Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nọgidenụ n’Okwu m’

‘Nọgidenụ n’Okwu m’

‘Nọgidenụ n’Okwu m’

“Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m.”—JỌN 8:31.

1. (a) Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, gịnị ka ọ hapụrụ n’ụwa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

MGBE Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Guzobere Iso Ụzọ Kraịst, laghachiri n’eluigwe, ihe ọ hapụrụ n’ụwa a abụghị akwụkwọ ndị o dere, ihe ncheta ndị o wuru, ma ọ bụ akụ̀ na ụba ndị ọ kpakọbara. Ihe ọ hapụrụ bụ ndị na-eso ụzọ ya nakwa ihe ndị a chọrọ kpọmkwem iji bụrụ onye na-eso ụzọ ya. N’ezie, n’Oziọma Jọn, anyị na-ahụ na Jizọs kwuru ihe atọ dị mkpa a chọrọ bụ́ ndị onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya na-aghaghị imezu. Gịnị bụ ihe ndị a a chọrọ? Gịnị ka anyị pụrụ ime iji mezuo ha? Oleekwa otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị onwe anyị ruru eru dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst taa? *

2. Gịnị bụ otu ihe dị mkpa a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ, dị ka e dekọrọ ya n’Oziọma Jọn?

2 Ihe dị ka ọnwa isii tupu ọ nwụọ, Jizọs gbagoro Jeruselem ma kwusaara ìgwè mmadụ gbakọtara n’ebe ahụ maka ime Ememe Ụlọ Ntu na-ewe otu izu, ozi ọma. N’ihi ya, ka ememe ahụ gara ọkara, “ọtụtụ ndị n’ìgwè mmadụ ahụ tinyere okwukwe na ya.” Jizọs nọgidere na-eme nkwusa, nke mere na n’ụbọchị ikpeazụ nke ememe ahụ, ọzọkwa, “ọtụtụ ndị tinyere okwukwe na ya.” (Jọn 7:10, 14, 31, 37; 8:30) N’oge ahụ, Jizọs lekwasịrị ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe anya ma kwuo otu ihe dị mkpa a chọrọ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ, dị ka Jọn onyeozi dekọrọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m.”—Jọn 8:31.

3. Àgwà dị aṅaa ka a chọrọ ka mmadụ wee ‘nọgide n’okwu Jizọs’?

3 Site n’ikwu nke ahụ, Jizọs adịghị egosi na ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe enweghị okwukwe zuru ezu. Kama nke ahụ, ọ nọ na-eme ka ọ pụta ìhè na ha nwere ohere nke ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ ya—ma ọ bụrụhaala na ha anọgide n’okwu ya, na ha enwee ntachi obi. Ha anakwerewo okwu ya, ma ugbu a, ọ dị ha mkpa ịnọgide na ya. (Jọn 4:34; Ndị Hibru 3:14) N’ezie, Jizọs lere ntachi obi anya dị ka àgwà dị nnọọ mkpa nye ụmụazụ ya nke na kpọmkwem ná mkparịta ụka ikpeazụ ya na ndịozi ya nwere, bụ́ nke e dekọrọ n’Oziọma Jọn, Jizọs gbara ume ugboro abụọ, sị: “Nọgide na-eso m.” (Jọn 21:19, 22) Ọtụtụ Ndị Kraịst oge mbụ mere nke ahụ kpọmkwem. (2 Jọn 4) Gịnị nyeere ha aka ịtachi obi?

