Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Okwukwe Gị Siri Ike?

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Okwukwe Gị Siri Ike?

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Okwukwe Gị Siri Ike?

“Ọ bụ n’okwukwe unu ka unu na-eguzo.”—2 NDỊ KỌRINT 1:24.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nwee okwukwe, oleekwa otú ọ pụrụ isi sikwuo ike?

NDỊ ohu Jehova maara na ha aghaghị inwe okwukwe. N’ezie, ‘ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ (Ndị Hibru 11:6) N’ihi ya, anyị na-eji amamihe ekpe ekpere maka mmụọ nsọ nakwa maka okwukwe, bụ́ nke so ná mkpụrụ ya mara mma. (Luk 11:13; Ndị Galeshia 5:22, 23) Iṅomi okwukwe nke ndị kwere ekwe ibe anyị pụkwara iwusi àgwà a ike n’ime anyị.—2 Timoti 1:5; Ndị Hibru 13:7.

2 Okwukwe anyị ga-esikwu ike ma ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike na-agbaso ụzọ ndụ nke Okwu Chineke setịpụụrụ Ndị Kraịst nile. Anyị pụrụ inwekwu okwukwe site n’ịgụ Bible kwa ụbọchị na site n’iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ site n’enyemaka nke akwụkwọ ndị “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” na-enye. (Luk 12:42-44; Joshua 1:7, 8) Site n’ịnọ ya mgbe nile ná nzukọ na mgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst, okwukwe ibe anyị na-agba anyị ume. (Ndị Rom 1:11, 12; Ndị Hibru 10:24, 25) A na-ewusikwa okwukwe anyị ike mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ okwu n’ozi.—Abụ Ọma 145:10-13; Ndị Rom 10:11-15.

3. N’ihe banyere okwukwe, enyemaka dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’aka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ahụ n’anya?

3 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ahụ n’anya na-enyere anyị aka iwulite okwukwe anyị site n’inye anyị ndụmọdụ na agbamume ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ha nwere mmụọ dị ka nke Pọl onyeozi, bụ́ onye gwara ndị Kọrint, sị: “Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu, n’ihi na ọ bụ n’okwukwe unu ka unu na-eguzo.” (2 Ndị Kọrint 1:23, 24) Nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “Anyị na unu na-arụkọ ọrụ iji mee ka unu nwee ọṅụ, n’ihi na okwukwe unu siri ike.” (Contemporary English Version) Onye ezi omume na-esi n’okwukwe dị ndụ. N’ezie, ọ dịghị onye ọzọ ga-egosipụta okwukwe n’aha anyị ma ọ bụ mee ka anyị bụrụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’akụkụ a, ‘anyị aghaghị ibu ibu nke aka anyị.’—Ndị Galeshia 3:11; 6:5.

4. Olee otú ihe ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ banyere ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ isi nyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sikwuo ike?

4 Ihe ndekọ banyere ndị nwere okwukwe jupụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Anyị pụrụ ịma ihe ndị dị ịrịba ama ha mere, ma gịnị banyere okwukwe ha gosipụtara kwa ụbọchị, ikekwe n’oge nile ha dịrị ogologo ndụ? Ịtụgharị uche ugbu a n’otú ha si gosipụta àgwà a n’ọnọdụ ndị yiri nke anyị pụrụ inye aka ime ka okwukwe anyị sikwuo ike.

Okwukwe Na-enye Anyị Obi Ike

5. Olee ihe àmà Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na okwukwe na-ewusi anyị ike iji obi ike na-ekwusa okwu Chineke?

5 Okwukwe na-ewusi anyị ike iji obi ike na-ekwusa okwu Chineke. Ịnọk ji obi ike buo amụma banyere mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe. “Lee!” ka ọ sịrị, “Jehova bịara ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya, ime ihe e kpere n’ikpe megide ha nile, na ịma ndị nile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume nile ha nke asọpụrụghị Chineke bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, na banyere ihe nile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” (Jud 14, 15) Mgbe ndị iro Ịnọk bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nụrụ okwu ndị ahụ, ha chọrọ igbu ya. N’agbanyeghị nke ahụ, o ji anyaike kwuo okwu n’okwukwe, Chineke ‘weere ya’ site n’ime ka ọ daa n’ụra ọnwụ, ikekwe n’ekweghị ka ọ nụ ụfụ ya. (Jenesis 5:24; Ndị Hibru 11:5) A dịghị arụrụ anyị ọrụ ebube ndị dị otú ahụ, ma Jehova na-aza ekpere anyị ka anyị wee nwee ike iji okwukwe na obi ike na-ekwusa okwu ya.—Ọrụ 4:24-31.

