Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ibi Ndụ n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

Ibi Ndụ n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

Ibi Ndụ n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

OLEE ihe na-agbata gị n’uche mgbe ị nụrụ “ogige ndị gbara ọsọ ndụ”? Ọ̀ dịtụla nke ị gara leta? Oleedị otú ọ na-adị?

N’oge a na-ede isiokwu a, e guzobewo ogige 13 maka ndị gbara ọsọ ndụ, n’ebe ọdịda anyanwụ Tanzania. N’ịbụ ndị agha obodo mere ka ha si n’obodo ha gbapụ, ihe dị ka mmadụ 500,000 bụ́ ndị si ná mba ndị ọzọ nke Africa gbaa ọsọ ndụ anọwo na-enweta enyemaka n’aka gọọmenti Tanzania bụ́ nke so ụlọ ọrụ Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ (UNHCR) na-arụkọ ọrụ. Olee ihe ndụ dị ka ya n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ?

Ịbịarute n’Ogige Ahụ

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma aha ya bụ Kandida na-akọwa ihe mere mgbe ya na ezinụlọ ya bịarutere afọ ole na ole gara aga, sị: “Ha nyere anyị kaadị e ji eketa ihe nke bu nọmba e ji amata mmadụ, e zigakwara ezinụlọ anyị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke dị na Nyarugusu. N’ebe ahụ, e nyere anyị nọmba ala na nọmba okporo ámá. E gosiri anyị ebe anyị ga-egbute osisi ma nweta ata anyị ga-eji wuo obere ụlọ nke anyị. Anyị zọrọ ájá. Ndị òtù UNHCR nyere anyị nnukwu wọtapruf anyị ji kpuchie elu ụlọ anyị. Ọ bụ ọrụ ike, ma obi dị anyị ụtọ mgbe anyị rụchara obere ụlọ anyị.”

A na-eji kaadị ahụ eketa ihe n’ụbọchị Wednesday nke izu abụọ ọ bụla. “Ee, anyị na-akwụ n’ahịrị n’ebe a na-eke nri iji keta ihe oriri ndị bụ́ isi ndị òtù UNHCR na-eke,” ka Kandida gara n’ihu ikwu.

Olee otú nri otu onye na-eketa maka otu ụbọchị na-aharu?

“A na-ekenye onye ọ bụla n’ime anyị ihe dị ka iko ntụ ọka 3, otu iko ahụekere, gram 20 nke ntụ soyabean, ngaji mmanụ nri 2, na ihe dị ka otu ngaji nnu. Mgbe ụfọdụ, anyị na-enwetakwa otu aka ncha, bụ́ nke kwesịrị ịdịru otu ọnwa.”

Gịnị banyere mmiri dị ọcha? Ọ̀ dị? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Riziki na-ekwu, sị: “Ee, e ji paịpụ mmiri si n’otu osimiri dị nso na-adọta mmiri ma na-awụba ya ná nnukwu ihe ndị e ji echekwa mmiri. A na-eji ọgwụ chlorine eme ka mmiri ahụ dị ọcha tupu a na-adọta ya n’ebe ndị a na-ekute mmiri n’ogige nke ọ bụla. Anyị na-agbakwa mbọ isi mmiri ahụ n’ọkụ tupu anyị aṅụọ ya iji zere ịda ọrịa. Mgbe mgbe, anyị na-anọ n’ebe ndị a na-ekute mmiri site n’ụtụtụ ruo abalị iji kute mmiri na iji saa ákwà anyị. Anyị pụrụ inweta nanị otu bọket mmiri na ọkara n’ụbọchị.”

Ọ bụrụ na i jiri ụgbọala gagharịa n’otu n’ime ogige ndị ahụ, ị pụrụ ịhụ ụlọ akwụkwọ ọta akara, ụlọ akwụkwọ praịmarị, na ụlọ akwụkwọ sekọndrị. A pụrụ ọbụna inwe ụfọdụ ụlọ akwụkwọ ndị okenye n’ogige ahụ. Otu ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na ụlọ ọrụ gọọmenti bụ́ ndị dị nnọọ ná mpụga ogige ahụ na-eme ka e jide n’aka na ndị nọ n’ogige ahụ nọ n’udo ma nwee nchebe. Ị pụrụ ịhụ otu nnukwu ahịa nke nwere ọtụtụ obere ụlọ ahịa bụ́ ebe ndị gbara ọsọ ndụ pụrụ inweta akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi, azụ̀, ọkụkọ, na ihe oriri ndị ọzọ bụ́ isi. Ụfọdụ n’ime ndị obodo ahụ na-abịa n’ahịa ahụ ịchụ nta ego. Oleedị ebe ndị ahụ gbara ọsọ ndụ si enweta ego ha ji azụ ihe? Ụfọdụ nwere obere ubi akwụkwọ nri ma na-ere ihe ha nwetara na ya n’ahịa ahụ. Ndị ọzọ pụrụ ire ụfọdụ n’ime ntụ ọka ma ọ bụ ahụekere ha ketara, na-eji ego ya azụta anụ ma ọ bụ mkpụrụ osisi. Ee, ogige ahụ pụrụ iyi nnọọ nnukwu obodo nta kama iyi ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ụfọdụ ndị n’ọmà ahịa ka ha na-achị ọchị ma na-ekpori ndụ, dị nnọọ ka ha gaara emewo n’obodo ha si bịa.

