Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọlta—Gịnị Bụ Ọnọdụ Ya N’ofufe?

Ọlta—Gịnị Bụ Ọnọdụ Ya N’ofufe?

Ọlta—Gịnị Bụ Ọnọdụ Ya N’ofufe?

Ị̀ NA-EWERE ọlta dị ka akụkụ dị mkpa nke ofufe gị? Nye ọtụtụ ndị na-aga chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, ọlta pụrụ ịbụ ebe dị oké mkpa. Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere banyere ihe Bible na-ekwu banyere otú e si jiri ebe ịchụàjà mee ihe, bụ́ ebe a sị na e si nweta okwu bụ́ ọlta? *

Ebe ịchụàjà mbụ e kwuru okwu ya n’ime Bible bụ nke Noa wuru iji chụọ àjà anụmanụ mgbe ọ pụtara n’ụgbọ nchebe ndụ ahụ ka Iju Mmiri ahụ gasịrị. *Jenesis 8:20.

Mgbe a ghagbusịrị asụsụ na Bebel, ihe a kpọrọ mmadụ gbasasịrị n’elu ụwa dum. (Jenesis 11:1-9) N’ihi ọchịchọ ebumpụta ụwa ha nwere ife ofufe, ụmụ mmadụ bịara chọọ ịbịaru Chineke nso, bụ́ onye ha na-amatụghị nke ọma, ‘na-asọgharị ìsì’ ịchọta ya. (Ọrụ 17:27; Ndị Rom 2:14, 15) Kemgbe oge Noa, ọtụtụ ndị ewuworo chi ha dị iche iche ebe ịchụàjà. Okpukpe na ndị dị iche iche ejiriwo ebe ịchụàjà mee ihe n’ofufe ụgha. N’ịbụ ndị e kewapụrụ n’ebe ezi Chineke ahụ nọ, ụfọdụ ndị anọwo n’ebe ịchụàjà mee ihe ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ mgbe mgbe, bụ́ ndị na-agụnye igbu mmadụ, ọbụna ụmụaka. Mgbe ụfọdụ ndị eze Izrel hapụrụ Jehova, ha wuru ebe ịchụàjà nye chi dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ, dị ka Bel. (1 Ndị Eze 16:29-32) Ma gịnị banyere iji ebe ịchụàjà eme ihe n’ezi ofufe?

Ebe Ịchụàjà na Ezi Ofufe n’Izrel

Mgbe oge Noa gasịrị, ndị ikom ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi wuru ebe ịchụàjà iji wee fee ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ofufe. Ebreham wuru ebe ịchụàjà na Shekem, n’ebe dị nso na Betel, na Hibrọn, nakwa n’Ugwu Moraịa, bụ́ ebe ọ chụrụ ebule Chineke wepụtara n’àjà, n’ọnọdụ Aịzik. Ka oge na-aga, Aịzik, Jekọb, na Mozis ji ọchịchọ obi ha wuo ebe ịchụàjà iji fee Chineke ofufe.—Jenesis 12:6-8; 13:3, 18; 22:9-13; 26:23-25; 33:18-20; 35:1, 3, 7; Ọpụpụ 17:15, 16; 24:4-8.

Mgbe Chineke nyere ndị Izrel Iwu ya, o nyere ha iwu ka ha wuo ụlọikwuu, bụ́ ụlọ ntú a na-ebugharị ebugharị, nke a na-akpọkwa “ụlọikwuu nzute,” ịbụ akụkụ bụ́ isi nke ndokwa maka ịbịaru ya nso. (Ọpụpụ 39:32, 40) Ụlọikwuu ahụ nwere ebe ịchụàjà abụọ. Nke a na-anọ achụ àjà nsure ọkụ, bụ́ nke e ji osisi acacia wuo ma jiri ọla kọpa machite ya, dị n’ebe mbata, ọ bụkwa na ya ka a na-anọ achụ àjà ụmụ anụmanụ. (Ọpụpụ 27:1-8; 39:39: 40:6, 29) Ebe ịchụàjà ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, bụ́kwa nke e ji osisi acacia wuo ma jiri ọlaedo machite, dị n’ime ụlọikwuu ahụ, n’ihu ákwà nkwụba nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. (Ọpụpụ 30:1-6; 39:38; 40:5, 26, 27) A na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ pụrụ iche na ya ugboro abụọ n’ụbọchị, n’ụtụtụ na n’anyasị. (Ọpụpụ 30:7-9) Ụlọ nsọ na-adịgide adịgide nke Eze Solomọn wuru nwere otu ụkpụrụ ahụ e ji wuo ụlọikwuu ahụ, na-enwe ebe ịchụàjà abụọ.