6. Olee otú okwukwe na obi ike nke Chineke na-enye si nyere Noa aka?

6 Site n’okwukwe, Noa ‘wuru ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya.’ (Ndị Hibru 11:7; Jenesis 6:13-22) Noa bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume” nke ji obi ike kwusaa ịdọ aka ná ntị Chineke gwa ndị ha na ya biri ndụ. (2 Pita 2:5) Ọ ghaghị ịbụwo na ha kwara ozi ya banyere Iju Mmiri na-abịanụ emo, ọbụna dị ka ụfọdụ na-akwa emo mgbe anyị nyere ha ihe àmà Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na a gaje ibibi usoro ihe dị ugbu a n’isi nso. (2 Pita 3:3-12) Otú ọ dị, dị ka Ịnọk na Noa, anyị pụrụ izi ozi dị otú ahụ n’ihi okwukwe na obi ike nke Chineke na-enye anyị.

Okwukwe Na-eme Ka Anyị Na-enwe Ndidi

7. Olee otú Ebreham na ndị ọzọ si gosipụta okwukwe na ndidi?

7 Okwukwe na ndidi dị anyị mkpa, karịsịa ka anyị na-echere ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. Onye so ná ndị ‘ga-esite n’okwukwe na ndidi keta nkwa ndị e kwere’ bụ nna ochie na-atụ egwu Chineke bụ́ Ebreham. (Ndị Hibru 6:11, 12) Site n’okwukwe, ọ hapụrụ obodo Ua na uru nile a na-erite na ya, ma ghọọ ọbịa n’ala ọzọ nke Chineke kwere ya ná nkwa. Aịzik na Jekọb bụcha ndị nketa nke otu nkwa ahụ. Otú ọ dị, “ndị a nile nwụrụ n’okwukwe, ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ.” Site n’okwukwe, ha ‘chụsoro ebe ka mma, ya bụ, nke dịịrị eluigwe.’ N’ihi ya, Chineke ‘akwadebeworo ha otu obodo.’ (Ndị Hibru 11:8-16) Ee, Ebreham, Aịzik, na Jekọb—na ndị nwunye ha na-atụ egwu Chineke—ji ndidi chere Alaeze eluigwe nke Chineke, bụ́ nke a ga-anọ na ya kpọlite ha n’ọnwụ ịdị ndụ n’elu ala.

8. N’agbanyeghị gịnị ka Ebreham, Aịzik, na Jekọb gosipụtara ndidi na okwukwe?

8 Ebreham, Aịzik, na Jekọb akwụsịghị inwe okwukwe. Ala Nkwa ahụ aghọghị nke ha n’oge ha, ha ahụghịkwa ka mba nile gọziri onwe ha site ná mkpụrụ Ebreham. (Jenesis 15:5-7; 22:15-18) N’agbanyeghị na ‘obodo ahụ nke Chineke wuru’ agaghị amalite ịdị adị ruo mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, ndị ikom a nọgidere na-egosipụta okwukwe na ndidi n’oge ndụ ha nile. N’ezie, anyị kwesịrị ime otu ihe ahụ ugbu a Alaeze Mezaịa ahụ maliteworo ịdị adị n’eluigwe.—Abụ Ọma 42:5, 11; 43:5.

Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Kasị Elu

9. Njikọ dị aṅaa ka okwukwe na inwe ihe mgbaru ọsọ na nzube nwere?

9 Ndị nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi adịghị mgbe ha ṅomiri ụzọ ndụ rụrụ arụ nke ndị Kenan, n’ihi na ha nwere ihe mgbaru ọsọ na nzube ndị ka elu. N’ụzọ yiri nke ahụ, okwukwe na-eme ka anyị nwee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị na-eme ka anyị nwee ike izere imikpu onwe anyị n’ime ụwa nke na-atọgbọ n’aka ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu.—1 Jọn 2:15-17; 5:19.

