Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” Ejiri Ọṅụ Gbakọta

“Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” Ejiri Ọṅụ Gbakọta

“Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” Ejiri Ọṅụ Gbakọta

NSOGBU nke omume, nke akụ̀ na ụba, na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpa ụwa aka ọjọọ. Otú ọ dị, n’ime ọgba aghara a nile, Ndịàmà Jehova gbakọtara maka Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nke were ụbọchị atọ nke e mere n’udo. E nwere mgbakọ ndị a gburugburu ụwa malite na May 2002.

N’ezie, mgbakọ ndị ahụ bụ ihe omume ndị na-enye ọṅụ. Ka anyị tụleghachi n’ụzọ dị mkpirikpi usoro ihe omume ahụ na-ewuli elu dabeere na Bible.

Ụbọchị nke Mbụ Mesiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Jizọs Ike

Isiokwu nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ bụ “Ṅomie Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Onyenwe Anyị, Jizọs.” (Jọn 2:17) Okwu bụ́ “Ṅụrịanụ Ọṅụ Maka Ịgbakọta Dị Ka Ndị Nkwusa Alaeze,” ji obi ụtọ gbaa ndị bịaranụ ume iso nweta ọṅụ nke e jiworo mara mgbakọ nke ndị Chineke. (Deuterọnọmi 16:15) Ajụjụ ọnụ a gbara ndị nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi sochiri okwu a.

Okwu bụ́ “Ka Ihe Jehova n’Onwe Ya Na-atọ Gị Ụtọ” tụlere Abụ Ọma 37:1-11 n’amaokwu n’amaokwu. A gbara anyị ume ịghara ‘iwe iwe dị ọkụ’ n’ihi ihe yiri ihe ịga nke ọma nke ndị na-eme ihe ọjọọ na-enwe. Ọ bụ ezie na ndị ajọ omume pụrụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị, ka oge na-aga, Jehova ga-eme ka o doo anya ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. Okwu bụ́ “Gosinụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele” tụlere otú anyị pụrụ isi na-ekele Chineke ekele. Ndị Kraịst nile aghaghị ịchụrụ Jehova “àjà otuto.” (Ndị Hibru 13:15) N’ezie, otú oge anyị na-etinye n’ozi Jehova haruru na-adabere n’ekele anyị na-enwe nakwa n’ọnọdụ anyị.

Isiokwu nke okwu bụ́ isi bụ “Ndị Nkwusa Alaeze Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi.” O zoro aka n’ebe Jizọs Kraịst nọ dị ka onye nlereanya anyị kasịnụ nke ịnụ ọkụ n’obi. Mgbe e guzobesịrị Alaeze eluigwe na 1914, ịnụ ọkụ n’obi bịara dị ezi Ndị Kraịst mkpa iji kpọsaa ozi ọma ahụ. Ọkà okwu ahụ zoro aka ná mgbakọ ahụ e nwere na Cedar Point, Ohio, U.S.A., na 1922 ma chetara anyị òkù ahụ mere ihe akụkọ, bụ́: “Kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya”! Ka oge na-aga, ịnụ ọkụ n’obi nke ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi kwaliri ha ịkpọsara mba nile eziokwu Alaeze ahụ dị ebube.

Okwu bụ́ “Unu Atụla Egwu Ebe Unu Maara na Jehova Nọnyeere Anyị,” bụ́ nke e kwuru n’ehihie nke ụbọchị mbụ ahụ, mere ka a mara na Setan lekwasịrị ndị Chineke anya n’ụzọ pụrụ iche. Otú ọ dị, n’agbanyeghị mmegide anyị na-enweta, ịtụgharị uche n’ọtụtụ ihe atụ nke okwukwe ndị dị na Bible na ndị nke oge a na-eme ka obi sie anyị ike iche ule na ọnwụnwa ihu n’atụghị egwu.—Aịsaịa 41:10.

Ihe sochirinụ n’usoro ihe omume ahụ bụ okwu ọtụtụ ndị kwuru nke nwere akụkụ atọ n’isiokwu bụ́ “Amụma Maịka Na-ewusi Anyị Ike Ijegharị n’Aha Jehova.” Ọkà okwu nke mbụ ji ndakpọ omume ọma, ndapụ n’ezi ofufe, na ịhụ ihe onwunwe n’anya nke oge Maịka tụnyere nke oge anyị. O kwuru, sị: “Olileanya anyị nwere maka ọdịnihu ga-abụ nke e ji n’aka ma ọ bụrụ na anyị enwee obi nke na-erube isi ma jide n’aka na omume anyị dị nsọ nakwa na ndụ anyị jupụtara n’omume nke nsọpụrụ Chineke—ma ọ bụrụkwa na anyị echefughị mgbe ọ bụla na ụbọchị Jehova ga-abịa.”2 Pita 3:11, 12.

