Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Achọtara M Ihe Nile Dị M Mkpa”

“Achọtara M Ihe Nile Dị M Mkpa”

“Achọtara M Ihe Nile Dị M Mkpa”

DỊ KA otu akụkọ sitere n’aka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa si kwuo, e mere atụmatụ na, ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị nde mmadụ 120 n’ụwa nile gaje ịda mbà n’obi. Kwa afọ, otu nde mmadụ na-egbu onwe ha, ọnụ ọgụgụ mmadụ dị n’agbata nde 10 ruo nde 20 na-anwakwa igbu onwe ha. Enyemaka dị aṅaa ka e nwere maka ndị dara mbà n’obi? Ọgwụ pụrụ ibelata nhụjuanya ha, nkwado n’ụzọ mmetụta uche dịkwa oké mkpa. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị dara mbà n’obi achọtakwuwo enyemaka n’akwụkwọ ndị bara uru dabeere na Bible Ndịàmà Jehova na-ebipụta, dị ka akwụkwọ ozi na-esonụ bụ́ nke e si France nweta na-egosi.

“N’oge na-adịchaghị anya gara aga, ahụghị m ihe mere m ga-eji nọgide na-adị ndụ. Ekpekuru m Chineke ekpere ka ọ hapụ m ka m nwụọ. Ọ dị ka a ga-asị na mụ anwụọla n’ime. N’ịchọ nduzi, ekpekusiri m Jehova ekpere ike. Ekpebikwara m ịgụ 2002 Yearbook of Jehovah’s Witnesses ma gụchapụ ya n’ime ụbọchị atọ. Aghaghị m ikwu na ọ gbara m ume nke ukwuu ma mee ka okwukwe m sikwuo ike.

“Emere m nnyocha ụfọdụ na magazin Ụlọ Nche na Teta!, leekwa ihe ịtụnanya m chọpụtara! Agụchiwo m magazin ndị a anya ruo ihe karịrị afọ 15, ma achọpụtabeghị m kpọmkwem otú isiokwu ndị dị na ha si bụrụ nnọọ ihe na-agba ume ma na-akpali akpali. Ihe ha na-ekwu jupụtara n’ịhụnanya—àgwà nke kọrọ nnọọ ụkọ n’oge a. Achọtara m ihe nile dị m mkpa.”

Bible na-ekwu, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị nile “obi ha tiwara etiwa” ma ọ bụ “ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha” pụrụ inweta agbamume na olileanya maka ọdịnihu n’ime Bible. Ndịàmà Jehova na-ekesa akwụkwọ ndị dabeere na Bible iji nyere ndị nọ ná mkpa aka irite uru n’ihe ahụ sitere n’aka Chineke bụ́ nke e si na ya enweta nkasi obi.