Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikwere na Chi nke Ọ Pụrụ Ịbụ na Anyị Amaghị

Ikwere na Chi nke Ọ Pụrụ Ịbụ na Anyị Amaghị

Ikwere na Chi nke Ọ Pụrụ Ịbụ na Anyị Amaghị

MMADỤ abụọ n’ime mmadụ atọ ọ bụla nọ na Germany kweere na Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe a jụrụ ihe karịrị otu puku mmadụ otú Chi ha kweere na ya dị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla n’ime ha nyere azịza dị iche. “Ndị Germany n’otu n’otu nwere echiche nke aka ha banyere Chineke, bụ́ ndị dịgasịkwa nnọọ iche otú ndị ahụ n’onwe ha si dịgasịa iche,” ka magazin na-ebu akụkọ bụ́ FOCUS na-akọ. Ọ bụ ezie na ikwere na Chineke bụ ihe kwesịrị ịja mma, ọ́ bụghị ihe dị mwute ikwere na ya n’amaghị ihe ọ dị ka ya?

Ọ bụghị nanị na Germany ka e nwere ndị na-ejighị n’aka otú Chineke dị ma ọ bụkwanụ onye ọ bụ; e nwekwara ha n’ebe ndị ọzọ na Europe. Nnyocha e mere n’Austria, Britain, na Netherlands gosiri na ọtụtụ mmadụ n’ebe nile kweere na Chineke bụ “ike ka elu ma ọ bụ ihe nzuzo a na-apụghị ịkọwa akọwa.” Ndị na-eto eto karịsịa, ọbụna ndị nke kweere na ya, na-ewere ya na ọ bụ ihe omimi.

Ị̀ Maara Chineke nke Ọma?

E nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ịmara banyere mmadụ na ịmara onye ahụ nke ọma. Ịmara banyere mmadụ—eze nke ị na-ahụtụbeghị, ọkachamara n’egwuregwu, onye a ma ama n’ime ihe nkiri—pụtara nnọọ ịmara na ọ dị adị. Otú ọ dị, ịmara mmadụ nke ọma na-agụnye ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-agụnye ịmara àgwà, omume, na mmetụta nke onye ahụ, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya, na atụmatụ ya banyere ọdịnihu. Ịmara mmadụ nke ọma na-eme ka i nwee ike iso ya nwee mmekọrịta chiri anya.

Ọtụtụ narị puku mmadụ ekpebiwo na nanị ịmara Chineke n’ụzọ na-edoghị anya—ma ọ bụ nanị ịmara na ọ dị adị—ezughị. Ha emewo ihe karịrị nnọọ nke ahụ site n’ịmara Chineke nke ọma. Hà ahụtawo ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị? Otu nwoke aha ya bụ Paul, onye bi n’ebe ugwu Germany, bụ́kwa onye nweburu nanị nkwenkwe nkịtị banyere Chineke, kpebiri ịmatakwu Ya nke ọma. Paul na-akọwa, sị: “Ịmara Chineke nke ọma na-achọ oge na mgbalị, ma ọ na-arụpụta ihe dị mma. Iso Onye Okike na-enwe mmekọrịta chiri anya na-eme ka ndụ a na-adị kwa ụbọchị ka mma.”

Oge na mgbalị a chọrọ iji mara Chineke nke ọma ò kwesịrị ya? Biko gụọ isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

E nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ịmara banyere mmadụ na ịmara onye ahụ nke ọma