Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpagbu Siri Ike Lere Ya Ule

Mkpagbu Siri Ike Lere Ya Ule

Akụkọ Ndụ

Mkpagbu Siri Ike Lere Ya Ule

DỊ KA PERICLES YANNOURIS SI KỌỌ

Udè nke dị n’ime ụlọ nga ahụ nke na-esi ísì ka ihe mara ebu mere ka oyi tụruo m n’ọkpụkpụ. Ka m nọ ọdụ n’ebe ahụ nanị m ma jiri nanị ntakịrị blanket dị fere fere kpuchie onwe m, m ka na-echeta otú ihu nwunye m na-akatabeghị ahụ́ dị ụbọchị abụọ tupu mgbe ahụ, mgbe ndị agha si n’ụlọ kpụrụ m na-apụ, hapụ ya na ụmụ anyị abụọ ahụ́ na-adịghị. Ka oge na-aga, nwunye m, bụ́ onye mụ na ya na-adịghị ekpe otu okpukpe, ziteere m otu ngwugwu na akwụkwọ ozi na-ekwu, sị: “Ana m ezitere gị bred ndị a, m na-enwekwa olileanya na ị ga-arịakwa ọrịa dị ka ụmụ gị na-arịa.” M̀ ga-adị ndụ laghachi ma hụ ezinụlọ m anya ọzọ?

NKE ahụ bụ nanị otu n’ime ihe omume ndị weere ọnọdụ n’ọgụ ahụ siri ike, nke nọtere aka, nke a lụrụ maka okwukwe Ndị Kraịst, ọgụ nke gụnyere mmegide ezinụlọ, ịbụ onye a mapụrụ n’iwu n’ógbè, okwu ikpe dị iche iche, na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma olee otú, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka mụ, bụ́ onye dị nwayọọ nke na-atụ egwu Chineke si bịa nọrọ n’ebe ahụ jọgburu onwe ya? Biko, ka m kọwaa.

Obere Nwa nke Nwere Ihe Mgbaru Ọsọ Dị Elu

Mgbe a mụrụ m na 1909 na Stavromeno, Krit, e nwere agha, ịda ogbenye, na ụnwụ nri ná mba ahụ. Mgbe oge na-aga, mụ na ụmụnne m anọ ndị m tọrọ jisiri ike gbanahụ mwakpọ nke ahụ́ ọkụ ahụ si Spen. Echetara m na n’otu oge, ndị mụrụ anyị kpọchibidoro anyị ụzọ ruo ọtụtụ izu ka anyị ghara ibute ahụ́ ọkụ ahụ.

Nna m, bụ́ onye ọrụ ugbo dara ogbenye, bụ nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu kama ọ na-anabata echiche ọhụrụ. Ebe ọ bụ na o biela na France nakwa na Madagascar, o mụtawo ịnabata echiche ndị ọhụrụ banyere okpukpe. Otú ọ dị, ezinụlọ anyị nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Chọọchị Ọtọdọks nke Gris, na-aga Mas kwa Sunday ma na-anabata bishọp ógbè anyị ịnọ n’ụlọ anyị n’oge nleta ya kwa afọ. Eso m n’òtù ukwe, ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ bụkwa ịghọ onye ụkọchukwu.

Na 1929, aghọrọ m onye uwe ojii. Anọ m n’ọrụ na Tesalonaịka, n’ebe ugwu nke Gris, mgbe nna m nwụrụ. N’ịchọ nkasi obi na nghọta ime mmụọ, arịọrọ m ka e ziga m isonyere ndị uwe ojii nọ n’Ugwu Athos, bụ́ obodo ndị mọnk nke dị nso, nke Ndị Kraịst Ọtọdọks na-asọpụrụ dị ka “ugwu nsọ.” * Anọrọ m ebe ahụ rụọ ọrụ afọ anọ, ma hụ nke ọma, ndụ ndị mọnk na-ebi. Kama ịbụ onye a dọtakwuru nso n’ebe Chineke nọ, omume rụrụ arụ na nrụrụ aka nke ndị mọnk na-arụrụ n’asọghị anya wụrụ m akpata oyi n’ahụ́. Obi jọrọ m nnọọ njọ mgbe osote bishọp, bụ́ onye m na-akwanyere ùgwù chọrọ ka mụ na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ. N’agbanyeghị ndakpọ olileanya dị otú ahụ, m ka chọrọ n’eziokwu ijere Chineke ozi na ịghọ onye ụkọchukwu. Ọbụna eyi m uwe onye ụkọchukwu see foto dị ka ihe ncheta. N’ikpeazụ, m gaghachiri Krit.

“Ọ Bụ Ekwensu!”

Na 1942, alụrụ m otu nwa agbọghọ mara nnọọ mma, bụ́ Frosini, onye si n’ezinụlọ a na-akwanyere ùgwù. Alụmdi na nwunye mere ka mkpebi m mere ịghọ ụkọchukwu sikwuo ike, ebe ọ bụ na ndị ọgọ m bụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. * Ezubesiri m ike ịga Atens ịga gụọ akwụkwọ na seminarị. Ná ngwụsị 1943, erutere m n’ọdụ ụgbọ mmiri Iráklion, nke dị na Krit, ma agawaghị m Atens. Nke ahụ pụrụ ịbụ n’ihi na, ka ọ dịgodị, achọtawo m ihe dị iche na-enye m ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Gịnịzi mere?

Ruo ihe karịrị otu afọ, Emmanuel Lionoudakis, bụ́ onye nkwusa na-eto eto nke nwere ume, onye na-esonyere Ndịàmà Jehova, anọwo na-akụzi eziokwu Bible ndị na-enye ihe ọmụma n’ebe nile na Krit. * Nghọta doro anya nke Okwu Chineke nke Ndịàmà na-akụzi dọọrọ mmasị ụfọdụ ndị, ha hapụkwara okpukpe ụgha. N’otu obodo dị nso, bụ́ Sitía, a haziri otu ìgwè na-anụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà. Nke a nyere bishọp nọ n’ógbè ahụ nsogbu n’obi, bụ́ onye—ebe o biworo na United States—maara n’onwe ya otú Ndịàmà Jehova dịruru irè dị ka ndị nkwusa. O kpebisiri ike ikpochapụ “ozizi nduhie” a n’ógbè ọ na-elekọta. Ná mkpali ya, ndị uwe ojii na-akpụga Ndịàmà ọtụtụ mgbe n’ụlọ nga na n’ụlọikpe n’ihi ebubo ụgha dịgasị iche iche.

Otu n’ime Ndịàmà a gbalịrị ịkọwara m eziokwu Bible, ma o weere ya na mụ enweghị mmasị. N’ihi ya, o zitere onyeozi ka ya nwee ahụmahụ ka ọ gwa m okwu. O doro anya na otú m si zaghachi n’ike mere ka Onyeàmà nke abụọ ahụ laghachi ma kọọrọ ìgwè ahụ dị nta, sị: “Ọ gaghị ekwe omume Pericles ịghọ Onyeàmà. Ọ bụ Ekwensu!”

Idetụ Mmegide Ire nke Mbụ Ya

Obi dị m ụtọ na Chineke eleghị m anya otú ahụ. Na February 1945, nwanne m nwoke bụ́ Demosthenes, bụ́ onye kwenyesiri ike na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu nyere m akwụkwọ nta bụ́ Comfort All That Mourn. * Ihe ndị dị n’ime ya masịrị m. Ozugbo, anyị kwụsịrị ịga Chọọchị Ọtọdọks, ma sonyere ìgwè ahụ dị nta nọ na Sitía, gbakwaara ụmụnne anyị àmà banyere okpukpe ọhụrụ anyị. Ha nile wee nakwere eziokwu Bible. Dị ka m tụrụ anya ya, mkpebi m ịhapụ okpukpe ụgha mere ka nwunye m na ndị ezinụlọ ya kewapụ onwe ha n’ebe m nọ ma buso m iro. Ruo oge ụfọdụ, ọgọ m nwoke jụrụ ọbụna ikwusara m okwu. N’ụlọ anyị, e nwere esemokwu na obi ilu na-ekweghị akwụsị akwụsị. N’agbanyeghị nke a, na May 21, 1945, Nwanna Minos Kokkinakis mere mụ na Demosthenes baptizim. *

N’ikpeazụ, enwere m ike iru ihe mgbaru ọsọ m ma jee ozi dị ka ezigbo onye ozi nke Chineke! M ka na-echeta ụbọchị mbụ m jere ozi ụlọ n’ụlọ. Ka m bu akwụkwọ nta 35 n’ime akpa m, eji m bọs gaa n’otu obodo nta, nanị m. N’ụjọ, amalitere m ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ka m na-agakwu, otú ahụ ka m na-enwekwu obi ike. Mgbe otu ụkọchukwu iwe ji bịarutere ebe ahụ, eji m obi ike guzoro chịm megide ya, jụ isoro ya gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii bụ́ nke ọ nọgidere na-ekwu ka m soro ya gaa. Agwara m ya na mụ agaghị ala ruo mgbe m jezuru obodo ahụ dum, nke ahụ kpọmkwem bụkwa ihe m mere. Enwere m obi ụtọ dị ukwuu nke na echedịghị m ka bọs ahụ laghachite kama eji m ụkwụ gaa kilomita 15 ahụ iji laa.

Mmeso Ọjọọ n’Aka Òtù Ndị Ome Mpụ

Na September 1945, e nyekwuru m ọrụ n’ọgbakọ anyị a ka guzobere ọhụrụ na Sitía. N’oge na-adịghị anya, agha obodo malitere na Gris. Ìgwè na-akwado òtù dịgasị iche iche ji oké ịkpọasị wakporịta onwe ha. N’iji ọnọdụ ahụ mere ihe, bishọp gbara otu ìgwè ndị agha okpuru nọ n’ógbè ahụ ume ka ha jiri ụzọ ọ bụla masịrị ha kpochapụ Ndịàmà. (Jọn 16:2) Ka ìgwè ndị agha okpuru ahụ ji bọs na-abịa n’obodo anyị, otu nwaada nwere obiọma n’ebe anyị nọ bụ́ onye so ha na bọs ahụ nụpeere atụmatụ ha nke ịrụzu ọrụ “Chineke nyere” ha, ọ dọkwara anyị aka ná ntị. Anyị zoro, otu n’ime ndị ikwu anyị gbachitekwaara anyị. A zọpụtara ndụ anyị.

Nke a doziri ụzọ maka mkpagbu ndị ọzọ gaje ịbịa. Iti ihe na mmaja ghọrọ ihe a na-ahụ n’ebe nile. Ndị na-emegide anyị gbalịrị ịmanye anyị ịbanyeghachi na chọọchị, ime ụmụ anyị baptizim, na ime akara nke obe. N’otu oge, ha tigidere nwanne m nwoke ihe ruo mgbe ha chere na ọ nwụọla. O wutere m nke ukwuu ịhụ ka a dọwara uwe ụmụnne m ndị nwanyị abụọ yi ma tie ha ihe. N’oge ahụ, chọọchị mere ụmụaka asatọ nke Ndịàmà Jehova baptizim n’ike.

Na 1949, nne m nwụrụ. Ụkọchukwu ahụ chụwakwara anyị ọzọ, bo anyị ebubo na anyị emeghị ihe iwu kwuru nke bụ́ inweta ikike maka ili ozu. E kpere m ikpe n’ụlọikpe ma kwuo na ọ dịghị ihe m mere. Nke a gbara àmà dị ukwuu, ebe ọ bụ na a nụrụ aha Jehova n’okwu ndị e kwuru ná mmalite ikpe ahụ. Nanị ihe fọdụziiri ndị iro anyị ime iji mee ka “anya doo anyị” bụ ijide anyị na ibuga anyị ná mba ọzọ. Ha mere nke a n’April 1949.

N’ime Ọdọ Ọkụ

Eso m n’ime ụmụnna atọ e jidere. Nwunye m abịadịghị ọbụna ịhụ mụ anya n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n’ógbè anyị. Ebe mbụ anyị kwụsịrị bụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’Iráklion. Dị ka m kọwara ná mmalite, anọ m nanị m, nweekwa nkụda mmụọ. Ahapụrụ m nwunye na-akatabeghị ahụ́, onye na-abụghị Onyeàmà na ụmụ ọhụrụ abụọ n’ụlọ. Ekpesiri m ekpere ike rịọ Jehova maka enyemaka. Ihe Chineke kwuru bụ́ nke e dekọrọ ná Ndị Hibru 13:5 batara m n’uche: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” Abịara m ghọta amamihe dị n’ịtụkwasị Jehova obi m nile.—Ilu 3:5.

