Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Zụlite Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Ọrụ

Ụzọ Isi Zụlite Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Ọrụ

Ụzọ Isi Zụlite Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Ọrụ

N’ỤWA azụmahịa taa nke e nwere oké nrụgide na ya, nke e ji obi ọjọọ asọ mpi na ya, na nke a na-emepụta ngwá ahịa n’ụba na ya, ọ dịghị agụ ọtụtụ ndị agụụ ịga ọrụ kwa ụbọchị. Ma, anyị kwesịrị inwe obi ụtọ n’ọrụ anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na e kere anyị n’onyinyo Chineke—Chineke na-enwekwa obi ụtọ n’ọrụ ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke na-atụle ihe o meworo ná ngwụsị nke “ụbọchị” isii nke okike, ma ọ bụ ogologo oge, ‘ọ hụrụ ihe nile ọ bụla o mere, ma lee, ọ dị mma nke ukwuu,’ ka Jenesis 1:31 na-ekwu.

Obi abụọ adịghị ya na mmasị Jehova nwere n’ọrụ bụ otu n’ime ihe ndị mere e ji kpọọ ya “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Ya mere, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na ka anyị na-eṅomi ya, otú ahụ ka anyị na-enwekwu obi ụtọ? Banyere nke a, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie, onye bụ́ ọkà n’iwu ihe na n’ịhazi ihe dere, sị: “Mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”—Eklisiastis 3:13.

Ịzụlite echiche kwesịrị ekwesị ma dị mma banyere ọrụ n’ebe ọrụ nke ọnọdụ ya na-agbanwe ngwa ngwa taa pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ma Jehova Chineke na-agọzi ndị na-agbaso nduzi ịhụnanya ya. (Abụ Ọma 119:99, 100) Ndị dị otú ahụ na-aghọ ndị ọrụ e ji kpọrọ ihe na ndị a tụkwasịrị obi, n’ihi ya kwa, o yikarịghị ka a ga-achụ ha n’ọrụ. Ha na-amụtakwa ile ndụ ha na ọrụ ha anya na-adabere ọ bụghị nanị n’ihe ha na-akpata kama n’ihe ime mmụọ. Nke a na-eme ka ha nwee ike ime mkpebi ndị amamihe dị na ha ná ndụ na ịhụ na obi ụtọ na ahụ́ iru ala ha adịghị adabere nanị n’ọrụ ha ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ọnọdụ ya na-agbanwe agbanwe mgbe mgbe. (Matiu 6:31-33; 1 Ndị Kọrint 2:14, 15) Ọ na-enyere ha aka ịzụlite àgwà kwesịrị nnọọ ekwesị n’ihe banyere ọrụ.

Zụlite Àgwà Na-amasị Chineke n’Ihe Banyere Ọrụ

Ụfọdụ ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, na-edebe ọrụ ha n’ọnọdụ mbụ. Ndị ọzọ na-atụsi anya oge mgbasa ọrụ ike bụ́ mgbe ha ga-akwụsị ọrụ ma laa n’ụlọ. Olee echiche nke kwesịrị ekwesị? Bible na-aza, sị: “Ọ dị mma, bụ́ otu njụaka n’izu ike, karịa njụaka abụọ n’ịdọgbu onwe gị n’ọrụ na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:6) N’ezie, mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ gabiga ókè ma ọ bụ ịrụ ọrụ ruo oge gabigara ókè adịghị eme ka ọ rụpụta ihe—ọ bụ “ịchọ ijide ifufe” nke bụ́ ihe efu. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị pụrụ nnọọ imebi kpọmkwem ihe ndị na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ kasịnụ: mmekọrịta anyị na ezinụlọ na ndị enyi anyị, ọnọdụ ime mmụọ anyị, ahụ́ ike anyị, na ọbụna afọ ndụ anyị. (1 Timoti 6:9, 10) Echiche kwesịrị ekwesị bụ inwe afọ ojuju n’ihe onwunwe dị nta tinyere inwe nnọọ udo kama ịbụ onye njụaka ọrụ abụọ na-anyịgbu tinyere nsogbu na nhụsianya.

N’ịgba ume ka e nwee echiche kwesịrị ekwesị dị otú ahụ, Bible adịghị akwado ịdị umengwụ. (Ilu 20:4) Ịdị umengwụ na-eme ka mmadụ ghara inwe ùgwù onwe onye, na-emekwa ka ndị ọzọ ghara ịdị na-akwanyeziri anyị ùgwù. Nke ka njọ, ọ na-emebi mmekọrịta anyị na Chineke. Bible na-ekwu hoo haa na onye jụrụ ịrụ ọrụ ekwesịghị iri ihe ndị ọzọ rụtara. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10) Kama nke ahụ, o kwesịrị ịgbanwe omume ya ma rụsie ọrụ ike, si otú ahụ na-akpata ihe ya na ndị dabeere n’ebe ọ nọ ga-eri. Site n’ịrụsi ọrụ ike, ọ pụrụ ọbụna inyere ndị nọ ná mkpa n’ezie aka—omume Okwu Chineke na-agba ume inwe.—Ilu 21:25, 26; Ndị Efesọs 4:28.