4. Gịnị nyeere Ndị Kraịst oge mbụ aka ịtachi obi?

4 Jọn onyeozi, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi soo ụzọ Kraịst ruo ihe dị ka afọ iri asaa, rụtụrụ aka n’otu isi ihe dị mkpa. Ọ jara Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi mma, na-asị: “Unu siri ike, okwu Chineke na-anọgidekwa n’ime unu, unu emeriwokwa ajọ onye ahụ.” Ndị ahụ na-eso ụzọ Kraịst tachiri obi ma ọ bụ nọgide n’okwu Chineke, n’ihi na okwu Chineke nọgidere n’ime ha. Ha ji ya kpọrọ ihe nke ukwuu. (1 Jọn 2:14, 24) N’otu aka ahụ taa, iji ‘tachie obi ruo ọgwụgwụ,’ ọ dị anyị mkpa ijide n’aka na okwu Chineke na-anọgide n’ime anyị. (Matiu 24:13) Ànyị pụrụ isi aṅaa mee ya? Otu ihe atụ Jizọs nyere na-enye azịza ya.

‘Ịnụ Okwu Ahụ’

5. (a) Olee ụdị ala dịgasị iche iche Jizọs kwuru banyere ha n’otu n’ime ihe atụ ya? (b) Gịnị ka mkpụrụ na ala nke ihe atụ Jizọs na-anọchi anya ha?

5 Jizọs nyere ihe atụ banyere ọgha mkpụrụ nke na-agha mkpụrụ, e dekọkwara ya n’Oziọma Matiu, Mak, na Luk. (Matiu 13:1-9, 18-23; Mak 4:1-9, 14-20; Luk 8:4-8, 11-15) Ka ị na-agụ ihe ndekọ ahụ, ị ga-arịba ama na isi ihe dị n’ihe atụ ahụ bụ na otu ụdị mkpụrụ dara n’ụdị ala dịgasị iche iche, ihe si na ya pụta dịgasịkwa iche iche. Ụdị ala nke mbụ kpọrọ nkụ, nke abụọ emighị emi, ebe nke atọ bụ nke ogwu tojuru. Nke anọ, n’adịghị ka atọ ndị nke ọzọ ahụ, bụ “ala dị mma.” Dị ka Jizọs n’onwe ya si kọwaa ya, mkpụrụ ahụ bụ ozi Alaeze ahụ nke a na-achọta n’Okwu Chineke, ala ahụ na-anọchi anya mmadụ ndị nwere ọnọdụ obi dịgasị iche iche. Ọ bụ ezie na mmadụ ndị ala ahụ dịgasị iche iche nọchiri anya ha nwekọrọ ihe ụfọdụ ọnụ, ndị ala ahụ dị mma nọchiri anya ha nwere àgwà mere ka ha dị iche n’ebe ndị nke ọzọ nọ.

6. (a) Olee otú ala nke anọ ahụ dị n’ihe atụ Jizọs si dị iche n’ala atọ ndị nke ọzọ, gịnịkwa ka nke ahụ pụtara? (b) Gịnị dị oké mkpa iji na-atachi obi dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst?

6 Ihe ndekọ ahụ dị na Luk 8:12-15 na-egosi na n’ọnọdụ anọ ahụ dum, ndị mmadụ ‘nụrụ okwu ahụ.’ Otú ọ dị, ndị nwere “ezi obi nke dị mma” na-eme ihe karịrị ‘ịnụ okwu ahụ.’ Ha “na-ejigide ya, na-ejikwa ntachi obi amị mkpụrụ.” Ezi ala ahụ nke dị mma, n’ịbụ nke na-akpọghị nkụ na nke nwere ájá miri emi, na-enye mkpọrọgwụ nke mkpụrụ ahụ ohere ịbami n’ime ala, n’ihi ya kwa, mkpụrụ ahụ na-epulite ma na-amị mkpụrụ. (Luk 8:8) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị nwere ezi obi na-aghọta okwu Chineke, na-eji ya akpọrọ ihe, ma na-etinye obi ha dum na ya. (Ndị Rom 10:10; 2 Timoti 2:7) Okwu Chineke na-anọgide n’ime ha. N’ihi ya, ha na-eji ntachi obi amị mkpụrụ. Ya mere, iji Okwu Chineke na-akpọrọ ihe n’ụzọ miri emi dị oké mkpa iji na-atachi obi dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst. (1 Timoti 4:15) Otú ọ dị, ànyị pụrụ isi aṅaa malite iji Okwu Chineke na-akpọrọ ihe n’ụzọ miri emi otú ahụ?

