N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
“N’aka Onyenwe anyị ka m natara ihe ahụ nke m nyefekwara unu.”—1 Ndị Kọrint 11:23.
1, 2. Gịnị ka Jizọs mere n’abalị Ememe Ngabiga na 33 O.A.?
ỌKPARA Jehova mụrụ nanị ya nọ ya. Ndị ikom 11 bụ́ ndị ‘rapawooro n’ahụ́ ya n’ọnwụnwa ya dị iche iche’ nọkwa ya. (Luk 22:28) Ọ bụ n’uhuruchi Thursday, March 31, 33 O.A., o yikwara nnọọ ka ọnwa na-eti gbaa ò mere ka ihu igwe maa mma na Jeruselem. Jizọs Kraịst na ndịozi ya ka mesịrị Ememe Ngabiga. E mewo ka onye sabo bụ́ Judas Iskarịọt pụọ, ma oge erubeghị ka ndị ọzọ pụọ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs na-aga ime ihe dị nnọọ oké mkpa. Gịnị ka ọ bụ?
2 Ebe ọ bụ na onye so dee Oziọma ndị ahụ bụ́ Matiu nọ n’ebe ahụ, ka ọ kọọrọ anyị. O dere, sị: “Jizọs weere otu ogbe achịcha, mgbe ọ gọzisịworo ya, ọ nyawara ya, ka ọ na-enye ya ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịkwara: ‘Naranụ, rie. Nke a pụtara ahụ́ m.’ Ọzọ, o buuru iko, mgbe o nyesịworo ekele, o bunyekwara ha ya, na-asị: ‘Ṅụọnụ, unu nile; n’ihi na nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,” bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’” (Matiu 26:26-28) Nke a ọ̀ gaje ịbụ ihe a ga-eme otu ugboro? Gịnị ka ọ pụtara? Ọ̀ dị ihe ọ pụtara nye anyị taa?
“Nọgidenụ Na-eme Nke A”
3. N’ihi gịnị ka ihe Jizọs mere n’abalị Naịsan 14, 33 O.A. ji dị ịrịba ama?
3 Ihe Jizọs Kraịst mere n’abalị Naịsan 14, 33 O.A. abụghị nnọọ ihe omume e mere na mberede n’oge ndụ ya. Pọl onyeozi kwuru okwu banyere ya mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Kọrint akwụkwọ, bụ́ ebe a ka na-agbaso ụkpụrụ ahụ ka ihe karịrị afọ 20 gasịrị. Ọ bụ ezie na Pọl esoghị Jizọs na ndịozi 11 ahụ nọrọ na 33 O.A., n’ezie o si n’aka ụfọdụ ndịozi mata ihe mere n’oge ahụ. Ọzọkwa, ihe àmà na-egosi na e mere ka Pọl kwenye na akụkụ ụfọdụ nke ihe omume ahụ mere eme site n’ihe e kpugheere 1 Ndị Kọrint 11:23-25.
ya site n’ike mmụọ nsọ. Pọl kwuru, sị: “N’aka Onyenwe anyị ka m natara ihe ahụ nke m nyefekwara unu, na Onyenwe anyị Jizọs, n’abalị ahụ a gaje ịrara ya nye, weere otu ogbe achịcha, mgbe o nyesịrị ekele, ọ nyawara ya wee sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu. Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.’ O mere otu ihe ahụ n’ihe banyere iko ahụkwa, mgbe o risịworo nri anyasị, na-asị: ‘Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke na-adabere n’ọbara m. Nọgidenụ na-eme nke a, n’oge nile unu na-aṅụ ya, iji na-echeta m.’”—4. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji kwesị ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
4 Onye so dee Oziọma ndị ahụ bụ́ Luk kwetara na Jizọs nyere iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) A sụgharịwokwa okwu ndị a ịbụ: “Na-emenụ nke a dị ka ememe ncheta m.” (The Jerusalem Bible) N’ezie, a na-akpọkarị ememe a Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Pọl kpọkwara ya Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—aha kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na e guzobere ya n’abalị. (1 Ndị Kọrint 11:20) E nyere Ndị Kraịst iwu ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ma n’ihi gịnị ka e ji guzobe ememe a?
Ihe Mere E Ji Guzobe Ya
5, 6. (a) Gịnị bụ otu ihe mere Jizọs ji guzobe Ememe Ncheta ahụ? (b) Kwuo ihe ọzọ mere e ji guzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.
5 Otu ihe mere e ji guzobe Ememe Ncheta ahụ metụtara otu nzube ọnwụ Jizọs mezuru. Ọ nwụrụ dị ka onye na-akwado ọbụbụeze nke Nna ya nke eluigwe. Kraịst si otú a mee Setan bụ́ Ekwensu onye ụgha, bụ́ onye boworo ụmụ mmadụ ebubo ụgha na ha na-ejere Chineke ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe ha nanị. (Job 2:1-5) Ọnwụ Jizọs nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi gosipụtara na ebubo a bụ ụgha ma mee ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.
6 Ihe ọzọ mere e ji guzobe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ iji chetara anyị na site n’ọnwụ ya dị ka mmadụ zuru okè nke na-emeghị mmehie, Jizọs ‘nyere mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Mgbe nwoke mbụ ahụ mehiere megide Chineke, ọ tụfuru ndụ mmadụ zuru okè na atụmanya ya nile. Otú ọ dị, Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) N’ezie, “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-echetara anyị ịhụnanya dị ukwuu nke ma Jehova ma Ọkpara ya gosiri anyị n’ihe banyere ọnwụ ịchụ àjà nke Jizọs. Lee ka anyị si kwesị inwe ekele maka ịhụnanya ahụ!
Olee Mgbe E Kwesịrị Ịdị Na-eme Ya?
7. Olee otú o si bụrụ na Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekere òkè n’Ememe Ncheta ahụ “n’oge nile”?
7 Pọl kwuru banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, sị: “N’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.” (1 Ndị Kọrint 11:26) Ndị Kraịst e tere mmanụ n’otu n’otu ga na-ekere òkè n’ihe nnọchianya ahụ ruo mgbe ha ga-anwụ. N’ụzọ dị otú a, ha ga-anọ n’ihu Jehova Chineke na ụwa kpọsaa, ugboro ugboro, okwukwe ha nwere ná ndokwa Chineke mere maka àjà mgbapụta Jizọs.
8. Ruo ole mgbe ka ndị so ná ndị e tere mmanụ ga na-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
8 Ruo ole mgbe ka ndị so ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ga na-eme Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst? Ọ bụ “ruo mgbe ọ ga-abịarute,” ka Pọl kwuru, na-apụta, dị ka ihe àmà na-egosi, na a ga-anọgide na-eme ememe a ruo mgbe Jizọs ga-abịarute ịnabata ụmụazụ ya e tere mmanụ n’eluigwe site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ n’oge “ọnụnọ” ya. (1 Ndị Tesalonaịka 4:14-17) Nke a kwekọrọ n’ihe Jizọs gwara ndịozi 11 ahụ na-eguzosi ike n’ihe, sị: “Ọ bụrụ na mụ agaa wee kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.”—Jọn 14:3.
9. Gịnị ka okwu Jizọs nke e dekọrọ na Mak 14:25 pụtara?
9 Mgbe Jizọs guzobere Ememe Ncheta ahụ, o kwuru banyere iko mmanya ma gwa ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Agaghị m aṅụ ihe sitere Mak 14:25) Ebe ọ bụ na Jizọs agaghị na-aṅụ mmanya nkịtị n’eluigwe, o doro anya na ihe o bu n’uche bụ ọṅụ nke a na-eji mmanya eme ihe atụ ya mgbe ụfọdụ. (Abụ Ọma 104:15; Eklisiastis 10:19) Ịnọkọta ọnụ n’Alaeze ahụ ga-abụ ahụmahụ na-enye ọṅụ nke ya na ụmụazụ ya na-atụsi anya ya ike.—Ndị Rom 8:23; 2 Ndị Kọrint 5:2.
ná mmanya vaịn ọzọ ma ọlị ruo ụbọchị ahụ mgbe m ga-aṅụ ya nke ọhụrụ n’alaeze Chineke.” (10. Ugboro ole ka e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta?
10 È kwesịrị ịdị na-eme ememe ncheta ọnwụ Jizọs kwa ọnwa, kwa izu, ma ọ bụ ọbụna kwa ụbọchị? Ee e. Jizọs guzobere ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụbọchị Ememe Ngabiga, bụ́ nke a na-eme dị ka “ihe ncheta” nke nnapụta a napụtara Izrel site n’agbụ n’Ijipt na 1513 T.O.A., e gbuokwa ya n’ụbọchị ahụ. (Ọpụpụ 12:14) A na-eme Ememe Ngabiga ahụ nanị otu ugboro n’afọ, n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa ndị Juu bụ́ Naịsan. (Ọpụpụ 12:1-6; Levitikọs 23:5) Nke a na-egosi na e kwesịrị ime ememe ncheta ọnwụ Jizọs nanị ugboro ole ahụ a na-eme Ememe Ngabiga—otu ugboro n’afọ—ọ bụghị kwa ọnwa, kwa izu, ma ọ bụ kwa ụbọchị.
11, 12. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-ekpughe banyere Ememe Ncheta ndị mbụ e mere?
11 Ya mere, o kwesịrị ekwesị ime Ememe Ncheta ahụ otu ugboro n’afọ na Naịsan 14. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “A na-akpọ Ndị Kraịst nọ n’Asia Minor ndị Quartodeciman [Ndị Ụbọchị nke Iri na Anọ] n’ihi omume maara ha ahụ́ nke ime ememe pascha [Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị] mgbe nile n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa Naịsan . . . Akara ụbọchị ahụ pụrụ ịmanye na Friday ma ọ bụ n’ụbọchị ọ bụla ọzọ n’izu.”—The New Schaff-Herzog Encyclopedia of Religious Knowledge, Mpịakọta nke 4, peeji nke 44.
12 N’ikwu banyere otú e si mee ya na narị afọ nke abụọ O.A., ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. L. von Mosheim kwuru na ndị Quartodeciman na-eme Ememe Ncheta ahụ na Naịsan 14 n’ihi na “ha weere ihe nlereanya Kraịst dị ka iwu.” Onye ọzọ na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu, sị: “Otú chọọchị Quartodeciman ndị dị n’Eshia si jiri ya mee ihe na otú chọọchị ahụ dị na Jeruselem si jiri ya mee ihe bụ otu ihe. Na narị afọ nke 2 chọọchị ndị a, n’oge Pascha ha n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa Naịsan, mere ememe ncheta nke mgbapụta nke ọnwụ Kraịst wetara.”—Studia Patristica, Mpịakọta nke Ise, 1962, peeji nke 8.
Ihe Achịcha ahụ Pụtara
13. Olee ụdị achịcha Jizọs ji mee ihe mgbe ọ na-eguzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
13 Mgbe Jizọs guzobere Ememe Ncheta ahụ, “o weere otu ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya ma nye [ya ndịozi ahụ].” (Mak 14:22) Achịcha ha ji mee ihe n’oge ahụ bụ ụdị nke ahụ ha ka ji nnọọ mechaa ihe n’Ememe Ngabiga. (Ọpụpụ 13:6-10) Ebe ọ bụ na e mere ya n’etinyeghị ya ihe na-eko achịcha, ọ dị mbadamba ma na-agbari ngwa ngwa, a ghaghịkwa ịnyawa ya anyawa iji kesaa ya. Mgbe Jizọs mụbara achịcha n’ụzọ ọrụ ebube maka ọtụtụ puku mmadụ, achịcha ahụ dịkwa ka biskit, n’ihi na ọ nyawara ya anyawa ka e wee nwee ike ikesa ya. (Matiu 14:19; 15:36) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ịnyawa achịcha Ememe Ncheta enweghị ihe ọ pụtara n’ụzọ ime mmụọ.
14. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na achịcha Ememe Ncheta ga-abụ nke na-ekoghị eko? (b) Olee ụdị achịcha a pụrụ inweta ma ọ bụ mee maka iji eme ihe ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
14 Jizọs kwuru banyere achịcha ahụ o ji mee ihe mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ncheta, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu.” (1 Ndị Kọrint 11:24; Mak 14:22) O kwesịrị ekwesị na achịcha ahụ ekoghị eko. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe na-eko achịcha pụrụ ịpụta ịdị njọ, ajọ omume, ma ọ bụ mmehie. (1 Ndị Kọrint 5:6-8) Achịcha ahụ na-anọchi anya ahụ́ mmadụ zuru okè na nke na-enweghị mmehie nke Jizọs, bụ́ nke a chụworo n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka àjà mgbapụta. (Ndị Hibru 7:26; 10:5-10) Ndịàmà Jehova na-eburu nke a n’uche ma na-agbaso ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ site n’iji achịcha na-ekoghị eko na-eme ihe n’Ememe Ncheta. N’ọnọdụ ụfọdụ, ha na-eji achịcha matzo nke ndị Juu bụ́ nke na-adịghị atọ ụtọ, nke a na-etinyeghịkwa ihe ọ bụla ọzọ, dị ka yabasị ma ọ bụ àkwá, eme ihe. Ma ọ́ bụghị ya, a pụrụ iji ntakịrị ntụ ọka (ebe o kwere mee, ntụ wit) a gwara obere mmiri mee achịcha na-ekoghị eko. E kwesịrị ime ụtụ ọka ahụ a gwọrọ agwọ ka ọ dị mbadamba ma jiri efere e ji eme achịcha nke e tetụrụ mmanụ na ya mee ya ruo mgbe ọ kpọrọ nkụ ma na-agbari ngwa ngwa.
Ihe Mmanya ahụ Pụtara
15. Gịnị dị n’ime iko ahụ e ji mee ihe mgbe Kraịst guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya?
15 Mgbe e bugharịsịrị achịcha ahụ na-ekoghị eko, Jizọs weere iko, “[nye] ekele, bunyekwa ya [ndịozi ahụ], ha nile wee ṅụọ ya.” Jizọs wee kọwaa, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ.” (Mak 14:23, 24) Gịnị dị n’ime iko ahụ? Ọ bụ mmanya gbara ụka, ọ bụghị mmiri mkpụrụ osisi vaịn na-agbaghị ụka. Mgbe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mmanya, o bughị n’uche mmiri mkpụrụ osisi vaịn. Dị ka ihe atụ, ọ bụ mmanya gbara ụka, ọ bụghị mmiri mkpụrụ osisi vaịn, ga-agbawali “akpụkpọ mmanya meworo ochie,” dị ka Jizọs kwuru. Ndị iro Kraịst bokwara ya ebubo na ọ ‘na-aṅụ oké mmanya.’ Nke ahụ gaara abụwo ebubo na-enweghị isi ma ọ bụrụ na mmanya ahụ bụ mmiri mkpụrụ osisi vaịn nkịtị. (Matiu 9:17; 11:19) A ṅụrụ mmanya n’oge Ememe Ngabiga, Kraịst jikwa ya mee ihe mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ncheta ọnwụ ya.
16, 17. Olee ụdị mmanya kwesịrị ekwesị maka Ememe Ncheta, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
16 Ọ bụ nanị mmanya na-acha ọbara ọbara bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke ihe ihe dị n’ime iko ahụ nọchiri anya ya, ya bụ, ọbara Jizọs a wụsịrị. O kwuru n’onwe ya, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ.” Pita onyeozi dekwara, sị: “Unu [Ndị Kraịst e tere mmanụ] maara na ọ bụghị ihe ndị pụrụ ire ure, ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ka e ji gbapụta unu n’ụdị omume unu nke na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ nke unu natara site n’ọdịnala sitere n’aka ndị nna ochie unu. Kama ọ bụ ọbara dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ na-enweghị mmerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ, ọbụna nke Kraịst.”—1 Pita 1:18, 19.
17 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ mmanya vaịn na-acha ọbara ọbara ka Jizọs ji mee ihe mgbe ọ na-eguzobe Ememe Ncheta ahụ. Otú ọ dị, ụfọdụ mmanya ndị na-acha ọbara ọbara e nwere n’oge a ekwesịghị ekwesị n’ihi na a gbanyere ha kaịkaị ma ọ bụ brandy iji mee ka ha sie ike ma ọ bụ tinye ha mkpá akwụkwọ na ihe ndị na-eme ka ihe dị ụtọ. Ọbara Jizọs zuru ezu, ọ chọghị itinye ya ihe ọzọ. N’ihi ya, mmanya ndị dị ka port, sherry, na vermounth, agaghị ekwesị ekwesị. Ọ bụ mmanya na-acha ọbara ọbara na-adịghị ụtọ, nke na-esighịkwa ike kwesịrị ịdị n’iko Ememe Ncheta ahụ. A pụrụ iji mmanya vaịn na-acha ọbara ọbara na-adịghị ụtọ nke mmadụ ji aka ya mee mee ihe, a pụkwara iji mmanya ndị dị ka burgundy na claret na-acha ọbara ọbara mee ihe.
18. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ na Jizọs rụrụ ọrụ ebube n’ihe banyere achịcha na mmanya Ememe Ncheta ahụ?
18 Mgbe Jizọs na-eguzobe nri a, ọ rụghị ọrụ ebube, na-agbanwe ihe nnọchianya ndị ahụ ịbụ ahụ́ na ọbara nkịtị ya. Iri anụ mmadụ na ịṅụ ọbara bụ imebi iwu Chineke. (Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:10) Anụ ahụ́ na ọbara Jizọs dum ka dị ya n’ahụ́. O nyere ndụ ya dị ka àjà zuru okè, a wụpụkwara ọbara ya n’ehihie na-esonụ nke otu ụbọchị ndị Juu ahụ, bụ́ Naịsan 14. N’ihi ya, achịcha na mmanya Ememe Ncheta ahụ bụ ihe nnọchianya, na-anọchi anya ahụ́ na ọbara Kraịst. *
Ememe Ncheta Ahụ —Nri A Na-erikọ Ọnụ
19. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri ihe karịrị otu efere na otu iko mee ihe mgbe a na-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
19 Mgbe Jizọs guzobere Ememe Ncheta ahụ, ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ha ṅụkọọ n’otu iko. Oziọma Matiu na-ekwu, sị: “[Jizọs] buuru iko, mgbe o nyesịworo ekele, o bunyekwara ha ya, na-asị: ‘Ṅụọnụ, unu nile.’” (Matiu 26:27) Iji nanị ‘otu iko,’ ọ bụghị ọtụtụ iko, mee ihe enyeghị nsogbu, ebe ọ bụ na n’oge ahụ, ọ bụ nanị mmadụ 11 ihe àmà na-egosi na ha nọ n’otu tebụl ṅụrụ ya, ọ pụkwara ịdịrị ha mfe ibugharị iko ahụ n’etiti onwe ha. N’afọ a, ọtụtụ nde mmadụ ga-ezukọta maka ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ihe karịrị ọgbakọ 94,000 nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. Ebe imerime mmadụ ga-ezukọta maka ememe a n’otu abalị ahụ, ikekwe a pụghị iji nanị otu iko mee ihe maka mmadụ nile. Ma a na-eji otu ụkpụrụ ahụ eme ihe n’ọgbakọ ndị buru ibu site n’iji ọtụtụ iko eme ihe ka e wee nwee ike ibugharị ha n’etiti ndị na-ege ntị n’obere oge. N’otu aka ahụ, a pụrụ iji ihe karịrị otu efere mee ihe maka achịcha ahụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na iko ma ọ bụ iko nkụwa ahụ n’onwe ya kwesịrị inwe kpọmkwem otú ọ ga-adịrịrị. Otú ọ dị, ya na efere ahụ kwesịrị igosipụta ùgwù nke ihe omume ahụ dị. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịgbaju mmanya n’iko ahụ ruo n’ókè nke na ọ pụrụ ịkwafu mgbe a na-ebugharị ya.
20, 21. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Ememe Ncheta ahụ bụ nri a na-erikọ ọnụ?
20 Ọ bụ ezie na a pụrụ iji ihe karịrị otu efere achịcha na otu iko mmanya mee ihe, Ememe Ncheta ahụ bụ nri a na-erikọ ọnụ. N’Izrel oge ochie, mmadụ pụrụ iweta nri a ga-erikọ ọnụ site n’iweta anụmanụ n’ebe ịchụàjà Chineke, bụ́ ebe a ga-anọ gbuo ya. A na-esure otu akụkụ nke anụmanụ ahụ n’ọkụ n’ebe ịchụàjà, nye onye nchụàjà chụrụ àjà ahụ otu akụkụ, nyekwa ụmụ Erọn bụ́ ndị nchụàjà otu akụkụ, ebe onye ahụ wetara nri ahụ na ezinụlọ ya ga-eso rie nri ahụ. (Levitikọs 3:1-16; 7:28-36) Ememe Ncheta ahụ bụkwa nri a na-erikọ ọnụ n’ihi na ọtụtụ ndị na-eso eri ya.
21 Jehova na-eso eri nri a a na-erikọ ọnụ dị ka Onye malitere ndokwa ahụ. Jizọs bụ àjà ahụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekerekwa òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ dị ka ndị so na-ekerịta ihe. Iri ihe na tebụl Jehova na-egosi na ndị ahụ na-eri ihe na ya na Jehova dị n’udo. N’ihi ya, Pọl dere, sị: “Iko ngọzi ahụ nke anyị na-agọzi, ọ́ bụghị ikere òkè n’ọbara nke Kraịst ahụ? Ogbe achịcha ahụ nke anyị na-anyawa, ọ́ bụghị ikere òkè n’ahụ́ nke Kraịst ahụ? N’ihi na e nwere otu ogbe achịcha, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ́, ebe anyị nile na-ekere òkè n’otu ogbe achịcha ahụ.”—1 Ndị Kọrint 10:16, 17.
22. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere Ememe Ncheta ka anyị ka ga-aza?
22 Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ nanị ememe okpukpe nke Ndịàmà Jehova na-eme otu ugboro n’afọ. Nke a kwesịrị ekwesị n’ihi na Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” N’Ememe Ncheta ahụ, anyị na-echeta ọnwụ Jizọs, bụ́ ọnwụ nke gosipụtara oruru o ruuru Jehova ịbụ eze. Dị ka anyị kwuworo, ná nri a a na-erikọ ọnụ, achịcha ahụ na-anọchi anya ahụ́ Kraịst a chụrụ n’àjà, mmanya ahụ na-anọchikwa anya ọbara ya a wụsịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-ekere òkè n’achịcha na mmanya ahụ bụ́ ihe nnọchianya. N’ihi gịnị ka o ji dị otú a? Ememe Ncheta ahụ ò nwere ezi ihe ọ pụtara nye ọtụtụ nde ndị na-adịghị ekere òkè? N’ezie, gịnị ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị kwesịrị ịpụta nye gị?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Lee Mpịakọta nke 2, peeji nke 271, nke Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
• N’ihi gịnị ka Jizọs ji guzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
• Ugboro ole ka e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta?
• Gịnị ka achịcha na-ekoghị eko nke Ememe Ncheta ahụ pụtara?
• Gịnị ka mmanya Ememe Ncheta ahụ na-anọchi anya ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Jizọs guzobere Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị