwukwe?

4 Ma gịnị bụ okwukwe? Pọl onyeozi dere, sị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1) Okwukwe anyị na-eme ka anyị jide n’aka na ihe nile Chineke kwere ná nkwa n’Okwu ya ga-emezu. Ọ dị ka a ga-asị na anyị ji akwụkwọ ikike nke na-egosi na ọ bụ anyị nwe otu ihe onwunwe. Okwukwe bụkwa “ngosipụta pụtara ìhè,” ma ọ bụ ihe àmà na-eme ka e kwenye, banyere ihe ndị a na-adịghị ahụ anya. Echiche anyị na obi anyị jupụtara n’ekele na-eme ka anyị kwere na ihe ndị ahụ ga-eme, ọ bụ ezie na anyị ahụbeghị ha.—2 Ndị Kọrint 5:7; Ndị Efesọs 1:18.

Okwukwe Dị Anyị Mkpa!

5. N’ihi gịnị ka okwukwe ji dị oké mkpa?

5 Anyị bu mkpa ime mmụọ pụta ụwa ma anyị ebughị okwukwe pụta ụwa. N’ezie, “okwukwe abụghị ihe mmadụ nile nwere.” (2 Ndị Tesalonaịka 3:2) Otú ọ dị, Ndị Kraịst aghaghị inwe okwukwe iji nweta ihe ndị Chineke kwere ná nkwa. (Ndị Hibru 6:12) Mgbe Pọl depụtasịrị ọtụtụ ihe atụ nke ndị nwere okwukwe, o dere sị: “Ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà hà otú a gbara anyị gburugburu, ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ na mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe, ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ nke e setịpụrụ n’ihu anyị, ka anyị na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.” (Ndị Hibru 12:1, 2) Gịnị bụ “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe”? Ọ bụ enweghị okwukwe, ọbụna enweghịzi okwukwe e nweburu. Iji nọgide na-enwe okwukwe siri ike, anyị aghaghị ‘ilegide anya n’ebe Jizọs nọ’ ma na-agbaso ihe nlereanya ya. Ọ dịkwa anyị mkpa ịjụ omume rụrụ arụ, ịlụso ọrụ nile nke anụ ahụ́ ọgụ, ma zere ịhụ ihe onwunwe n’anya, nkà ihe ọmụma ụwa, na omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. (Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Timoti 6:9, 10; Jud 3, 4) Ọzọkwa, anyị aghaghị ikwere na Chineke nọnyeere anyị nakwa na ndụmọdụ ndị dị n’Okwu ya dị irè n’ezie.

6, 7. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ikpe ekpere maka okwukwe?

6 Anyị apụghị inwe okwukwe n’ime onwe anyị site n’ike aka anyị. Okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ya mere, gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka e wusikwuo okwukwe anyị ike? Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu . . . maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:13) Ee, ka anyị na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ, n’ihi na ọ pụrụ ịmịpụta n’ime anyị okwukwe dị mkpa iji na-eme uche Chineke ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ.—Ndị Efesọs 3:20.

7 O kwesịrị ekwesị ikpe ekpere ka e nyekwuo anyị okwukwe. Mgbe Jizọs na-achọ ịchụpụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ otu nwatakịrị nwoke, nna nwa ahụ rịọrọ, sị: “Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!” (Mak 9:24) “Nyekwuo anyị okwukwe,” ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru. (Luk 17:5) Ya mere, ka anyị na-ekpe ekpere maka okwukwe, na-enwe obi ike na Chineke ga-aza ekpere ndị dị otú ahụ.—1 Jọn 5:14.

Okwukwe n’Okwu Chineke Dị Mkpa

8. Olee otú inwe okwukwe n’Okwu Chineke pụrụ isi nyere anyị aka?

8 Nwa oge tupu Jizọs anwụọ ọnwụ ịchụàjà ya, ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Gosipụtanụ okwukwe na Chineke, gosipụtakwanụ okwukwe na mụ.” (Jọn 14:1) Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere okwukwe na Chineke na n’Ọkpara ya. Ma gịnị banyere Okwu Chineke? Ọ pụrụ ịkpa ike ná ndụ anyị n’ụzọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị na-amụ ma na-etinye ya n’ọrụ, na-enwe okwukwe siri ike na ọ na-enye ndụmọdụ na nduzi kasị mma anyị pụrụ inweta.—Ndị Hibru 4:12.