Ọkà okwu nke abụọ n’okwu a ọtụtụ ndị kwuru, kwuru banyere nkatọ Maịka katọrọ ndị ndú Juda. Ha megburu ndị ogbenye na-apụghị ịzọ onwe ha. Ma Maịka bukwara amụma banyere mmeri ezi ofufe ga-enwe. (Maịka 4:1-5) N’ịbụ ndị mmụọ nsọ Jehova nyere ikike, anyị kpebisiri ike ikwusa ozi olileanya a na-enye ume ọhụrụ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ka ọrịa ọ na-adọla anyị azụ ma ọ bụ dị anyị ka anyị erughị eru n’ụfọdụ ụzọ ndị ọzọ? Ọkà okwu nke atọ kwuru, sị: “Ihe Jehova chọrọ bụ ihe ndị ezi uche dị na ha nakwa . . . ihe ndị a pụrụ ime eme.” Ọ gara n’ihu ịtụle akụkụ dịgasị iche iche nke Maịka 6:8, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe [“ikpe ikpe ziri ezi,” NW], na ịhụ ebere [“obiọma,” NW] n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”

Ebe ọ bụ na ndakpọ omume nke ụwa pụrụ imetụta Ndị Kraịst, anyị nile ritere uru n’okwu ahụ isiokwu ya bụ “Nọgide Na-adị Ọcha n’Omume Site n’Ichebe Obi Gị.” Dị ka ihe atụ, anyị ịnọgide na-adị ọcha n’omume ga-enyere anyị aka inwe alụmdi na nwunye obi ụtọ. Dị ka Ndị Kraịst, anyị agatụghị echetụ ọbụna n’echiche inwe mmekọahụ rụrụ arụ.—1 Ndị Kọrint 6:18.

Okwu bụ́ “Nọrọ na Nche Megide Aghụghọ” gosiri na anyị ga-abụ ndị maara ihe iwere nkọwahie, okwu ndị na-abụchaghị eziokwu, na ụgha chara acha bụ́ ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akwalite, dị ka nsí. (Ndị Kọlọsi 2:8) N’otu aka ahụ, anyị agatụghị eduhie onwe anyị gaa n’ichewe na anyị pụrụ imeju ọchịchọ mmehie anyị n’enwetaghị ihe mmerụ ahụ́.

“Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe” bụ isiokwu okwu mmechi nke ụbọchị mbụ ahụ. Ka ọnọdụ ndị dị n’ụwa nọgidere na-akakwu njọ, lee ihe agbamume ọ bụ ịmara na Jehova ga-eweta ụwa ọhụrụ ezi omume ya n’isi nso! Olee ndị ga-ebi na ya? Ọ bụ nanị ndị na-efe Jehova ofufe. Iji nyere anyị, ụmụ anyị, na ndị anyị na-amụrụ Bible aka iru ihe mgbaru ọsọ a, ọkà okwu ahụ wepụtara akwụkwọ ọhụrụ e ji amụ ihe bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Lee ka obi si dị anyị ụtọ inweta ya!

Ụbọchị nke Abụọ Mere Ka Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe Pụta Ìhè

Isiokwu ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ bụ “Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe.” (1 Pita 3:13) Ọkà okwu nke mbụ tụlere ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị ahụ. O mesiri ya ike na ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị mgbe nile n’ụzọ nwere nzube na-eme ka anyị na-anụ ọkụ n’obi karị.

Mgbe nke ahụ gasịrị, okwu ọtụtụ ndị kwuru bụ́ “Ndị Nkwusa Alaeze Bụ́ Ndị Na-eme Ka Ozi Ha Nwee Ùgwù,” sochiri. Akụkụ nke mbụ ya mesiri ike mkpa ọ dị ijizi Okwu Chineke ejizi. (2 Timoti 2:15) Anyị iji Bible na-eme ihe nke ọma na-emeghe ụzọ maka ya ‘ịkpa ike’ ná ndụ ndị mmadụ. (Ndị Hibru 4:12) Anyị kwesịrị ịdị na-adọrọ uche aga na Bible ma jiri ya soro ndị mmadụ na-atụgharị uche n’ụzọ ga-eme ka e kwenye. Akụkụ nke abụọ nke okwu ahụ ọtụtụ ndị kwuru gbara anyị ume iletaghachi ndị nwere mmasị ugboro ugboro. (1 Ndị Kọrint 3:6) Nkwadebe na obi ike dị mkpa iji na-esochi mmasị nile e gosipụtara ozugbo. Akụkụ nke atọ tụrụ aro ka anyị na-ele onye ọ bụla anyị zutere anya dị ka onye ga-emesị bụrụ onye na-eso ụzọ ma gosi na ikwu ka a malitere mmadụ ọmụmụ Bible n’oge mbụ anyị zutere ya pụrụ ime ka anyị nweta ọṅụ nke inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ.