Ọnọdụ Obi na Ntụgharị Uche Nwere Nzube

7. Olee ihe omume a na-ejikọta ya na ezi obi n’ụzọ chiri anya?

7 Rịba ama ihe omume Bible na-ejikọtakarị ya na ezi obi dị mma. “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.” (Ilu 15:28, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) “Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova.” (Abụ Ọma 19:14, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) “Ntụgharị uche nke obi m ga-abụkwa nghọta nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—Abụ Ọma 49:3.

8. (a) Mgbe anyị na-agụ Bible, gịnị ka anyị kwesịrị izere, ma gịnị ka anyị kwesịrị ime? (b) Olee uru ndị anyị na-erite site n’iji ekpere na-atụgharị uche n’Okwu Chineke? (Gụnye ihe dị n’igbe bụ́ “Ndị Na-anọsi Ike n’Eziokwu Ahụ.”)

8 Dị ka ndị a so dee Bible, ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa iji ekele na ekpere na-atụgharị uche n’Okwu Chineke na n’ọrụ ya. Mgbe anyị na-agụ Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible, anyị ekwesịghị ịdị na-eme ka ànyị bụ ndị njem nleta ọ dị ngwa ngwa bụ́ ndị na-esi n’otu ebe mara mma agbaga ebe ọzọ, na-ese ihe nile foto ma ghara ịhụcha ihe nile. Kama nke ahụ, mgbe anyị na-amụ Bible, anyị kwesịrị iwepụta oge iji kwụsị ma kirie ebe ndị ahụ mara mma, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. * Ka anyị na-eji nwayọọ atụgharị uche n’ihe anyị na-agụ, okwu Chineke na-emetụta obi anyị. Ọ na-eru anyị n’obi ma na-akpụzi echiche anyị. Ọ na-akpalikwa anyị iji ekpere na-agwa Chineke ihe nzuzo ndị dị anyị n’obi. N’ihi ya, nkekọ anyị na Jehova na-esikwu ike, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpalikwa anyị ịnọgide na-eso Jizọs ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ. (Matiu 10:22) N’ụzọ doro anya, ịtụgharị uche n’ihe Chineke na-ekwu dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ.—Luk 21:19.

9. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na obi anyị nọgidere na-anabata okwu Chineke?

9 Ihe atụ Jizọs na-egosikwa na e nwere ihe ndị na-egbochi uto nke mkpụrụ ahụ, bụ́ okwu Chineke. N’ihi ya, iji nọgide na-abụ ndị na-eso ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi, anyị kwesịrị (1) ịmata ihe mgbochi ndị ọnọdụ ọjọọ nke ala ndị dị n’ihe atụ ahụ nọchiri anya ha na (2) ime ihe iji dozie ma ọ bụ zere ha. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-ejide n’aka na obi anyị nọgidere na-anabata mkpụrụ Alaeze ahụ ma nọgide na-amị mkpụrụ.

“N’akụkụ Okporo Ụzọ” —Ịbụ Ndị Ji Ọrụ n’Aka

10. Kọwaa ụdị ala mbụ dị n’ihe atụ Jizọs, kọwaakwa ihe ọ pụtara.

10 Ụdị ala mbụ mkpụrụ ahụ dara na ya bụ ‘akụkụ okporo ụzọ,’ bụ́ ebe ‘a zọkwasịrị mkpụrụ ahụ ụkwụ.’ (Luk 8:5) Ala dị n’akụkụ okporo ụzọ e si aga ugbo na-akpọ nkụ n’ihi ọtụtụ mmadụ na-esi na ya agafe. (Mak 2:23) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị kwere ka ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi n’ụwa na-eri oge na ume ha n’ụzọ na-enweghị isi pụrụ ịchọpụta na ha ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na ha apụghị ịzụlite ezi mmasị maka okwu Chineke. Ha na-anụ ya, ma ha adịghị atụgharị uche na ya. N’ihi ya, obi ha na-anọgide bụrụ nke na-adịghị anabata ya. Tupu ha azụlite mmasị maka ya, “Ekwensu [na-abịa] wepụ okwu ahụ n’obi ha ka ha wee ghara ikwere e wee zọpụta ha.” (Luk 8:12) À pụrụ igbochi nke a?

