Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nweenụ Ịhụnanya N’etiti Onwe Unu’

‘Nweenụ Ịhụnanya N’etiti Onwe Unu’

‘Nweenụ Ịhụnanya N’etiti Onwe Unu’

“Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—JỌN 13:35.

1. Olee àgwà Jizọs mesiri ike n’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya?

“ỤMỤNTAKỊRỊ.” (Jọn 13:33) Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya aha a na-egosi ịhụnanya n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya. Ọ dịghị ebe ọ bụla e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ na Jizọs akpọtụwo ha nke ahụ ka ọ na-agwa ha okwu. Otú ọ dị, n’abalị ahụ pụrụ iche, a kpaliri ya iji okwu a na-egosi ịhụnanya mee ihe iji gosi ịhụnanya miri emi o nwere n’ebe ụmụazụ ya nọ. N’ezie, Jizọs kwuru banyere ịhụnanya ihe dị ka ugboro 30 n’abalị ahụ. N’ihi gịnị ka o ji mesie àgwà a ike otú ahụ?

2. N’ihi gịnị ka igosipụta ịhụnanya ji dị oké mkpa nye Ndị Kraịst?

2 Jizọs kọwara ihe mere ịhụnanya ji dị oké mkpa. “Mmadụ nile,” ka o kwuru, “ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35; 15:12, 17) Ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst na igosipụta ịhụnanya ụmụnna na-aga ụkwụ na ụkwụ. A na-amata ezi Ndị Kraịst, ọ bụghị site n’ụdị ejiji pụrụ iche ha na-eji ma ọ bụ site n’omenala ụfọdụ pụrụ iche ha na-eme, kama site n’ezi ịhụnanya na-ekpo ọkụ ha na-egosirịta ibe ha. Inwe ụdị ịhụnanya a dị ịrịba ama bụ nke abụọ n’ime ihe atọ bụ́ isi a chọrọ n’aka onye na-eso ụzọ Kraịst bụ́ ndị e kwuru banyere ha ná mmalite nke isiokwu bu ụzọ. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-emezu ihe a a chọrọ?

‘Ime Ya n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Zuru Ezu Karị’

3. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi nyere banyere ịhụnanya?

3 Dị ka ọ dị n’etiti ụmụazụ Kraịst na narị afọ mbụ, a na-ahụ ịhụnanya a pụtara ìhè taa n’etiti ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “N’ihe banyere ịhụnanya ụmụnna, ọ dịghị unu mkpa ka anyị na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke na-akụziri ịhụrịta ibe unu n’anya; n’eziokwu, unu na-emekwara ya ụmụnna nile.” N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl gbakwụnyere, sị: ‘Nọgidenụ na-eme ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị.’ (1 Ndị Tesalonaịka 3:12; 4:9, 10) Ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl ma na-agbalịsi ike igosirịta ibe anyị ịhụnanya “n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị.”

4. Dị ka Pọl na Jizọs si kwuo, ole ndị ka anyị kwesịrị ilebara anya n’ụzọ pụrụ iche?

4 N’otu akwụkwọ ozi ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà,’ na ‘ịkwado ndị na-adịghị ike.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) N’oge ọzọ, o chetaara Ndị Kraịst na “ndị siri ike kwesịrị iburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike.” (Ndị Rom 15:1) Jizọs n’onwe ya nyekwara ntụziaka banyere inyere ndị na-adịghị ike aka. Mgbe Jizọs busịrị amụma na Pita ga-agbahapụ ya n’abalị a ga-ejide ya, ọ gwara Pita, sị: “Ozugbo ị laghachiworo, mee ka ụmụnna gị dị ike.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha onwe ha kwa ga-ahapụwo Jizọs, n’ihi ya kwa, enyemaka ga-adị ha mkpa. (Luk 22:32; Jọn 21:15-17) Ya mere, Okwu Chineke na-enye anyị ntụziaka inwe ịhụnanya n’ebe ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ na ndị ọ pụrụ ịbụ na ha esoghịzi ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpakọrịta nọ. (Ndị Hibru 12:12) Gịnị mere anyị ji kwesị ime otú ahụ? Ihe atụ abụọ doro anya Jizọs nyere na-enye azịza ya.

