Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Nri Anyasị Nke Onyenwe Anyị Pụtara Nye Gị?

Gịnị Ka Nri Anyasị Nke Onyenwe Anyị Pụtara Nye Gị?

Gịnị Ka Nri Anyasị Nke Onyenwe Anyị Pụtara Nye Gị?

“Onye ọ bụla na-ata ogbe achịcha ahụ ma na-aṅụ iko nke Onyenwe anyị n’erughị eru ga-abụ onye ikpe mara n’ihe banyere ahụ́ na ọbara nke Onyenwe anyị.”—1 NDỊ KỌRINT 11:27.

1. Olee ihe omume kasị mkpa e mere atụmatụ ime n’afọ 2003, oleekwa otú o si malite?

IHE omume kasị mkpa e mere atụmatụ ime n’afọ 2003 ga-ewere ọnọdụ mgbe anyanwụ dasịrị n’April 16. Ndịàmà Jehova ga-ezukọta mgbe ahụ ime Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs Kraịst. Dị ka e gosiworo n’isiokwu bu ụzọ, Jizọs guzobere ememe a, bụ́ nke a na-akpọkwa Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, mgbe ya na ndịozi ya mesịrị Ememe Ngabiga na Naịsan 14, 33 O.A. Ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ, bụ́ achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara, na-anọchi anya ahụ́ Kraịst na-enweghị mmehie na ọbara ya a wụsịrị—nanị àjà nke pụrụ ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ ná mmehie na ọnwụ e ketara eketa.—Ndị Rom 5:12; 6:23.

2. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 11:27?

2 Ndị na-ekere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ aghaghị iru eru tupu ha emee otú ahụ. Pọl onyeozi mere ka nke ahụ doo anya mgbe o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrint oge ochie akwụkwọ, bụ́ ebe a na-adịghị eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (1 Ndị Kọrint 11:20-22) Pọl dere, sị: “Onye ọ bụla na-ata ogbe achịcha ahụ ma na-aṅụ iko nke Onyenwe anyị n’erughị eru ga-abụ onye ikpe mara n’ihe banyere ahụ́ na ọbara nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 11:27) Gịnị ka okwu ndị ahụ pụtara?

Ụfọdụ Mere Ya n’Erughị Eru

3. Olee otú ọtụtụ Ndị Kraịst nọ na Kọrint si na-akpa àgwà n’ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

3 Ọtụtụ Ndị Kraịst nọ na Kọrint keere òkè n’Ememe Ncheta ahụ n’erughị eru. E nwere nkewa n’etiti ha, ma ọ́ dịghịkwa ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ, ụfọdụ n’ime ha na-ebu nri abalị ha abịa ma na-eri ya tupu ma ọ bụ n’oge nzukọ ahụ na-aga n’ihu, mgbe mgbe na-eribiga ihe ma na-aṅụbiga ihe ọṅụṅụ ókè. Uche ha adịghị adị nkọ, ha adịghịkwa amụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Nke a mere ka ha bụrụ ndị “ikpe mara n’ihe banyere ahụ́ na ọbara nke Onyenwe anyị.” Agụụ na-agụ ndị na-adịghị ebu nri abalị ha abịa, ha na-abụkwa ndị a dọpụrụ uche ha. Ee, ọtụtụ ndị keere òkè n’egosighị nkwanye ùgwù maka nakwa n’aghọtaghị ịdị mkpa nke ihe omume ahụ nke ọma. Ka a sịkwa ihe mere ha ji kpatara onwe ha ikpe ọmụma!—1 Ndị Kọrint 11:27-34.

4, 5. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka ndị na-ekerekarị òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ nyochaa onwe ha?

4 Ka Ememe Ncheta ahụ na-eru nso kwa afọ, ọ dị oké mkpa ka ndị na-ekerekarị òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ nyochaa onwe ha. Iji kere òkè n’ụzọ kwesịrị ekwesị ná nri a a na-erikọ ọnụ, ha aghaghị ịnọ n’ọnọdụ dị nnọọ mma n’ụzọ ime mmụọ. Onye ọ bụla nke na-adịghị egosi nkwanye ùgwù maka àjà Jizọs, ọbụna na-elelị ya, ga-anọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye ‘a ga-ebipụ n’etiti ndị Chineke,’ dị nnọọ ka a na-eme onye Izrel nke keere òkè ná nri a na-erikọ ọnụ mgbe ọ na-adịghị ọcha.—Levitikọs 7:20; Ndị Hibru 10:28-31.

