Ihe Ọjọọ Ò Meriwo?
Ihe Ọjọọ Ò Meriwo?
ECHICHE bụ́ na ikike nke ezi ihe na ihe ọjọọ na-alụ ọgụ n’eluigwe na ala akpaliwo ndị edemede na ndị ọkà ihe ọmụma n’akụkọ ihe mere eme nile ichepụta ọtụtụ echiche dịgasị iche iche. Otú ọ dị, e nwere otu akwụkwọ kọrọ ihe bụ́ eziokwu banyere ọgụ Chineke na Ekwensu na-alụ. Akwụkwọ ahụ bụ Bible. Ọ na-ekpughe ihe ndị na-esere ha ma na-egosi ụzọ a ga-esi mata onye meriworo n’ezie.
N’oge na-adịghị anya ka e kesịrị nwoke na nwanyị mbụ ahụ, otu mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya, bụ́ Setan Ekwensu, mara ịchịisi Chineke aka. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’iji aghụghọ nye echiche na Chineke napụrụ ihe ndị o kere eke ezi ihe nakwa na ndụ ụmụ mmadụ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ha adabereghị n’ebe Ọ nọ.—Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9.
E mesịa, n’ụbọchị nna ochie ahụ bụ́ Job, Setan welitere ihe iseokwu ọzọ. N’ịchọ ime ka Job kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke, Setan kwuru, sị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọbụna ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Job 2:4) Lee ka nke ahụ si bụrụ ebubo e boro mmadụ nile! Site n’iji okwu ahụ bụ́ “mmadụ” mee ihe kama iji aha Job, Setan mere ka e nwee obi abụọ banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ nile. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ zọọrọ, sị: ‘Mmadụ ga-eme ihe ọ bụla iji chebe ndụ ya. Nye m ohere, apụkwara m ime ka mmadụ ọ bụla gbakụta Chineke azụ.’
A na-ekpebi onye meriri n’ọgụ Chineke na Ekwensu na-alụ site n’ịza ajụjụ abụọ: Mmadụ ò nwere ike ịchị onwe ya n’ụzọ na-aga nke ọma? Ekwensu ò nwewo ike ime ka mmadụ nile gbakụta ezi Chineke ahụ azụ?
Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Ịchị Onwe Ha n’Ụzọ Na-aga nke Ọma?
Ruo ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ anwalewo ụdị ọchịchị dịgasị iche iche. N’oge ndị gafeworonu, a nwalewo ụdị ọchịchị ndị dị ka ọchịchị onyeeze, ọchịchị dị n’aka nanị ndị oké ozu, ọchịchị onye kwuo uche ya, ọchịchị nchịgbu, ọchịchị aka ike Fascist, na ọchịchị Kọmunist. Eziokwu ahụ bụ́ na a nọgidewo na-enwe mkpa nke ime nnwale ọ́ dịghị egosi na ụzọ ndị a dị iche iche e si achị ọchịchị erughị eru?
“Ndị Rom hụtara onwe ha, n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’amaghị ama, dị ka ndị na-etinye aka n’usoro ọchịchị ọhụrụ sara mbara,” ka H. G. Wells dere n’akwụkwọ bụ́ A History of the World, nke e bipụtara na 1922. Ọ gara n’ihu, sị: “Ọ nọ na-agbanwe mgbe nile, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ kwụụrụ chịm. N’otu echiche, nnwale ndị ahụ kụrụ afọ n’ala. N’echiche ọzọ, nnwale ndị ahụ nọgidere bụrụ ndị a na-emechaghị emecha, Europe na America ka nọkwa na-edozi nsogbu ndị tara akpụ metụtara usoro ọchịchị zuru ụwa ọnụ bụ́ nke ndị Rom bu ụzọ chee ihu.”
Nnwale ndị a na-eme n’ọchịchị dịgidere ruo na narị afọ nke 20. Ka narị afọ ahụ gwụrụ, a nabatara ọchịchị onye kwuo uche ya karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Dị ka e kweere, ọchịchị onye kwuo uche ya na-enye onye ọ bụla ohere itinye ọnụ n’ọchịchị. Ma ọchịchị onye kwuo uche ya ò gosiwo na mmadụ pụrụ ịchị nke ọma n’adabereghị n’ebe Chineke nọ? Jawaharlal Nehru, onye bụbu praịm minista India, kpọrọ ọchịchị onye kwuo uche ya ihe dị mma ma gbakwụnye, sị: “Ana m ekwu nke a n’ihi na usoro ọchịchị ndị ọzọ ka ya njọ.” Onye bụbu president France bụ́ Valéry Giscard d’Estaing kwuru, sị: “Anyị na-ahụ ọgba aghara n’ọchịchị onye kwuo uche ya nke a nọchitere anya mmadụ nile na ya.”