Atụrụ Furu Efu na Mkpụrụ Ego Furu Efu

5, 6. (a) Olee ihe atụ abụọ dị mkpirikpi Jizọs nyere? (b) Gịnị ka ihe atụ ndị a na-ekpughe banyere Jehova?

5 Iji kụziere ndị na-ege ya ntị otú Jehova si ele ndị kpafuworo akpafu anya, Jizọs nyere ihe atụ abụọ dị mkpirikpi. Otu bụ banyere onye ọzụzụ atụrụ. Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ime unu nwere otu narị atụrụ, bụ́ onye, ọ bụrụ na otu n’ime ha efuo, na-agaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’ala ịkpa ma gaa ịchọ nke ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya? Mgbe ọ chọtawokwara ya, ọ na-ekukwasị ya n’ubu ya ma na-aṅụrị ọṅụ. Mgbe o rukwara ụlọ, ọ na-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, na-asị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtawo m atụrụ m nke furu efu.’ Asị m unu na otú ahụ ka a ga-enwe ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ karịa n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu bụ́ ndị nchegharị na-adịghị mkpa.”—Luk 15:4-7.

6 Ihe atụ nke abụọ bụ banyere otu nwanyị. Jizọs kwuru, sị: “Olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ego drakma iri, ọ bụrụ na otu mkpụrụ ego drakma efunahụ ya, nke na-adịghị amụnye oriọna ma zachaa ụlọ ya, jirikwa nlezianya chọọ ya ruo mgbe ọ chọtara ya? Mgbe ọ chọtawokwara ya, ọ na-akpọkọta ndị inyom bụ́ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, na-asị, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtawo m mkpụrụ ego drakma funahụrụ m.’ Otú ahụkwa, asị m unu, ọṅụ na-adị n’etiti ndị mmụọ ozi Chineke n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ.”—Luk 15:8-10.

7. Olee ihe abụọ anyị na-amụta n’ihe atụ nke atụrụ ahụ furu efu na mkpụrụ ego ahụ furu efu?

7 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ndị a dị mkpirikpi? Ha na-egosi anyị (1) mmetụta anyị kwesịrị inwe banyere ndị na-adịghịzi ike na (2) ihe anyị kwesịrị ime iji nyere ha aka. Ka anyị tụlee isi ihe ndị a.

Ha Furu Efu Ma Ha Dị Oké Ọnụ Ahịa

8. (a) Olee otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ na nwanyị ahụ si meghachi omume banyere ihe funahụrụ ha? (b) Gịnị ka mmeghachi omume ha na-agwa anyị banyere otú ha si lee ihe funahụrụ ha anya?

8 N’ihe atụ abụọ ahụ, ọ dị ihe furunụ, ma rịba ama otú ndị nwe ha si meghachi omume. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ asịghị: ‘Gịnị bụ otu atụrụ ebe m ka nwere atụrụ 99? Ọ dịghị ihe m ji ya eme.’ Nwanyị ahụ asịghị: ‘Gịnị ka m na-echegburu onwe m banyere otu mkpụrụ ego? Mkpụrụ ego itoolu m ka nwere zuoro m.’ Kama nke ahụ, onye ọzụzụ atụrụ ahụ chọrọ atụrụ ya furu efu dị ka a ga-asị na ọ bụ nanị ya ka o nwere. Mkpụrụ ego ahụ funahụrụ nwanyị ahụ wutekwara ya dị ka a ga-asị na o nweghịzi ọzọ. N’ihe atụ abụọ ahụ, ihe ahụ furu efu nọgidere bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya ndị nwe ha. Gịnị ka nke a na-egosi?

