Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Okwu Chineke Nọ n’Ọrụ

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Okwu Chineke Nọ n’Ọrụ

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Okwu Chineke Nọ n’Ọrụ

A SỊ na ị hụrụ Tony ná mmalite afọ ndị iri na ụma ya, ihe ị gaara ahụ bụ nwa okoro dị aghara ma na-eme ihe ike nke na-agakarị n’ụfọdụ n’ime ebe ndị dị njọ na Sydney, Australia. Ndị nọ n’òtù ndị omempụ so ná ndị enyi ya. Ha na-ekerekarị òkè n’itika ụlọ, n’ọgụ òtù ndị omempụ, na n’ịkwarịta mgbọ n’okporo ámá.

Tony malitere ise siga mgbe ọ dị afọ itoolu. Ka ọ na-erule afọ 14, ọ bịara na-esechi wii wii anya ma na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ka ọ na-erule oge ọ dị afọ 16, ịṅụ ọgwụ heroin bịara rie ya ahụ́, nke a dugakwara ya n’iji cocaine, LSD eme ihe—“n’ezie, ihe ọ bụla pụrụ ime ka anya kaa m,” dị ka Tony si kwuo ya. E mesịa, ya na òtù ndị omempụ abụọ a ma ama bịara banye ná nkwekọrịta azụmahịa ọgwụ ọjọọ. N’oge na-adịghị anya, a bịara mara Tony dị ka otu n’ime ndị ahịa ọgwụ ọjọọ a kasị tụkwasị obi n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ oké osimiri Australia.

Ihe Tony na-emefu kwa ụbọchị n’ise heroine na wii wii dị n’agbata $160 (U.S.) na $320 (U.S.). Ma ọ nọ na-efu ezinụlọ ya ihe karịrị nnọọ nke ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ndị omekome na-achọ ọgwụ ọjọọ na ego anyị nwere n’ụlọ anyị atụgidewo mụ na nwunye m egbe na mma n’ihu ọtụtụ mgbe.” Mgbe Tony gasịrị mkpọrọ ugboro atọ, ọ bịara nwee mmetụta nke ịbụ onye a manyere inyocha ebe ndụ ya chere ihu.

Ọ bụ ezie na ọ na-aga ụka, ọ dị Tony ka e kewapụrụ ya n’ebe Chineke nọ, bụ́ nke a sịrị na ọ na-akpọ ndị mmehie ọkụ na hel ruo mgbe ebighị ebi dị ka ntaramahụhụ. Otú ọ dị, mgbe mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova letara Tony, ọ tụrụ ya n’anya ịmata na Chineke adịghị otú ahụ. Obi dịkwa Tony ụtọ na ọ pụrụ n’ezie imezi ndụ ya ma nweta ngọzi n’aka Chineke. Ihe a Jizọs Kraịst kwuru kpaliri mmasị Tony: “Ihe nile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Karịsịa, okwu a na-agba ume metụrụ Tony n’ahụ́: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Tony echezie ihe ịma aka nke ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Bible ihu. Ọ na-ekwu, sị: “Ihe mbụ m kwụsịrị bụ ise siga, bụ́ ihe m na-emelighị mbụ, n’agbanyeghị na m gbalịrị ọtụtụ ugboro ime ya. Site n’ike Jehova, abịara m nwee ike ịkwụsị ise heroin na wii wii, bụ́ ọgwụ ọjọọ ndị maworo m ahụ́ ruo afọ 15 gara aga. Ọ dịtụbeghị mgbe m chere na ọ ga-ekwe m omume ịkwụsị ihe ndị a riworo m ahụ́.”

Kama ịtụ Chineke nke na-emekpa ndị mmadụ ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi na hel egwu—ozizi na-enweghị ebe ọ dị na Bible—Tony na nwunye ya bịara nakwere olileanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:10, 11; Ilu 2:21) “O were m oge dị ukwuu na ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ndụ m kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke,” ka Tony na-ekweta, “ma site ná ngọzi Jehova, enwere m ihe ịga nke ọma.”

Ee, onye a ọgwụ ọjọọ riburu ahụ́ ghọrọ Onye Kraịst. N’iwepụta oge na ihe onwunwe ha n’afọ ofufo, ya na nwunye ya ejiriwo ọtụtụ puku awa rụọ ọrụ ịkụzi Bible. Ha nọkwa na-agbasi mbọ ike ịzụlite ụmụ abụọ na-atụ egwu Chineke. E mere mgbanwe a dị ịrịba ama site n’ike nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ́ nke a na-apụghị iguzogide eguzogide. N’ezie, dị ka Pọl onyeozi na-ekwu, “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

N’agbanyeghị ọmarịcha ihe atụ dị otú a, ụfọdụ na-ekwu, n’ụzọ na-abụghị eziokwu, na ọrụ izi ihe dabeere na Bible nke Ndịàmà Jehova na-arụ na-etisasị ezinụlọ ma na-eme ka ndị ntorobịa ghara inwe ụkpụrụ omume dị mma. Ihe merenụ n’ọnọdụ Tony na-agbagha ebubo ahụ.

Dị ka Tony, ọtụtụ ndị amụtawo na a pụrụ ịkwụsị ihe ndị na-egbu egbu riri mmadụ ahụ́. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ na ịdabere n’ebe ọ nọ na n’ebe Okwu ya dị, nakwa site ná nkwado nke ndị enyi bụ́ Ndị Kraịst na-enwe mmetụta ma na-ahụ n’anya. Tony ji obi ụtọ na-ekwubi, sị: “Ahụwo m otú ụkpụrụ ndị dị na Bible siworo chebe ụmụ m. Ozizi Bible echebewo alụmdi na nwunye m. Ndị agbata obi m na-ehikwa ụra nke ọma karị n’ihi na abụghịzi m ihe iyi egwu nye ha.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

‘Site n’ike Jehova, abịara m nwee ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ nke riworo m ahụ́ ruo afọ 15’

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ụkpụrụ Bible Ndị Nọ n’Ọrụ

Ụkpụrụ Bible dịgasị iche iche enyeworo ọtụtụ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ aka ịkwụsị omume a maara ha ahụ́ bụ́ nke na-egbu egbu. Ụkpụrụ ndị na-esonụ so n’ime ha:

“Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Ịṅụ ọgwụ ọjọọ megidere iwu Chineke.

“Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ: ihe ọmụma nke Onye Nsọ bụkwa nghọta.” (Ilu 9:10) Ịsọpụrụ Jehova dabere n’ezi ihe ọmụma banyere ya na ụzọ ya enyeworo ọtụtụ ndị aka inwere onwe ha pụọ ná mmetụta nke ọgwụ ọjọọ.

“Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Mmadụ pụrụ ịkwụsị omume ndị maara ya ahụ́ bụ́ ndị na-egbu egbu site n’iji obi ya dum na-atụkwasị Chineke obi ma na-adabere n’ebe ọ nọ n’ụzọ zuru ezu.