‘Ezi Ụlọikwuu ahụ’ na Ebe Ịchụàjà Ihe Atụ Ahụ

Mgbe Jehova nyere Izrel Iwu ahụ, o nyere ndị ya ihe karịrị nanị ụkpụrụ nduzi ndị ga na-achịkwa ndụ ha na ụzọ ha si eji àjà na ekpere abịakwute ya. Ọtụtụ n’ime ndokwa ndị e mere na ya mejupụtara ihe Pọl onyeozi kpọrọ “ihe nnọchiteanya bụ́ ihe atụ,” “ihe atụ,” ma ọ bụ “onyinyo nke ihe eluigwe.” (Ndị Hibru 8:3-5; 9:9; 10:1; Ndị Kọlọsi 2:17) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụghị nanị na ọtụtụ akụkụ nke Iwu ahụ duziri mba Izrel ruo ọbịbịa Kraịst kamakwa ha sere onyinyo nzube Chineke ndị a gaje imezu site n’aka Jizọs Kraịst. (Ndị Galeshia 3:24) Ee, akụkụ ụfọdụ nke Iwu ahụ nwere ihe ha pụtara n’ụzọ amụma. Dị ka ihe atụ, nwa atụrụ ahụ e ji eme Ememe Ngabiga, bụ́ nke e ji ọbara ya mee ihe dị ka ihe atụ nke nzọpụta a zọpụtara ụmụ Izrel, sere onyinyo Jizọs Kraịst. Ọ bụ ya bụ “Nwa atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa,” bụ́ onye a wụsiri ọbara ya iji mee ka anyị nwere onwe anyị pụọ ná mmehie.—Jọn 1:29; Ndị Efesọs 1:7.

Ọtụtụ ihe ndị metụtara ozi ndị e jere n’ụlọikwuu na n’ụlọ nsọ na-ese onyinyo ihe ime mmụọ ndị dị adị. (Ndị Hibru 8:5; 9:23) N’ezie, Pọl dere banyere ‘ezi ụlọikwuu ahụ, bụ́ nke Jehova wuru, ọ bụghị mmadụ.’ Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Kraịst bịara dị ka nnukwu onye nchụàjà nke ihe ọma ndị meworo eme, site n’ụlọikwuu ka ukwuu ma zuo okè karị nke a na-ejighị aka mee, ya bụ, nke na-esighị n’okike a.” (Ndị Hibru 8:2; 9:11) ‘Ụlọikwuu ka ukwuu ma zuo okè karị’ bụ ndokwa nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. Ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na-egosi na oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ bụ ndokwa e mere nke ụmụ mmadụ pụrụ isi bịaruo Jehova nso ná ndabere nke àjà ime udo Jizọs Kraịst chụrụ.—Ndị Hibru 9:2-10, 23-28.

Ịmụta site n’Okwu Chineke na ụfọdụ n’ime ndokwa na ụkpụrụ nke Iwu ahụ sere onyinyo ndokwa ime mmụọ ka ukwuu ma baa uru karị na-eme ka e nwekwuo okwukwe n’ezie na e dere Bible n’ike mmụọ nsọ. Ọ na-emekwa ka e nwekwuo ekele maka amamihe Chineke nke pụtara ìhè n’ụzọ pụrụ iche n’Akwụkwọ Nsọ.—Ndị Rom 11:33; 2 Timoti 3:16.