Onye A Zụrụ Site na Nwata Iji Ọrụ Akpọrọ Ihe

Àgwà ọma n’ihe banyere ọrụ abụghị ihe a na-enwe na mberede; a na-amụta ya na nwata. N’ihi ya, Bible na-agba ndị nne na nna ume, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) E wezụga isetịpụ ihe nlereanya dị mma n’onwe ha dị ka ndị ọrụ, ndị nne na nna maara ihe na-amalite ịzụ ụmụ ha site n’inye ha ọrụ kwesịrị afọ ndụ ha n’ụlọ. Ọ bụ ezie na ọrụ ụfọdụ pụrụ ịkpasu ụmụaka iwe, ha ga-ewere onwe ha dị ka ndị e ji kpọrọ ihe n’ezinụlọ—karịsịa mgbe Mama na Papa jara ha mma maka ọrụ ha rụrụ nke ọma. N’ụzọ dị mwute, ọ na-afọ nke nta ka ụfọdụ ndị nne na nna na-emere ụmụ ha ihe nile, ikekwe n’ihi obiọma hiere ụzọ. Ọ ga-adị mma ka ndị nne na nna dị otú ahụ tụgharịa uche n’ihe dị n’Ilu 29:21, bụ́ nke na-asị: “Onye zụtọworo ohu ya site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu ahụ ga-aghọkwa [onye na-enweghị ekele, NW].”

Ndị nne na nna ji ihe kpọrọ ihe na-enwekwa mmasị miri emi n’agụmakwụkwọ nke ụmụ ha, na-agba ha ume ịmụta ihe na ịrụsi ọrụ ike mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ. Nke a pụrụ ịbara ndị na-eto eto uru n’ikpeazụ mgbe ha ga-amalite ịrụ ọrụ ego.

Jiri Amamihe Mee Ihe n’Ụdị Ọrụ Ị Na-ahọrọ

Ọ bụ ezie na Bible adịghị agwa anyị ụdị ọrụ anyị ga-arụ, ọ na-enye anyị ụkpụrụ nduzi ndị dị mma ka ọganihu ime mmụọ anyị, ozi anyị na-ejere Chineke, na ibu ọrụ ndị ọzọ dị mkpa ghara ịba n’ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Oge fọdụrụnụ dị ntakịrị. Site ugbu a gaa n’ihu, ka ndị . . . jikwa ụwa eme ihe dị ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’újú; n’ihi na ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (1 Ndị Kọrint 7:29-31) Ọ dịghị ihe ọ bụla na-adịgide adịgide ma ọ bụ kwụ chịm n’usoro ihe a. Itinye oge na ume anyị nile na ya dị ka iji ihe nile anyị kpatara ná ndụ na-ewu ụlọ n’ebe idei mmiri na-akpa ike. Lee ka nke ahụ si bụrụ imefu ego n’ụzọ iberibe!

Nsụgharị Bible ndị ọzọ sụgharịrị nkebi okwu ahụ bụ́ ‘adịghị eji ya eme ihe n’újú’ ịbụ “ịghara imikpu n’ime ya” na “ịghara itinye uche kpam kpam na ha.” (The Jerusalem Bible; Today’s English Version) Ndị maara ihe adịtụghị echefu eziokwu ahụ bụ́ na oge fọdụụrụ usoro ihe a “dị ntakịrị” nakwa na “imikpu” ma ọ bụ “itinye uche kpam kpam” na ya ga-edugarịrị ná mmechuihu na ịkwa ụta.—1 Jọn 2:15-17.

‘Chineke Agaghị Ahapụ Gị Ma Ọlị’

Jehova maara mkpa anyị nke ọma ọbụna karịa ka anyị maara. Ọ makwaara oge anyị nọ na ya ná mmezu nke nzube ya. N’ihi ya, ọ na-echetara anyị, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’” (Ndị Hibru 13:5) Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ ihe na-akasi obi! N’iṅomi nchegbu ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ya nọ, Jizọs ji akụkụ dị ukwuu nke Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama kụziere ndị na-eso ụzọ ya echiche kwesịrị ekwesị banyere ọrụ na ihe onwunwe.—Matiu 6:19-33.

Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịgbaso ozizi ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onyeisi ọrụ gwara otu Onyeàmà, bụ́ onye na-arụ ọrụ eletrik, ka ọ na-arụ ọrụ mgbe nile ma a gbasaa ọrụ, onye ahụ e were n’ọrụ jụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chọghị ka ọrụ ego ya metụta oge o ji eso ezinụlọ ya anọkọ na nke o ji ahụ maka ihe ime mmụọ. Ebe ọ bụ ezigbo onye ọrụ na nke a tụkwasịrị obi, onye ahụ were ya n’ọrụ nabatara ọchịchọ ya. N’ezie, ihe adịghị agacha otú ahụ mgbe nile, ọ pụkwara ịbụ na mmadụ aghaghị ịchọ ọrụ ọzọ iji wee nwee ike ịnọgide na-ebi ndụ n’ụzọ a haziri nke ọma. Otú o sina dị, ndị na-atụkwasị Jehova obi kpam kpam na-achọpụtakarị na àgwà ọma ha na àgwà ha n’ihe banyere ọrụ na-eme ka ndị were ha n’ọrụ nwee mmasị n’ebe ha nọ.—Ilu 3:5, 6.

Mgbe Ọrụ Nile Ga-abụ Ihe Na-akwụghachi Ụgwọ

N’usoro ihe dị ugbu a na-ezughị okè, ọrụ na atụmanya inweta ọrụ adịghị mgbe ọ ga-akwụsi ịbụ nke nwere nsogbu na nke a na-ejighị n’aka. N’ezie, ihe pụrụ ịkawanye njọ ka ụwa na-abụwanye nke na-akwụsighị ike, ọnọdụ akụ̀ na ụba abụrụkwa nke na-agbanwe agbanwe ma ọ bụ ọbụna nke na-ada ada. Ma ọnọdụ a ga-adịru nwa oge. N’isi nso, ọ dịghị onye ga-anọ n’enweghị ọrụ. Ọzọkwa, ọrụ nile ga-abụ ihe na-enye afọ ojuju ma na-akwụghachi ụgwọ n’ezie. Olee otú nke ahụ ga-esi ekwe omume? Gịnị ga-eweta mgbanwe dị otú ahụ?

Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa, Jehova zoro aka n’oge dị otú ahụ. “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” ka Jehova sịrị, “a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịsaịa 65:17) Ọ na-ekwu banyere ọchịchị ọhụrụ nke ọ ga-eweta, bụ́ nke a ga-enwe ọha mmadụ dị nnọọ ọhụrụ ma dị iche na ya.—Daniel 2:44.

Banyere otú ndị mmadụ ga-esi na-ebi ndụ ma na-arụ ọrụ mgbe ahụ, amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri: n’ihi na mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ, ha na ụmụ ga-esi n’ahụ ha pụta.”—Aịsaịa 65:21-23.

Lee aha mgbanwe a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta! Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ibi n’ụwa dị otú ahụ, bụ́ ebe ị ‘na-agaghị adọgbu onwe gị n’ọrụ n’efu’ kama ị ga-eri “mkpụrụ” nke si ná ndọgbu n’ọrụ gị n’újú? Otú ọ dị, rịba ama ndị ga-enweta ngọzi ndị dị otú ahụ: “Mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ.” Ị pụrụ iso ná ndị dị otú ahụ a “gọziworo” site n’ịmụta banyere Jehova ma na-emezu ihe ọ na-achọ. Jizọs sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka inweta ihe ọmụma ahụ na-enye ndụ site n’iji nlezianya na-amụ Okwu Chineke, bụ́ Bible.

[Igbe dị na peeji nke 6]

“NDỊ A NA-ACHỌSI IKE”

“Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-arụ ya dị ka ọ bụ nye Jehova, ọ bụghịkwa nye ndị mmadụ,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Kọlọsi 3:23) N’ụzọ doro anya, onye ụkpụrụ a na-achịkwa àgwà ya n’ihe banyere ọrụ ga-abụ onye a ga na-achọsi ike iwe n’ọrụ. N’ihi nke ahụ, n’akwụkwọ ya bụ́ How to Be Invisible, J. J. Luna nyere ndị na-achọ iwe mmadụ n’ọrụ ndụmọdụ ịchọ ezigbo ndị òtù nke okpukpe ụfọdụ, ma na-agbakwụnye, sị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Ndịàmà [Jehova] ka anyị na-emesịkarị kpebie iwe n’ọrụ.” Otu n’ime ihe ndị o kwuru kpatara ya bụ n’ihi na e ji nnọọ ime ihe n’eziokwu mara ha, nke ahụ mekwara ka ha bụrụ “ndị a na-achọsi ike” n’ọrụ dịgasị iche iche.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ime ka ọrụ, ihe ime mmụọ, na ntụrụndụ nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ha na-eweta afọ ojuju