Ibu Ụzọ Achọ Alaeze Ahụ—Ndụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Obi Ụtọ
Akụkọ Ndụ
Ibu Ụzọ Achọ Alaeze Ahụ—Ndụ E Ji n’Aka na nke Na-enye Obi Ụtọ
DỊ KA JETHA SUNAL SI KỌỌ
Mgbe anyị risịrị nri ụtụtụ, anyị nụrụ ịma ọkwa a na redio: “Ndịàmà Jehova bụ òtù iwu na-akwadoghị, a machibidowokwa ọrụ ha iwu.”
Ọ BỤ na 1950, anyị bụ́ ụmụ agbọghọ anọ dịcha afọ 20 na ụma na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na Dominican Republic. Anyị gara ebe ahụ n’afọ bu ya ụzọ.
Ozi ala ọzọ abụghị ihe mgbaru ọsọ m site na nwata. N’eziokwu, agara m chọọchị mgbe m bụ nwata. Otú ọ dị, papa m kwụsịrị ịga chọọchị n’oge Agha Ụwa Mbụ. N’ụbọchị a kwọrọ m aka n’isi ịbanye na Chọọchị Episcopal na 1933, bishọp gụrụ nanị otu amaokwu Bible, ma malitezie ikwu banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Iwe were mama m nke ukwuu nke na ọ kwụsịrị ịga chọọchị.
Ụzọ Ndụ Anyị Gbanwere
Ndị mụrụ m, bụ́ William Karl Adams na Mary mụrụ ụmụ ise. Ndị nwoke bụ Don, Joel, na Karl. Nwanne m nwanyị, bụ́ Joy, bụ ọdụdụ nwa, ọ bụkwa m tọchara ha. Ọ ghaghị ịbụ na m dị afọ 13 mgbe m lọtara akwụkwọ otu ụbọchị ma hụ mama m ka ọ na-agụ otu akwụkwọ nta nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Aha ya bụ The Kingdom, the Hope of the World. “Nke a bụ eziokwu ahụ,” ka o kwuru.
Mama m kọọrọ anyị nile ihe ndị ọ na-amụta site na Bible. Site n’okwu ọnụ na omume, o mere ka anyị ghọta nke ọma ịdị mkpa nke ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.”—Matiu 6:33.
Adịchaghị m aṅa ntị nke ọma mgbe nile. N’otu oge, ekwuru m sị, “Mama, kwụsị ikwusara m ozi ọma ma ọ́ bụghị ya, agaghị m ehichara gị efere ọzọ.” Ma o ji akọ nọgide na-akọrọ anyị ihe ọ na-amụta. Ọ na-akpọ anyị nile bụ́ ụmụ ya mgbe nile aga ọmụmụ Bible a
na-enwe n’ụlọ Clara Ryan, bụ́ onye bi n’ebe na-adịghị anya site n’ụlọ anyị dị n’Elmhurst, Illinois, U.S.A.Clara na-akụzikwa ka e si apị piano. Mgbe ndị ọ na-akụziri ihe kpọrọ egwú n’ememe ịkpọ egwú a na-eme kwa afọ, ọ na-eji ohere ahụ ekwu okwu banyere Alaeze Chineke na olileanya mbilite n’ọnwụ. Ebe ọ bụ na enwere m mmasị n’egwú, ebe m mụrụ ịkpọ violin malite mgbe m dị afọ asaa, egere m ntị n’ihe Clara na-ekwu.
N’oge na-adịghị anya, anyị bụ́ ụmụaka malitere iso mama m na-aga nzukọ ọgbakọ n’ebe ọdịda anyanwụ nke Chicago. Ọ bụ njem dị ogologo nke e ji bọs na ụgbọ okporo ígwè aga, ma o so n’ọzụzụ mbụ anyị nwetara n’ihe ibu ụzọ achọ Alaeze ahụ pụtara. Na 1938, bụ́ afọ atọ ka e mesịrị mama m baptizim, eso m ya gaa mgbakọ Ndịàmà Jehova na Chicago. Ọ bụ otu n’ime obodo 50 e ji telifon ụzarị redio jikọta maka ihe omume ahụ. Ihe m nụrụ n’ebe ahụ metụrụ m n’obi.
N’agbanyeghị nke ahụ, enwekwara m oké mmasị n’egwú. Agụsịrị m akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị na 1938, papa m mekwara ndokwa ka m gaa akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ America Maka Ịkpọ Egwú nke dị na Chicago. Ya mere, n’afọ abụọ sochirinụ, amụrụ m egwú, soro òtù abụọ na-akpọ egwú kpọọ egwú, ma chee echiche banyere iji ya mere aka ọrụ.
Onye na-akụziri m violin, bụ́ Herbert Butler, si Europe bịa biri na United States. Ya mere, enyere m ya akwụkwọ nta bụ́ Refugees, * na-eche na ọ pụrụ ịgụ ya. Ọ gụrụ ya, mgbe m mụsịkwara ihe n’izu na-esonụ, ọ sịrị: “Jetha, i mere nke ọma, ọ bụrụkwa na ị nọgide na-amụ ihe, ị pụrụ inweta ọrụ n’òtù ndị egwú nke ụlọ ọrụ redio ma ọ bụ nweta ọrụ ịkụzi egwú. Ma,” ka ọ gbakwụnyere ka ọ na-atụ aka n’akwụkwọ nta ahụ m nyere ya, “echere m na obi gị dị n’ihe a. Gịnị ma i mee ya ọrụ ị ga-arụ ná ndụ gị?”
Echebasiiri m ya echiche ike. Kama ịnọgide n’ụlọ akwụkwọ egwú ahụ, anakweere m òkù mama m kpọrọ m ịga mgbakọ Ndịàmà Jehova na Detroit, Michigan, na July 1940. Anyị biri n’ụlọ ntú ndị dị n’ebe ndị njem nleta na-anọ. N’ezie, eji m violin m gaa, esokwa m òtù ndị
egwú nke mgbakọ ahụ kụọ egwú. Ma n’ebe ahụ a mara ụlọ ntú, ezutere m ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ (ndị ozi oge nile). Ha nile nwere nnọọ obi ụtọ. Ekpebiri m ịbụ onye e mere baptizim na itinye akwụkwọ maka ozi ọsụ ụzọ. Ekpekuru m Jehova ekpere ka o nyere m aka ịnọgide n’ozi oge nile ná ndụ m nile.Amalitere m ịsụ ụzọ n’obodo m. Ka e mesịrị, ejere m ozi na Chicago. Na 1943, akwagara m Kentucky. N’oge ọkọchị nke afọ ahụ, obere oge tupu mgbakọ distrikti amalite, enwetara m akwụkwọ e ji kpọọ m òkù ịga klas nke abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ́ ebe m ga-enweta ọzụzụ maka ozi ala ọzọ. Klas ahụ gaje ịmalite na September 1943.
Ná mgbakọ ahụ e nwere n’oge ọkọchị ahụ, ebi m na nke otu Onyeàmà bụ́ onye nyere m ihe nile m chọrọ site n’ebe nkowe ákwà nke nwa ya nwanyị. Nwa ya nwanyị esonyeworo òtù ndị agha, ọ gwawokwa mama ya ka o nye ndị mmadụ ihe ya nile. Nye m, onyinye ndị a bụ mmezu nke nkwa Jizọs kwere, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:33) Ọnwa ise m nọrọ na Gilead gwụrụ ngwa ngwa, mgbe anyị gụsịkwara akwụkwọ na January 31, 1944, atụsiri m anya ike ịbanye n’ozi ala ọzọ.
Ha Họrọkwaara Ozi Oge Nile
Mama m amalitelarị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ na 1942. N’oge ahụ, ụmụnne m ndị nwoke atọ na nwanne m nwanyị ka na-aga akwụkwọ. Mama m na-ejekwukarị ha ma ha gbasaa akwụkwọ ma kpọrọ ha gaa ozi ubi. Ọ kụzikwaara ha iso na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ya onwe ya na-amụkarịkwa anya ruo ime abalị na-ede ákwà ma na-eme ihe ndị ọzọ dị mkpa ka o wee nwee ike ịga ozi ubi n’echi ya.
Na January 1943, ka m na-asụ ụzọ na Kentucky, nwanne m nwoke bụ́ Don malitekwara ịsụ ụzọ. Nke a mere ka papa m nwee ndakpọ olileanya, bụ́ onye tụworo anya na ụmụ ya nile ga-aga mahadum dị ka ya na mama m gara. Mgbe Don sụsịrị ụzọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ, a kpọrọ ya ịga n’ihu n’ozi oge nile ya dị ka otu n’ime ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York.
Joel malitere ịsụ ụzọ na June 1943 mgbe ọ ka nọ n’ụlọ. N’oge ahụ, ọ gbalịrị ime ka papa m kwenye ịga mgbakọ ma o nweghị isi. Otú ọ dị, mgbe Joel gbalịsịrị ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’ógbè anyị ma o nweghị ihe ịga nke ọma, papa m kweere ka o jiri akwụkwọ bụ́ “The Truth Shall Make You Free” mụwara ya ihe. Ọ na-aza nnọọ ajụjụ ndị a jụrụ ya n’ụzọ dị mfe, ma na-esi ọnwụ ka Joel nye ya ihe àmà sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-akwado ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ahụ. Nke ahụ nyeere Joel aka ime ka eziokwu Bible bụrụ nke ya.
Joel tụrụ anya na Bọọdụ Na-eme Nhọrọ Maka Ije Ozi bụ́ nke kwuru ka Don ghara ije agha n’ihi ịbụ onye ruru eru dị ka onye ozi okpukpe ga-ekwu otu ihe ahụ banyere ya onwe ya. Ma mgbe bọọdụ ahụ hụrụ otú o si yie nwata, ha jụrụ ịgụnye ya ná ndị ozi okpukpe ma gwa ya ka ọ bịa maka ije ozi agha. Mgbe ọ jụrụ idebanye aha ya, e nyere ikike ka e jide ya. Mgbe òtù na-enyocha mpụ, bụ́ FBI, chọtara ya, ọ nọrọ ụbọchị atọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Cook County.
Papa m ji ụlọ anyị mee ihe mbé iji gbapụta ya. Mgbe e mesịrị, o mere otu ihe ahụ maka Ndịàmà ndị ọzọ na-eto eto bụ́ ndị banyekwara n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Ikpe na-ezighị ezi e kpere n’okwu ahụ were papa m oké iwe, ya na Joel sokwa gaa Washington, D.C., iji hụ maka itinye akwụkwọ mkpegharị ikpe. N’ikpeazụ, Joel
nwetara nkwado dị ka onye ozi okpukpe, e bikwara ikpe ahụ. Papa m detaara m akwụkwọ n’ebe m nọ na-eje ozi ala ọzọ, sị, “Echere m na ọ bụ Jehova ka otuto kwesịrị ịgara maka mmeri a!” Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke August 1946, a kpọwokwa Joel ịrụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn.Karl sụrụ ụzọ ọtụtụ ugboro n’oge ezumike ụlọ akwụkwọ ha tupu ya agụsịa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ná mmalite afọ 1947 ma malite ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ka ọ dị mgbe ahụ, ahụ́ ike papa m malitere ịdị njọ, n’ihi ya Karl nyeere ya aka n’azụmahịa ya ruo nwa oge tupu ya ahapụ ụlọ ije sụọ ụzọ n’ebe ọzọ. Ná ngwụsị afọ 1947, Karl malitere iso Don na Joel na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn dị ka onye òtù nke ezinụlọ Betel.
Mgbe Joy gụsịrị akwụkwọ sekọndrị, ọ malitere ịsụ ụzọ. Mgbe e mesịrị, na 1951, o sonyeere ụmụnne ya ndị nwoke na Betel. Ọ rụrụ ọrụ ná ngalaba na-elekọta ebe obibi nakwa ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ụtụ Magazin. Na 1955, ọ lụrụ Roger Morgan, bụ́ onye ọzọ so n’ezinụlọ Betel. Ihe dị ka afọ asaa ka e mesịrị, n’ịhọrọ inwe ezinụlọ nke onwe ha, ha hapụrụ Betel. Ka oge na-aga, ha zụlitere ụmụ abụọ, bụ́ ndị na-ejekwara Jehova ozi.
Mgbe ụmụ mama m nile banyechara ozi oge nile, o nyere papa m agbamume dị ya mkpa nke mere ka ọ rarakwuo ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim na 1952. Ruo afọ 15, ruo mgbe ọ nwụrụ, o ji nnọọ nkà chọpụta ụzọ dị iche iche isi soro ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu nke Alaeze ahụ, ọ bụ ezie na ọrịa kpaara ihe ndị ọ pụrụ ime ókè.
Mgbe mama m kwụsịtụchara ọrụ ọsụ ụzọ n’ihi ọrịa papa m, ọ gara n’ihu na ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọ dịghị mgbe o nwere ụgbọala; ọ gbatụbeghịkwa ịnyịnya ígwè. Ọ bụ onye mkpụmkpụ, o ji ụkwụ gazuo ebe nile, mgbe mgbe ọ na-abanye n’ime ime obodo, iji duzie ọmụmụ Bible.
Ịbanye n’Ubi Ala Ọzọ
Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ụfọdụ n’ime anyị sụrụ ụzọ n’ebe ugwu nke New York City ruo otu afọ tupu anyị enwee ike inweta akwụkwọ ndị dị mkpa iji mee njem. N’ikpeazụ, na 1945, anyị gawara ebe e kenyere anyị ọrụ, bụ́ Cuba, bụ́ ebe anyị ji nwayọọ nwayọọ mee mgbanwe iji kwekọọ n’ụzọ ndụ ọhụrụ. A nabatara ọrụ nkwusa anyị nke ọma, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị nile malitere iduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible. Anyị jere ozi n’ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ka e mesịrị, e kenyere anyị ọrụ na Dominican Republic. Otu ụbọchị, ezutere m otu nwanyị nke gbara m ume ije hụ otu onye ahịa ya, bụ́ nwanyị France aha ya bụ Suzanne Enfroy, bụ́ onye chọrọ enyemaka iji ghọta Bible.
Suzanne bụ onye Juu, mgbe Hitler wakpokwara France, di ya kpọọrọ ya na ụmụ ha abụọ kwaga mba ọzọ. Ngwa ngwa, Suzanne sooro ndị ọzọ kerịta ihe ọ na-amụta. O bu ụzọ gwa nwanyị ahụ nke gwara m gaa leta ya okwu, e
mesịa ya agwa Blanche, bụ́ enyi ya nke si France okwu. Ha abụọ nwere ọganihu ruo n’ókè nke ịbụ ndị e mere baptizim.“Gịnị ka m pụrụ ime iji nyere ụmụ m aka?” ka Suzanne jụrụ m. Nwa ya nwoke na-amụ nkà ọgwụ na ahụ́ ike, nwa ya nwanyị na-amụkwa ịgba egwú ballet, na-atụ anya ịgba egwú n’Ụlọ Egwú nke Radio City dị na New York. Suzanne zigaara ha ụtụ Ụlọ Nche na Teta! N’ihi ya, nwa Suzanne, nwunye ya, na ejima nwunye ya ghọchara Ndịàmà. Ahụ́ erughị di Suzanne bụ́ Louis ala n’ihi mmasị nwunye ya nwere n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’ihi na ka ọ dị mgbe ahụ, ọchịchị Dominican Republic amachibidowo ọrụ anyị iwu. Ma mgbe ezinụlọ ahụ dum kwagara United States, ya onwe ya mesịkwara ghọọ Onyeàmà.
N’okpuru Mmachibido Iwu Ma Ka Na-eje Ozi
Ọ bụ ezie na a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Dominican Republic n’oge na-adịghị anya ka e kenyesịrị anyị ọrụ n’ebe ahụ na 1949, mkpebi siri ike anyị mere bụ irubere Chineke isi dị ka Onye Na-achị Achị karịa mmadụ. (Ọrụ 5:29) Anyị nọgidere buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke site n’ime ka a nụrụ ozi ọma banyere ya, dị ka Jizọs nyere ụmụazụ ya ntụziaka ime. (Matiu 24:14) Otú ọ dị, anyị mụtara ịdị “akọ dị ka agwọ ma bụrụkwa ndị aka ha dị ọcha dị ka nduru” ka anyị na-arụ ọrụ nkwusa anyị. (Matiu 10:16) Dị ka ihe atụ, violin m nyeere m aka nke ukwuu. Ana m eji ya ma m na-aga iduzi ọmụmụ Bible. Ndị m na-eduziri ọmụmụ ihe aghọghị ndị na-akpọ violin, ma ọtụtụ ezinụlọ ghọrọ ndị ohu Jehova!
Mgbe a machibidosịrị ọrụ anyị iwu, e si n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na San Francisco de Macorís kpọga anyị bụ́ ụmụ agbọghọ anọ—mụ, Mary Aniol, Sophia Soviak, na Edith Morgan—na nke dị n’alaka ụlọ ọrụ dị na Santo Domingo, bụ́ isi obodo ahụ. Ma kwa ọnwa, ana m eme njem gaa n’ebe mbụ ahụ e kenyere anyị ọrụ iji kụzie egwú. Nke ahụ mere ka o kwe m omume itinyere ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst nri ime mmụọ n’ọbọ violin m ma jiri akụkọ banyere ọrụ ịgba àmà ha alọghachi.
Mgbe a tụrụ ụmụnna ndị nọ na San Francisco de Macorís mkpọrọ na Santiago n’ihi nnọpụiche Ndị Kraịst ha, a gwara m ka m na-ewegara ha ego nakwa Bible ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ma na-ewelatara ezinụlọ ha ozi. N’ụlọ mkpọrọ dị na Santiago, mgbe ndị nche hụrụ ọbọ violin m ka m kpafanyere ya na mkpa abụ, ha jụrụ sị, “Gịnị ka i ji ihe ahụ eme?” “Achọrọ m iji ya mee ha obi ụtọ,” ka m zara.
Otu n’ime abụ ndị m kpọọrọ ha bụ nke otu Onyeàmà dere mgbe ọ nọ n’ogige ịta ahụhụ nke ndị Nazi. Abụ ahụ bụzi abụ nke 29 n’akwụkwọ abụ Ndịàmà Jehova. Akpọrọ m ya ka ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ wee nwee ike ịmụta ka e si abụ ya.
A gwara m na a kpọfewo ọtụtụ n’ime Ndịàmà ndị ahụ n’ugbo Trujillo, bụ́ onyeisi ọchịchị mba ahụ. A gwara m na ọ dị nso n’ụzọ bọs na-agba. Ya mere, ihe dị ka n’oge
ehihie, esi m na bọs rịtuo ma jụọ ebe e si aga n’ugbo ahụ. Otu onye nwere obere ụlọ ahịa tụụrụ m aka gabiga ebe ugwu juru ma kwe nkwa inye m ịnyịnya ya na ịkpọnye m nwatakịrị nke ga-eduga m n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na m ga-ahapụ violin m dị ka ihe mbé.Mgbe anyị gafesịrị ugwu ndị ahụ, anyị aghaghị ịgafe otu osimiri, anyị abụọ anọdụ n’elu ịnyịnya ahụ ka ọ na-egwu mmiri. Anyị hụrụ ìgwè icheoku n’ebe ahụ, bụ́ ndị nwere ábụ́bà ndị na-acha ka eke na ogwurugwu ma na-egbukepụ egbukepụ n’anwụ. Ha mara mma dị egwu! Ekpere m ekpere, sị: “Jehova, i meela maka ime ka ha maa nnọọ mma.” N’ikpeazụ, n’elekere anya anọ nke ehihie, anyị rutere n’ugbo ahụ. Onye soja na-elekọta ebe ahụ ji obiọma kwe ka m gwa ụmụnna ahụ okwu, o kwekwara ka m nye ha ihe nile m wetaara ha, ọbụna obere Bible.
Mgbe m na-alọghachi, ekpere m ekpere ka anyị na-aga, n’ihi na chi ejiwo mgbe ahụ. Mmiri matọsịrị anyị ahụ́ mgbe anyị ji lọghachi n’ụlọ ahịa ahụ. Ebe ọ bụ na bọs ikpeazụ n’ụbọchị ahụ agaala, agwara m onye ahụ nwe ụlọ ahịa ahụ ka ọ kwụsịrị m otu gwongworo na-agbafenụ. M̀ kachiri obi soro ụmụ nwoke abụọ nọ na gwongworo ahụ? Otu n’ime ha jụrụ m sị: “Ị̀ maara Sophie? Ọ mụụrụ nwanne m nwanyị ihe.” Abịara m kwere na nke a bụ azịza Jehova nye ekpere m! Ha buuru m ruo Santo Domingo n’udo.
Na 1953, eso m ná ndị si Dominican Republic gaa mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova e mere n’Ámá Egwuregwu Yankee dị na New York. Ezinụlọ m dum, gụnyere papa m, gara ya. Mgbe a kọsịrị banyere otú ọrụ nkwusa anyị si na-aga n’ihu na Dominican Republic, mụ na onye mụ na ya na-ejekọ ozi n’ala ọzọ, bụ́ Mary Aniol, ji obere oge n’usoro ihe omume ahụ mee ihe ngosi nke otú anyị si arụ ọrụ nkwusa anyị n’agbanyeghị mmachibido iwu.
Ọṅụ Pụrụ Iche nke Ọrụ Njegharị
N’oge ọkọchị nke afọ ahụ, ezutere m Rudolph Sunal, bụ́ onye ghọrọ di m n’afọ na-eso ya. Ndị ezinụlọ ya ghọrọ Ndịàmà n’Allegheny, Pennsylvania, n’oge na-adịghị anya mgbe Agha Ụwa Mbụ bisịrị. Mgbe ọ nọsịrị n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche Ndị Kraịst n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ malitere ije ozi Betel na Brooklyn, New York. N’oge na-adịghị anya ka anyị lụsịrị, a kpọrọ ya ileta ọgbakọ dị iche iche dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ruo afọ 18 sochirinụ, esonyeere m ya n’ọrụ sekit.
Ozi anyị kpọgara anyị Pennsylvania, West Virginia, New Hampshire, na Massachusetts, tinyere ebe ndị ọzọ. Anyị na-anọkarị n’ụlọ ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ pụrụ iche ịmara ha nke ọma na iso ha na-ejere Jehova ozi. Ịhụnanya e gosiri anyị na ọbịa e lere anyị bụ ndị na-enye ọṅụ ma site n’obi mgbe nile. Mgbe Joel lụsịrị onye mụ na ya jekọrọ ozi ala ọzọ, bụ́ Mary Aniol, ha jiri afọ atọ rụọ ọrụ njegharị, na-eleta ọgbakọ ndị dị na Pennsylvania na Michigan. Ka e mesịrị, na 1958, a kpọrọ Joel òkù ọzọ ịghọ onye òtù Betel, nke ugbu a ya na Mary.
Karl anọwo ihe dị ka afọ asaa na Betel mgbe e zigara ya n’ọrụ sekit ruo ọnwa ole na ole iji nwetakwuo ahụmahụ. Mgbe e mesịrị, ọ ghọrọ onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Na 1963, ọ lụrụ Bobbie, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi na Betel ruo mgbe ọ nwụrụ n’October 2002.
N’ime ọtụtụ afọ Don nọrọ na Betel, ọ gara mba ndị ọzọ site n’oge ruo n’oge ileta ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na n’ubi ala ọzọ. Ọrụ e kenyere ya akpọgawo ya n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Africa, Europe, nakwa ná mba ndị dị na Kọntinent America. Nwunye Don na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ Dolores, na-esokwa ya eme njem ọtụtụ mgbe.
Ọnọdụ Anyị Gbanwere
Mgbe papa m rịasịrị ọrịa ruo ogologo oge, ọ nwụrụ, ma tupu ya anwụọ, ọ gwara m na obi dị ya nnọọ ụtọ na anyị họọrọ ijere Jehova Chineke ozi. O kwuru na anyị enwetawo ọtụtụ ngọzi karịa ka anyị gaara enweta ma ọ bụrụ na anyị chụsoro agụmakwụkwọ mahadum bụ́ nke o zubeburu maka anyị. Mgbe m nyesịịrị mama m aka ịkwakọ ihe iji kwaga n’ebe dịdewere ebe nwanne m nwanyị, bụ́ Joy, bi, mụ na di m nakweere ọrụ ịsụ ụzọ na New England ka anyị wee nwee ike ịnọ mama ya nso, bụ́ onye chọrọ enyemaka anyị mgbe ahụ. Mgbe mama ya nwụsịrị, mama m binyeere anyị ruo afọ 13. Mgbe e mesịrị, na January 18, 1987, o jesịrị ozi elu ala ya mgbe ọ dị afọ 93.
Mgbe mgbe, mgbe ndị enyi ya jara ya mma maka ịzụlite ụmụ ya nile ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi, mama m na-eji obi umeala azaghachi, sị: “Ọ dabaara m nnọọ na ‘ala’ m na-arụ ọrụ na ya dị mma.” (Matiu 13:23) Lee ihe ngọzi ọ bụ inwe ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị setịpụụrụ anyị ihe nlereanya mara mma n’ịnụ ọkụ n’obi na n’ịdị umeala n’obi!
Anyị Ka Na-ebute Alaeze ahụ Ụzọ
Anyị anọgidewo na-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị ma na-agbalị itinye ndụmọdụ Jizọs banyere iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe n’ọrụ. (Luk 6:38; 14:12-14) N’aka nke ya, Jehova enyewo anyị ihe na-akpa anyị n’ụba. Ndụ anyị abụwo nke e ji n’aka na nke na-enye obi ụtọ.
Mụ na Rudy ka nwere mmasị n’egwú. Ọ na-abụ oge na-enye obi ụtọ mgbe ndị ọzọ nwekwara mmasị n’egwú bịara n’ụlọ anyị maka ntụrụndụ n’uhuruchi, anyị akpọkọọkwa ngwá egwú anyị ọnụ. Ma egwú abụghị ọrụ m. Ọ bụ ihe na-enyekwu m obi ụtọ ná ndụ. Ugbu a, obi na-adị mụ na di m ụtọ ịhụ mkpụrụ nke ozi ọsụ ụzọ anyị mịpụtara, bụ́ ndị anyị nyeere aka n’afọ ndị gara aga.
N’agbanyeghị nsogbu ahụ́ ike m na-enwe ugbu a, apụrụ m ikwu na ndụ anyị abụwo nnọọ nke obi ụtọ na nke e ji n’aka n’ime ihe karịrị afọ 60 anyị jere ozi oge nile. Kwa ụtụtụ mgbe m tetara ụra, ana m ekele Jehova maka ịza ekpere m kpere mgbe m banyere ozi oge nile ọtụtụ afọ gara aga, ana m echekwa sị, ‘Ugbu a, olee otú m pụrụ isi buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ taa?’
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ezinụlọ anyị na 1948 (site n’aka ekpe gaa n’aka nri): Joy, Don, mama m, Joel, Karl, mụ, na papa m
[Foto dị na peeji nke 25]
Mama m setịpụrụ ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi n’ozi
[Foto dị na peeji nke 26]
Karl, Don, Joel, Joy, na mụ taa, ka ihe karịrị afọ 50 gasịrị
[Foto dị na peeji nke 27]
Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Mụ, Mary Aniol, Sophia Soviak, na Edith Morgan ka anyị na-eje ozi ala ọzọ na Dominican Republic
[Foto dị na peeji nke 28]
Mụ na Mary (n’aka ekpe) n’Ámá Egwuregwu Yankee, 1953
[Foto dị na peeji nke 29]
Mụ na di m mgbe ọ nọ n’ọrụ sekit