5 Pọl ji Ememe Ncheta ahụ tụnyere nri a na-erikọ ọnụ n’Izrel oge ochie. O kwuru na ndị na-ekere òkè na-ekekọ ihe n’ime Kraịst ma kwuzie, sị: “Unu apụghị ịdị na-aṅụ iko Jehova na iko ndị mmụọ ọjọọ; unu apụghị ịdị na-eri na ‘tebụl Jehova’ nakwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 10:16-21) Ọ bụrụ na onye na-ekerekarị òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ emee mmehie dị oké njọ, o kwesịrị ikwupụtara ya Jehova ma chọọ enyemaka ime mmụọ site n’aka ndị okenye ọgbakọ. (Ilu 28:13; Jems 5:13-16) Ọ bụrụ na o chegharịa n’ezie ma mịa mkpụrụ kwesịrị nchegharị, ọ gaghịzi abụ onye na-ekere òkè n’erughị eru.—Luk 3:8.

Ịga Dị Ka Ndị Ji Nkwanye Ùgwù Na-ekiri Ihe Na-emenụ

6. Ole ndị ka Chineke debewooro ihe ùgwù nke ikere òkè ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

6 Ndị na-emere ihe fọdụrụ na 144,000 bụ́ ụmụnna Kraịst ihe ọma ugbu a hà kwesịrị ikere òkè ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị? (Matiu 25:31-40; Mkpughe 14:1) Ee e. Chineke edebewo ihe ùgwù ahụ maka ndị o jiworo mmụọ nsọ tee mmanụ ịbụ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe.” (Ndị Rom 8:14-18; 1 Jọn 2:20) Gịnịzi bụ ọnọdụ nke ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs ga-ezu ụwa ọnụ n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ? (Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4) Ebe ọ bụ na ha abụghị ndị ha na Jizọs na-eketakọ ihe bụ́ ndị nwere olileanya eluigwe, ha na-aga Ememe Ncheta ahụ dị ka ndị ji nkwanye ùgwù na-ekiri ihe na-emenụ.—Ndị Rom 6:3-5.

7. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji mara na ha kwesịrị ikere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta?

7 E ji mmụọ nsọ tee ezi Ndị Kraịst na narị afọ mbụ mmanụ. Ọtụtụ n’ime ha bịara nwee ike iji otu ma ọ bụ abụọ n’ime onyinye nke mmụọ nsọ ndị e nyere n’ụzọ ọrụ ebube, dị ka ịsụ asụsụ dị iche iche, mee ihe. N’ihi ya, ọ gaghị esiworo ndị dị otú ahụ ike ịmara na e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ nakwa na ha kwesịrị ikere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ. Otú ọ dị, n’oge anyị, a pụrụ ịmata nke a na-adabere n’okwu ndị sitere n’ike mmụọ nsọ dị ka ndị a: “Ndị nile mmụọ Chineke na-edu, ndị a bụ ụmụ Chineke. N’ihi na unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu bụ́ nke na-akpataghachi egwu, kama unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’”—Ndị Rom 8:14, 15.

8. Ole ndị ka “wit ahụ” na “ata ahụ” a kpọtụrụ uche na Matiu isi 13 na-anọchi anya ha?

8 Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị e tere mmanụ n’ezie toro dị ka “wit” n’ubi nke “ata,” ma ọ bụ Ndị Kraịst ụgha, jupụtara. (Matiu 13:24-30, 36-43) Kemgbe afọ ndị 1870, “wit” ahụ pụtawanyere ìhè, afọ ụfọdụ ka e mesịkwara, a gwara ndị nlekọta bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Ndị okenye . . . kwesịrị ịgwa ndị gbakọtara [maka Ememe Ncheta] banyere ihe ndị a a chọrọ,—(1) okwukwe n’ọbara [Kraịst]; na (2) ịrara onwe onye nye Onyenwe anyị nakwa maka ozi ya, ọbụna ruo ọnwụ. Ha kwesịziri ịkpọ ndị nile ruru ihe ndị ahụ a chọrọ na ndị raara onwe ha nye òkù isonye n’ime ememe ncheta ọnwụ Onyenwe anyị.”—Studies in the Scriptures, Mpịakọta nke Isii, The New Creation, peeji nke 473. *

Ịchọ “Atụrụ Ọzọ” Ahụ

9. Olee otú e si mee ka a mata “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke ọma na 1935, oleekwa otú nke a si metụta ụfọdụ ndị nọworo na-ekere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ?

