Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ezi Obi Eme Ihe Ọ Bụ Ihe A Na-achọsi Ike, Ma Ọ̀ Bụ Nanị Ihe A Chọrọ?

Iji Ezi Obi Eme Ihe Ọ Bụ Ihe A Na-achọsi Ike, Ma Ọ̀ Bụ Nanị Ihe A Chọrọ?

Iji Ezi Obi Eme Ihe Ọ Bụ Ihe A Na-achọsi Ike, Ma Ọ̀ Bụ Nanị Ihe A Chọrọ?

IJI ezi obi eme ihe ọ̀ bụ ihe a na-achọsi ike n’ezie ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara “iji ezi obi eme ihe” dị ka “mmadụ ịghara ime ka ọ bụ ihe ọ na-abụghị ma ọ bụ inwe ihu abụọ; ịkwụwa aka ọtọ; ikwu eziokwu; ịbụ ezigbo ya.” N’ụzọ doro anya, àgwà a bara uru n’ịkwalite ezi mmekọrịta nke mmadụ na ibe ya. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Na-eruberenụ ndị bụ́ nna ukwu unu n’echiche anụ ahụ́ isi n’ihe ọ bụla, ọ bụghị n’omume ije ozi ka e wee hụ unu, dị ka ndị na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, kama n’izi ezi nke obi, n’ịtụ egwu Jehova.” (Ndị Kọlọsi 3:22) Olee onye na-agaghị enwe mmasị ka onye ji ezi obi eme ihe otú ahụ na-arụrụ ya ọrụ? Taa, ndị ji ezi obi eme ihe pụrụ inwe ohere ka mma ịchọta ọrụ na ịnọgide n’ọrụ ha.

Otú ọ dị, ihe na-eme ka iji ezi obi eme ihe bụrụ ihe a na-achọsi ike bụ ụzọ o si emetụta mmekọrịta anyị na Chineke. Izrel oge ochie nwetara ngọzi Chineke mgbe ha ji nlezianya debe iwu ahụ ma mee ememe e dekọrọ na ya. Mgbe Pọl na-ekwu banyere ịdị ọcha nke ọgbakọ, ọ gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị na-eme ememe ahụ, ọ bụghị site n’iji ihe iko achịcha ochie, ọ bụghịkwa site n’iji ihe iko achịcha bụ́ ihe ọjọọ na ajọ omume, kama site n’iji achịcha na-ekoghị eko bụ́ izi ezi na eziokwu.” (1 Ndị Kọrint 5:8) Ka ofufe anyị wee bụrụ nke Chineke na-anakwere, ọ bụghị nanị na iji ezi obi eme ihe bụ ihe a na-achọsi ike kamakwa ọ bụ ihe dị oké mkpa. N’agbanyeghị nke ahụ, rịba ama na iji ezi obi eme ihe abụghị ebe okwu biri. A ghaghị ijikọta ya na eziokwu.

Ọ pụrụ ịbụ na ndị rụrụ Titanic na ndị njem nọ na ya ji ezi obi kwere na ụgbọ mmiri ahụ apụghị ikpu ekpu. Otú ọ dị, na njem mbụ o mere na 1912, ọ kpọkaara ọkpụrụkpụ ice, mmadụ 1,517 nwụkwara. Ụfọdụ ndị Juu narị afọ mbụ pụrụ ijiwo ezi obi kwere n’ụzọ ha si efe Chineke ofufe, ma ịnụ ọkụ n’obi ha ‘abụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.’ (Ndị Rom 10:2) Ka anyị wee bụrụ ndị Chineke na-anakwere, nkwenkwe anyị ji ezi obi kwere aghaghị ịdabere n’ezi ihe ọmụma. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka n’inyocha ihe iji ezi obi na eziokwu ejere Chineke ozi gụnyere.