9, 10. Olee otú ị ga-esi kọwaa ihe e kwuru banyere okwukwe na Jems 1:5-8?

9 Ndụ anyị dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè jupụtara ná nsogbu. Otú ọ dị, okwukwe n’Okwu Chineke pụrụ inyere anyị aka n’ezie. (Job 14:1) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na anyị amaghị otú anyị ga-esi nagide otu ọnwụnwa. Okwu Chineke na-enye anyị ndụmọdụ a: “Ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha; a ga-enyekwa ya. Ma ka ọ nọgide na-arịọ n’okwukwe, n’enweghị obi abụọ ma ọlị, n’ihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-akwagharị ma na-enugharị. N’eziokwu, ka onye ahụ ghara iche na ya ga-anata ihe ọ bụla site n’aka Jehova; ọ bụ onye nwere uche abụọ, onye na-adịghị akwụsi ike n’ụzọ ya nile.”—Jems 1:5-8.

10 Jehova Chineke agaghị akọcha anyị n’ihi na anyị enweghị amamihe ma na-ekpe ekpere maka ya. Kama nke ahụ, ọ ga-enyere anyị aka ile ọnwụnwa ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ ime ka anyị mata akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere anyị aka ma ọ bụkwanụ anyị pụrụ ịmata ha mgbe anyị na-amụ Bible. Ma ọ bụ mmụọ nsọ Jehova pụrụ iduzi anyị n’ụzọ ndị ọzọ. Nna anyị nke eluigwe ga-enye anyị amamihe iji nagide ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị ‘anọgide na-arịọ n’okwukwe, n’enweghị obi abụọ ma ọlị.’ Ọ bụrụ na anyị dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-ebugharị, anyị apụghị ịtụ anya ịnata ihe ọ bụla n’aka Chineke. N’ihi gịnị? Nihi na nke a ga-apụta na anyị nwere obi abụọ nakwa na anyị akwụsighị ike n’ekpere ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ—ee, ọbụna n’igosipụta okwukwe. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa inwe okwukwe siri ike n’Okwu Chineke nakwa ná nduzi ọ na-enye. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ nke otú o si enyere anyị aka ma na-eduzi anyị.

Okwukwe na Ihe E Ji Azụ Ahụ́

11. Mmesi obi ike dị aṅaa ka okwukwe anyị nwere n’Okwu Chineke na-enye anyị banyere ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị?

11 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị nọ n’ụkọ ma ọ bụ daa ogbenye ugbu a? Okwukwe anyị nwere n’Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee atụmanya e ji n’aka na Jehova ga-ahụ maka ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị nakwa na ọ ga-emesịa mee ndokwa bara ụba maka ndị nile hụrụ ya n’anya. (Abụ Ọma 72:16; Luk 11:2, 3) Ọ pụrụ ịbụrụ anyị ihe agbamume ịtụgharị uche n’otú Jehova si nye onye amụma ya bụ́ Ịlaịja nri n’oge otu ụnwụ. Mgbe e mesịrị, Chineke mere n’ụzọ ọrụ ebube ka ụtụ ọka na mmanụ bụ́ nke debere otu nwanyị, nwa ya nwoke, na Ịlaịja ndụ ghara ịgwụ agwụ. (1 Ndị Eze 17:2-16) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova gboro mkpa Jeremaịa onye amụma mgbe ndị Babilọn nọchibidoro Jeruselem. (Jeremaịa 37:21) Ọ bụ ezie na ihe oriri Jeremaịa na Ịlaịja nwere ehighị nne, Jehova lekọtara ha. Ọ na-emekwara ndị na-egosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ taa otu ihe ahụ.—Matiu 6:11, 25-34.