Ọbụna na narị afọ nke ise T.O.A., ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Gris bụ́ Plato chọpụtara nsogbu dị n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya. Dị
ka akwụkwọ bụ́ A History of Political Theory si kwuo, ọ katọrọ “amaghị ihe na erughị eru nke ndị ọchịchị, nke bụ́ ọnụ pụrụ iche a bụrụ ọchịchị onye kwuo uche ya.” Ọtụtụ n’ime ndị na-azọ ọchịchị n’oge a na-akwa arịrị banyere ihe isi ike ha na-enwe n’ịchọta ndị nwere nkà bụ́ ndị ruru eru ịnọ n’ọchịchị. Ndị mmadụ “na-eweso ndị ndú na-eyi ndị na-erughị eru n’oge nsogbu ndị chere ha ihu dị nnọọ ukwuu iwe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal kwuru. Ọ gara n’ihu, sị: “Obi na-agbawa ha ịhụ emeghị mkpebi na nrụrụ aka mgbe ha na-achọ nduzi.”Tụlezie ọchịchị Eze Solomọn nke Izrel oge ochie. Jehova Chineke nyere Solomọn amamihe dị ịrịba ama. (1 Ndị Eze 4:29-34) Olee otú ihe si gaara mba Izrel n’oge ọchịchị Solomọn bụ́ nke were afọ 40? “Juda na [Izrel] dị ọtụtụ,” ka Bible na-aza, “dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ.” Ihe ndekọ ahụ na-ekwukwa, sị: “Juda na [Izrel] wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na Biasheba, ụbọchị nile nke Solomọn.” (1 Ndị Eze 4:20, 25) Ka eze maara ihe na-achị ha dị ka onye nnọchianya a na-ahụ anya nke Onye Ọchịchị Kasịnụ a na-adịghị ahụ anya, bụ́ Jehova Chineke, mba ahụ kwụsiri ike, nwee ọganihu na ọṅụ n’ụzọ na-enweghị atụ.
Lee ka ịchịisi mmadụ na nke Chineke si dị nnọọ iche! Ọ̀ dị onye pụrụ izi ezi ikwu na Setan emeriwo n’okwu banyere ịchịisi? Ee e, n’ihi na Jeremaịa onye amụma kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
Setan Ọ̀ Pụrụ Ime Ka Mmadụ Nile Gbakụta Chineke Azụ?
Setan ò nwewo ihe ịga nke ọma ná nzọrọ ọ zọọrọ na ọ pụrụ ime ka mmadụ nile gbakụta Chineke azụ? N’isi 11 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Hibru, Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge Ndị Kraịst. Mgbe ahụ, o kwuru, sị: “Oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere Gidiọn, Berak, Samsin, Jefta, Devid nakwa Samuel na ndị amụma ndị ọzọ.” (Ndị Hibru 11:32) Pọl kpọrọ nnọọ ndị ohu Chineke a na-eguzosi ike n’ihe “oké ìgwè ndị àmà.” (Ndị Hibru 12:1) Okwu Grik mbụ e ji mee ihe ebe a pụtara “igwe ojii,” ọ bụghị igwe ojii na-anọkọtaghị ọnụ nke e kwuru kpọmkwem otú ọ haruru na otú ọ dị, kama ọ bụ igwe ojii buru nnọọ ibu nke a na-amaghị ọdịdị ya. Nke a dabara adaba n’ihi na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie dị nnọọ ọtụtụ nke na ha dị ka igwe ojii buru nnọọ ibu. Ee, n’ime narị afọ ndị gafeworonụ, ìgwè mmadụ a na-amaghị ole ha dị ejiriwo nnwere onwe ime nhọrọ ha mee ihe ma họrọ irubere Jehova Chineke isi.—Joshua 24:15.
Gịnị ka anyị na-ahụ n’oge anyị? Ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile amụbawo ruo ihe karịrị nde isii n’agbanyeghị mkpagbu na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ha nwetara n’ime narị afọ nke 20. Ihe dị ka nde mmadụ itoolu ndị ọzọ so ha na-akpakọrịta, ọtụtụ n’ime ha na-ewerekwa nzọụkwụ kwesịrị ekwesị iji soro Chineke na-enwe mmekọrịta n’onwe ha.
E si n’aka Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, nweta azịza kasịnụ nye nzọrọ Setan zọọrọ na ya pụrụ ime ka ụmụ mmadụ gbakụta Jehova azụ. Ọbụna oké ihe mgbu n’elu osisi ịta ahụhụ emeghị ka ọ kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe. Kpọmkwem tupu Jizọs ekubie ume, o ji oké olu kwuo, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.”—Luk 23:46.