“Ihe Mere A Ga-eji ‘Na-ekpe Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị’” bụ isiokwu nke okwu sochirinụ. Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ilegara Chineke anya maka nduzi n’akụkụ nile nke ndụ. Ọ dị anyị mkpa iwepụta oge maka ikpe ekpere n’onwe anyị. Ọzọkwa, anyị aghaghị ịnọgidesi ike n’ekpere, n’ihi na Jehova pụrụ ikwe ka anyị nọgide na-ekpe ekpere ruo oge ụfọdụ tupu a hụ nzaghachi ya.—Jems 4:8.

Okwu bụ́ “Mkparịta Ụka Dabeere n’Ihe Ime Mmụọ Na-ewuli Elu” gbara anyị ume iji onyinye anyị nke ikwu okwu na-eme ihe iji na-abara onwe anyị na ndị ọzọ uru. (Ndị Filipaị 4:8) Mkparịta ụka ime mmụọ dị ndị di na nwunye na ụmụaka mkpa kwa ụbọchị. Iji mezuo nke ahụ, ezinụlọ kwesịrị ịgbalị ịdị na-erikọ nri ọnụ, ọ dịkarịa ala, otu ugboro n’ụbọchị, si otú ahụ na-enye ohere maka mkparịta ụka na-ewuli elu.

Usoro ihe omume nke ụtụtụ ahụ ji okwu a na-ekpo obi ọkụ bụ́ “Otú Nraranye na Baptizim Si Eduga ná Nzọpụta,” mechie. Ndị a na-aga ime baptizim enwetawo ihe ọmụma, gosipụta okwukwe, chegharịa, chigharịa pụọ n’ihe ọjọọ, ma rara onwe ha nye Chineke. Ọkà okwu ahụ sịrị na mgbe e mesịrị ha baptizim, ha aghaghị ịnọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ ma nọgide na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi na omume ọma ha.—Ndị Filipaị 2:15, 16.

N’ehihie ahụ, e mesiri isi ihe abụọ ike n’okwu bụ́ “Dị Obi Umeala, Ka Anya Gị Na-elekwa Otu Ebe.” Ịdị obi umeala pụtara inwe echiche ziri ezi banyere erughị eru anyị na ọnọdụ anyị n’ihu Chineke. Obi umeala na-enyere anyị aka ime ka anya anyị na-elegide “otu ebe”—na-elekwasị n’Alaeze Chineke, ọ bụghị n’ihe onwunwe. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, ọ gaghị adị anyị mkpa inwe nchegbu, n’ihi na Jehova ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị.— Matiu 6:22-24, 33, 34.

Ọkà okwu nke sochirinụ gosiri ihe mere i kwesịrị iji “Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile n’Oge Nsogbu.” Olee otú anyị pụrụ isi nagide ihe ndị dị ka adịghị ike onwe onye na nsogbu akụ̀ na ụba ma ọ bụ nke ahụ́ ike? Ka anyị rịọ Jehova maka ezi amamihe ma rịọ ndị ọzọ maka enyemaka. Kama ịtụwa ụjọ ma ọ bụ inwewe obi nkoropụ, anyị kwesịrị ime ka ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike site n’ịgụ Okwu ya.—Ndị Rom 8:35-39.

Isiokwu okwu ikpeazụ ọtụtụ ndị kwuru ná mgbakọ ahụ bụ “Ule Dị Iche Iche Na-anwale Ọdịdị nke Okwukwe Anyị.” Akụkụ nke mbụ chetaara anyị na ezi Ndị Kraịst nile na-eche mkpagbu ihu. Ọ na-abụ ihe àmà, na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, ma na-enye anyị ohere igosipụta iguzosi ike n’ihe anyị nye Chineke. Ọ bụ ezie na anyị adịghị abanye n’ihe ize ndụ n’ụzọ na-enweghị isi, ọ dịghị mgbe anyị ga-eme ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị iji zere mkpagbu.—1 Pita 3:16.