9. Gịnị ka nchegbu onye ọzụzụ atụrụ na nwanyị ahụ gosipụtara na-eme ihe atụ ya?

9 Rịba ama otú Jizọs si mechie okwu ya n’ihe atụ abụọ ahụ: “Otú ahụ ka a ga-enwe ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ” na “otú ahụkwa, asị m unu, ọṅụ na-adị n’etiti ndị mmụọ ozi Chineke n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ.” Ya mere, nchegbu onye ọzụzụ atụrụ ahụ na nwanyị ahụ nwere na-egosipụta, n’ụzọ dị nta, mmetụta nke Jehova na ndị o kere eke nọ n’eluigwe. Dị nnọọ ka ihe ndị furunụ nọgidere dị oké ọnụ ahịa n’anya onye ọzụzụ atụrụ na nwanyị ahụ, n’otu aka ahụ, ndị kpafuworonụ ma kwụsị iso ndị Chineke na-akpakọrịta na-anọgide na-adị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. (Jeremaịa 31:3) Ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ, n’agbanyeghị nke ahụ, ha abụchaghị ndị nnupụisi. N’agbanyeghị adịghị ike ha, ọ pụrụ ịbụ na, ruo n’ókè ụfọdụ, ha ka na-eme ihe Jehova na-achọ. (Abụ Ọma 119:176; Ọrụ 15:29) N’ihi ya, dị ka ọ dị n’oge gara aga, Jehova na-ala azụ ‘isi n’ihu Ya chụpụ ha.’—2 Ndị Eze 13:23.

10, 11. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị siworo n’ọgbakọ kpafuo anya? (b) Dị ka ihe atụ abụọ nke Jizọs si gosi, olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta nchegbu anyị n’ebe ha nọ?

10 Dị ka Jehova na Jizọs, anyị onwe anyị kwa na-enwe nchegbu miri emi banyere ndị na-adịghị ike, bụ́kwa ndị na-anọghịzi n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ezikiel 34:16; Luk 19:10) Anyị na-ele onye na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ anya dị ka atụrụ furu efu—ọ bụghị dị ka onye a na-agaghị emetali. Anyị adịghị eche, sị: ‘Gịnị ka anyị na-echegburu onwe anyị banyere onye na-adịghị ike? Ọ dịghị ihe ọgbakọ ji ya eme.’ Kama nke ahụ, dị ka Jehova, anyị na-ele ndị kpafuworonụ ma chọọ ịlọghachi anya dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa.

11 Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta nchegbu anyị? Ihe atụ abụọ nke Jizọs na-egosi na anyị pụrụ ime ya (1) site n’ibute ụzọ, (2) site n’iji obi dị nro, na (3) site n’iji ezi obi. Ka anyị leba anya n’akụkụ ndị a n’otu n’otu.

Na-ebute Ụzọ

12. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘ịga chọọ nke ahụ furu efu’ na-agwa anyị banyere àgwà onye ọzụzụ atụrụ ahụ?

12 Na nke mbụ n’ime ihe atụ abụọ ahụ, Jizọs na-ekwu na onye ọzụzụ atụrụ ahụ ‘ga-aga ịchọ nke ahụ furu efu.’ Onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-ebute ụzọ ma na-eme mgbalị siri ike iji chọta atụrụ ahụ furu efu. Ihe isi ike, ihe ize ndụ, na otú ebe ahụ teruru aka adịghị akụda ya mmụọ. Kama nke ahụ, onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-anọgidesi ike “ruo mgbe ọ chọtara ya.”—Luk 15:4.

13. Olee otú ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie si mee ihe banyere mkpa nke ndị na-adịghị ike, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ndị dị otú ahụ dị na Bible?

