Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha “Na-anụ” Ozi Alaeze ahụ na Brazil

Ha “Na-anụ” Ozi Alaeze ahụ na Brazil

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ha “Na-anụ” Ozi Alaeze ahụ na Brazil

IJI kwusaara ndị ntị chiri ozi ọma Alaeze ahụ, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova nọ na Brazil anakwerewo ihe ịma aka nke ịmụ Ụdị Asụsụ Ogbi nke Brazil. Mgbalị ha na-arụpụta ihe ndị magburu onwe ha, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.

Eva, * bụ́ nwanyị ntị chiri nke bi na São Paulo, malitere ịmụ asụsụ ogbi mgbe ọ kpọrọsịịrị ụmụ ya atọ gaa binyere otu nwoke ntị chiri. N’otu ụlọ ahịa, Eva na enyi ya nwoke zutere otu ìgwè nke Ndịàmà ntị chiri, a kpọkwara ha òkù ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha kweere, na-eche na ọ bụ nnọkọ ntụrụndụ.

Ebe Eva na-amachaghị asụsụ ndị ogbi nke ọma, ọ ghọtara nnọọ ihe dị nta n’ihe ndị e mere ná nzukọ ahụ. Mgbe e mesịrị, ụfọdụ Ndịàmà kpọrọ ya òkù n’ụlọ ha maka ntụrụndụ. N’iji ihe osise ndị dị na broshuọ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! mee ihe, ha kọwaara ya nkwa Chineke kwere banyere paradaịs elu ala n’ọdịnihu. Eva nwere mmasị n’ihe ọ mụtara ma malite ịgachi nzukọ anya.

N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, Eva hapụrụ enyi ya nwoke iji bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka ezinụlọ ya, ọ nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ, e mekwara ya baptizim na 1995. Ọnwa isii ka e mesịrị, Eva denyere aha ya dị ka ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa oge nile nke Alaeze ahụ. Kemgbe ahụ, o nyeworo mmadụ anọ ntị chiri aka ruo n’ókè nke ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim.

Ntị chiri Carlos site n’ọmụmụ. Ọ malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ime omume rụrụ arụ, na izu ohi site na nwata. N’ịbụ onye òtù ndị omempụ nke ha na ha dị n’iro yiri egwu, ọ gbagara São Paulo ma binyere João ruo nwa oge. Dị ka Carlos, ntị chiri João, ọ na-ebikwa ndụ rụrụ arụ.

Afọ ụfọdụ ka e mesịrị, Carlos nụrụ ozi Alaeze ahụ, bụ́ nke kpaliri ya ime ka ndụ ya dị ọcha na idebanye alụmdi na nwunye ya n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro. Mgbe Carlos mezuru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ, e mere ya baptizim ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova. Ka ọ dịgodị, Carlos amaghị na João anụwokwa ozi ọma ahụ ma meekwa mgbanwe ndị dị ukwuu ná ndụ ya. Mgbe João matara na Jehova adịghị anabata iji ihe oyiyi efe ofufe, ọ tụfuru ihe oyiyi “ndị senti” ndị o nwere. Mgbe João hapụsịrị ụzọ ndụ mbụ ya, e mekwara ya baptizim.

Lee ka Carlos na João si nwee oké ọṅụ mgbe ha zutere n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma hụ mgbanwe onye nke ọ bụla n’ime ha meworo! Ugbu a, ha abụọ bụ ndị isi ezinụlọ ji ihe kpọrọ ihe ma na-eje ozi dị ka ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi.

Na Brazil, e nwere ọgbakọ 30 na ìgwè 154 ji asụsụ ndị ogbi eme ihe ugbu a, na-enwe ihe karịrị ndị nkwusa 2,500, bụ́ ndị ihe dị ka mmadụ 1,500 n’ime ha bụ ndị ntị chiri. Ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke 2001 nke e mere na Brazil maka ndị ntị chiri, ihe karịrị mmadụ 3,000 gara ya, e mekwara mmadụ 36 baptizim. Site ná ngọzi Jehova, anyị na-enwe olileanya na ọtụtụ ndị ntị chiri ga-anabatakwu ozi Alaeze ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwewo aha ndị ahụ.