10. Olee otú anyị si mara na Josef chụsoro ihe mgbaru ọsọ dị nnọọ elu karịa ịbụ onye a ma ama n’ụwa?

10 Site ná nduzi Chineke, nwa Jekọb bụ́ Josef jere ozi dị ka onye na-elekọta ihe oriri n’Ijipt, ma ọ bụghị ihe mgbaru ọsọ ya ịbụ oké mmadụ n’ụwa a. N’ihi okwukwe nke Josef dị afọ 110 nwere ná mmezu nke nkwa Jehova, ọ gwara ụmụnne ya, sị: “Mụ onwe m gaje ịnwụ: ma Chineke ga-eleta unu n’ezie, mee ka unu si n’ala nke a rịgoruo ala ahụ nke Ọ ṅụụrụ Ebreham na Aịzik iyi banyere ya.” Josef rịọrọ ka e lie ya n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe ọ nwụrụ, a gbasiri ya ma tinye ya n’igbe ozu n’Ijipt. Ma mgbe a gbapụtara ụmụ Izrel site n’agbụ Ijipt, Mozis onye amụma mere ka e weta ọkpụkpụ Josef maka ili ya n’Ala Nkwa ahụ. (Jenesis 50:22-26; Ọpụpụ 13:19) Okwukwe yiri nke Josef kwesịrị ịkpali anyị ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị dị elu karịa ịbụ onye a ma ama n’ụwa.—1 Ndị Kọrint 7:29-31.

11. N’ụzọ dị aṅaa ka Mozis si nye ihe àmà na ya nwere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ?

11 Mozis ‘họọrọ ịbụ onye a na-emeso ya na ndị Chineke n’ụzọ ọjọọ kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge’ dị ka onye gụrụ akwụkwọ nke ọma nke sitere n’ezinụlọ eze Ijipt. (Ndị Hibru 11:23-26; Ọrụ 7:20-22) Nke a mere ka ọ ghara inweta ihe ùgwù ụwa nakwa ma eleghị anya ịbụ onye e ji igbe ozu a chọrọ oké mma lie n’ebe a ma ama n’Ijipt. Ma olee uru nke ahụ gaara aba ma e jiri ya tụnyere ihe ùgwù nke ịbụ “onye nke Chineke,” onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, onye amụma Jehova, na onye so dee Bible? (Ezra 3:2) Ọ̀ bụ mbuli n’ọkwá dị elu ka ị na-achọ, ka okwukwe ò mewo ka i nwee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị ka elu?

Okwukwe Na-eme Ka E Bie Ndụ Na-eju Afọ

12. Olee mmetụta okwukwe nwere ná ndụ Rehab?

12 Ọ bụghị nanị ihe mgbaru ọsọ ndị kasị elu ka okwukwe na-eme ka ndị mmadụ nwee kamakwa ọ na-eme ka ha na-ebi ndụ na-eju afọ. Ọ ghaghị ịbụ na Rehab nke Jeriko chọpụtara na ndụ ya dị ka akwụna enwechaghị nzube. Ma, lee ka nke ahụ si gbanwee mgbe o gosipụtara okwukwe! ‘E sitere n’ọrụ nke okwukwe kpọọ ya onye ezi omume, mgbe o jisịrị omume ile ọbịa nabata ndị Izrel ahụ na-eje ozi ma zipụ ha site n’ụzọ dị iche,’ nke mere ka ha gbanahụ ndị iro ha bụ́ ndị Kenan. (Jems 2:24-26) N’ịnakwere Jehova dị ka ezi Chineke ahụ, Rehab gosipụtakwara okwukwe site n’ịgbahapụ ụzọ ndụ ya nke ịgba akwụna. (Joshua 2:9-11; Ndị Hibru 11:30, 31) Ọ lụrụ ohu Jehova, ọ bụghị onye Kenan na-ekweghị ekwe. (Deuterọnọmi 7:3, 4; 1 Ndị Kọrint 7:39) Rehab nwere ihe ùgwù dị ebube nke ịghọ nne ochie nke Mezaịa ahụ. (1 Ihe E Mere 2:3-15; Rut 4:20-22; Matiu 1:5, 6) Dị ka ndị ọzọ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha gbahapụworo ndụ rụrụ arụ, ọ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ọzọ—mbilite n’ọnwụ banye ná ndụ na paradaịs elu ala.

