Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahapụla Obi Nwa Gị n’Enweghị Nduzi!

Ahapụla Obi Nwa Gị n’Enweghị Nduzi!

Ahapụla Obi Nwa Gị n’Enweghị Nduzi!

ỌKPỤITE bụ́ aka ochie pụrụ iji ụrọ na-abaghị uru kpụọ arịa mara mma ile anya. Ọ bụ mmadụ ole na ole na-arụ ọrụ nkà na-eji ihe na-adịghị ihe ha bụ arụpụta ọtụtụ ihe. Ruo ọtụtụ puku afọ, ọha mmadụ adaberewo n’ebe ọkpụite nọ maka iko, efere, ite e ji esi nri, ite mmiri, na ọkwá okooko osisi ndị e ji achọ ihe mma.

Ndị nne na nna na-atụnyekwa ụtụ dị ukwuu n’obodo site n’ịkpụzi omume na àgwà nke ụmụ ha. Bible ji onye ọ bụla n’ime anyị atụnyere ụrọ, Chineke enyewokwa ndị nne na nna ọrụ dị oké mkpa nke ịkpụzi “ụrọ” bụ́ ụmụ ha. (Job 33:6; Jenesis 18:19) Dị ka ọ dị n’ịkpụpụta ite mara mma, ịkpụzi nwata ịghọ okenye ji ihe akpọrọ ihe ma na-eche echiche nke ọma abụghị obere ọrụ. Ịkpụzi nwata n’ụzọ dị otú ahụ adịghị ewere ọnọdụ na mberede.

E nwere ọtụtụ ihe na-akpụzi obi ụmụ anyị. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-ebibi ihe. Ya mere, kama ịhapụ obi nwata n’enweghị nduzi, nne ma ọ bụ nna maara ihe ga-azụlite nwa ahụ “dị ka ụzọ ya si dị,” na-enwe obi ike na “mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”—Ilu 22:6.

N’ime ogologo oge jupụtara n’ihe omume nke e ji azụlite nwata, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst maara ihe aghaghị iwepụta oge iji na-alụso mmetụta ọjọọ ndị na-etinye obi nwa ha n’ihe ize ndụ ọgụ. A ga-anwale ịhụnanya ha n’ụzọ dị ukwuu ka ha ji ndidi na-enye nwa ahụ “ntụziaka, na mgbazi, bụ́ ụzọ e si azụlite mmadụ dị ka Onye Kraịst.” (Ndị Efesọs 6:4, The New English Bible) N’ezie, ọrụ ndị nne na nna ga-adịkwu mfe karị ma ọ bụrụ na ha amalite n’oge.

Ịmalite n’Oge

Ọ na-amasị ndị ọkpụite iji ụrọ na-ekwe nnọọ ọkpụkpụ, bụ́kwa nke siri ike ruo n’ókè nke ịdịgide otú a kpụrụ ya, na-eme ihe. Mgbe ha nụchasịrị ụrọ, ha na-ahọrọ iji ya mee ihe n’ime ọnwa isii. N’otu aka ahụ, oge kasị mma ndị nne na nna ịmalite ịkpụzi obi nwa ha bụ mgbe ọ ga-akasị anabata ya ma dị mfe mkpụzi.

Ndị ọkachamara n’ihe banyere ụmụaka na-ekwu na ka nwata na-erule ọnwa asatọ, ọ malitelarị ịmata ụda asụsụ obodo ya, iso ndị mụrụ ya nwee nkekọ chiri anya, ịzụlite nkà nke ịghọta ihe, na ịmata ihe ndị gbara ya gburugburu. Oge kasị mma ịmalite ịkpụzi obi ya bụ oge ọ ka dị obere. Lee uru nwa gị ga-erite ma ọ bụrụ na dị ka Timoti, ya ‘amalite ịmata ihe odide ndị ahụ dị nsọ n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ’!—2 Timoti 3:15. *