11. Olee otú anyị pụrụ isi gbochie ọnọdụ obi anyị ịdị ka ala kpọrọ nkụ?

11 Ọ dị ọtụtụ ihe a pụrụ ime iji gbochie obi ịdị ka ala dị n’akụkụ okporo ụzọ nke na-adịghị emepụta ihe. Ala ọtụtụ ndị si na ya agafe na nke kpọrọ nkụ pụrụ ịghọ ala dị nro na nke na-eme ihe ma ọ bụrụ na a kọọ ya ma kwụsị isi na ya na-agafe. N’ụzọ yiri nke ahụ, iwepụta oge iji na-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya pụrụ ime ka obi dịrị ka ala dị mma nke na-amị mkpụrụ. Ihe bụ́ isi bụ ekweghị ka ihe ndị a na-eme ná ndụ na-adọpụ uche anyị. (Luk 12:13-15) Kama nke ahụ, jide n’aka na ị na-ewepụta oge iji tụgharịa uche ‘n’ihe ndị ka mkpa’ ná ndụ.—Ndị Filipaị 1:9-11.

“N’elu Oké Nkume”—Ịbụ Ndị Na-atụ Egwu

12. Olee isi ihe mere mkpụrụ ahụ puliterenụ ji kpọnwụọ n’ụdị ala nke abụọ ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ Jizọs?

12 Mgbe mkpụrụ ahụ dara n’ụdị ala nke abụọ ahụ, ọ nọgideghị nnọọ na ya, dị ka o mere na nke mbụ ahụ. Ọ gbanyere mkpọrọgwụ ma pulite. Ma e mesịa, mgbe anyanwụ wara, okpomọkụ anyanwụ chanwụrụ ya, o wee kpọnwụọ. Otú ọ dị, rịba ama nkọwa a dị mkpa. Isi ihe mere mkpụrụ ahụ pulitere ji kpọnwụọ abụghị okpomọkụ ahụ. E kwuwerị, anwụ na-achakwa ihe ọkụkụ ahụ pulitere n’ezi ala, ma ọ dịghị akpọnwụ—n’ezie, ọ na-eto nke ọma. Gịnị kpatara ọdịiche ahụ? Mkpụrụ ahụ pulitere kpọnwụrụ, ka Jizọs na-akọwa, “n’ihi enweghị ájá miri emi” na “n’ihi na ha enweghị udè.” (Matiu 13:5, 6; Luk 8:6) “Oké nkume” nke obere ájá dị n’ala ahụ kpuchiri, na-egbochi mkpọrọgwụ ihe ọkụkụ ahụ ịbami n’ebe ọ ga-enweta mmiri ma kwụsie ike. Mkpụrụ ahụ kpọnwụrụ n’ihi na ájá dị ebe ahụ emighị emi.

