Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Cheta Ndịàmà Jehova E Gburu Egbu

E Cheta Ndịàmà Jehova E Gburu Egbu

E Cheta Ndịàmà Jehova E Gburu Egbu

NA March 7, 2002, e kpughere otu nkume ihe ncheta n’obodo Körmend, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Hungary. E ji ya echeta ọnwụ nke Ndịàmà Jehova atọ ndị Nazi gburu na 1945.

A kpọgidere nkume ihe ncheta ahụ n’ahụ́ mgbidi nke ebe bụ́ ugbu a, isi ụlọ ọrụ nke ngalaba mgbanyụ ọkụ dị na Hunyadi Road, bụ́ ebe a nọ gbuo ndị ahụ n’ihu ọha. Nkume ihe ncheta ahụ bụ iji cheta “Ndị Kraịst e gburu na March 1945 n’ihi ọjụjụ ha jụrụ ikere òkè n’agha n’ihi akọ na uche ha. Antal Hőnisch (1911-1945), Bertalan Szabó (1921-1945), János Zsondor (1923-1945), 2002, Ndịàmà Jehova.”

E gburu ndị ahụ mgbe ọ fọdụrụ nanị ọnwa abụọ ka Agha Ụwa nke Abụọ bie. Gịnị mere e ji gbuo Ndị Kraịst a? Akwụkwọ akụkọ Hungary bụ́ Vas Népe na-akọwa, sị: “Mgbe Hitler wegharasịịrị ọchịchị na Germany, ọ bụghị nanị ndị Juu ka o lekwasịrị anya kama o lekwasịkwara Ndịàmà Jehova anya ịkpagbu na imekpọ ha ọnụ, itinye ha n’ogige ịta ahụhụ na igbu ha ma ọ bụrụ na ha ajụghị nkwenkwe okpukpe ha. . . . Na March 1945, oké ụjọ ji onye ọ bụla n’ebe ọdịda anyanwụ Hungary. . . . Otu n’ime ihe a na-atụ ụjọ ya bụ ịgbara Ndịàmà Jehova ụgbọ nwa mkpi na igbu ha egbu.”

E kewara usoro ihe omume nke ikpughe nkume ihe ncheta ahụ ụzọ abụọ. Nke mbụ weere ọnọdụ n’ụlọ ebe a na-eme ihe nkiri nke dị na Batthyány Castle, bụ́ ebe ndị ọkà okwu dị iche iche kwuru okwu, gụnyere Prọfesọ Szabolcs Szita, bụ́ onyeisi nke Ebe Ndebe Ihe Ndekọ Banyere Oké Mgbukpọ ahụ na Budapest; László Donáth, bụ́ onye so na Kọmitii nke Ndị Ome Iwu Guzobere Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, Okwu Metụtara Okpukpe na Ndị Ọnụ Ọgụgụ Ha Ka Ala; na Kálmán Komjáthy, bụ́ onye ji anya ya hụ mgbe e gburu ndị ahụ, onye bụ́ ugbu a ọkọ akụkọ ihe mere eme n’obodo ahụ. Ihe karịrị mmadụ 500 bịara ememe ahụ ji ụkwụ gafere n’akụkụ nke ọzọ nke obodo ahụ maka akụkụ nke abụọ nke usoro ihe omume ahụ—mkpughe nke Onyeisi Obodo Körmend bụ́ József Honfi kpughere nkume ihe ncheta ahụ.

N’akwụkwọ ozi ya o ji sị ndị mmadụ ka e mesịa, Ján Žondor (János Zsondor) gbara ụmụnna ya Ndị Kraịst, ndị nwoke na ndị nwanyị ume ka ha ghara iru újú. O dere, sị: “M ka bu n’uche ihe Jọn kwuru nke dị ná Mkpughe 2:10: ‘Gosipụta na ị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ.’ . . . Gwanụ ndị nọ n’ụlọ ka ha ghara iru újú, n’ihi na ana m anwụ maka eziokwu ahụ, ọ bụghịkwa dị ka onye omekome.”

[Foto dị na peeji nke 32]

Bertalan Szabó

[Foto dị na peeji nke 32]

Antal Hőnisch

[Foto dị na peeji nke 32]

Ján Žondor