Ọkà okwu nke abụọ n’okwu a ọtụtụ ndị kwuru tụlere ajụjụ ndị metụtara nnọpụiche. Ndị Kraịst oge mbụ abụghị ndị na-emegide ụdị agha nile, ma ha ghọtara na onye bụ́ isi ha kwesịrị iguzosi ike n’ihe nye bụ Chineke. N’otu aka ahụ taa, Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike n’ụkpụrụ bụ́: “Unu abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 15:19) Ebe ọ bụ na ule ndị metụtara nnọpụiche pụrụ ibilite ngwa ngwa, ezinụlọ dị iche iche kwesịrị iwepụta oge iji tụleghachi ụkpụrụ nduzi Bible nyere banyere okwu a. Dị ka okwu nke atọ n’isiokwu a ọtụtụ ndị kwuru mere ka ọ pụta ìhè, nzube Setan abụchaghị igbu anyị, kama ọ bụ ịmanye anyị ịghọ ndị na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi. Site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ịkwa emo, nrụgide ime omume rụrụ arụ, obi mgbawa, na ọrịa, anyị na-ewetara Jehova otuto.

Agbamume ahụ na-ekpo ọkụ bụ́ “Bịaruo Jehova Nso” bụ isiokwu nke okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ. Ịghọta àgwà ndị bụ́ isi nke Jehova na-adọta anyị nso n’ebe ọ nọ. Ọ na-eji ike ya na-enweghị nsọtụ echebe ndị ya, karịsịa n’ụzọ ime mmụọ. Ikpe ziri ezi ya adịghị aka ike kama ọ na-akpali ya ime ka onye ọ bụla na-eme ezi omume nwee ike inweta ndụ agwụghị agwụ. A na-ahụ amamihe Chineke n’ụzọ o si jiri ụmụ mmadụ na-ezughị okè mee ihe n’ide Bible. Nke kasị adọta anyị n’ebe ọ nọ bụ ịhụnanya ya, bụ́ nke kpaliri ya ime ndokwa maka ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’aka Jizọs Kraịst. (Jọn 3:16) Ọkà okwu ahụ ji mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ ahụ na-ekpo obi ọkụ bụ́ Bịaruo Jehova Nso mechie.

Ụbọchị nke Atọ Lekwasịrị Anya n’Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ọrụ

Isiokwu ụbọchị nke atọ nke mgbakọ ahụ bụ “Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ọrụ.” (Taịtọs 2:14) Usoro ihe omume nke ụtụtụ ahụ malitere n’ụzọ dị mma site ná ntụle otu ezinụlọ tụlere ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, okwu bụ́ “Ọ̀ Bụ n’Ebe Jehova Nọ Ka Obi Ike Gị Dị?” sochiri. Mba dị iche iche enwewo obi ike n’ihe na-ekwesịghị site n’ịdabere n’amamihe na ike nke ha. Otú ọ dị, n’ụzọ dị iche, ndị ohu Jehova ji obi ike na ọṅụ na-adabere n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị ọdachi dị iche iche.—Abụ Ọma 46:1-3, 7-11.

Okwu isiokwu ya bụ “Ndị Ntorobịa—Burunụ Nzukọ Jehova n’Uche Mgbe Unu Na-eme Atụmatụ Maka Ọdịnihu” tụlere ajụjụ a: Olee otú onye na-eto eto ga-esi enweta ihe kasị mma n’ezie ná ndụ? A dịghị enweta ya site n’ịchụ ego, ihe onwunwe, na ùgwù. Onye Okike anyị ji ịhụnanya agba ndị ntorobịa ume icheta ya mgbe ha ka na-eto eto. Ọkà okwu ahụ gbara ụfọdụ ndị tinyesiri mgbalị ike n’ozi Ndị Kraịst n’oge ha bụ ndị ntorobịa ajụjụ ọnụ, anyị pụkwara ịhụ ọṅụ ha na-enwe. Leekwa ka o si bụrụ ihe bara uru inweta traktị ọhụrụ bụ́, Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee?, bụ́ nke e wepụtara iji nyere Ndịàmà na-eto eto aka ịtọ ntọala maka ọdịnihu ebighị ebi ná nzukọ Jehova!

Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe nkiri Bible na-adọrọ nnọọ mmasị nke isiokwu ya bụ “Guzosie Ike n’Oge Ihe Isi Ike,” sochiri. O nyere nkọwa dị mkpirikpi banyere ọrụ were ogologo oge Jeremaịa rụrụ site n’oge ọ bụ nwa okorobịa ruo n’oge mbibi Jeruselem, bụ́ nke o jiworo ịnụ ọkụ n’obi buo amụma banyere ya. Ọ dị Jeremaịa ka o rughị eru maka ọrụ e kenyere ya, ma ọ rụzuru ya n’agbanyeghị mmegide, Jehova napụtakwara ya.—Jeremaịa 1:8, 18, 19.