9 Ka oge na-aga, nzukọ Jehova malitere ilekwasị anya n’ebe ndị ọzọ nọ tụkwasị n’ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ. Otu ihe dị ịrịba ama nke metụtara nke a mere n’etiti afọ ndị 1930. Tupu mgbe ahụ, ndị Chineke na-ele “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe 7:9 anya dị ka òtù ime mmụọ nke abụọ bụ́ ndị ga-esonyere 144,000 ahụ e tere mmanụ bụ́ ndị e si n’ọnwụ kpọlite, n’eluigwe—dị ka ndị enyi ma ọ bụ ndị ibe nke nwunye a na-alụ ọhụrụ nke Kraịst. (Abụ Ọma 45:14, 15; Mkpughe 7:4; 21:2, 9) Ma na May 31, 1935, n’otu okwu e kwuru n’otu mgbakọ Ndịàmà Jehova e mere na Washington, D.C., U.S.A., a kọwara site n’Akwụkwọ Nsọ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-ezo aka n’ebe “atụrụ ọzọ” ahụ nọ bụ́ ndị na-ebi ndụ n’oge ọgwụgwụ. (Jọn 10:16) Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, ụfọdụ ndị kerebuuru òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta kwụsịrị ikere òkè n’ihi na ha bịara ghọta na olileanya ha bụ iketa ụwa, ọ bụghị eluigwe.

10. Olee otú ị ga-esi kọwaa olileanya na ibu ọrụ nke “atụrụ ọzọ” nke oge a”?

10 Ọ bụ karịsịa kemgbe 1935 ka a nọworo na-achọ ndị bịara ghọọ “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ, rara onwe ha nye Chineke ma na-akwado “ìgwè atụrụ nta” ahụ e tere mmanụ n’ọrụ nkwusa Alaeze. (Luk 12:32) Atụrụ ọzọ a nwere olileanya nke ịdị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi, ma n’akụkụ nile ọzọ, ha yiri ihe ahụ fọdụrụ n’oge a ná ndị nketa Alaeze ahụ. Dị ka ndị ọbịa bi n’Izrel oge ochie bụ́ ndị fere Jehova ofufe ma doo onwe ha n’okpuru Iwu ahụ, atụrụ ọzọ nke oge a na-anakwere ibu ọrụ dị iche iche nke Ndị Kraịst, dị ka iso ndị Izrel ime mmụọ na-ekwusa ozi ọma ahụ. (Ndị Galeshia 6:16) Otú ọ dị, dị nnọọ ka ọ na-adịghị onye ọbịa nke pụrụ ịghọ eze ma ọ bụ onye nchụàjà nke Izrel, n’otu aka ahụ, ọ dịghị onye ọ bụla so n’atụrụ ọzọ ahụ nke pụrụ ịchị achị n’Alaeze eluigwe ahụ ma ọ bụ jee ozi dị ka onye nchụàjà.—Deuterọnọmi 17:15.

11. N’ihi gịnị ka ụbọchị mmadụ raara onwe ya nye pụrụ iji nwee ihe jikọrọ ya na olileanya ya?

11 Ya mere, ka ọ na-erule n’afọ ndị 1930, ọ bịara na-apụtawanye ìhè na, n’ozuzu ya, a họpụtawo ndị òtù eluigwe. Ruo ọtụtụ iri afọ ugbu a, ihe a nọworo na-achọ bụ atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị olileanya ha bụ iketa ụwa. Ọ bụrụ na onye e tere mmanụ akwụsị ikwesị ntụkwasị obi, o yikarịrị ka a ga-akpọ onye so n’atụrụ ọzọ ahụ nke jiworo ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi ruo ogologo oge ka ọ nọchie anya onye ahụ na-esoghịzi na 144,000.

Gịnị Mere E Ji Enwe Echiche Hiere Ụzọ?

12. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka mmadụ kwesịrị ịkwụsị ikere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Ndị Kraịst e tere mmanụ ji nnọọ n’aka na ha nwere ọkpụkpọ eluigwe. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ndị na-enweghị ọkpụkpọ a anọwo na-ekere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta? Ugbu a ha matara na ọ dịghị mgbe ha nwere olileanya eluigwe, n’ezie akọ na uche ha ga-amanye ha ịkwụsị ikere òkè. Chineke agaghị ele onye ọ bụla ji aka ya mee onwe ya onye a kpọrọ ịbụ eze na onye nchụàjà n’eluigwe mgbe ọ maara n’ezie na o nweghị ọkpụkpọ dị otú ahụ anya ọma. (Ndị Rom 9:16; Mkpughe 20:6) Jehova gburu onye Livaị bụ́ Kora n’ihi iji mpako na-achọ ọkwá ndị nchụàjà sitere n’eriri Erọn. (Ọpụpụ 28:1; Ọnụ Ọgụgụ 16:4-11, 31-35) Ọ bụrụ na Onye Kraịst ọ bụla amata na ya anọwo na-ekere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi, o kwesịrị ịkwụsị ikere òkè na ya ma jiri obi umeala kpee ekpere ka Jehova gbaghara ya.—Abụ Ọma 19:13.

13, 14. N’ihi gịnị ka ụfọdụ pụrụ iji chee n’ụzọ na-ezighị ezi na ha nwere ọkpụkpọ eluigwe?

13 N’ihi gịnị ka ụfọdụ pụrụ iji chee n’ụzọ hiere ụzọ na ha nwere ọkpụkpọ eluigwe? Ọnwụ nke onye òtù ọlụlụ ma ọ bụ ụfọdụ ọdachi ndị ọzọ pụrụ ime ka ha ghara inwekwa mmasị ná ndụ a na-adị n’ụwa. Ma ọ bụ, ha pụrụ ịchọ inweta otu olileanya ezigbo enyi ha nwere bụ́ onye sị na ya so ná Ndị Kraịst e tere mmanụ. N’ezie, ọ dịghị onye Chineke nyere ọrụ idebanye aha ndị ọzọ n’akwụkwọ maka ihe ùgwù a. Ọ dịghịkwa ete ndị nketa Alaeze mmanụ site n’ime ka ha na-anụ olu dị iche iche nke na-ezi ha ozi na e tewo ha mmanụ.

14 Echiche okpukpe ụgha nke bụ́ na ndị ọma nile ga-eje eluigwe pụrụ ime ka ụfọdụ chewe na ha nwere ọkpụkpọ eluigwe. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide ịbụ ndị echiche na-ezighị ezi ndị anyị nwere n’oge gara aga ma ọ bụ ihe ndị ọzọ megharịrị anya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ pụrụ ịjụ onwe ha sị: ‘Ò nwere ọgwụ m na-aṅụ nke na-emetụta mmetụta uche m? Àna m enwekarị oké mmetụta bụ́ nke pụrụ ime ka m nwee echiche hiere ụzọ?’

15, 16. N’ihi gịnị ka mmadụ ole na ole pụrụ iji kwubie n’ụzọ na-ezighị ezi na ha bụ ndị e tere mmanụ?

15 Ụfọdụ pụrụ ịjụ onwe ha, sị: ‘Àchọrọ m ịbụ onye a ma ama? Ènwere m oké ọchịchọ maka ịchịisi ugbu a ma ọ bụ nke ịbụ onye ya na Kraịst ga-eketakọ ihe n’ọdịnihu?’ Mgbe a kpọrọ ndị nketa Alaeze na narị afọ mbụ, ọ bụghị ha nile nwere ọnọdụ dị ùgwù n’ọgbakọ. Ndị nwere ọkpụkpọ eluigwe adịghịkwa achọ ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ itu ọnụ banyere ịbụ ndị e tere mmanụ. Ha na-egosipụta ịdị umeala n’obi a chọrọ n’aka ndị nwere “uche nke Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 2:16.