Ụmụaka na-eṅomikarị ndị mụrụ ha. E wezụga iṅomi ụda olu ha, otú ha si ekwu okwu, na otú ha si emegharị ahụ́, ha na-amụta igosipụta ịhụnanya, obiọma, na ọmịiko mgbe ha hụrụ ka ndị mụrụ ha na-egosipụta àgwà ndị a. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzụlite nwa anyị dị ka iwu Jehova si dị, iwu Chineke aghaghị ibu ụzọ dịrị n’obi anyị. Obi ekele dị otú ahụ ndị nne na nna nwere ga-akpali ha ịdị na-agwa ụmụ ha mgbe nile banyere Jehova nakwa banyere Okwu ya. “[Kwuo] banyere ha,” ka Bible na-agba ume, “mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Francisco na Rosa na-akọwa otú ha si eme nke a n’ebe ụmụntakịrị abụọ ha nọ. *

“E wezụga mkparịta ụka anyị na ụmụ anyị na-enwe kwa ụbọchị, anyị na-agbalị isoro onye nke ọ bụla n’ime ha kwurịta okwu, ọ dịkarịa ala, minit 15 kwa ụbọchị. Mgbe anyị hụpeere nsogbu, nkwurịta okwu ahụ na-adịkwu ogologo—anyị na-achọpụtakwa na e nwere nsogbu n’ezie. Dị ka ihe atụ, nwa anyị nwoke dị afọ ise si ụlọ akwụkwọ lọta n’oge na-adịbeghị anya ma gwa anyị na ya ekweghị na Jehova. Ikekwe, otu n’ime ụmụ klas ya ji ya mee ihe ọchị ma kwuo na ọ dịghị Chineke dịnụ.”

Ndị nne na nna a ghọtara na ọ dị ụmụaka mkpa ịzụlite okwukwe n’ebe Onye Okike ha nọ. A pụrụ ịdabere ná mmasị ebumpụta ụwa ha na-enwe n’ihe ndị Chineke kere wee zụlite okwukwe dị otú ahụ. Lee ka ụmụaka si enwe mmasị imetụ anụmanụ aka, ịkụrụ okooko osisi, ma ọ bụ igwuri egwu n’ájá dị n’ụsọ oké osimiri! Ndị nne na nna pụrụ inyere ha aka ịhụ njikọ dị n’etiti ihe e kere eke na Onye Okike. (Abụ Ọma 100:3; 104:24, 25) Ụjọ na nkwanye ùgwù ha zụlitere n’ebe ihe ndị Jehova kere eke dị pụrụ ịdịgide ruo ogologo ndụ ha nile. (Abụ Ọma 111:2, 10) Tinyere nghọta dị otú ahụ, nwa ahụ pụrụ ịzụlite ọchịchọ nke ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na egwu nke ịkpasu ya iwe. Nke a ga-akwali ya ‘isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.’—Ilu 16:6.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ụmụaka na-achọkarị ịmata ihe ma na-amụta ihe ngwa ngwa, ha nwere ike ghara ịdị na-erube isi n’ụzọ dị mfe. (Abụ Ọma 51:5) Mgbe ụfọdụ, ha pụrụ isi ọnwụ ime ihe masịrị ha ma ọ bụ inweta ihe ọ bụla ha chọrọ. Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịbụ ndị na-akwụsi ike, ndị na-enwe ndidi, na ndị na-enye ịdọ aka ná ntị iji gbochie àgwà ndị a ịgbanye mkpọrọgwụ n’obi ụmụ ha. (Ndị Efesọs 6:4) Nke a bụ ahụmahụ Phyllis na Paul, bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ ise.

Phyllis na-echeta: “Ọ bụ ezie na onye nke ọ bụla n’ime ụmụ anyị nwere àgwà nke ya, nke ọ bụla n’ime ha chọrọ ịdị na-eme ihe masịrị ya. Ọ dịghịrị anyị mfe, ma ha mesịrị mara ihe okwu ahụ bụ́ ‘ee e’ pụtara.” Paul, bụ́ di ya, kwuru, sị: “Mgbe mgbe, anyị na-agwa ha ihe ndị mere anyị ji mee mkpebi ndị anyị mere ma ọ bụrụ na ha toruru ịghọta ha. Ọ bụ ezie na anyị na-agbalị mgbe nile ịdị obiọma, anyị kụziiri ha ịkwanyere ikike Chineke nyere anyị ùgwù.”

Ọ bụ ezie na afọ ndị mbụ nke nwata pụrụ iwetara ya nsogbu, ọtụtụ ndị nne na nna na-achọpụta na ọ bụ n’afọ ndị iri na ụma, bụ́ mgbe obi ya na-akaghị aka na-enweta ọtụtụ ule ndị ọhụrụ, ka a kasị enwe ihe ịma aka.