Ebe ịchụàjà nsure ọkụ ahụ nwekwara ihe ọ pụtara n’ụzọ amụma. O yiri ka ọ na anọchi anya “uche” Chineke, ma ọ bụ ọchịchọ ya ịnakwere àjà mmadụ zuru okè nke Jizọs chụrụ.—Ndị Hibru 10:1-10.

Ka e mesịrị n’akwụkwọ Ndị Hibru, Pọl kwuru okwu a na-akpali mmasị: “Anyị nwere ebe ịchụàjà nke ndị na-eje ozi dị nsọ n’ụlọikwuu ahụ na-enweghị ikike iri ihe sitere na ya.” (Ndị Hibru 13:16) Gịnị ka o bu n’uche mgbe o kwuru banyere ebe ịchụàjà? Ọ̀ na-ekwu banyere ebe a na-akpọ ọlta taa?

Ọtụtụ ndị na-akọwa okpukpe Katọlik na-asị na ebe ịchụàjà ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Hibru 13:10 bụ ọlta nke a na-anọ na ya eri Oriri Nsọ, bụ́ “sakrament” nke a sịrị na a na-eji eme ka àjà Kraịst dịghachi ọhụrụ mgbe a na-edo Mas. Ma ị pụrụ ịhụ site n’ihe a na-ekwu na ebe ịchụàjà Pọl na-ekwu okwu ya bụ nke ihe atụ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na “ebe ịchụàjà” a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ nke ihe atụ. Nye Giuseppe Bonsirven, bụ́ onye Jesuit, “nke a kwekọrọ nke ọma n’ihe atụ nile nke akwụkwọ ozi ahụ [e degaara Ndị Hibru].” Ọ na-ekwu, sị: “N’okwu Ndị Kraịst ji eme ihe, e ji okwu ahụ bụ́ ‘ebe ịchụàjà’ mee ihe na mbụ n’ụzọ ime mmụọ, ọ bụkwa nanị mgbe oge Irenaeus, nakwa kpọmkwem nke Tertulian na St. Cyprian gasịrị, ka a malitere iji ya eme ihe maka oriri nsọ nakwa karịsịa maka tebụl oriri nsọ.”

Dị ka otu magazin ndị Katọlik si kwuo, a malitere iji ọlta eme ihe n’ebe nile “n’oge Constantine” site “n’owuwu e wuru ụlọ chọọchị basilika dị iche iche.” Magazin bụ́ Rivista di Archeologia Cristiana (Ntụle nke Ihe Ndị Kraịst Mere n’Oge Ochie) kwuru, sị: “O doro anya na n’ime narị afọ abụọ ndị mbụ, ọ dịghị onye pụrụ ikwu na e nwere ebe e wepụtara kpọmkwem maka ịnọ na-efe ofufe, kama ihe a maara bụ na a gbakọtara maka ofufe n’ụlọ ndị mmadụ . . . , bụ́ ọnụ ụlọ ndị a na-ejighachi emere ọnụ ụlọ obibi ozugbo ofufe ahụ gasịrị.”

Krisendọm na Ọlta

“Ọlta,” ka akwụkwọ ndị Katọlik bụ́ La Civiltà Cattolica na-ekwu, “bụ ebe bụ́ isi, ọ bụghị nanị n’ụlọ chọọchị, kamakwa nye ndị òtù Chọọchị ahụ.” Ma, Jizọs Kraịst eguzobeghị ọbụna otu ememe okpukpe nke a ga na-eme n’ọlta; ọ gwaghịkwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha nọrọ na ya na-eme ememe. Uche Jizọs kpọtụrụ n’ebe ịchụàjà na Matiu 5:23, 24 nakwa n’ebe ọ bụla ọzọ na-ezo aka n’ihe omume okpukpe ndị e ji mara ndị Juu, ma ọ dịghị egosi na ndị na-eso ụzọ ya ga-eji ebe ịchụàjà na-efe Chineke ofufe.

