Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ò kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ Onye Kraịst ịtụkwasị aka n’elu Bible ma ṅụọ iyi ikwu eziokwu nile n’ụlọikpe?

Onye ọ bụla aghaghị ime mkpebi n’onwe ya banyere nke a. (Ndị Galeshia 6:5) Otú ọ dị, Bible adịghị emegide ịṅụ iyi ikwu eziokwu n’ụlọikpe.

Ọ dịwo anya ịṅụ iyi bụ ihe a na-eme n’ebe nile. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, ndị Gris na-eweli otu aka elu ma ọ bụ na-emetụ aka n’ebe ịchụàjà mgbe ha na-aṅụ iyi. Mgbe onye Rom na-aṅụ iyi, ọ na-ejide nkume n’aka ya ma na-aṅụ iyi, sị: “Ọ bụrụ na m mara ụma kwuo okwu nduhie, ka [chi] Jupita na-anapụta obodo na ebe e wusiri ike, ya tụfuokwa ezi ihe nile ga-abịara m, dị ka m na-eme nkume a.”—Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke John McClintock na James Strong dere, Mpịakọta nke Asaa, peeji nke 260.

Omume ndị dị otú ahụ na-egosipụta ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ nwere ikwere na e nwere chi nke pụrụ ịhụ ụmụ mmadụ bụ́kwa onye ha ga-aza ajụjụ n’ihu ya. Site n’oge ochie, ndị na-efe Jehova ezi ofufe ghọtara na ọ maara ihe ha kwuru ma mee. (Ilu 5:21; 15:3) Ha ṅụrụ iyi n’ihu Chineke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma ọ bụ ka ọ nọ ya dị ka onye nkiri. Dị ka ihe atụ, Boaz, Devid, Solomọn, na Zedekaịa mere nke a. (Rut 3:13; 2 Samuel 3:35; 1 Ndị Eze 2:23, 24; Jeremaịa 38:16) Ndị na-efe ezi Chineke ofufe kwekwara ka ndị ọzọ gbaa ha iyi. Otú ahụ ka ọ dị n’ọnọdụ Ebreham na Jizọs Kraịst.—Jenesis 21:22-24; Matiu 26:63, 64.

Mgbe ụfọdụ, onye na-aṅụ iyi n’ihu Jehova na-edebe aka ya n’ọnọdụ ụfọdụ mgbe ọ na-aṅụ ya. Ebram (Ebreham) gwara eze Sọdọm, sị: “Eweliwo m aka m nye Jehova, bụ́ Chineke Nke kachasị ihe nile elu, Onye nwe eluigwe na ụwa.” (Jenesis 14:22) Mmụọ ozi nke na-agwa Daniel onye amụma okwu “[weliri] aka nri ya na aka ekpe ya n’eluigwe, were Onye ahụ Nke na-adị ndụ mgbe ebighị ebi [ṅụọ iyi].” (Daniel 12:7) Ọbụna a na-ekwu na Chineke na-eweli aka ya elu n’ụzọ ihe atụ ịṅụ iyi.—Deuterọnọmi 32:40; Aịsaịa 62:8.

Akwụkwọ Nsọ emegideghị ịṅụ iyi. Otú ọ dị, ọ dịghị Onye Kraịst mkpa ịṅụ iyi iji kwado ihe ọ bụla o kwuru. Jizọs sịrị: “Nanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, Ee e unu abụrụ Ee e.” (Matiu 5:33-37) Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems kwuru ihe yiri nke ahụ. Mgbe ọ sịrị “kwụsịnụ ịṅụ iyi,” ọ nọ na-adọ aka ná ntị megide ịṅụ iyi n’ihi ihe na-enweghị isi. (Jems 5:12) Ma Jizọs ma Jems adịghị nke kwuru na ọ dị njọ ịṅụ iyi ikwu eziokwu n’ụlọikpe.

Gịnịzi ma ọ bụrụ na a gwa Onye Kraịst nọ n’ụlọikpe ka ọ ṅụọ iyi na akaebe ọ na-agba bụ eziokwu? Ọ pụrụ iche na ya pụrụ ịṅụ iyi dị otú ahụ. Ma ọ bụkwanụ, a pụrụ ikwe ka o kwe nkwa siri ike na ya adịghị ekwu okwu ụgha.—Ndị Galeshia 1:20.

Mgbe usoro a na-agbaso n’ụlọikpe gụnyere iweli aka elu ma ọ bụ ịtụkwasị ya n’elu Bible mgbe a na-aṅụ iyi, Onye Kraịst pụrụ ịhọrọ ime otú ahụ. Ọ pụrụ iburu n’uche ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara idebe aka n’ọnọdụ ụfọdụ mgbe a na-aṅụ iyi. Nye Onye Kraịst, ihe ka mkpa karịa mmadụ idebe aka n’ọnọdụ ụfọdụ mgbe ọ na-aṅụ iyi bụ ya icheta na ọ na-aṅụ iyi n’ihu Chineke ikwu eziokwu. Ịṅụ iyi dị otú ahụ abụghị obere okwu. Ọ bụrụ na Onye Kraịst echee na ya pụrụ ma kwesị ịza ajụjụ a jụrụ ya n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, mgbe ahụ, o kwesịrị iburu n’uche na ya ṅụrụ iyi ikwu eziokwu, nke bụ́ n’ezie ihe Onye Kraịst na-achọ ikwu mgbe nile.