Iru n’Obi Onye Dị Afọ Iri na Ụma

Ọkpụite aghaghị iji ụrọ ahụ kpụọ ihe mgbe ọ na-akpọbeghị nkụ. Iji nyekwuo onwe ya oge, ọ pụrụ ịwụsatụ mmiri n’ụrọ ahụ iji mee ka ọ dịtụ mmiri mmiri ma kwe ọkpụkpụ. N’otu aka ahụ, ndị nne na nna aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji gbochie obi nwa ha dị afọ iri na ụma ịbụ nke na-adịghị anabata ihe. N’ezie, ngwá ọrụ bụ́ isi ha nwere bụ Bible, bụ́ nke ha pụrụ iji ‘dọọ nwa ha aka ná ntị, mee ka o guzozie, ma kwadebe ya maka ezi ọrụ ọ bụla.’—2 Timoti 3:15-17.

Otú ọ dị, onye dị afọ iri na ụma nwere ike ọ gaghị anabata ndụmọdụ nne na nna ya ngwa ngwa otú o si anabata ya mgbe ọ dị obere karị. Ndị dị afọ iri na ụma pụrụ ịmalite ịṅa ndị ọgbọ ha ntị karị, n’ihi ya, ha pụrụ ịkwụsị iso ndị mụrụ ha na-enwe nkwurịta okwu sitere n’obi. Ọ bụ oge maka inwekwu ndidi na itinyekwu nkà, ka ọrụ nke ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-abanye n’agba ọhụrụ. Onye ahụ dị afọ iri na ụma aghaghị ime ihe iji kwekọọ ná mgbanwe ndị ọ na-enwe n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ mmetụta uche. Ọ ghaghị ịmalite ime mkpebi na isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị pụrụ imetụta ya n’afọ ndụ ya fọdụrụnụ. (2 Timoti 2:22) N’oge a nile na-ama aka, ọ ghaghị ịnagide ikike nke pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’obi ya—nrụgide ndị ọgbọ.

A dịkebeghị enweta nrụgide dị otú ahụ n’otu ihe omume a pụrụ ịghọta ngwa ngwa. Kama nke ahụ, a na-enwetakarị ya site n’ọtụtụ okwu ma ọ bụ ihe omume ndị na-akụda mmụọ. Ihe ndị a na-awakpo ebe ọtụtụ ndị na-adịghị ike—egwu gbanyere mkpọrọgwụ nke ịbụ onye ndị ntorobịa ndị ọzọ jụrụ. N’ịbụ onye ya na onwe ya na-alụ na onye chọrọ ka a nabata ya, onye ntorobịa pụrụ ịmalite ịnakwere “ihe ndị dị n’ụwa” nke ndị ntorobịa ndị ọzọ na-akwalite.—1 Jọn 2:15-17; Ndị Rom 12:2.

Nke ka njọ, ọchịchọ ebumpụta ụwa ndị obi ya na-ezughị okè na-enwe pụrụ imekwu ka ọ nabata ihe ndị ọgbọ ya na-ekwu. Okwu agbamume ndị dị ka “Kporie ndụ” na “Mee ihe masịrị gị” pụrụ ịda ka okwu ndị na-akpali nnọọ mmasị. María na-echeta ahụmahụ ya, sị: “Egere m ndị ibe m dị afọ iri na ụma ntị bụ́ ndị kweere na ndị ntorobịa nwere ikike nke ikpori ndụ otú masịrị ha, n’agbanyeghị ihe ndị ga-esi na ya pụta. Ebe m chọrọ ime ihe ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ na-eme, ọ fọrọ nke nta ka m banye n’ajọ nsogbu.” Dị ka nne ma ọ bụ nna, ị ga-achọ inyere nwa gị dị afọ iri na ụma aka imeri nrụgide dị otú ahụ, ma olee otú ị pụrụ isi mee ya?