12. Olee otú okwukwe ga-esi enyere anyị aka ịhụ ihe anyị riri?

12 Okwukwe na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ agaghị eme ka anyị baa ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe, ma ọ ga-enyere anyị aka ịhụ ihe anyị riri. Iji maa atụ: Bible na-adụ anyị ọdụ ịbụ ndị na-eme ihe n’eziokwu, nwee ike ime ihe, ma na-arụsi ọrụ ike. (Ilu 22:29; Eklisiastis 5:18, 19; 2 Ndị Kọrint 8:21) Anyị ekwesịtụghị ileda mkpa ọ dị inwe aha ọma dị ka onye ọrụ anya. Ọbụna n’ebe ọrụ na-enye ezigbo ego kọrọ ụkọ, ndị ọrụ na-eme ihe n’eziokwu, dị nkà, ma na-adị uchu na-enwe ohere dị mma karịa ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ndị ọrụ dị otú ahụ pụrụ inwe ihe onwunwe dị nta, ha na-enwetakarị ihe ndị bụ́ isi na-akpa ha na afọ ojuju nke iri ihe ha kpatara n’onwe ha.—2 Ndị Tesalonaịka 3:11, 12.

Okwukwe Na-enyere Anyị Aka Idi Iru Újú

13, 14. Olee otú okwukwe si enyere anyị aka idi ihe kpatara iru újú?

13 Okwu Chineke na-egosi n’ezie na ọ bụ ihe e bu pụta ụwa iru újú mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ. Nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebreham ruru újú n’ihi ọnwụ nke nwunye ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Sera. (Jenesis 23:2) Devid ruru újú mgbe ọ nụrụ na nwa ya bụ́ Absalọm anwụọla. (2 Samuel 18:33) Ọbụna nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs bere ákwá n’ihi ọnwụ nke enyi ya bụ́ Lazarọs. (Jọn 11:35, 36) Mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ, anyị pụrụ inwe ihe mwute nke pụrụ ịfọ nke nta ka ọ karịa ike anyị, ma inwe okwukwe ná nkwa ndị dị n’Okwu Chineke pụrụ inyere anyị aka idi ihe dị otú ahụ na-akpata iru újú.

14 ‘Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ,’ ka Pọl kwuru, ‘na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na ndị ajọ omume.’ (Ọrụ 24:15) Ọ dị anyị mkpa inwe okwukwe ná ndokwa Chineke mere ịkpọlite oké ìgwè mmadụ n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ndị ga-eso n’ime ha ga-abụ Ebreham na Sera, Aịzik na Rebeka, Jekọb na Lia—bụ́ ndị nọ n’ụra ọnwụ ugbu a ma na-echere mbilite n’ọnwụ ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Jenesis 49:29-32) Lee aha ọṅụ a ga-enwe mgbe ndị anyị hụrụ n’anya ga-esi n’ụra ọnwụ teta ịdị ndụ n’elu ala ebe a! (Mkpughe 20:11-15) Ka ọ dịgodị, okwukwe agaghị ewepụ iru újú nile, ma ọ ga-eme ka anyị nọrọ Chineke nso, bụ́ onye na-enyere anyị aka idi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya.—Abụ Ọma 121:1-3; 2 Ndị Kọrint 1:3.

Okwukwe Na-ewusi Ndị Dara Mbà n’Obi Ike

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ịda mbà n’obi abụghị ihe ọhụrụ n’etiti ndị na-egosipụta okwukwe? (b) Gịnị ka a pụrụ ime iji nagide ịda mbà n’obi?

15 Okwu Chineke na-egosikwa na ọbụna ndị na-egosipụta okwukwe pụrụ ịda mbà n’obi. N’oge ọnwụnwa ya siri ike, Job chere na Chineke agbahapụwo ya. (Job 29:2-5) Mbibi e bibiri Jeruselem na mgbidi ya mere ka obi ghara ịdị Nehemaịa mma. (Nehemaịa 2:1-3) Obi gbawara nnọọ Pita mgbe ọ gọnahụsịrị Jizọs nke na ọ ‘kwara ákwá n’ụzọ dị ilu.’ (Luk 22:62) Pọl gbakwara ndị kwere ekwe ibe ya nọ n’ọgbakọ dị na Tesalonaịka ume ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) N’ihi ya, ịda mbà n’obi nke ndị na-egosipụta okwukwe taa abụghị ihe ọhụrụ. Gịnịzi ka anyị pụrụ ime iji na-anagide ịda mbà n’obi?

16 Anyị pụrụ ịda mbà n’obi n’ihi na anyị na-enwe ọtụtụ nsogbu siri ike. Kama ilewe ha anya dị ka nnukwu nsogbu karịrị ike anyị, anyị pụrụ inwe ike idozi ha otu otu site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Nke a pụrụ inye aka belata ịda mbà n’obi anyị. Ịrụ ọrụ ruo n’ókè kwesịrị ekwesị na izu ike nke ọma pụkwara inye aka. Otu ihe doro anya: Inwe okwukwe na Chineke na Okwu ya na-akwalite ọdịmma ime mmụọ n’ihi na ọ na-eme ka nkwenye anyị na ọ na-eche banyere anyị n’ezie sikwuo ike.

17. Olee otú anyị si mara na Jehova na-eche banyere anyị?

17 Pita na-agwa anyị okwu mmesi obi ike a na-akasi obi: “Wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ya ruru; ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.” (1 Pita 5:6, 7) Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Jehova na-akwagide ndị nile na-ada ada, Ọ na-ekulikwa ndị nile na-eruda n’ala.” (Abụ Ọma 145:14) Anyị kwesịrị ikwere okwu ndị a na-emesi obi ike n’ihi na ha dị n’Okwu Chineke. Ọ bụ ezie na ịda mbà n’obi pụrụ ịdịgide, lee ka o si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike ịmara na anyị pụrụ ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya nchegbu anyị nile!

Okwukwe na Ọnwụnwa Ndị Ọzọ

18, 19. Olee otú okwukwe si enyere anyị aka ịnagide ọrịa nakwa ịkasi ndị kwere ekwe ibe anyị na-arịa ọrịa obi?

18 Anyị pụrụ inwe ule siri ike nke okwukwe mgbe anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa siri ike. Ọ bụ ezie na Bible akọghị na a gwọrọ Ndị Kraịst dị ka Epafrọdaịtọs, Timoti, na Trọfimọs n’ụzọ ọrụ ebube, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova nyeere ha aka idi ya. (Ndị Filipaị 2:25-30; 1 Timoti 5:23; 2 Timoti 4:20) Ọzọkwa, banyere “onye nwere uche n’imeso onye na-enweghị ike” ihe, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ́ na-adịghị ya ike: ihe ndina ya nile ka Ị gbanweworo n’ọrịa ya.” (Abụ Ọma 41:1-3) Olee otú okwu ọbụ abụ ahụ pụrụ isi nyere anyị aka ịkasi ndị kwere ekwe ibe anyị na-arịa ọrịa obi?

19 Otu ụzọ isi nye aka n’ụzọ ime mmụọ bụ iso ndị na-arịa ọrịa kpee ekpere na ikpe ekpere n’ihi ha. Ọ bụ ezie na anyị agaghị arịọ ka a gwọọ ha n’ụzọ ọrụ ebube taa, anyị pụrụ ịrịọ Chineke ka o nye ha obi ike ịnagide nsogbu ha na ike ime mmụọ dị ha mkpa iji na-atachi obi n’oge dị otú ahụ ha na-adịghị ike. Jehova ga-akwagide ha, ha ga-ewusikwa okwukwe ha ike site n’ilepụ anya gaa n’oge mgbe ‘onye obibi ya na-agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.’ (Aịsaịa 33:24) Lee ihe na-akasi obi ọ bụ ịmara na site n’aka Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ nakwa site n’Alaeze Chineke, a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nwere onwe ha kpam kpam pụọ ná mmehie, ọrịa, na ọnwụ! Anyị na-ekele Jehova, bụ́ ‘onye na-agwọ ọrịa anyị nile,’ maka atụmanya ndị a magburu onwe ha.—Abụ Ọma 103:1-3; Mkpughe 21:1-5.

20. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na okwukwe pụrụ inyere anyị aka ịnagide “ụbọchị ihe ọjọọ” nke oge agadi?