16 Ụfọdụ pụrụ ikwubiwo na ha nwere ọkpụkpọ eluigwe n’ihi na ha enwetawo ihe ọmụma dị ukwuu nke Bible. Ma ịbụ onye e ji mmụọ nsọ tee mmanụ adịghị eme ka mmadụ nwee nghọta pụrụ iche, n’ihi na Pọl aghaghị inye ụfọdụ ndị e tere mmanụ ntụziaka na ndụmọdụ. (1 Ndị Kọrint 3:1-3; Ndị Hibru 5:11-14) Chineke emewo ndokwa maka inye ndị ya nile ihe oriri ime mmụọ. (Matiu 24:45-47) Ya mere, ọ dịghị onye kwesịrị iche na ịbụ Onye Kraịst e tere mmanụ na-eme ka ya mara ihe karịa ndị nwere olileanya elu ala. E jighị ịbụ ọkà n’ịza ajụjụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, n’ịgba àmà, ma ọ bụ n’ikwu okwu ndị dabeere na Bible amata onye e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ndị Kraịst nwere olileanya elu ala na-emekwa nke ọma n’akụkụ ndị a.

17. Iji mmụọ nsọ tee mmanụ na-adabere na gịnị nakwa n’ebe ònye nọ?

17 Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị ajụọ ajụjụ banyere ọkpụkpọ eluigwe, onye okenye ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ tozuru okè pụrụ isoro ya kwurịta ya. Otú ọ dị, ọ dịghị onye ga-emere ibe ya mkpebi a. Ọ dịghị onye nwere ọkpụkpọ eluigwe n’ezie mkpa ịjụ ndị ọzọ ma o nwere olileanya dị otú ahụ. “A mụwo [ndị e tere mmanụ] ọzọ, ọ bụghị site ná mkpụrụ pụrụ ire ure nke na-emepụta ihe kama nke na-apụghị ire ure, site n’okwu Chineke bụ́ onye dị ndụ ma na-adịru mgbe ebighị ebi.” (1 Pita 1:23) Chineke na-eji mmụọ ya na Okwu ya akụ “mkpụrụ” nke na-eme ka onye ahụ bụrụ “ihe e kere ọhụrụ,” nke nwere olileanya eluigwe. (2 Ndị Kọrint 5:17) Ọ bụkwa Jehova na-eme nhọrọ ahụ. Ịbụ onye e tere mmanụ “na-adabere, ọ bụghị n’onye ahụ ọ bụ ọchịchọ ya ma ọ bụ n’onye ahụ na-agba ọsọ, kama na Chineke.” (Ndị Rom 9:16) Ya mere, olee otú mmadụ pụrụ isi jide n’aka na ya nwere ọkpụkpọ eluigwe?

Ihe Mere Ha Ji Jide n’Aka

18. Olee otú mmụọ Chineke si eso mmụọ nke ndị e tere mmanụ na-agba àmà?

18 Àmà nke mmụọ Chineke na-agba na-eme ka o doo Ndị Kraịst e tere mmanụ anya na ha nwere olileanya eluigwe. “Unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ,” ka Pọl dere, “bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’ Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, ma ọ bụrụhaala na anyị atakọọ ahụhụ ka e wee mee ka anyị nwekọọ ebube.” (Ndị Rom 8:15-17) Site ná nkwali nke mmụọ nsọ, mmụọ, ma ọ bụ àgwà bụ́ isi, nke ndị e tere mmanụ na-akpali ha ikpebi na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ụmụ ime mmụọ Jehova metụtara ha. (1 Jọn 3:2) Mmụọ Chineke na-eme ka ha nwee mmetụta na ha bụ ụmụ ya ma na-eme ka ha nwee olileanya pụrụ iche. (Ndị Galeshia 4:6, 7) Ee, ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala dị ka mmadụ zuru okè, na-abụ ndị ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi gbara gburugburu, ga-abụ ihe magburu onwe ya, ma nke ahụ abụghị olileanya Chineke nyere ha. Site ná mmụọ ya, Chineke emewo ka olileanya eluigwe ha nwere sie nnọọ ike nke na ha dị njikere ịchụ mmekọrịta na atụmanya nile nke ụwa n’àjà.—2 Ndị Kọrint 5:1-5, 8; 2 Pita 1:13, 14.

19. Olee òkè ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-ekere ná ndụ Onye Kraịst e tere mmanụ?

19 Ndị Kraịst e tere mmanụ ji n’aka na ha nwere olileanya eluigwe, ha ji n’aka na e mewo ka ha banye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Jizọs kpọtụrụ uche na ya mgbe o guzobere Ememe Ncheta ahụ ma kwuo sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke na-adabere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.” (Luk 22:20) Ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ Chineke na ndị e tere mmanụ. (Jeremaịa 31:31-34; Ndị Hibru 12:22-24) Jizọs bụ onye ogbugbo ya. N’ịbụ nke e ji ọbara Kraịst a wụsịrị mee ka ọ malite ịdị irè, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ si ná mba dị iche iche, ọ bụghị nanị n’etiti ndị Juu, wepụtara aha Jehova otu ndị ma mee ka ha soro ná “mkpụrụ” Ebreham. (Ndị Galeshia 3:26-29; Ọrụ 15:14) “Ọgbụgba ndụ ebighị ebi” a na-eme ka o kwe omume ịkpọlite ndị Izrel ime mmụọ nile n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe.—Ndị Hibru 13:20.