Jiri okwu na omume gị mesie ma mesighachi ya obi ike na ị na-eche banyere ya. Gbalịsie ike ịchọpụta mmetụta ọ na-enwe banyere ihe ụfọdụ, ma gbalịa ịghọta nsogbu ya, bụ́ ndị pụrụ nnọọ ịta akpụ karịa nsogbu ndị i nwetara n’ụlọ akwụkwọ. N’oge a karịsịa, ọ dị nwa gị mkpa ile gị anya dị ka onye ọ pụrụ ịkọrọ izu nzuzo. (Ilu 20:5) Site n’otú o si eme ma ọ bụ ọnọdụ uche ya, ị pụrụ ịchọpụta na obi erughị ya ala ma ọ bụ na uche ya tisasịrị etisasị. Mee ihe banyere ákwá ọ na-ebe n’obi ya, ma ‘kasie ya obi.’—Ndị Kọlọsi 2:2.

N’ezie, ọ dị mkpa ịkwụsi ike maka ezi ihe. Ọtụtụ ndị nne na nna achọpụtawo na ha na ụmụ ha na-ama aka mgbe ụfọdụ banyere ndị ga na-atụ ihe a ga-eme, ma ha apụghị ikwenyere ụmụ ha mgbe mkpebi nke ha nwere ezi ntọala. N’aka nke ọzọ, jide n’aka na ị ghọtara ọnọdụ ahụ nke ọma tupu ị na-ekpebi ma ị̀ ga-enye ịdọ aka ná ntị sitere n’ịhụnanya na otú ị ga-esi eme ya ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.—Ilu 18:13.

Ọbụna n’Ime Ọgbakọ

Ite ụrọ pụrụ iyi ihe a rụcharala, ma ọ gwụla ma a nụrụ ya n’ọkụ, ọ pụrụ ịbụ nke mmiri e bu n’obi ka a na-awụnye n’ime ya ga-emebi. Bible ji ọnwụnwa na ihe isi ike atụnyere ụdị ịnụ ihe n’ọkụ ahụ, ebe ọ bụ na ha na-eme ka a mara ụdị mmadụ anyị bụ n’ezie. N’ezie, Bible na-ekwu kpọmkwem banyere ọnwụnwa nke okwukwe anyị, ma n’ụzọ sara mbara, isi ihe a na-ekwu metụtakwara ọnwụnwa ndị ọzọ. (Jems 1:2-4) N’ụzọ na-atụ n’anya, ụfọdụ ọnwụnwa siri ike ndị na-eto eto na-enweta pụrụ isi n’ọgbakọ.

Ọ bụ ezie na nwa gị dị afọ iri na ụma pụrụ iyi onye gbasiri ike n’ụzọ ime mmụọ, n’ime obi ya, ọ pụrụ ịbụ onye ya na obi abụọ na-alụ. (1 Ndị Eze 18:21) Dị ka ihe atụ, Megan chere echiche ụwa ihu bụ́ ndị sitere n’aka ndị ntorobịa ndị ọzọ na-abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze:

“Ìgwè ndị na-eto eto bụ́ ndị hụtara Iso Ụzọ Kraịst dị ka ihe na-agwụ ike na ihe na-egbochi mmadụ ikpori ndụ bịara na-enwe mmetụta ná ndụ m. Ha kwuru ihe ndị dị ka: ‘Ozugbo m ruru afọ 18, aga m ahapụ eziokwu ahụ,’ ma ọ bụ ‘Ọ dị m ka m pụwa apụwa.’ Ha na-ezere ndị na-eto eto bụ́ ndị na-ekwu ihe dị iche, na-akpọ ha ndị nsọ.”

Nanị otu onye ma ọ bụ abụọ nwere àgwà ọjọọ ezuwo iji kpalie ndị ọzọ. Ndị nọ n’otu ìgwè na-emekarị ihe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ìgwè ahụ na-eme. Nzuzu na ịkata obi pụrụ ime ka e leghara amamihe na ime ihe n’ụzọ dị mma anya. N’ọtụtụ mba, e nwewo akụkọ ndị dị mwute banyere ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst ịdaba ná nsogbu n’ihi na ha mere ihe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ na-eme.