Anyị nụrụ na a ga-ebuga anyị Makrónisos, bụ́ àgwàetiti na-adịghị emepụta ihe nke dị ná mpụga ụsọ oké osimiri Attica, Gris. Nanị ịkpọta Makrónisos aha ezuwo imenye mmadụ ụjọ, n’ihi na e ji mmekpa ahụ́ na ọrụ ahụhụ mara ụlọ mkpọrọ dị n’ebe ahụ. Ka anyị nọ na-aga n’ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị kwụsịrị na Piraeus. Ọ bụ ezie na a ka tụrụ anyị ịgà, anyị nwetara agbamume mgbe ụfọdụ n’ime ndị kwere ekwe ibe anyị batara n’ime ụgbọ mmiri ahụ, makụọ anyị.—Ọrụ 28:14, 15.

Ibi na Makrónisos na-emenye nnọọ ụjọ. Ndị agha na-emeso ndị mkpọrọ mmeso ọjọọ malite n’ụtụtụ ruo n’abalị. Isi mebiri ọtụtụ ndị mkpọrọ na-abụghị Ndịàmà, ndị ọzọ nwụrụ, ọnụ ọgụgụ buru ibu nwetakwara nkwarụ. N’abalị, anyị na-anụ mkpu na ịsụ ude nke ndị a na-emekpa ahụ́. Blanket m dị fere fere na-egbochi oyi ntakịrị mgbe oyi na-atụ n’abalị.

Nke nta nke nta, a bịara mata Ndịàmà Jehova nke ọma n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’ihi na a na-akpọ aha ahụ n’oge ọ bụla a na-akpọ aha n’ụtụtụ. N’ụzọ dị otú a, anyị nwere ọtụtụ ohere iji gbaa àmà. Enwere m ọbụna ihe ùgwù nke ime otu onye nke a tụrụ mkpọrọ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye nweworo ọganihu ruo n’ókè nke ịrara ndụ ya nye Jehova, baptizim.

N’oge ahụ e bugara m ná mba ọzọ, anọgidere m na-edere nwunye m m hụrụ n’anya akwụkwọ ozi, n’enwetatụghị ọbụna otu nzaghachi site n’aka ya. Nke a emeghị ka m kwụsị iji ịhụnanya na-edere ya akwụkwọ ozi, na-enye ya nkasi obi, na-emesi ya obi ike na nke a bụ nanị ihe ndọla azụ na-agaghị adịte aka, nakwa na anyị ga-emecha nweekwa obi ụtọ ọzọ.

Ka ọ dịgodị, ọnụ ọgụgụ anyị mụbara ka a na-ebute ụmụnna ndị ọzọ. Ebe m na-arụ ọrụ n’ọfịs, emetere m onye agha na-elekọta ogige ahụ enyi. Ebe ọ na-akwanyere Ndịàmà ùgwù, akatara m obi ma jụọ ya ma a pụrụ isi n’ọfịs anyị dị n’Atens wetara anyị akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible. “Ọ gaghị ekwe omume,” ka o kwuru, “ma, gịnịkwanụ ma ndị òtù unu nọ n’Atens tinye ya n’ime ngwugwu unu, dee aha m n’elu ya, zitere m ya?” O riri m ọnụ! Ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ka anyị nọ na-ebutusị ibu ndị dị n’ụgbọ mmiri batara abata, otu onye uwe oji gbuchapụụrụ onye agha ahụ ma gwa ya, sị: “Nna anyị ukwuu, ibu gị abatala o.” “Ibu ole nke?” ka ọ zaghachiri. Ọ dabara na m nọ nso ma nụpere mkparịta ụka ahụ, ya mere m takwụnyeere ya, sị: “Ma eleghị anya, ọ bụ nke anyị, nke e ji aha gị zite, dị ka i nyere n’iwu.” Nke a bụ otu n’ime ụzọ Jehova ji hụ na a na-enyeju anyị afọ n’ụzọ ime mmụọ.

Ngọzi A Na-atụghị Anya Ya —Mgbe ahụ Mkpagbu Ka Ukwuu

Ná ngwụsị nke 1950, a tọhapụrụ m. Alọtara m ụlọ—na-arịa ọrịa, na-acha ka onye ọbara na-adịghị n’ahụ́, tasịa ahụ́, n’ejighịkwa n’aka otú a ga-esi nabata m. Lee obi ụtọ m nwere ịhụ nwunye m na ụmụ m anya ọzọ! Nke ka nke, o juru m anya ịhụ na obi ilu Frosini ebelatawo. Akwụkwọ ozi ndị ahụ m si n’ụlọ mkpọrọ na-edere ya rụrụ ọrụ dị irè. Ntachi obi m na nnọgidesi ike m emetụwo Frosini n’ahụ́. Ntakịrị oge ka e mesịrị, mụ na ya nwere ogologo mkparịta ụka iji kpezie. Ọ nakweere ọmụmụ Bible ma zụlite okwukwe na Jehova na nkwa ya. Otu n’ime ụbọchị m kachasị nwee obi ụtọ ná ndụ m bụ na 1952, mgbe m mere ya baptizim dị ka ohu Jehova raara onwe ya nye!

Na 1955, anyị malitere ikesara ndị ụkọchukwu nile akwụkwọ nta ahụ bụ́ Christendom or Christianity—Which One Is “the Light of the World”? E jidere m ma kpee m ikpe, mụ na ọtụtụ Ndịàmà ibe m. E nwere ọtụtụ okwu ikpe megide Ndịàmà Jehova nke na ụlọikpe nwere nnọkọ pụrụ iche iji kpechaa ha nile. N’ụbọchị ahụ, ndị ọkàikpe na ndị ọkàiwu nile nọ n’ógbè ahụ bịara, ụlọikpe ahụ jupụtakwara ná ndị ụkọchukwu. Bishọp nọ na-ejegharị, ọ gaa ihu, ọ gaa azụ, n’ebe ndị e si agafe n’ime ụlọikpe ahụ. Otu n’ime ndị ụkọchukwu ahụ gbara m akwụkwọ maka ime ntọghata. Ọkàikpe jụrụ ya, sị: “Okwukwe gị, ọ̀ dara nnọọ mbà nke na a pụrụ ịtọghata gị site n’ịgụ otu broshuọ?” Nke a enyeghị ụkọchukwu ahụ ọnụ okwu. A tọhapụrụ m, ma a mara ụmụnna ụfọdụ ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii.

N’afọ ndị sochirinụ, e jidere anyị ugboro ugboro, ịgba akwụkwọ mụbakwara. Ikpechitere anyị ọnụ anyị mere ka ndị ọkàiwu anyị jiri ọrụ n’aka mgbe nile. A kpụpụrụ m n’ụlọikpe ugboro 17 ná ngụkọta. N’agbanyeghị mmegide ahụ, anyị na-arụ ọrụ ime nkwusa mgbe nile. Anyị ji obi ụtọ nakwere ihe ịma aka a, ọnwụnwa ndị ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nụchakwara okwukwe anyị.—Jems 1:2, 3.

Ihe Ùgwù Ndị Ọhụrụ na Ihe Ịma Aka Dị Iche Iche

Na 1957, anyị kwagara Atens. N’oge na-adịghị anya, a họpụtara m ije ozi n’ọgbakọ e guzobere ọhụrụ. Nkwado nwunye m ji obi ya dum na-akwado m mere ka anyị nwee ike ime ka ndụ anyị dị mfe, anyị butekwara ihe ime mmụọ ụzọ. N’ụzọ dị otú a, anyị nwere ike itinye ihe ka ukwuu n’oge anyị n’ọrụ nkwusa. N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, a gwawo anyị ka anyị kwaga n’ọgbakọ dịgasị iche iche ebe e nwere mkpa.

Na 1963, nwa m nwoke gbara afọ 21, ọ ghaghịkwa ịga maka idebanye aha ya n’òtù ndị agha. N’ihi nnọpụiche ha, e tiri Ndịàmà nile e debara aha ha maka ịga agha ihe, kwaa ha emo, ma mesoo ha n’ụzọ mweda n’ala. E mekwara nwa m nwoke otú ahụ. Enyere m ya blanket m si Makrónisos weta iji gbaa ya ume n’ụzọ ihe atụ ịgbaso ihe nlereanya nke ndị bu ya ụzọ bụ́ ndị guzosiri ike n’ezi ihe. Ụlọikpe ndị agha kpere ụmụnna ndị ahụ a kpọrọ idebanye aha ha n’òtù ndị agha ikpe, dị ka ọ na-adịkarịkwa, a na-ama ha ikpe ịga mkpọrọ malite n’afọ abụọ ruo afọ anọ. Mgbe a tọhapụrụ ha, a na-akpọkwa ha ọzọ ma tụọ ha mkpọrọ ọzọ. Dị ka onye ozi okpukpe, enwere m ike ileta ụlọ mkpọrọ dịgasị iche iche, mụ na nwa m nwoke na Ndịàmà ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi hụkwara ugboro ole na ole. Nwa m nwoke nọrọ ihe karịrị afọ isii n’ụlọ mkpọrọ.