Setan na-eji ihe ọ bụla o nwere ike—site n’ọnwụnwa ruo ná mkpagbu doro anya—eme ihe iji na-achịkwa ụmụ mmadụ. N’iji “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” anwa ụmụ mmadụ ọnwụnwa, ọ na-achọ ma ọ́ bụghị ime ka ha gbakụta Jehova azụ ọ bụrụ ịrara ha pụọ n’ebe Ọ nọ. (1 Jọn 2:16) Setan ‘emewokwa ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst ahụ wee ghara inwupụta.’ (2 Ndị Kọrint 4:4) Setan adịghịkwa ala azụ n’iji iyi egwu na egwu mmadụ eme ihe iji mezuo nzube ya.—Ọrụ 5:40.
Otú ọ dị, Ekwensu adịghị emeri ndị ha na Chineke kwụ. Ha abịawo mara Jehova Chineke ma ‘jiri obi ha dum, jirikwa mkpụrụ obi ha dum, jirikwa uche ha dum hụ Jehova bụ́ Chineke ha n’anya.’ (Matiu 22:37) Ee, iguzosi ike n’ihe na-adịghị ada ada nke Jizọs Kraịst na imerime ụmụ mmadụ, na-egosi nnọọ na e meriwo Setan bụ́ Ekwensu mmeri dị ukwuu.
Gịnị Ka Ọdịnihu Ga-eweta?
Ụmụ mmadụ hà ga-anọgide na-anwale ụdị ọchịchị dị iche iche ruo mgbe ebighị ebi? Daniel onye amụma buru amụma, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Alaeze ahụ Chineke nke eluigwe ga-eguzobe bụ ọchịchị eluigwe nke dị n’aka Jizọs Kraịst. Ọ bụ otu Alaeze ahụ Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya. (Matiu 6:9, 10) Alaeze ahụ ga-ebibi ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ “n’agha [na-abịanụ] nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” ọ ga-emetụtakwa elu ụwa dum.—Mkpughe 16:14, 16.
Gịnị na-echere Setan? Bible na-akọwa ihe a gaje ime n’ọdịnihu, sị: “[Otu mmụọ ozi Jehova] wee jichie dragọn ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan, ma kee ya agbụ ruo otu puku afọ. Ọ tụbakwara ya n’ime abis ahụ, mechiekwa ya ma kaa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ ruo mgbe puku afọ ahụ ga-agwụsị.” (Mkpughe 20:1-3) Ọ bụ nanị mgbe a tụbara Setan n’abis nke arụghị ọrụ ka Ọchịchị Puku Afọ nke Jizọs Kraịst ga-amalite.
Lee ebe magburu onwe ya ụwa a ga-abụ n’oge ahụ! Ajọ omume na ndị na-eme ya ga-apụ n’anya. Bible na-ekwe nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:9-11) Ọ dịghị ihe ọ bụla—mmadụ ma ọ bụ anụmanụ—ga-eyi udo ha egwu. (Aịsaịa 11:6-9) Ọbụna a ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ, bụ́ ndị kwụnyeere Ekwensu n’oge ndị gafeworonụ n’ihi amaghị ihe ma ọ bụ n’ihi enweghị ohere nke ịmara Jehova, n’ọnwụ ma kụziere ha ụzọ Chineke.—Ọrụ 24:15.
Mgbe Ọchịchị Puku Afọ ahụ ga-agwụ, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, a ga-emewokwa ka ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya zuo okè. Mgbe ahụ, a ga-atọhapụ Setan ruo “nwa oge,” e mesịa, a ga-ebibi ya na ndị nile na-emegide ịchịisi Chineke ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 20:3, 7-10.
Ònye Ka Ị Ga-akwụnyere?
Narị afọ nke 20 bụ oge Setan kpara ike ọjọọ n’ụwa. Otú ọ dị, kama igosi na o meriwo, ọnọdụ ndị dị n’ụwa bụ ihe ama na-egosi na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ nke ajọ ụwa a. (Matiu 24:3-14; Mkpughe 6:1-8) Ma otú ihe ọjọọ si baa ụba n’ụwa ma ihe bụ́ echiche ọtụtụ ndị abụghị ihe na-egosi onye meririnụ. Ihe ndị na-ekpebi ya bụ onye ụzọ o si achị kasị mma nakwa ma ọ̀ dị onye jiworo ịhụnanya jeere Chineke ozi. N’akụkụ abụọ ahụ, Jehova nwe mmeri.
Ọ bụrụ na oge e nyere egosilarị na Setan bụ onye ụgha, n’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ajọ omume dịgide? Jehova na-enwe ndidi “n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Uche Chineke bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) A na-enwe olileanya na ị ga-eji oge fọdụrụnụ mụọ Bible ma ‘nweta ihe ọmụma banyere nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka inweta ihe ọmụma ahụ ka gị onwe gị kwa wee nwee ike isonyere ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị kwụnyesiiri onye nke na-enwe mmeri ike.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, Ndịàmà Jehova enyewo ihe àmà ọzọ na-egosi na e meriwo Setan
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọtụtụ ndị na-eguzosi ike n’ihe kwụnyeere Jehova