20 Okwukwe pụkwara inyere anyị aka ịnagide “ụbọchị ihe ọjọọ” nke oge agadi, bụ́ mgbe ahụ́ ike na ume na-agbada agbada. (Eklisiastis 12:1-7) Ya mere, ndị agadi nọ n’etiti anyị pụrụ ikpe ekpere dị ka ọbụ abụ ahụ meworo agadi mere, bụ́ onye bụrụ sị: “Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova . . . Atụfula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” (Abụ Ọma 71:5, 9) Ọ dị ọbụ abụ ahụ mkpa ka Jehova na-akwado ya, dịkwa ka ọ dị ọtụtụ Ndị Kraịst ibe anyị meworo agadi n’ozi Chineke. N’ihi okwukwe ha, ha pụrụ ijide n’aka na ogwe aka ebighị ebi nke Jehova ga-anọgide na-akwagide ha.—Deuterọnọmi 33:27.

Nọgide Na-enwe Okwukwe n’Okwu Chineke

21, 22. Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe, olee otú nke ahụ si emetụta mmekọrịta anyị na Chineke?

21 Inwe okwukwe n’ozi ọma ahụ na n’Okwu Chineke n’ozuzu ya na-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso mgbe nile. (Jems 4:8) N’eziokwu, ọ bụ Eze Onyenwe anyị, ma ọ bụkwa Onye Okike anyị na Nna anyị. (Aịsaịa 64:8; Matiu 6:9; Ọrụ 4:24) “Nna m ka Ị bụ, Chineke m, na oké nkume nke nzọpụta m,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 89:26) Ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe na Jehova na n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, anyị pụkwara ime ya ‘oké nkume nke nzọpụta anyị.’ Lee ihe ùgwù na-enye obi ụtọ nke ahụ bụ!

22 Jehova bụ Nna nke Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta na ndị ibe ha nwere olileanya elu ala. (Ndị Rom 8:15) Okwukwe n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ adịghịkwa eduga ná mmechuihu ma ọlị. Devid kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Ọzọkwa, a na-agwa anyị okwu a na-emesi obi ike, sị: “Jehova agaghị ahapụ ndị Ya n’ihi aha ukwu Ya.”—1 Samuel 12:22.

23. Gịnị ka a chọrọ n’aka anyị iji soro Jehova na-enwe mmekọrịta na-adịgide adịgide?

23 N’ezie, iji soro Jehova na-enwe mmekọrịta na-adịgide adịgide, anyị aghaghị inwe okwukwe n’ozi ọma ahụ ma nakwere Akwụkwọ Nsọ dị ka Okwu Chineke n’ezie. (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Anyị aghaghị inwe okwukwe zuru ezu na Jehova ma kwe ka Okwu ya mụkwasị ìhè n’okporo ụzọ anyị. (Abụ Ọma 119:105; Ilu 3:5, 6) Okwukwe anyị ga-esikwu ike ka anyị na-ekpegara ya ekpere, na-enwe obi ike na ọ ga-enwe ọmịiko na ebere n’ahụ́ anyị ma kwado anyị.

24. Echiche dị aṅaa na-akasi obi ka e depụtara ná Ndị Rom 14:8?

24 Okwukwe kpaliri anyị ịrara onwe anyị nye Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike, ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, anyị bụ ndị ohu ya raara onwe ha nye bụ́ ndị nwere olileanya nke mbilite n’ọnwụ. Ee, “ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Ndị Rom 14:8) Ka anyị buru echiche dị otú ahụ na-akasi obi n’uche ka anyị na-anọgide na-enwe obi ike n’Okwu Chineke, nọgidekwa na-enwe okwukwe n’ozi ọma ahụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ okwukwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka àgwà a ji dị anyị mkpa?

• N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị nwee okwukwe n’ozi ọma ahụ nakwa n’Okwu Chineke n’ozuzu ya?

• Olee otú okwukwe si enyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa dịgasị iche iche?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe okwukwe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Jehova kwagidere Jeremaịa na Ịlaịja n’ihi na ha nwere okwukwe

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Job, Pita, na Nehemaịa nwere okwukwe siri ike

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Iji soro Jehova na-enwe mmekọrịta na-adịgide adịgide, anyị aghaghị inwe okwukwe n’ozi ọma ahụ