13. Olee ụdị ndị dị ka ájá na-emighị emi, oleekwa isi ihe mere ha ji emeghachi omume otú ha si emeghachi?

13 Akụkụ a nke ihe atụ ahụ na-ezo aka n’ebe mmadụ ndị “na-eji ọṅụ anabata okwu ahụ” ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eso Jizọs “ruo oge ụfọdụ” nọ. (Luk 8:13) Mgbe oké anwụ nke “ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu” chakwasịrị ha, ha na-atụ oké egwu nke na ha na-akwụsị inwe ọṅụ na ume ma kwụsị iso Kraịst. (Matiu 13:21) Otú ọ dị, isi ihe mere ha ji atụ egwu abụghị mkpagbu. E kwuwerị, ọtụtụ nde ndị na-eso ụzọ Kraịst na-atachi obi n’ụdị mkpagbu dịgasị iche iche, n’agbanyeghị nke ahụ, ha na-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (2 Ndị Kọrint 2:4; 7:5) Isi ihe mere ụfọdụ ji atụ egwu ma na-adapụ bụ na ọnọdụ obi ha nke yiri oké nkume na-egbochi ha ịtụgharị uche n’ụzọ miri emi n’ihe ndị na-ewuli elu na n’ihe ime mmụọ. N’ihi ya, ekele ha na-enwe maka Jehova na okwu ya adịtụghị esi ha n’obi, ọ na-abụkwa nke na-esighị ike iji nagide mmegide. Olee otú mmadụ pụrụ isi gbochie ihe dị otú ahụ ime?

14. Olee ihe mmadụ kwesịrị ime iji gbochie ọnọdụ obi ya ịdị ka ala na-emighị emi?

14 Ọ dị mmadụ mkpa ijide n’aka na o nweghị ihe mgbochi ndị yiri oké nkume n’obi ya, dị ka iwe gbanyeworo mkpọrọgwụ n’obi, ọdịmma onwe onye na-apụtaghị ìhè, ma ọ bụ mmetụta ndị yiri ha bụ́ ndị siri ike ma zoo ezoo. Ọ bụrụ na mmadụ enweelarị ihe mgbochi dị otú ahụ, ike okwu Chineke na-akpa pụrụ iwepụ ya. (Jeremaịa 23:29; Ndị Efesọs 4:22; Ndị Hibru 4:12) E mesịa, iji ekpere na-atụgharị uche ga-akpali onye ahụ ‘ịkụnye okwu ahụ’ n’obi ya. (Jems 1:21) Nke a ga-enye ya ume iji nagide ịda mbà n’obi na obi ike iji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ọnwụnwa.

“N’etiti Ogwu”—Ịbụ Ndị Na-enwe Ihe Ndọpụ Uche

15. (a) N’ihi gịnị ka ụdị ala nke atọ Jizọs kwuru banyere ya ji kwesị ka anyị lebara ya anya karịsịa? (b) Gịnị mesịrị mee n’ebe ụdị ala nke atọ ahụ dị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

15 Ụdị ala nke atọ ahụ, bụ́ nke nwere ogwu, kwesịrị ka anyị lebara ya anya karịsịa n’ihi na, n’ụzọ ụfọdụ, o yiri ala ahụ dị mma. Dị ka ala ahụ dị mma, ala ahụ ogwu dị na ya kwere ka mkpụrụ ahụ gbanye mkpọrọgwụ ma pulite. Ná mmalite, e nweghị ọdịiche dị n’uto nke ihe ọkụkụ ọhụrụ ahụ dị n’ụdị ala abụọ ahụ. Otú ọ dị, ka oge na-aga, a bịara nwee otu ọnọdụ biliterenụ nke mesịrị kpagbuo mkpụrụ ahụ. N’adịghị ka ala ahụ dị mma, ogwu bịara tojuo n’ala a. Ka mkpụrụ ahụ nọ na-etolite n’ala a, ya na “ogwu ndị ha na ha tolitekọrọ” marịtara aka. Ruo oge ụfọdụ, ihe ọkụkụ abụọ ahụ zọrịtara ihe oriri, ìhè, na ohere, ma n’ikpeazụ, ogwu ahụ tokarịrị mkpụrụ ahụ ma ‘kpagbuo ya.’—Luk 8:7.

16. (a) Olee ndị yiri ala ahụ ogwu juru na ya? (b) Dị ka e dekọrọ n’Oziọma atọ ndị ahụ, gịnị ka ogwu ahụ nọchiri anya ya?—Lee ihe odide ala ala peeji.