Okwu bụ́ “Mee Ka Jeremaịa—Kpọsaa Okwu Chineke n’Atụghị Egwu,” sochiri ihe nkiri ahụ. Ndị nkwusa Alaeze nke oge a na-abụkarị ndị a na-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu na okwu ọjọọ banyere ha. (Abụ Ọma 109:1-3) Otú ọ dị, dị ka Jeremaịa, anyị pụrụ ịnagide nkụda mmụọ site n’ime ka Okwu Chineke na-atọ anyị ụtọ. Obi sikwara anyị ike na ndị na-alụso anyị ọgụ ga-akụ afọ n’ala.

N’ezie, okwu ihu ọha ahụ isiokwu ya bụ “Ọnọdụ Ụwa A Na-agbanwe Agbanwe” bịara n’ezi oge. E jiriwo mgbanwe ndị dị ịrịba ama mara oge anyị. Bible buru amụma na ọnọdụ ndị dị otú ahụ, gụnyere mkpu “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi,” ga-eduga n’ụbọchị ikpe Chineke nke na-akpali egwu. (1 Ndị Tesalonaịka 5:3) Ọ ga-eweta mgbanwe ndị dị egwu—ọgwụgwụ nke agha, mpụ, ihe ike, na ọbụna ọrịa nile. Ya mere, kama ịtụkwasị obi n’usoro ihe a, ugbu a bụ oge ịchụso nsọpụrụ Chineke ma nọgide na-eme omume dị ọcha.

Mgbe a chịkọtasịrị ihe ọmụmụ Ụlọ Nche dịịrị izu ahụ, okwu ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, nke isiokwu ya bụ “Baanụ Ụba n’Ezi Ọrụ Dị Ka Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi,” sochiri. Ọkà okwu ahụ rụtụrụ aka n’otú usoro ihe omume ahụ siworo kpalie anyị n’ụzọ ime mmụọ ma gbaa anyị ume ịdabere n’ebe Jehova nọ. Ná mmechi, a gbara anyị ume ịbụ ndị nkwusa Alaeze Chineke na-anụ ọkụ n’obi, dị ọcha, ma na-ahụ n’anya.—1 Pita 2:12.

N’inwe mmụọ yiri nke ndị ohu Jehova n’oge Nehemaịa, anyị lọtara n’ebe obibi anyị n’ezie na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ngọzi ime mmụọ ndị anyị nwetara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi.” (Nehemaịa 8:12) Ọ̀ bụ na mgbakọ a na-akpali akpali emebeghị ka i nwee nnọọ ọṅụ na mkpebi siri ike ịnọgidesi ike dị ka onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Akwụkwọ Ọhụrụ Na-enye Aka n’Ịmụ Ihe!

Ná mmechi nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ, obi dị ndị bịaranụ ụtọ n’ihi mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. A haziri ya ka a na-amụrụ ya ndị mụchaworo akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ ga-eme ka okwukwe nke ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” sikwuo ike.—Ọrụ 13:48.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe osise dị n’ihu akwụkwọ: Foto U.S. Navy

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ihe Na-enye Aka n’Ịbịarukwu Chineke Nso

Ọkà okwu ikpeazụ n’ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ mara ọkwa mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. O nwere nkebi anọ bụ́ isi, otu bụ maka otu n’ime àgwà ndị bụ́ isi nke Jehova—ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya. Nkebi nke ọ bụla nke akwụkwọ ahụ nwere otu isiakwụkwọ nke na-egosi otú Jizọs Kraịst si gosipụta àgwà Chineke n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè. Nzube bụ́ isi nke akwụkwọ ọhụrụ a bụ inyere anyị na ndị anyị na-amụrụ Bible aka iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chikwuru anya ma sikwuo ike.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]

Nduzi Ime Mmụọ Maka Ndị Na-eto Eto

Ihe pụrụ iche n’ụbọchị nke atọ nke mgbakọ ahụ bụ mwepụta e wepụtara traktị pụrụ iche isiokwu ya bụ Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? N’ịbụ nke a haziri iji nyere Ndịàmà na-eto eto aka ime mkpebi ndị ziri ezi banyere ọdịnihu ha, traktị ọhụrụ a na-enye nduzi ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ banyere ịbanye n’ọrụ na-adịru mgbe ebighị ebi n’ozi Jehova.