13 N’ụzọ yiri nke ahụ, inyere onye agbamume dị mkpa aka na-achọkarị na onye nke dị ike ga-ebute ụzọ. Ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie ghọtara nke a. Dị ka ihe atụ, mgbe Jonatan, bụ́ nwa Eze Sọl, chọpụtara na agbamume dị ezigbo enyi ya bụ́ Devid mkpa, Jonatan “[biliri], jekwuru Devid n’oké ọhịa ahụ, mee ka aka ya dị ike n’ime Chineke.” (1 Samuel 23:15, 16) Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, mgbe onye ọchịchị bụ́ Nehemaịa hụrụ na ụfọdụ n’ime ụmụnna ya bụ́ ndị Juu adịghịzi ike, ya onwe ya kwa “biliri ozugbo” ma gbaa ha ume ‘iburu Jehova n’uche.’ (Nehemaịa 4:14, NW) Anyị onwe anyị taa ga-achọkwa ‘ibili ọtọ’—ibute ụzọ—iji mee ka ndị na-adịghị ike dị ike. Ma olee ndị kwesịrị ime nke a n’ọgbakọ?

14. Olee ndị n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị inyere ndị na-adịghị ike aka?

14 Ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst karịsịa nwere ibu ọrụ nke “[ime] aka kụdara akụda ka ha dị ike, [na ịgba] ikpere na-asụ ngọngọ ume” na ịsị “ndị obi ha na-eme ngwa, Dịnụ ike, unu atụla egwu.” (Aịsaịa 35:3, 4; 1 Pita 5:1, 2) Otú ọ dị, rịba ama na ọ bụghị nanị ndị okenye ka Pọl dụrụ ọdụ ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà’ na ‘ịkwado ndị na-adịghị ike.’ Kama nke ahụ, ọ bụ ndị nile so ‘n’ọgbakọ ndị Tesalonaịka’ ka Pọl gwara okwu ahụ. (1 Ndị Tesalonaịka 1:1; 5:14) N’ihi ya, inyere ndị na-adịghị ike aka bụ ọrụ dịịrị Ndị Kraịst nile. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke ihe atụ ahụ, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịbụ onye a kpaliri ‘ịga chọọ nke ahụ furu efu.’ N’ezie, a na-eme nke a n’ụzọ kasị dị irè site n’iso ndị okenye na-agbakọ aka. Ị̀ pụrụ ime ihe ụfọdụ iji nyere onye na-adịghị ike n’ọgbakọ gị aka?

Jiri Obi Dị Nro Na-eme Ya

15. N’ihi gịnị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ pụrụ ijiwo mee ihe n’ụzọ o si mee ya?

15 Gịnị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-eme mgbe o mesịrị chọta atụrụ nke furu efu? “Ọ na-ekukwasị ya n’ubu ya.” (Luk 15:5) Lee nkọwa na-emetụ n’ahụ́ ma na-ekpughe ihe nke ahụ bụ! Ọ pụrụ ịbụwo na atụrụ ahụ akpagharịwo ehihie na abalị n’ebe ndị ọ na-agatụbeghị mbụ, ikekwe ọbụna nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ nke ọdụm chụrụ ọsọ. (Job 38:39, 40) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ike gwụrụ atụrụ ahụ n’ihi agụụ. Ike adịtụghị ya nnọọ imeri n’ike nke aka ya ihe mgbochi ndị ọ ga-ezute mgbe ọ na-alọghachi n’ogige atụrụ ahụ. N’ihi ya, onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-ehulata ala, kulite atụrụ ahụ n’ụzọ dị nro, ma kuru ya gafee ihe mgbochi nile ma kubata ya n’ogige atụrụ ya. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta nchebara echiche onye ọzụzụ atụrụ a gosipụtara?

16. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị inwe obi dị nro nke onye ọzụzụ atụrụ ahụ nwere n’ebe atụrụ ahụ kpafuru akpafu nọ?

16 Onye na-esoghịzi ọgbakọ na-akpakọ pụrụ ịghọ onye ike gwụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka atụrụ ahụ ya na onye ọzụzụ atụrụ na-anọghị, onye dị otú ahụ pụrụ ịkpagharịwo n’enweghị nduzi n’ime ógbè ndị dị njọ n’ụwa. N’ịbụ onye na-adịghị enweta nchebe a na-enweta n’ogige atụrụ ahụ, bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst, e kpughepụrụ ya ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ nye mwakpo Ekwensu, bụ́ onye “na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ọzọkwa, ike gwụrụ ya n’ihi erighị nri ime mmụọ. N’ihi ya, a hapụ ya, o yiri ka ike agatụghị adị ya imeri ihe mgbochi ndị ọ ga-ezute mgbe ọ ga na-alọghachi n’ọgbakọ. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ihulata ala, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, jiri ụzọ dị nro kulite onye ahụ na-adịghị ike, ma kuru ya lọghachite. (Ndị Galeshia 6:2) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

17. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Pọl onyeozi mgbe anyị na-eleta onye na-adịghị ike?

17 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị onye na-adịghị ike, ọ̀ bụ na adịghị m eso ya ekerịta adịghị ike ya?” (2 Ndị Kọrint 11:29, The New English Bible; 1 Ndị Kọrint 9:22) Pọl nwere mmetụta ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ, gụnyere ndị na-adịghị ike. Anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta mmetụta ọmịiko yiri nke ahụ n’ebe ndị na-adịghị ike nọ. Mgbe ị na-eleta Onye Kraịst na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ, mesighachi ya obi ike na ọ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova nakwa na ọ na-agụsi nnọọ Ndịàmà ibe ya agụụ ike ịhụ ya. (1 Ndị Tesalonaịka 2:17) Mee ka ọ mara na ha dị njikere ịkwado ya ma jiri obi ha chọọ ịbụrụ ya ‘nwanne a na-amụ maka oge ahụhụ.’ (Ilu 17:17; Abụ Ọma 34:18) Okwu sitere n’obi anyị gwara ya pụrụ iji ụzọ dị nro nakwa nke nta nke nta gbaa ya ume ruo n’ókè nke na ọ ga-enwe ike ịlọghachite n’ìgwè atụrụ ahụ. Olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime? Ihe atụ nke nwanyị ahụ na mkpụrụ ego ahụ furu efu na-enye anyị nduzi.

Jiri Obi Gị Na-eme Ya

18. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị nwanyị ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe atụ ahụ ka olileanya adịghị? (b) Olee mgbalị siri ike nwanyị ahụ mere, gịnịkwa si na ya pụta?

18 Nwanyị ahụ mkpụrụ ego ya funahụrụ maara na ọnọdụ ahụ tara akpụ ma ọ bụghị nke olileanya na-adịghị na ya. A sị na mkpụrụ ego ahụ dabara n’ebe ọhịa tojuru ma ọ bụ n’ọdọ mmiri apịtị ya miri emi, ikekwe ọ gaara ewerewo ya na o funyụọla anya. Otú ọ dị, n’ịmara na mkpụrụ ego ahụ aghaghị ịdị n’ime ụlọ ya, na e nwere ike ịchọta ya, ọ malitere iji nlezianya chọsiwe ya ike. (Luk 15:8) Nke mbụ, ọ mụnyere oriọna iji mee ka ìhè dị n’ụlọ ya gbara ọchịchịrị. E mesịa, ya ejiri azịza zaa ụlọ ya, na-atụ anya ịnụ ụda ígwè. N’ikpeazụ, ya ejiri nlezianya chọọ ya n’ebe nile zoro ezo n’ụlọ ya ruo mgbe ìhè oriọna ahụ gbukere ná mkpụrụ ego ọlaọcha. Nwanyị ahụ nwetara ụgwọ ọrụ n’ihi mgbalị siri ike o mere!

19. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere inyere ndị na-adịghị ike aka site n’ihe nwanyị ahụ mere n’ihe atụ nke mkpụrụ ego ahụ furu efu?

19 Dị ka nkọwa a nke ihe atụ ahụ na-echetara anyị, ibu ọrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke inyere Onye Kraịst na-adịghị ike aka abụghị ihe karịrị ike anyị. N’otu mgbe ahụ, anyị na-aghọta na ọ na-achọ mgbalị. E kwuwerị, Pọl onyeozi gwara ndị okenye nọ n’Efesọs, sị: “Site n’ịdọgbu onwe unu n’ọrụ otú a unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka.” (Ọrụ 20:35a) Buru n’uche na nwanyị ahụ achọtaghị mkpụrụ ego ahụ site n’ilegharị nnọọ anya n’ụlọ ya, site ebe a ruo ebe a. Ee e, o nwere ihe ịga nke ọma n’ihi na o ji nlezianya chọọ ya “ruo mgbe ọ chọtara ya.” N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-agbalị inwetaghachi onye na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị mkpa ka anyị jiri obi anyị na-eme ya n’ụzọ nwere nzube. Gịnị ka anyị pụrụ ime?

20. Gịnị ka a pụrụ ime iji nyere ndị na-adịghị ike aka?

20 Olee otú anyị pụrụ isi nyere onye na-adịghị ike aka iwulite okwukwe na obi ekele? Iji akwụkwọ kwesịrị ekwesị nke Ndị Kraịst na-enwe ọmụmụ Bible onwe onye pụrụ ịbụ nnọọ ihe a chọrọ. N’ezie, iduziri onye na-adịghị ike ọmụmụ Bible na-enye anyị ohere inyere ya aka n’ụzọ dị n’usoro ma zuo ezuo. O yiri ka ọ bụ onye nlekọta ije ozi pụrụ ikpebi n’ụzọ kasị mma onye pụrụ inye aka dị ka a chọrọ. Ọ pụrụ ịtụ aro isiokwu a ga-amụ na akwụkwọ ga-akasị abụ ihe enyemaka. Dị nnọọ ka nwanyị ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe atụ ahụ si jiri ngwá ọrụ ndị na-enye aka rụzuo ọrụ ya, n’otu aka ahụ taa, anyị nwere ngwá ọrụ ndị na-enyere anyị aka ịrụzu ọrụ Chineke nyere anyị nke inyere ndị na-adịghị ike aka. Abụọ n’ime ngwá ọrụ, ma ọ bụ akwụkwọ, ọhụrụ anyị pụrụ ịbụ ihe enyemaka karịsịa iji rụzuo nke a. Ha bụ akwụkwọ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe na Bịaruo Jehova Nso. *

21. Olee otú inyere ndị na-adịghị ike aka si ewetara mmadụ nile ngọzi?

21 Inyere ndị na-adịghị ike aka na-ewetara mmadụ nile ngọzi. Onye a na-enyere aka na-enweta obi ụtọ nke ịbụ onye a na-eme ka ya na ezi ndị enyi ya dịghachi n’otu. Anyị na-enweta ọṅụ sitere n’obi nke a pụrụ inweta nanị site n’inye ihe. (Luk 15:6, 9; Ọrụ 20:35b) Ọgbakọ n’ozuzu ya na-enwekwu ịhụnanya ka onye nke ọ bụla n’ime ha na-enwe ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Karịsịa, a na-enye Ndị Ọzụzụ Atụrụ anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova na Jizọs, nsọpụrụ ka ọchịchọ ha nwere ịkwado ndị na-adịghị ike na-apụta ìhè n’ahụ́ ndị ohu ha nọ n’ụwa. (Abụ Ọma 72:12-14; Matiu 11:28-30; 1 Ndị Kọrint 11:1; Ndị Efesọs 5:1) Ya mere, lee ezi ihe mere anyị ga-eji nọgide ‘na-enwe ịhụnanya n’etiti onwe anyị’ nke ahụ bụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ihi gịnị ka igosipụta ịhụnanya ji dị oké mkpa nye onye ọ bụla n’ime anyị?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-egosi ịhụnanya n’ebe ndị na-adịghị ike nọ?

• Gịnị ka ihe atụ nke atụrụ ahụ furu efu na mkpụrụ ego ahụ furu efu na-akụziri anyị?

• Olee ihe ndị dị irè anyị pụrụ ime iji nyere onye na-adịghị ike aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

N’inyere ndị na-adịghị ike aka, anyị na-ebute ụzọ ma na-eji ụzọ dị nro na obi anyị eme ya

[Foto dị na peeji nke 17]

Inyere ndị na-adịghị ike aka na-ewetara mmadụ nile ngọzi