Ọ bụrụ na ị kwụsị n’ụlọ ọgwụ dị ebe ahụ, otu n’ime ndị dọkịta na-arụ na ya pụrụ ịgwa gị na e nwere ụlọ ahụ́ ike ole na ole n’ogige ahụ bụ́ ebe a na-elebara ọrịa ndị na-esichaghị ike anya; a na-akpọga ndị nwere ọnọdụ mberede na ndị na-arịa ọrịa dị oké njọ n’ụlọ ọgwụ ahụ. N’ụzọ kwere nghọta, ngalaba na-ahụ maka ndị inyom dị ime na ndị mụrụ nwa nakwa ọnụ ụlọ a na-anọ amụ nwa n’ụlọ ọgwụ ahụ dị mkpa, na-eburu n’uche na n’ogige e nwere mmadụ 48,000 gbara ọsọ ndụ, mmadụ 250 pụrụ ịmụ nwa na ya n’ime otu ọnwa.

A Na-enyeju Ha Afọ n’Ụzọ Ime Mmụọ

Gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova pụrụ ịdị na-eche otú ụmụnna ime mmụọ ha bi n’ogige ndị a dị na Tanzania na-eme. N’ozuzu, ha dị ihe dị ka 1,200, a hazikwara ha gaa n’ọgbakọ 14 na ìgwè 3. Olee otú ha na-eme?

Otu n’ime ihe ndị mbụ Ndị Kraịst a raara onwe ha nye mere mgbe ha bịarutere n’ogige ndị ahụ bụ ịrịọ ka e nye ha ala ebe ha ga-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke a ga-enyere ndị ahụ gbara ọsọ ndụ aka ịmara ebe ha ga-achọta Ndịàmà na ebe ha ga na-aga nzukọ ndị ha na-enwe kwa izu. N’ogige nke dị na Lugufu, e nwere ọgbakọ 7, bụ́ ndị nwere ngụkọta nke Ndị Kraịst 659 na-eje ozi. Ná nzukọ ndị ha na-enwe na Sunday, ngụkọta nke ndị na-aga ya n’ọgbakọ 7 ahụ na-erukarị ihe dị ka 1,700.

Ndịàmà nọ n’ogige nile ahụ na-eritekwa uru ná mgbakọ ukwu na mgbakọ nta nke Ndị Kraịst. Mgbe e nwere mgbakọ distrikti mbụ n’ogige ahụ dị na Lugufu, mmadụ 2,363 gara ya. Ndịàmà ahụ rụrụ ọdọ mmiri a nọ eme baptizim kpọmkwem ná mpụga ala mgbakọ ahụ. Ọdọ mmiri ahụ bụ olulu e gwuru n’ala, nke e ji wọtapruf tụchie ala ya na akụkụ ya nile ka ala ghara ịmịkọrọ mmiri a wụnyere na ya. Ụmụnna ji ịnyịnya ígwè gaa kute mmiri n’otu osimiri dị ihe dị ka kilomita abụọ site n’ebe ahụ. Ebe ọ bụ lita 20 ka ha buru na nke ọ bụla ha gara, ọ pụtara na ha gara ya ọtụtụ ugboro. Ndị a na-aga ime baptizim, bụ́ ndị yi uwe dị mma, kwụụrụ n’ahịrị ka e mee ha baptizim. Ná ngụkọta, e mere mmadụ 56 baptizim site n’imikpu ha kpam kpam n’ime mmiri. Otu onye ozi oge nile a gbara ajụjụ ọnụ ná mgbakọ ahụ kọwara na ya duziiri mmadụ 40 ọmụmụ Bible. E mere mmadụ anọ n’ime ndị ọ mụụrụ ihe baptizim ná mgbakọ ahụ.

Alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova mere ndokwa ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta ha mgbe nile. Otu n’ime ha na-ekwu, sị: “Ụmụnna anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ahụ. Ha nwere ubi buru ibu ha na-eme nkwusa na ya, n’otu ọgbakọ kwa, Onyeàmà nke ọ bụla na-etinye ihe dị ka awa 34 n’ọnwa n’ozi. Ọtụtụ na-eduziri mmadụ ise ma ọ bụ karị nwere mmasị ọmụmụ Bible. Otu ọsụ ụzọ [onye ozi oge nile] kwuru na ya apụghị inweta ókèala ka ebe a mma n’ebe ọ bụla ọzọ. Ndị nọ n’ogige ndị ahụ na-enwe mmasị nke ukwuu n’akwụkwọ anyị.”

Olee otú akwụkwọ ndị e ji amụ Bible si erute n’ogige ndị ahụ? Alaka ụlọ ọrụ na-eji ụgbọ okporo ígwè ebuga ya na Kigoma, bụ́ obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Ọdọ Mmiri Tanganyika. N’ebe ahụ, ụmụnna na-ebru akwụkwọ ndị ahụ ma hazie ibugara ha ọgbakọ ndị ahụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-agbazite ụgbọala pikọp ma jiri aka ha buga akwụkwọ ndị ahụ n’ogige nile ahụ. Ọ na-ewe ha njem ihe dị ka ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ bụ́ nke ha na-esi n’ụzọ ndị mebisịrị emebi aga.

Enyemaka Ihe Onwunwe

Ndịàmà Jehova nọ na France, Belgium, na Switzerland agbalịwo karịsịa n’inyere ndị gbara ọsọ ndụ nọ n’ogige ndị a aka. Ụfọdụ agawo n’ogige ndị ahụ dị na Tanzania, site ná nkwado nke Ministri Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme n’Obodo na òtù UNHCR. Ndịàmà nọ na Europe tụkọtara ihe ọṅụṅụ e ji soyabean mee, ákwà, akpụkpọ ụkwụ, akwụkwọ ndị e ji aga akwụkwọ, na ncha n’ọ̀tụ̀tụ̀ hiri nne. E nyere ihe ndị a ka e kesaara ha ndị nile gbara ọsọ ndụ, n’ikwekọ n’ụkpụrụ Bible bụ́: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.”—Ndị Galeshia 6:10.

Ọrụ ebere ndị a a rụrụ arụpụtawo ihe ndị dị nnọọ mma, na-eme ka ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ bụrụ ndị e nyeere aka. Kọmitii nke Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ n’otu n’ime ogige ndị ahụ si otú a kwupụta ekele ha: “N’aha ogige anyị dum, ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ịgwa unu okwu iji kelee unu maka ọrụ ebere nzukọ unu rụwooro anyị ugboro atọ . . . Uwe ndị ahụ egbowo mkpa nke mmadụ 12,654 bụ́ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka, tinyere ụmụ ọhụrụ . . . Ka ọ dị ugbu a, mmadụ 37,000 bi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke dị na Muyovozi. Ná ngụkọta, e nyeere mmadụ 12,654, ma ọ bụ pasent 34.2 nke ndị bi na ya, aka.”

N’ogige ọzọ, e nyere onye ọ bụla n’ime mmadụ 12,382 gbara ọsọ ndụ uwe atọ, ogige ọzọ nwetakwara ọtụtụ puku akwụkwọ maka ụmụ akwụkwọ sekọndrị na praịmarị nakwa maka ụlọ ọrụ na-elekọta ụmụaka. Onye òtù UNHCR nke ọrụ ya bụ idekọ ihe ndị e butere n’otu n’ime ógbè ndị ahụ kwuru, sị: “Anyị nwere nnọọ ekele maka onyinye ndị e nyere anyị [iji gboo] oké mkpa nke ndị bi n’ogige dị iche iche nke ndị gbara ọsọ ndụ. Ihe ikpeazụ a tụbataara anyị bụ nnukwu igbe 5 ndị akwụkwọ ụmụ akwụkwọ juru na ha, bụ́ ndị ndị na-arụ n’ogige nke anyị kesawooro ndị gbara ọsọ ndụ. . . . Unu emeela nke ukwuu.”

Ọbụna akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta n’ógbè ahụ ekwuwo okwu banyere ihe enyemaka ahụ e wetara. Otu isi akụkọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Sunday News nke May 20, 2001, kwuru, sị: “A Na-ebutere Ndị Gbara Ọsọ Ndụ Nọ na Tanzania Uwe.” Mbipụta ya nke February 10, 2002, kwuru, sị: “Ndị ahụ gbara ọsọ ndụ nwere ekele maka onyinye ahụ n’ihi na ụfọdụ n’ime ụmụaka ha, bụ́ ndị kwụsịworo ịga akwụkwọ n’ihi enweghị uwe, na-agachizi akwụkwọ anya.”

A Na-akpagide Ha Ma Ọ Bụghị n’Enweghị Ụzọ Mgbapụ

Ọ na-ewe ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ gbara ọsọ ndụ ihe dị ka otu afọ iji mee ka ndụ ha kwekọọ n’ụdị ndụ ọhụrụ a na-ebi n’ogige ahụ. Ha na-ebi ndụ dị mfe. Ndịàmà Jehova nọ n’ogige ndị a na-eji ihe ka ukwuu n’oge ha esoro ndị agbata obi ha gbara ọsọ ndụ ekerịta ozi ọma na-akasị obi nke sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ha na-ekwu banyere ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe mmadụ nile “ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” Mgbe ahụ, mmadụ nile “ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” N’ụzọ doro anya, site ná ngọzi Chineke, nke a ga-abụ ụwa nke a na-agaghị enwe ogige ndị gbara ọsọ ndụ na ya.—Maịka 4:3, 4; Abụ Ọma 46:9.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ụlọ ndị dị n’ogige nke dị na Nduta

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Lukole (n’aka nri) Ka a na-eme ndị mmadụ baptizim na Lugufu (n’okpuru)

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbakọ distrikti e nwere n’ogige dị na Lugufu