Onye America na-akọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ George Foot Moore (1851-1931), dere, sị: “Ihe ndị bụ́ isi a na-eme n’ofufe Ndị Kraịst bụbu otu ihe ahụ mgbe nile, ma ka oge na-aga, e mere ka ememe ndị ahụ dị mfe, bụ́ ndị Justin kọwara banyere ha n’etiti narị afọ nke abụọ, bụrụzie ndị na-ekwo ekwo.” Ememe ndị Katọlik na ememe okpukpe ọha na eze dị nnọọ ọtụtụ ma dị mgbagwoju anya nke na ọ ghọrọ otu n’ime ihe ọmụmụ—ememe okpukpe—ndị a na-amụ na seminarị ndị Katọlik. Moore gara n’ihu kwuo, si: “Mmetụta Agba Ochie nwere mere ka ihe a e ji mara ememe okpukpe nile gaa n’ihu n’ụzọ dị ukwuu mgbe a bịara were ndị ụkọchukwu nke Ndị Kraịst dị ka ndị nọchiri usoro ndị nchụàjà nke oge ochie. Ọmarịcha uwe nke nnukwu onye nchụàjà, uwe ndị nchụàjà ndị ọzọ ji eje ozi, njem ngagharị nke okpukpe, òtù ndị ukwe nke ndị Livaị na-abụ abụ ọma, nnukwu anwụrụ ọkụ nke na-esi n’ọkwá ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ apụta—ihe a nile yichara ka ha bụ ụkpụrụ Chineke tụpụtara maka okpukpe, nke mere ka obi kaa chọọchị ịma okpukpe oge ochie aka n’ịdị ukwuu.”

Ọ pụrụ iju gị anya ịmata na ọtụtụ ememe, uwe mwụda, na ihe ndị ọzọ chọọchị dị iche iche ji efe ofufe dabeere, ọ bụghị n’ozizi Ndị Kraịst dị n’Oziọma ndị ahụ, kama n’omenala na ememe nke ndị Juu na ndị ọgọ mmụọ. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia Cattolica na ekwu na okpukpe Katọlik “mụtara iji ọlta eme ihe site n’okpukpe ndị Juu nakwa ruo n’ókè ụfọdụ site n’aka ndị ọgọ mmụọ.” Minucius Felix, bụ́ onye nkwado okwukwe nke narị afọ nke atọ O.A., dere na Ndị Kraịst enweghị ‘ma ụlọ nsọ ma ọlta.’ Akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-akọwa okwu bụ́ Religioni e Miti (Okpukpe na Akụkọ Ifo) kwukwara n’otu aka ahụ, sị: “Ndị Kraịst oge gboo jụrụ iji ebe ịchụàjà mee ihe ka ofufe ha wee dị iche na nke ndị Juu na ndị ọgọ mmụọ.”

Ebe ọ bụ na Iso Ụzọ Kraịst dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’ụkpụrụ ndị a ga-anakwere n’ala nile ma tinye n’ọrụ ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, ọ dịghịzi mkpa inwe obodo nsọ nke dị n’ụwa, ma ọ bụ ụlọ nsọ nkịtị nwere ebe ịchụàjà, ma ọ bụ ndị nchụàjà bụ́ mmadụ nọ n’ọkwá pụrụ iche ma na-eyi uwe dị iche. “Oge awa na-abịa,” ka Jizọs kwuru, “mgbe ọ na-agaghị abụ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem ka unu ga-efe Nna m ofufe. . . . Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:21, 23) Otú ememe dị iche iche nke okpukpe si dị mgbagwoju anya na ojiji ọtụtụ okpukpe ji ọlta eme ihe ekwekọghị n’ihe Jizọs kwuru banyere ụzọ a ga-esi na-efe ezi Chineke ahụ ofufe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 N’isiokwu a, ọlta na-ezo aka n’ebe ndị a nọ chụọ àjà n’oge Bible ma ọ bụkwanụ na tebụl oriri nsọ nke e ji eme ihe na Roman Katọlik.

^ par. 3 Tupu mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbụworị na Ken na Ebel chụụrụ Jehova àjà n’ebe ịchụàjà.—Jenesis 4:3, 4.