Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Afọ Ojuju Na-apụ n’Anya

Ọrụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Afọ Ojuju Na-apụ n’Anya

Ọrụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Afọ Ojuju Na-apụ n’Anya

“IKIKE ịrụ ọrụ” bụ ihe ruuru mmadụ nile, dị ka Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, nke sitere n’aka òtù Mba Ndị Dị n’Otu, si kwuo. Otú ọ dị, a dịghị eji ihe ahụ ruuru mmadụ n’aka mgbe nile. Ọrụ ịbụ nke e ji n’aka na-adabere n’ọtụtụ ihe—site n’ọnọdụ akụ̀ na ụba nke mba ruo n’ọnọdụ azụmahịa zuru ụwa ọnụ. Otú o sina dị, mgbe a chụrụ ndị mmadụ n’ọrụ ma ọ bụ mgbe ọrụ ha nọ n’ihe ize ndụ, ihe na-esochikarị ya na-abụ ime ngagharị iwe, ọgba aghara, na ịgba abụbọ ọrụ. Ọ bụ mba ole na ole bụ ndị na-enweghị nsogbu a. Otu onye edemede kwuru na ọbụna okwu ahụ bụ́ “ọrụ” “bụ, dị ka ọ nọworo na-abụ mgbe nile, okwu pụrụ ịkpasu iwe.”

Ọrụ dị anyị mkpa n’ihi ọtụtụ ihe. E wezụga ime ka anyị na-akpata ego, ọ na-enye aka eme ka anyị nwee ọnọdụ uche na nke mmetụta uche dị mma. Ọrụ na-emeju ọchịchọ mmadụ nwere ịbụ onye so n’ọha mmadụ nke na-arụpụta ihe na ịbụ onye nwere nzube ná ndụ. Ọ na-emekwa ka anyị nwee ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ùgwù onwe onye. N’ihi ya, ọbụna ndị nwere ego buru ibu ha ga-eji na-egbo mkpa ha ma ọ bụ ndị rurula ịla ezumike nká na-ahọrọ ịnọgide na-arụ ọrụ. Ee, ọrụ dị oké mkpa nke na enweghị ya na-akpatakarị nsogbu siri ike n’etiti ndị mmadụ na ibe ha.

N’aka nke ọzọ, e nwere ndị nwere ọrụ ma na-enwe ọtụtụ nrụgide n’ebe ha na-arụ ọrụ nke na ha adịghị enwe afọ ojuju n’ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, n’ihi oké asọmpi a na-enwe n’azụmahịa taa, ọtụtụ ụlọ ọrụ egbubilatawo ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ha iji belata mmefu. Nke a pụrụ ịmụba ihe a na-achọ n’aka ndị ọrụ fọrọ afọ, bụ́ ndị nke a pụrụ ime ka ihe ha ga na-arụzi hikwuo nne.

Ọ pụrụ ịbụ na nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ, bụ́ nke kwesịrị ime ka ndụ dịkwuo mfe nakwa ka a na-arụpụtakwu ihe, emewo ka a na-enwekwu nrụgide n’ebe ọrụ. Dị ka ihe atụ, kọmputa, ígwè ozi fax, na Intanet na-eme ka o kwe ndị mmadụ omume iji ọrụ ha laa n’ebe obibi ha ma ọrụ gbasaa, si otú ahụ na-eme ka a ghara ịma ọdịiche dị n’etiti ebe obibi na ụlọ ọrụ. Ọ dị otu onye ọrụ ka ígwè pager na fon na-enweghị eriri nke ụlọ ọrụ ya ọ̀ bụ ụdọ a na-adịghị ahụ anya nke nna ya ukwu ji adọkpụgharị ya.

Ihe na-atụwanye ọtụtụ ndị katatụworo ahụ́ ụjọ n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na nke ebe ọrụ bụ́ ndị na-agbanwe ngwa ngwa bụ ịbụ ndị e lere anya dị ka ndị na-adịghịzi arụpụta ihe mgbe ha ka na-arụpụta ihe. Banyere nke a, onye bụbu Kọmishọna Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ bụ́ Chris Sidoti kwuru, sị: “O yiri ka ọ dị echiche e nwere nke bụ́ na ọ gwụla ma i rubeghị afọ 40, i nweghị ike iji kọmputa na nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ mee ihe.” N’ihi ya, ọtụtụ ezigbo ndị ọrụ, bụ́ ndị a gaara elewo anya n’oge gara aga dị ka ndị na-arụpụta ihe, bụzị ndị a na-ewere n’oge a dị ka ndị meworo agadi nke ukwuu ịrụpụta ihe. Lee ihe dị mwute nke ahụ bụ!

N’ụzọ kwere nghọta, àgwà a na-akpa n’ihe banyere ọrụ na iguzosi ike n’ihe nye ụlọ ọrụ adịla njọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. “Mgbe ụlọ ọrụ na-achụ ndị mmadụ n’ọrụ n’ihi ntakịrị ụsụ ahịa e nwere n’ụlọ ahịa ego, iguzosi ike n’ihe nye ụlọ ọrụ na-aghọ ihe mgbe ochie,” ka magazin French bụ́ Libération na-ekwu. “N’ezie, ị ghaghị ịrụ ọrụ, ma, ọ bụ maka onwe gị, ọ bụghị maka ụlọ ọrụ.”

N’agbanyeghị nsogbu ndị a na-arịwanye elu, ụmụ mmadụ nọgidere na-enwe mkpa bụ́ isi nke ịrụ ọrụ. Ya mere, n’oge anyị nke na-agbanwe ngwa ngwa, olee otú mmadụ pụrụ isi na-enwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ọrụ ego ma, n’otu oge ahụ, na-enwe mmetụta nke ịbụ onye ji ọrụ ya n’aka ma na-enwe afọ ojuju na ya?

[Foto dị na peeji nke 3]

Ọ pụrụ ịbụ na nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emewo ka a na-enwekwu nrụgide n’ebe ọrụ