13. Olee otú Devid si mee mmehie n’ihe banyere Bat-sheba, àgwà dịkwa aṅaa ka o gosipụtara?

13 Mgbe ọ hapụsịrị ndụ nke mmehie ya, ihe àmà gosiri na Rehab nọgidere na-ebi ndụ ziri ezi. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị rarawooro onwe ha nye Chineke ruo ogologo oge emewo mmehie dị oké njọ. Eze Devid sooro Bat-sheba kwaa iko, mee ka e gbuo di ya n’agha, ma mesịa kpọrọ ya ịbụ nwunye ya. (2 Samuel 11:1-27) N’ichegharị site n’igosi mwute miri emi, Devid rịọrọ Jehova, sị: “Anarakwala m Mmụọ Nsọ Gị.” Chineke anaraghị Devid mmụọ ya. O nwere okwukwe na Jehova, n’ihi ebere ya, agaghị eleda “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa” n’ihi mmehie anya. (Abụ Ọma 51:11, 17; 103:10-14) N’ihi okwukwe ha, e ji ihe ùgwù nke iso ná ndị nne na nna ochie nke Mezaịa ahụ kwụghachi Devid na Bat-sheba ụgwọ.—1 Ihe E Mere 3:5; Matiu 1:6, 16; Luk 3:23, 31.

Okwukwe nke E Ji Mmesi Obi Ike Mee Ka O Sikwuo Ike

14. Olee ihe na-emesi obi ike nke Gidiọn nwetara, oleekwa otú ihe ndekọ a pụrụ isi metụta okwukwe anyị?

14 Ọ bụ eziokwu na anyị si n’okwukwe na-ejegharị, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa mgbe ụfọdụ ịbụ ndị e mesiri obi ike na Chineke ga-enyere anyị aka. Otú ahụ ka ọ dị Onyeikpe Gidiọn, bụ́ otu n’ime ndị “sitere n’okwukwe merie alaeze dị iche iche n’ọgụ.” (Ndị Hibru 11:32, 33) Mgbe ndị Midian na ndị ha na ha jikọrọ aka wakporo Izrel, mmụọ Chineke dakwasịrị Gidiọn. N’ịchọ inweta ihe ga-eme ka obi sie ya ike na Jehova nọnyeere ya, o mere atụmatụ ime nnwale, na-eji ajị anụ e biri ebi nke a ghasara n’ebe nzọcha ọka site n’abalị ruo chi ọbụbọ, mee ihe. Ná nnwale nke mbụ, igirigi dara nanị n’ajị anụ ahụ, ebe ala kpọrọ nkụ. Ná nnwale nke abụọ, igirigi dara n’ala ebe ajị anụ kpọrọ nkụ. N’ịbụ onye ihe ndị a na-emesi obi ike wusiri ike, Gidiọn dị akọ ji okwukwe mee ihe ma merie ndị iro ndị Izrel. (Ndị Ikpe 6:33-40; 7:19-25) Ọ bụrụ na anyị achọọ ihe mmesi obi ike mgbe anyị na-achọ ime mkpebi, ọ pụtaghị na anyị enweghị okwukwe. Anyị na-egosipụta okwukwe n’ezie site n’ịtụle Bible na akwụkwọ Ndị Kraịst dị iche iche nakwa site n’ikpe ekpere maka nduzi nke mmụọ nsọ mgbe anyị na-eme mkpebi.—Ndị Rom 8:26, 27.

15. Olee otú ịtụgharị uche n’okwukwe Berak pụrụ isi nyere anyị aka?

15 E ji mmesi obi ike n’ụdị agbamume wusie okwukwe nke Onyeikpe Berak ike. Onye amụma nwanyị bụ́ Debọra gbara ya ume ibute ụzọ n’ịnapụta ndị Izrel ná mmegbu sitere n’aka Eze Jabin nke Kenan. N’ihi okwukwe ya nakwa n’ihi ịbụ onye e mesiri obi ike na Chineke ga-akwado ya, Berak duuru ndị ikom 10,000 na-enwechaghị ngwá agha zuru ezu ma merie usuu ndị agha Jabin nke buru ibu karịa bụ́ nke Sisera bụ ọchịagha ya. E ji abụ na-akpali akpali nke Debọra na Berak rọrọ ṅụrịa ọṅụ maka mmeri ahụ. (Ndị Ikpe 4:1–5:31) Debọra gbara Berak ume ịrụ ọrụ dị ka onye ndú Izrel nke Chineke họpụtara, o sokwa ná ndị ohu Jehova bụ́ ndị sitere n’okwukwe “chụlaga usuu ndị agha ndị mba ọzọ.” (Ndị Hibru 11:34) Ịtụgharị uche n’otú Chineke si gọzie Berak n’ihi iji okwukwe mee ihe pụrụ nnọọ ịkpali anyị ime ihe ma ọ bụrụ na anyị na-alatụ azụ n’ịrụzu ọrụ siri ike e nyere anyị n’ozi Jehova.

Okwukwe Na-akwalite Udo

16. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Ebreham setịpụrụ n’iso Lọt mee udo?

16 Dị nnọọ ka okwukwe si enyere anyị aka ịrụzu ọrụ siri ike e kenyere anyị n’ozi Chineke, otú ahụ ka o si akwalite udo na ọnọdụ dị jụụ. Ebreham mere agadi kwere ka nwa nwanne ya bụ́ Lọt nke ọ tọrọ họrọ ala ndị kasị mma ụmụ anụmanụ na-ata nri na ha mgbe ndị na-azụrụ ha anụ ụlọ sere okwu, ya adịkwa mkpa ka ha kewaa. (Jenesis 13:7-12) Ọ ghaghị ịbụwo na Ebreham ji okwukwe kpee ekpere maka enyemaka Chineke n’idozi nsogbu a. Kama ibute ọdịmma nke ya ụzọ, o doziri ihe n’udo. Ọ bụrụ na anyị na nwanna anyị bụ́ Onye Kraịst enwee esemokwu, ka anyị jiri okwukwe kpee ekpere ma “chọọ udo,” na-eburu n’uche ihe nlereanya Ebreham nke iji ịhụnanya na-echebara ndị ọzọ echiche.—1 Pita 3:10-12.

17. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na e doziri esemokwu pụtara ìhè nke dịrị n’etiti Pọl, Banabas, na Mak n’udo?

17 Tụlee otú iji okwukwe na-etinye ụkpụrụ Ndị Kraịst n’ọrụ pụrụ isi nyere anyị aka ịkwalite udo. Mgbe Pọl na-achọ ịmalite njem ozi ala ọzọ nke abụọ ya, Banabas nakweere aro ọ tụrụ ka ha jee letaghachi ọgbakọ ndị dị na Saịprọs nakwa n’Asia Minor. Otú ọ dị, Banabas chọrọ ịkpọrọ nwa nwanne ya bụ́ Mak. Pọl jụrụ n’ihi na Mak hapụrụ ha na Pamfilia. E nwere “oké ntiwapụ nke iwe,” esemokwu a kpatakwara nkewa. Banabas kpọọrọ Mak gawa Saịprọs, ebe Pọl họọrọ Saịlas dị ka onye ibe ya ma ‘gabiga na Siria na Silishia, na-eme ka ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ dị ike.’ (Ọrụ 15:36-41) Ka oge na-aga, ha doziri esemokwu ahụ pụtara ìhè, n’ihi na Mak bịara soro Pọl nọrọ na Rom, onyeozi ahụ kwukwara okwu ọma banyere ya. (Ndị Kọlọsi 4:10; Faịlimọn 23, 24) Mgbe Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka 65 O.A., ọ gwara Timoti, sị: “Kpọrọ Mak ka gị na ya bịa, n’ihi na ọ baara m uru maka ije ozi.” (2 Timoti 4:11) Ihe àmà na-egosi na Pọl tinyere mmekọrịta ya na Banabas na Mak n’ekpere o ji okwukwe kpee, nke a mekwara ka e nwee ọnọdụ dị jụụ nke e jikọtara ya na “udo nke Chineke.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

18. Gịnị ma eleghị anya mere n’ihe banyere Yuodia na Sintiki?

18 N’ezie, n’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè, “anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Nsogbu bilitere n’etiti ndị inyom abụọ bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị Pọl dere banyere ha, sị: “Ana m agba Yuodia ume, ana m agbakwa Sintiki ume inwe otu uche ahụ n’ime Onyenwe anyị. . . . Nọgide na-enyere ụmụ nwanyị ndị a aka bụ́ ndị mụ na ha gbakọworo mbọ ọnụ n’ozi ọma.” (Ndị Filipaị 4:1-3) O yikarịrị nnọọ ka ndị inyom a na-asọpụrụ Chineke hà doziri nsogbu ha n’udo site n’itinye ndụmọdụ ndị dị ka nke ahụ e dekọrọ na Matiu 5:23, 24 n’ọrụ. Iji okwukwe na-etinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ga-enye aka nke ukwuu n’ime ka udo dị taa.

Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Ike Ịtachi Obi

19. Olee ọnọdụ tara akpụ nke na-ebibighị okwukwe Aịzik na Rebeka ma ọlị?

19 Site n’okwukwe, anyị pụkwara ịtachi obi n’ahụhụ. Ikekwe anyị na-enwe nkụda mmụọ n’ihi na onye e mere baptizim nke si n’ezinụlọ anyị enupụworo Chineke isi site n’ịlụ onye na-ekweghị ekwe. (1 Ndị Kọrint 7:39) Aịzik na Rebeka tara ahụhụ n’ihi ọlụlụ nwa ha bụ́ Ịsọ lụrụ ndị inyom na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ndị nwunye ya bụ́ ndị Het bụụrụ ha “ihe mmụọ ilu”—ha bụ nnọọ ihe ilu nke ukwuu nke na Rebeka kwuru, sị: “Ike ndụ m agwụsịwo m site n’ihu ụmụ ndị inyom Het: ọ bụrụ na Jekọb lụrụ nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Het, dị ka ndị a, bụ́ site n’ụmụ ndị inyom ala nke a, uru gịnị ka ndụ baara m?” (Jenesis 26:34, 35; 27:46) N’agbanyeghị nke ahụ, ọnọdụ a tara akpụ adịghị mgbe o mebiri okwukwe Aịzik na Rebeka. Ka anyị nọgide na-enwe okwukwe siri ike ma ọ bụrụ na ọnọdụ ndị siri ike aghọọrọ anyị ihe ịma aka.

20. Ihe nlereanya dị aṅaa nke okwukwe ka Naomi na Rut setịpụụrụ anyị?

20 Agadi nwanyị di ya nwụrụ bụ́ Naomi bụ onye Juda nke maara na ụfọdụ ndị inyom Juda ga-amụta ụmụ ndị ga-abụ ndị nna ochie nke Mezaịa ahụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ụmụ ya ndị nwoke anwụwo n’amụtaghị ụmụ, ya onwe ya etofeekwa ịmụ nwa, ọ pụchaghị nnọọ ikwe omume na ezinụlọ ya ga-eso n’usoro ọmụmụ Mezaịa ahụ. Otú o sina dị, nwunye nwa ya nke di ya nwụrụ, bụ́ Rut, ghọrọ nwunye Boaz meworo agadi, mụọrọ ya nwa nwoke, ma ghọọ nne ochie nke Jizọs, bụ́ Mezaịa ahụ! (Jenesis 49:10, 33; Rut 1:3-5; 4:13-22; Matiu 1:1, 5) Okwukwe Naomi na Rut gabigara ahụhụ ma wetara ha ọṅụ. Anyị onwe anyị pụrụ inwe ọṅụ dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-enwe okwukwe n’agbanyeghị nsogbu.

21. Gịnị ka okwukwe na-emere anyị, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

21 Ọ bụ ezie na anyị apụghị ikwu ihe chi ga-abọtara anyị n’otu n’otu, site n’okwukwe, anyị pụrụ imeri ihe ịma aka ọ bụla. Okwukwe na-eme ka anyị na-enwe obi ike na ndidi. Ọ na-eme ka anyị nwee ihe mgbaru ọsọ ndị kasị elu ma na-ebi ndụ na-eju afọ. Okwukwe na-enwe mmetụta dị mma ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ma na-emeri ihe isi ike. N’ihi ya, ka anyị bụrụ “ụdị ndị na-enwe okwukwe gaa n’ichebe mkpụrụ obi ndụ.” (Ndị Hibru 10:39) Site n’ike Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, nakwa iji wetara ya otuto, ka anyị nọgide na-egosipụta okwukwe siri ike.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe àmà dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na okwukwe pụrụ ime ka anyị nwee obi ike?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na okwukwe na-eme ka anyị na-ebi ndụ na-eju afọ?

• Olee otú okwukwe si akwalite udo?

• Olee ihe àmà na-egosi na okwukwe na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ahụhụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Okwukwe mere ka Noa na Ịnọk nwee obi ike izisa ozi Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Okwukwe dị ka nke Mozis na-akpali anyị ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Mmesi e mesiri Berak, Debọra, na Gidịọn obi ike na Chineke ga-enyere ha aka wusiri okwukwe ha ike