Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ ‘Na-azụpụta Oge Kwesịrị Ekwesị’?

Ị̀ ‘Na-azụpụta Oge Kwesịrị Ekwesị’?

Ị̀ ‘Na-azụpụta Oge Kwesịrị Ekwesị’?

PỌL onyeozi dụrụ Ndị Kraịst nọ n’Efesọs na narị afọ mbụ ọdụ, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’ihi gịnị ka ndụmọdụ a ji dị oké mkpa? Inweta azịza nye ajụjụ a chọrọ anyị ibu ụzọ mara ọnọdụ chere Ndị Kraịst ihu n’obodo oge ochie ahụ.

E ji oké akụ̀ na ụba, ajọ omume rụrụ arụ, oké ime mpụ, na ụdị dịgasị iche iche nke ofufe ndị mmụọ ọjọọ mara Efesọs. Tụkwasị na nke ahụ, Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ aghaghị ịgba mgba megide nkwenkwe nkà ihe ọmụma banyere oge. Ndị Gris na-abụghị Ndị Kraịst bụ́ ndị bi n’Efesọs ekweghị na oge chere ihu n’otu ebe. Ndị ọkà ihe ọmụma Gris akụziworo ha na a na-ebighachi ndụ ugboro ugboro. Onye lara oge ya n’iyi n’otu oge ndụ pụrụ inwetaghachicha ya n’oge ndụ ọzọ. Echiche dị otú a pụrụ idubawo Ndị Kraịst nọ n’Efesọs n’inwe àgwà ejighị ihe kpọrọ ihe n’ihe banyere oge Jehova dokwara maka ihe omume ụfọdụ, gụnyere oge o dokwara maka ikpe ya. N’ihi ya, ndụmọdụ Pọl nyere ka a ‘zụpụta oge kwesịrị ekwesị’ dabara adaba.

Pọl adịghị ekwu banyere oge n’ozuzu ya. Okwu Grik o ji mee ihe na-apụta oge a kara aka, oge kwesịrị ekwesị maka otu nzube a kpọrọ aha. Pọl nọ na-adụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ ọdụ ka ha jiri oge kwesịrị ekwesị, ma ọ bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma, nke ha nwere mgbe ahụ mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya tupu ya agwụ, bụ́ mgbe ha na-agaghịzi abụ ndị Chineke ga-emere ebere na ndị ọ ga-azọpụta.—Ndị Rom 13:11-13; 1 Ndị Tesalonaịka 5:6-11.

Anyị na-ebi n’oge kwesịrị ekwesị dị ka nke ha. Kama ịla oge a a na-anara mmadụ nke ọma bụ́ nke a na-agaghị enwetaghachi ọzọ n’iyi site n’ịchụso ihe ụtọ na-adịru nwa oge nke a na-enweta n’ụwa, Ndị Kraịst ga-abụ ndị maara ihe ma ọ bụrụ na ha ejiri oge ha nwere ugbu a na-eme “omume nke ịsọpụrụ Chineke” ma si otú ahụ na-ewusi mmekọrịta ha na Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, ike.—2 Pita 3:11; Abụ Ọma 73:28; Ndị Filipaị 1:10.