Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Meriri Mkpagbu

Ha Meriri Mkpagbu

Ha Meriri Mkpagbu

A MỤRỤ Frieda Jess na 1911 na Denmark, bụ́ ebe ya na ndị mụrụ ya si kwaga na Husum nke dị n’ebe ugwu Germany. Afọ ụfọdụ ka e mesịrị, o nwetara ọrụ na Magdeburg, na 1930 kwa, e mere ya baptizim dị ka otu n’ime Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Hitler batara n’ọchịchị na 1933, nyekwa Frieda, nke a bụ mmalite nke mmeso ọjọọ nke were afọ 23 site n’aka, ọ bụghị otu ọchịchị aka ike, kama abụọ.

Na March 1933, ọchịchị Germany mere ndokwa ime ntụli aka. Dr. Detlef Garbe, bụ́ onyeisi nke Ebe Ncheta nke Ogige Ịta Ahụhụ nke Neuengamme nke dị nso na Hamburg na-akọwa, sị: “Ọchịchị ndị Nazi chọrọ ịmanye ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ịtụnyere onyeisi ala nke ha họpụtara na onye ndú ha, bụ́ Adolf Hitler.” Ndịàmà Jehova gbasoro ndụmọdụ Jizọs nke ịnọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ‘ịghara ịbụ akụkụ nke ụwa,’ n’ihi ya ha atụghị vootu. Gịnị si na ya pụta? A machibidoro Ndịàmà iwu.—Jọn 17:16.

Frieda nọgidere na-arụ ọrụ ya dị ka Onye Kraịst na nzuzo, ọbụna na-enye aka n’ibipụta magazin Ụlọ Nche. “E zobara ụfọdụ n’ime magazin ndị ahụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche maka ndị kwere ekwe ibe anyị,” ka o kwuru. E jidere ya na 1940, ndị Gestapo gbakwara ya ajụjụ ọnụ, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nọrọ ọnwa ole na ole n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ. Olee otú o si tachie obi? Ọ na-ekwu, sị: “Ekpere bụ ebe mgbaba m. Ana m amalite ikpe ekpere n’isi ụtụtụ, na-ekpekwa ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị. Ekpere nyere m ume ma nyere m aka ịghara ichegbubiga onwe m ókè.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

A tọhapụrụ Frieda, ma na 1944, ndị Gestapo jidere ya ọzọ. Na nke ugbu a, a mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ asaa n’ụlọ mkpọrọ dị na Waldheim. Frieda gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nche ụlọ mkpọrọ kpọgara m iso ụfọdụ ụmụ nwanyị na-arụ ọrụ n’ebe a na-asacha ihe na-arụ ọrụ. Mụ na otu onye mkpọrọ si Czechoslovakia na-anọkarị, n’ihi ya agwara m ya okwu ugboro ugboro banyere Jehova nakwa banyere nkwenkwe m. Mkparịta ụka ndị ahụ wusiri m ike.”

A Tọhapụrụ Ya Ma Ọ Bụghị Ruo Ogologo Oge

Ndị agha Soviet weghaara ụlọ mkpọrọ dị na Waldheim na May 1945, Frieda nwekwaara onwe ya ịlaghachi Magdeburg na ịmaliteghachi ozi ọ na-eje maka ọha, ma ọ bụghị ruo ogologo oge. A malitekwara ịkpa ókè megide Ndịàmà ọzọ, nke ugbu a site n’aka ndị ọchịchị nọ n’Ógbè Ndị Soviet Weghaara. Gerald Hacke nke Ụlọ Ọrụ Hannah-Arendt Maka Inyocha Ọchịchị Aka Ike na-ede, sị: “Ndịàmà Jehova so n’òtù ole na ole ọchịchị aka ike abụọ e nwere n’ala Germany kpagburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’esepụghị aka.”

N’ihi gịnị ka e ji maliteghachi ịkpa ókè megide ha? Ọzọkwa, ihe na-ese bụ nnọpụiche Ndị Kraịst. Na 1948, a tụrụ vootu, bụ́ ntụli aka nke ọha obodo mere, na East Germany, dịkwa ka Hacke si kọwaa, “isi ihe mere e ji [kpagbuo Ndịàmà Jehova] bụ n’ihi na ha ekereghị òkè n’ịtụ vootu ahụ.” N’August 1950, a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na East Germany. E jidere ọtụtụ narị mmadụ, gụnyere Frieda.

Frieda gaghachiri n’ụlọikpe, a makwara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ isii. “Na nke ugbu a, mụ na ndị kwere ekwe ibe m nọ, mkpakọrịta mụ na ha nyekwaara m aka nke ukwuu.” Mgbe a tọhapụrụ ya na 1956, ọ kwagara West Germany. Frieda dị afọ 90 ugbu a ma biri na Husum, ọ ka na-ejere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ozi.

Ọchịchị aka ike abụọ kpagburu Frieda ruo afọ 23. “Ndị Nazi gbalịrị ịla m n’iyi; Ndị Kọmụnist gbalịrị igbu mmụọ m. Ebee ka m si nweta ume? Ọ bụ site n’ịmụ Bible nke ọma mgbe m nweere onwe m, ikpechi ekpere anya mgbe m nọ nanị m, iso ndị kwere ekwe ibe m na-akpakọrịta mgbe ọ bụla o kwere omume, na iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agwa ndị ọzọ ihe m kweere.”

Ọchịchị Aka Ike Fascist na Hungary

Ala ọzọ a kpara ókè na ya megide Ndịàmà Jehova ruo ọtụtụ iri afọ bụ Hungary. Ụfọdụ nwetara mkpagbu site n’aka, ọ bụghị ọchịchị aka ike abụọ, kama atọ. Otu ihe atụ bụ Ádám Szinger. A mụrụ Ádám na Paks, Hungary, na 1922, a zụlitekwara ya dị ka onye Protestant. Na 1937, ụfọdụ Ndị Mmụta Bible gara n’ụlọ Ádám, o gosikwara mmasị ozugbo n’ozi ha. Ihe ọ mụtara na Bible mere ka o kwenye na ihe chọọchị ya na-akụzi adịghị na Bible. Ya mere, ọ hapụrụ Chọọchị Protestant ma sonyere Ndị Mmụta Bible n’ozi ha na-eje maka ọha.

Ọchịchị aka ike Fascist nọ na-agbanyekwu mkpọrọgwụ na Hungary. Ọtụtụ ugboro ndị uwe ojii hụrụ ka Ádám na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma jide ya maka ịgba ya ajụjụ ọnụ. Nrụgide Ndịàmà na-enweta sikwuru ike, na 1939 kwa, a machibidoro ọrụ ha iwu. Na 1942, e jidere Ádám, kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ, ma tie ya ihe nke ukwuu. Gịnị nyeere ya aka n’oge a ọ dị afọ 19 ịtachi obi mgbe ọ na-ahụju anya nakwa n’ọnwa ndị ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ? “Mgbe m ka nọ n’ụlọ, ejiri m nlezianya mụọ Bible ma ghọta nzube Jehova nke ọma.” Ọ bụ nanị mgbe a tọhapụsịrị Ádám n’ụlọ mkpọrọ ka e mere ya baptizim dị ka Onyeàmà Jehova. Nke ahụ bụ n’abalị n’August 1942, n’otu osimiri dịdewere ụlọ ya.

N’ụlọ Mkpọrọ Dị na Hungary, n’Ogige Ịta Ahụhụ Dị na Serbia

Ka ọ dịgodị, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, Hungary na Germany jikọrọ aka megide Soviet Union, n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1942 kwa, e debanyere aha Ádám maka ije ozi agha. Ọ na-akọ, sị: “Ekwuru m na agaghị m eje ozi agha n’ihi ihe m mụtaworo na Bible. Akọwara m nnọpụiche m.” A mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ 11. Ma Ádám anọteghị aka na Hungary.

Na 1943, a chịkọtara ihe dị ka Ndịàmà Jehova 160, kpọnyejuo ha n’ụgbọ mmiri, ma si n’Osimiri Danube buga ha Serbia. Ádám so n’ime ha. Na Serbia, ndị mkpọrọ a nọzi n’okpuru Ọchịchị Alaeze Ukwu nke Atọ nke Hitler. A tụkpuru ha n’ogige ọrụ mmanye dị na Bor ma manye ha ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ọla kọpa. Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, e bughachiri ha Hungary, bụ́ ebe ndị agha Soviet nọ tọhapụ Ádám n’oge opupu ihe ubi nke 1945.

Hungary n’Okpuru Ọchịchị Kọmụnist

Ma ha enwereghị onwe ha ruo ogologo oge. Ka ọ na-eru ná ngwụsị afọ ndị 1940, ndị ọchịchị Kọmụnist nọ na Hungary machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu, dị nnọọ ka ndị Fascist mere tupu oge agha ahụ. Na 1952, e jidere Ádám, bụ́ onye dịzi afọ 29, lụọ nwanyị ma mụta ụmụ abụọ, ma bo ya ebubo mgbe ọ jụrụ ọzọ ije ozi agha. Ádám kọwara n’ụlọikpe, sị: “Nke a abụghị nke mbụ m jụrụ ije ozi agha. N’oge agha, agara m mkpọrọ, a gbakwaara m ụgbọ nwa mkpi gaa Serbia n’ihi otu ihe a. Ajụrụ m ịbanye n’òtù ndị agha n’ihi akọ na uche m. Abụ m Onyeàmà Jehova, adịghịkwa m etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” Ikpe a mara Ádám bụ ịga mkpọrọ afọ asatọ, e mesịa wetulata ya ịbụ afọ anọ.

A nọgidere na-akpa ókè megide Ádám ruo n’etiti afọ ndị 1970, bụ́ ihe karịrị afọ 35 eri oge mbụ Ndị Mmụta Bible bịara n’ụlọ ha. N’oge a nile, ụlọikpe isii mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ 23 ná ngụkọta, a kpọchikwara ya ma ọ dịkarịa ala n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ iri. Ọ tachiri obi ná mkpagbu ọchịchị atọ—Ọchịchị Fascist tupu agha adaa na Hungary, Ọchịchị Nazi nke Germany chịrị na Serbia, na Ọchịchị Kọmụnist n’oge agha nzuzo na Hungary—kpagburu ya n’esepụghị aka.

Ádám ka bi n’obodo ya bụ́ Paks, jiri iguzosi ike n’ihe na-ejere Chineke ozi. Ò nwere ikike pụrụ iche nke nyeere ya aka ịtachi obi n’ihe isi ike ndị ahụ ma nwee nnọọ mmeri? Ee e. Ọ na-akọwa, sị:

“Ọmụmụ Bible, ekpere, na iso ndị kwere ekwe ibe m na-akpakọrịta dị oké mkpa. Ma m ga-achọ ime ka ihe abụọ ọzọ pụta ìhè. Nke mbụ, Jehova bụ Isi Iyi nke ume. Iso ya enwe mmekọrịta chiri anya bụ ihe nyeere m aka ịlanarị. Nke abụọ, ebu m ihe dị n’isi 12 nke Ndị Rom n’uche mgbe nile, bụ́ nke na-asị: ‘Unu abọrọla onwe unu ọbọ.’ N’ihi ya ọ dịghị mgbe m buuru mmadụ iwe n’obi. Ọtụtụ mgbe enwere m ohere imegwara ndị na-akpagbu m, ma emeghị m otú ahụ. Anyị ekwesịghị iji ike Jehova na-enye anyị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi mmadụ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.”

Ọgwụgwụ nke Mkpagbu Nile

Frieda na Ádám nwere ike ijere Jehova ozi ugbu a n’enweghị ihe mgbochi. Otú ọ dị, gịnị ka ahụmahụ ndị yiri nke ha na-ekpughe banyere mkpagbu okpukpe? Ọ bụ na mkpagbu ndị dị otú ahụ adịghị aga nke ọma—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ mgbe ọ bụ ezi Ndị Kraịst ka a na-akpagbu. Ọ bụ ezie na ịkpagbu Ndịàmà Jehova mere ka ihe onwunwe ha funahụ ha ma kpatara ha oké nhụjuanya, o mezughị nzube ya. Taa, Ndịàmà Jehova na-abawanye ụba na Europe bụ́ ebe oké ọchịchị aka ike abụọ kpaburu ike.

Olee otú Ndịàmà si meghachi omume ná mkpagbu? Dị ka akụkọ banyere Frieda na Ádám na-egosi, ha tinyere ndụmọdụ Bible a n’ọrụ: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama nọgide jiri ezi ihe na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:21) Ezi ihe ọ̀ ga-emerili ihe ọjọọ n’ezie? Ee, mgbe ezi ihe ahụ sitere n’okwukwe siri ike e nwere na Chineke. Mmeri Ndịàmà Jehova meriri mkpagbu na Europe bụ mmeri nke mmụọ nsọ Chineke, ngosipụta nke ike ya nke na-akpali mmadụ ime ezi ihe bụ́ nke na-esite n’okwukwe nke mmụọ nsọ na-amịpụta n’ime Ndị Kraịst dị umeala n’obi. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ụwa taa nke ime ihe ike jupụtara na ya, nke ahụ bụ ihe mmụta anyị nile pụrụ iburu n’uche.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Frieda Jess (ọ na-azazi Thiele) n’oge e jidere ya na ugbu a

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ádám Szinger n’oge a tụrụ ya mkpọrọ na ugbu a