N’ezie, ọ dị ndị dị afọ iri na ụma mkpa ịdị na-enwe mkpakọrịta na-enye obi ụtọ ruo n’ókè ụfọdụ. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ha nweta ya dị ka nne ma ọ bụ nna? Na-echebara ntụrụndụ ha echiche n’ụzọ siri ike, ma na-eme ndokwa ka ezinụlọ gị na-enwe ntụrụndụ ma ọ bụ ka ha na-aga ntụrụndụ nke ma ndị ntorobịa ma ndị okenye ga-anọ na ya. Mara ndị enyi nwa gị. Kpọọ ha ka ha soro unu rie nri, ma ọ bụ soro ha nọkọọ n’otu uhuruchi. (Ndị Rom 12:13) Gbaa nwa gị ume ịchụso ihe omume ndị dị mma, dị ka ịmụta ịkpọ ngwá egwu ma ọ bụ ịmụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ nkà. Ruo ókè dị ukwuu, ọ pụrụ inwe ike ime nke a na gburugburu ebe obibi unu bụ́ nke dị nchebe.

Agụmakwụkwọ Pụrụ Ịbụ Ihe Nchebe

Agụmakwụkwọ nke onye dị afọ iri na ụma pụkwara inyere ya aka ime ka ntụrụndụ nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ya. Loli, bụ́ onye nlekọta n’otu ụlọ akwụkwọ buru ibu ruo afọ 20, na-ekwu, sị: “Ahụwo m ọtụtụ Ndịàmà na-eto eto ka ha gụsịrị akwụkwọ. Ọtụtụ bụ ndị omume ha kwesịrị ịja mma, ma ụfọdụ bụ ndị omume ha na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ bụ otu ihe. Ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya bụ mgbe nile ndị nke na-eji ihe ọmụmụ ha akpọrọ ihe. Ana m adụsi ndị nne na nna ọdụ ike inwe ezi mmasị n’ọganihu ụmụ ha na-enwe n’agụmakwụkwọ, ịmara ndị nkụzi ha, na ime ka ụmụ ha kwenye na akụkọ ọma banyere ha dị oké mkpa. Ụfọdụ ga-akasị eme nke ọma, ma ha nile pụrụ ime ihe n’ụzọ na-eju afọ ma bụrụ ndị ndị nkụzi ha na-akwanyere ùgwù.”

Agụmakwụkwọ dị otú ahụ pụkwara inyere ndị dị afọ iri na ụma aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Ọ pụrụ ime ka ha mụta otú e si amụ ihe nke ọma, nye ha ọzụzụ nke uche, ma mee ka ha nwee echiche nke ịbụ ndị nwere ibu ọrụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha inwe ike ịgụ ihe nke ọma na ịghọta echiche dị iche iche ga-agba ha ume ịbụ ndị na-amụ na ndị na-ezi Okwu Chineke n’ụzọ ka mma. (Nehemaịa 8:8) Ihe ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ na nke ime mmụọ ha na-achọ n’aka ha pụrụ inyere ha aka ime ka ntụrụndụ nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ya.

Ihe Ga-ewetara Unu na Jehova Otuto

Na Gris oge ochie, ọtụtụ ọkwá okooko osisi bu ma aha onye kpụrụ ha ma nke onye chọrọ ha mma. N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ime ezinụlọ, a na-enwekarị mmadụ abụọ na-ekere òkè n’ịkpụzi ụmụaka. Ma nne ma nna na-ekere òkè n’ịkpụzi obi nwata, n’ụzọ ihe atụ kwa, nwa unu na-ebu “aha” unu abụọ. Dị ka ọ dị n’ebe ọkpụite nakwa ma ọ bụ onye na-achọ ite mma nke na-enwe ihe ịga nke ọma nọ, ị pụrụ iji òkè i keere n’ịkpụzi onye na-eto eto ịghọ onye bara uru ma dị mma, nyaa isi.—Ilu 23:24, 25.

Ihe ịga nke ọma unu ga-enwe n’ọrụ a dị mkpa ga-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ókè unu kpụziruworo obi nwa unu. A na-enwe olileanya na unu ga-enwe ike ikwu, sị: “Iwu Chineke ya dị n’obi ya, nzọụkwụ ya nile agaghị agbụchapụkwa.” (Abụ Ọma 37:31) Ọnọdụ nke obi nwata dị oké mkpa ịhapụ ya n’enweghị nduzi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ụfọdụ ndị nne na nna na-agụrụ ụmụ ọhụrụ ha Bible. Olu ụtọ e ji na-agu ya na ihe omume a na-enye obi ụtọ pụrụ ịkpali nwa ahụ inwe mmasị n’ịgụ ihe n’afọ ndụ ya fọdụrụnụ.

^ par. 9 A gbanwewo aha ụfọdụ.