Jehova Kwagidere Anyị Imeri

Mgbe e weghachiri nnwere onwe ikpe okpukpe na Gris, enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge n’àgwàetiti Rhodes. Mgbe ahụ na 1986, e nwere mkpa na Sitía, Krit, bụ ebe m malitere ọrụ m dị ka Onye Kraịst. Obi tọrọ m ụtọ ịnakwere ọrụ a nke iso ndị kwere ekwe ibe m m hụrụ n’anya jekọọkwa ozi ọzọ, ndị m maara kemgbe m bụ nwa okorobịa.

Dị ka onye kasị mee okenye n’ezinụlọ m, obi dị m ụtọ ịhụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ikwu 70 ná ngụkọta, ka ha ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi. Ọnụ ọgụgụ ahụ ka na-amụbakwa. Ụfọdụ ejewo ozi dị ka ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, ndị ọsụ ụzọ, ndị Betel, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ruo ihe karịrị afọ 58, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ elewo okwukwe m ule. Adị m afọ 93 ugbu a, mgbe m leghachikwara anya azụ, adịghị m akwa ụta ma ọlị maka ijere Chineke ozi. O nyewo m ume iji zaa òkù o ji ịhụnanya na-akpọ, sị: “Nwa m, nye m obi gị, ka ụzọ m nile tọọkwa anya gị abụọ ụtọ.”—Ilu 23:26.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Lee Ụlọ Nche, December 1, 1999, peeji nke 30-31.

^ par. 11 E nyere ndị ụkọchukwu Chọọchị Ọtọdọks nke Gris ohere ịlụ nwanyị.

^ par. 12 Maka akụkọ ndụ nke Emmanuel Lionoudakis, lee Ụlọ Nche, September 1, 1999, peeji nke 25-29.

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara, ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 15 Maka mmeri n’okwu ikpe metụtara Minos Kokkinakis, lee Ụlọ Nche, September 1, 1993, peeji 27-31.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Makrónisos Àgwàetiti nke Na-emenye Ụjọ

Ruo afọ iri, malite na 1947 ruo 1957, àgwàetiti ahụ kpọrọ nkụ ma tọgbọrọ chakoo, bụ́ Makrónisos, bụ ebe ihe karịrị 100,000 ndị mkpọrọ biri. E nwekwara ọtụtụ Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi e zigara n’ebe ahụ n’ihi nnọpụiche Ndị Kraịst ha. Ndị mere e ji buga ha n’ebe ahụ, ọtụtụ mgbe, bụ ndị ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks nke Gris, bụ́ ndị boro Ndịàmà ebubo ụgha nke ịbụ ndị Kọmụnist.

Banyere usoro “mgbazi” nke e ji eme ihe na Makrónisos, akwụkwọ nkà ihe ọmụma Gris, bụ́ Papyros Larousse, na-ekwu, sị: “Ụzọ mmekpọ ọnụ obi ọjọọ, . . . ọnọdụ ibi ndụ, ndị mba ndị mepere anya na-anabataghị, na àgwà jọgburu onwe ya nke ndị nche n’ebe ndị mkpọrọ nọ . . . bụ ihe mmechuihu n’akụkọ ihe mere eme nke Gris.”

A gwara Ndịàmà ụfọdụ na ọ dịghị ihe ga-eme ka a tọhapụ ha, ọ gwụla ma ha jụrụ nkwenkwe okpukpe ha. Ka o sina dị, Ndịàmà ahụ nọgidere na-eguzosi ike n’ihe. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakweere eziokwu Bible n’ihi mmekọrịta ha na Ndịàmà.

[Foto dị na peeji nke 27]

Minos Kokkinakis (onye nke atọ site n’aka nri) nakwa mụ (onye nke anọ site n’aka ekpe) n’àgwàetiti a na-enye ntaramahụhụ, bụ́ Makrónisos

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe mụ na Onyeàmà ibe m nọ na-arụ ọrụ na Sitía, Krit, bụ́ ebe m jere ozi mgbe m bụ onye ntorobịa