16 Olee ụdị ndị yiri ala ahụ ogwu jupụtara na ya? Jizọs na-akọwa, sị: “Ndị a bụ ndị nụworonụ, ma, site n’ịbụ ndị nchegbu na akụ̀ na ụba na ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ na-ebupụ, a na-akpagbu ha kpam kpam, ha adịghịkwa emepụta ihe ọ bụla zuru okè.” (Luk 8:14) Dị nnọọ ka mkpụrụ nke ọgha mkpụrụ ahụ na ogwu ahụ tolitekọrọ n’ala ahụ, n’otu aka ahụ, ụfọdụ ndị na-agbalị ịnabata okwu Chineke na “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ” n’otu mgbe. A na-akụbanye eziokwu nke okwu Chineke n’obi ha, ma ha adịghị ama ma ọ bụ ya ka ha ga-elebara anya ka ọ bụ nchụso ndị ọzọ. Obi ihe atụ ha kewara ekewa. (Luk 9:57-62) Nke a na-egbochi ha iwepụta oge zuru ezu iji jiri ekpere na-atụgharị uche n’okwu Chineke n’ụzọ nwere nzube. Ha adịghị etinye obi ha dum n’okwu Chineke, n’ihi ya kwa, ha adịghị enwe ekele sitere n’obi bụ́ nke a chọrọ iji na-atachi obi. Nke nta nke nta, nchụso ha ndị na-abụghị nke ime mmụọ na-ekpuchi ihe ime mmụọ ha ruo n’ókè nke na a “na-akpagbu ha kpam kpam.” * Lee ọgwụgwụ dị mwute nke a bụụrụ ndị na-adịghị eji obi ha dum ahụ Jehova n’anya!—Matiu 6:24; 22:37.

17. Olee nhọrọ ndị ọ dị mkpa ka anyị mee ná ndụ iji zere ịbụ ndị ogwu ihe atụ e kwuru banyere ya n’ihe atụ Jizọs ga-akpagbu?

17 Site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ karịa ihe onwunwe, anyị na-ezere ịbụ ndị ihe mgbu na ihe ụtọ dị iche iche nke ụwa a ga-akpagbu. (Matiu 6:31-33; Luk 21:34-36) Anyị ekwesịtụghị ileghara ọgụgụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe anyị gụrụ anya. Anyị ga-enwekwu oge iji ekpere na-atụgharị uche n’enweghị ihe ndọpụ uche ma ọ bụrụ na anyị emee ka ndụ anyị dị mfe ruo ókè o kwere mee. (1 Timoti 6:6-8) Ndị ohu Chineke bụ́ ndị meworo otú ahụ—ndị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, fopụworo ogwu n’ala iji mee ka ihe ọkụkụ nke na-amị mkpụrụ na-enwetakwu nri, ìhè, na ohere—na-enweta ngọzi Jehova. Sandra, bụ́ onye dị afọ 26 na-ekwu, sị: “Mgbe m tụgharịrị uche ná ngọzi ndị m nwetaworo n’eziokwu ahụ, ana m aghọta na ụwa apụghị inye m ihe ọ bụla a ga-eji tụnyere ya!”—Abụ Ọma 84:11.

18. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide n’okwu Chineke ma na-atachi obi dị ka Ndị Kraịst?

18 Ya mere, n’ụzọ doro anya, anyị nile, ndị na-eto eto na ndị agadi, ga-anọgide n’okwu Chineke ma na-atachi obi dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst ma ọ bụrụhaala na okwu Chineke anọgide n’ime anyị. N’ihi ya, ka anyị jide n’aka na ọ dịghị mgbe ala nke obi ihe atụ anyị ga-akpọ nkụ, ghara imi emi, ma ọ bụ bụrụ nke ahịhịa tojupụtara, kama ka ọ nọgide bụrụ nke na-akpọghị nkụ na nke miri emi. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-enwe ike itinye uche anyị dum n’okwu Chineke, “na-ejikwa ntachi obi amị mkpụrụ.”—Luk 8:15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 N’isiokwu a, anyị ga-atụle nke mbụ n’ime ihe ndị a a chọrọ. A ga-atụle abụọ ndị nke ọzọ n’isiokwu ndị na-esonụ.

^ par. 8 Iji jiri ekpere tụgharịa uche n’otu akụkụ Bible ị gụrụ, ị pụrụ ịjụ onwe gị, dị ka ihe atụ, sị: ‘Ọ̀ na-ekpughe otu ma ọ bụ ihe karịrị otu n’ime àgwà Jehova? Olee njikọ ya na isiokwu nke Bible nwere? Olee otú m pụrụ isi tinye ya n’ọrụ ná ndụ m ma ọ bụ jiri ya nyere ndị ọzọ aka?’

^ par. 16 Dị ka ihe ndekọ banyere ilu Jizọs n’Oziọma atọ ndị ahụ si kwuo, ihe kpagburu mkpụrụ ahụ bụ ihe mgbu na ihe ụtọ dị iche iche nke ụwa a: “Nchegbu nke usoro ihe a,” “ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba,” “ọchịchọ maka ihe ndị ọzọ gasị,” na “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ.”—Mak 4:19; Matiu 13:22; Luk 8:14; Jeremaịa 4:3, 4.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ‘nọgide n’okwu Jizọs’?

• Ànyị pụrụ isi aṅaa na-ekwe ka okwu Chineke nọgide n’obi anyị?

• Olee ụdị mmadụ ndị ụdị ala anọ ahụ Jizọs kwuru banyere ha na-anọchi anya ha?

• Olee otú ị pụrụ isi nweta oge iji tụgharịa uche n’okwu Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

“NDỊ NA-ANỌSI IKE N’EZIOKWU AHỤ”

ỌTỤTỤ ndị soworo ụzọ Kraịst ruo ogologo oge na-egosipụta site n’afọ ruo n’afọ na ha bụ “ndị na-anọsi ike n’eziokwu ahụ.” (2 Pita 1:12) Gịnị na-enyere ha aka ịtachi obi? Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru.

“Ihe ikpeazụ m na-eme kwa ụbọchị bụ ịgụ otu akụkụ Bible na ikpe ekpere. E mesịa, ana m echebara ihe m gụrụ echiche.”—Jean, e mere ya baptizim na 1939.

“Ịtụgharị uche n’otú Jehova, bụ́ onye dị nnọọ elu, si hụ anyị n’anya nke ukwuu na-eme ka m nwee ahụ́ iru ala na ume nke ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.”—Patricia, e mere ya baptizim na 1946.

“Site n’ịnọgidesi ike na-enwe ọmụmụ Bible n’ụzọ dị mma na site n’itinye uche m dum ‘n’ihe ndị miri emi nke Chineke,’ enwewo m ike ịnọgide na-aga n’ihu.”—1 Ndị Kọrint 2:10; Anna, e mere ya baptizim na 1939.

“Ana m agụ Bible na akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible, na-eburu n’uche iji ha na-enyocha obi na ebumnobi m.”—Zelda, e mere ya baptizim na 1943.

“Oge kasị atọ m ụtọ bụ oge m pụrụ ịga kpagharịa ma gwa Jehova okwu n’ekpere ma mee nnọọ ka ọ mara otú obi dị m n’ezie.”—Ralph, e mere ya baptizim na 1947.

“Ana m amalite ụbọchị site n’ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị na ịgụ otu akụkụ Bible. Nke a na-eme ka m nwee ihe ọhụrụ m ga-atụgharị uche na ya n’ụbọchị.”—Marie, e mere ya baptizim na 1935.

“Ịtụle Bible n’amaokwu n’amaokwu na-abụrụ m ihe na-enye ume ọhụrụ n’ezie.”—Daniel, e mere ya baptizim na 1946.

Olee mgbe ị na-ewepụta oge iji jiri ekpere tụgharịa uche n’okwu Chineke?—Daniel 6:10b; Mak 1:35; Ọrụ 10:9.

[Foto dị na peeji nke 13]

Site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ, anyị pụrụ ‘iji ntachi obi na-amị mkpụrụ’