20. Olee ọgbụgba ndụ Kraịst na ndị e tere mmanụ banyere na ya?

20 Ndị e tere mmanụ ji olileanya ha n’aka. E mewo ka ha banye n’ọgbụgba ndụ ọzọ, bụ́ ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ. Banyere òkè ha na Kraịst ga-ekerịta, Jizọs kwuru, sị: “Unu bụ ndị rapawooro m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze.” (Luk 22:28-30) Ọgbụgba ndụ a nke dị n’etiti Kraịst na ndị eze ha na ya ga-eso chịa ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 22:5.

Oge Ememe Ncheta—Oge A Gọziri Agọzi

21. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru dị ukwuu n’oge Ememe Ncheta?

21 Ngọzi ndị a na-enweta n’oge Ememe Ncheta dị ọtụtụ. Anyị pụrụ irite uru n’ọgụgụ Bible nke e mere ndokwa ya maka oge a. Ọ bụkwa oge dị mma karịsịa maka ikpe ekpere, maka ịtụgharị uche ná ndụ Jizọs dịrị n’elu ala na n’ọnwụ ya, nakwa maka ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. (Abụ Ọma 77:12; Ndị Filipaị 4:6, 7) Ememe ahụ n’onwe ya na-echetara anyị ịhụnanya Chineke na Kraịst gosiri anyị n’ihe banyere àjà mgbapụta Jizọs. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Ndokwa a na-eme ka anyị nwee olileanya ma bụrụ ndị a kasiri obi, o kwesịkwara ime ka anyị kpebisikwuo ike ịgbaso ụzọ ndụ yiri nke Kraịst. (Ọpụpụ 34:6; Ndị Hibru 12:3) Ememe Ncheta ahụ kwesịkwara iwusikwu anyị ike imezu nraranye anyị dị ka ndị ohu Chineke na ịbụ ndị ji iguzosi ike n’ihe na-eso ụzọ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.

22. Gịnị bụ onyinye kasịnụ Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ, gịnịkwa bụ otu ụzọ isi gosipụta ekele maka ya?

22 Lee ezi onyinye ndị Jehova na-enye anyị! (Jems 1:17) Anyị nwere nduzi nke Okwu ya, enyemaka nke mmụọ ya, na olileanya nke ndụ ebighị ebi. Onyinye kasịnụ nke Chineke nyere anyị bụ àjà Jizọs chụrụ maka mmehie nke ndị e tere mmanụ nakwa maka nke ndị nile ọzọ na-egosipụta okwukwe. (1 Jọn 2:1, 2) Ya mere, ruo ókè ha aṅaa ka i ji ọnwụ Jizọs kpọrọ ihe? Ị̀ ga-eso ná ndị ga-egosipụta ekele ha nwere maka ya site n’izukọta mgbe anyanwụ dasịrị n’April 16, 2003, iji mee ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha, ma a dịghịzi ebipụta ha.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Ònye kwesịrị ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta?

• N’ihi gịnị ka “atụrụ ọzọ” ahụ ji aga ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nanị dị ka ndị ji nkwanye ùgwù ekiri ihe na-emenụ?

• Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ si amata na ha kwesịrị ikere òkè n’achịcha na mmanya ahụ mgbe a na-eme Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst?

• Oge Ememe Ncheta bụ oge dị mma iji mee gịnị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe e sere ese/Foto ndị dị na peeji 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ndị Gara Ememe Ncheta

NA NDE

15,597,746

15

14

13,147,201

13

12

11

10

 9

 8

 7

 6

 5

4,925,643

 4

 3

 2

 1

878,303

63,146

1935 1955 1975 1995 2002

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ ga-anọ ya maka ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’afọ a?

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Oge Ememe Ncheta bụ oge dị mma maka inwekwu ọgụgụ Bible na ikerekwu òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze