Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ọnọdụ Ndị Gbanwere Agbanwe Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Mma

Jiri Ọnọdụ Ndị Gbanwere Agbanwe Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Mma

Jiri Ọnọdụ Ndị Gbanwere Agbanwe Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Mma

Pum, Jan, Dries, na Otto, bụ́ Ndị Kraịst anọ bụ́ ndị okenye bi na Netherlands, nwere ọtụtụ ụzọ ha si yirịta. Ha anọ alụọla nwanyị, mụọkwa ụmụ. Tụkwasị na nke ahụ, ụfọdụ afọ gara aga, ha nile rụrụ ọrụ ego oge nile ma biri n’ụlọ dị ntụsara ahụ́. Otú ọ dị, ha nile kwụsịrị ịrụ ọrụ ego ma malite iji oge na ume ha nile na-eme ka ihe ndị metụtara Alaeze na-aga n’ihu. Gịnị nyeere ha aka ime mgbanwe a? Ha anọ ji ọnọdụ ndị gbanwere agbanwe mee ihe n’ụzọ dị mma.

ỌNỌDỤ nke ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-emesị gbanwee. Ọtụtụ mgbanwe ndị dị ka ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ịmụ ụmụ, ma ọ bụ ilekọta ndị nne na nna merela agadi, na-ewetakwu ibu ọrụ. Otú ọ dị, ụfọdụ mgbanwe na-eme ka anyị nwerekwuo onwe anyị ịmụba ozi anyị dị ka Ndị Kraịst. (Matiu 9:37, 38) Dị ka ihe atụ, ụmụ anyị ndị toworo eto pụrụ ịhapụ ụlọ, ma ọ bụ anyị pụrụ ịla ezumike nká.

Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ọnọdụ anyị pụrụ ịgbanwe ma ànyị chọrọ ya ma ọ bụ na anyị achọghị ya, ụfọdụ Ndị Kraịst enwewo ihe ịga nke ọma n’iji aka ha gbanwee ọnọdụ ha bụ́ nke meworo ka ha nwee ohere ịmụba òkè ha na-ekere n’ozi. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Pum, Jan, Dries, na Otto mere. Olee otú ha si mee ya?

Mgbe Ụmụaka Hapụrụ Ụlọ

Pum na-arụ ọrụ dị ka onye na-edekọ mkpata na mmefu n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ. Ya na nwunye ya, bụ́ Anny, na ụmụ ha nwanyị abụọ na-arụkarị ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Pum and Anny na-emekwa ndokwa maka isoro ndị ọzọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ enwe nnọkọ ntụrụndụ. “Nke a na-echebe anyị pụọ ná nsogbu ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ pụrụ ịkpata,” ka ha na-akọ. N’ịbụ ndị ihe nlereanya nke ndị mụrụ ha kpaliri, ụmụ ha nwanyị abụọ ahụ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ oge nile ozugbo ha gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.

Mgbe ụmụ ha hapụrụ ụlọ, Pum na Anny chọpụtara na ọnọdụ a gbanwerenụ nyekwuru ha nnwere onwe na ego nke ha pụrụ iji mee njem gaa n’ebe ndị mara mma ma ọ bụ nwee ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ. Otú ọ dị, kama ime otú ahụ, di na nwunye ahụ kpebiri iji ọnọdụ ahụ gbanwerenụ mụbaa ozi ha dị ka Ndị Kraịst. N’ihi ya, Pum rịọrọ onye were ya n’ọrụ ka ya na-ahapụ ọrụ otu ụbọchị n’izu. E mesịa, Pum mere ndokwa nke mere ka o nwee ike ịdị na-amalite ọrụ n’elekere 7:00 nke ụtụtụ ma na-agbasa n’elekere 2:00 nke ehihie. N’ezie, ibelata oge ọrụ pụtara na ha ga na-eji ụgwọ ọnwa pekwuru mpe na-ebi ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere ihe ịga nke ọma, na 1991 kwa, Pum sonyeere nwunye ya n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile.

Mgbe nke ahụ gasịrị, a gwara Pum ka ọ bụrụ osote onye nlekọta nke otu Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ihe ahụ a gwara di na nwunye a na-apụta na ha aghaghị ịhapụ ụlọ ha biworo na ya ruo afọ 30 ma kwaga n’ụlọ dị na mbara èzí nke Ụlọ Mgbakọ ahụ. Ha kwagara ebe ahụ. Ò siiri ha ike? Anny na-aza na mgbe ọ bụla ọ dị ya ka agụụ ụlọ ọ na-agụ ya, ya na-ajụ onwe ya, sị, ‘Àbụ m nwunye Lọt?’ Ọ jụrụ ‘ile anya n’azụ.’—Jenesis 19:26; Luk 17:32.

Pum na Anny chere na mkpebi ha ewetaworo ha ọtụtụ ngọzi. Tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ha na-enwe ọṅụ n’ozi ha na-eje n’Ụlọ Mgbakọ ahụ, n’ime nkwadebe maka mgbakọ distrikti, nakwa ná mkpakọrịta ha na ndị nlekọta sekit (ndị ozi na-ejegharị ejegharị) bụ́ ndị na-ekwu okwu n’Ụlọ Mgbakọ ahụ. Site n’oge ruo n’oge, ha na-eleta ọgbakọ dị iche iche mgbe Pum jere ozi dị ka onye nlekọta sekit nke inyeaka.

Gịnị mere ka di na nwunye a nwee ihe ịga nke ọma n’ịmụba ozi ha? Pum na-ekwu, sị: “Mgbe ndụ gị gbanwere n’ụzọ dị ukwuu, ị ghaghị ikpebisi ike iji ọnọdụ ọhụrụ ahụ mee ihe n’ụzọ kasị mma.”

Ịmalite Ibi ndụ Ka Mfe

Jan na nwunye ya, bụ́ Woth, mụrụ ụmụ atọ. Dị ka Pum na ezinụlọ ya, Jan ji ọnọdụ ndị gbanwere agbanwe mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ruo ọtụtụ afọ, Jan nọ n’ọkwá a na-akwụ ya ezigbo ego n’otu ụlọ akụ̀ ma mee ka ezinụlọ ya bie ndụ dị ntụsara ahụ́. Otú ọ dị, ọ gụsiri ya agụụ ike ịmụba ozi ya. Ọ na-akọwa, sị: “Ka m na-adị ndụ na-aga, abịara m nwekwuo obi ekele maka eziokwu ahụ, ma hụkwuo Jehova n’anya.” N’ihi ya, na 1986, Jan gbanwere ọnọdụ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Eji m nhazigharị e mere n’ụlọ ọrụ m mee ihe n’ụzọ bara uru ma belata awa ole m ji arụ ọrụ. Ndị ọrụ ibe m nke a juru anya malitere ịkpọ m Diwodo n’ihi na m na-arụ ọrụ nanị n’ụbọchị dinsdag [Tuesday], woensdag [Wednesday], na donderdag [Thursday]. E wepụrụ pasent 40 nke ihe a na-akwụ m n’ọnwa. Erere m ụlọ anyị ma zụta otu ụgbọ mmiri e ji mere ụlọ ka anyị wee nwee ike ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Mgbe e mesịrị, eji m ohere nke ịla ezumike nká n’oge mee ihe; e wepụkwuru pasent 20 n’ihe a na-akwụ m n’ọnwa, ma na 1993, abịara m nwee ike ịmalite ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile.”

Taa, Jan so na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ ma jee ozi ugboro ugboro dị ka onye nlekọta mgbakọ. N’agbanyeghị na ahụ́ esichaghị Woth ike, ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. Ụmụ ha atọ alụchaala di na nwunye, ha na ndị òtù ọlụlụ ha bụchakwa ndị ozi Alaeze na-anụ ọkụ n’obi.

Olee otú Jan na Woth siworo nwee ike iji obere ego ha na-akpata na-ebi ndụ? “N’oge anyị na-akpata ezigbo ego,” ka Jan na-aza, “anyị hụrụ na anyị adịghị etinye uche nke ukwuu n’ihe onwunwe. Ugbu a, ọ pụrụ iwepụ anyị obere ihe n’ahụ́ ichere ruo oge ụfọdụ tupu anyị enwee ike inweta ihe ụfọdụ, ma ngọzi na ihe ùgwù ime mmụọ ndị anyị nwetaworo emejuwo ya n’ụba.”

Dị ka Jan na Woth, Dries na nwunye ya, bụ́ Jenny, kpebikwara ime ka ndụ ha dị mfe iji tinyekwuo oge n’ihe ndị metụtara Alaeze. Dries na Jenny rụgidere ọrụ ọsụ ụzọ ruo mgbe ha ghọrọ nne na nna. E mesịa, iji lekọta ezinụlọ ya, Dries rụrụ ọrụ dị ka onye nlekọta n’otu nnukwu ụlọ ọrụ. Ndị were ya n’ọrụ nwere mmasị n’ọrụ ya ma bulie ya n’ọkwá. Otú ọ dị, Dries anabataghị mbuli n’ọkwá ahụ n’ihi na ịnabata ya gaara apụtawo na oge ga-afọrọ ya maka ihe omume Ndị Kraịst ga-epekwu mpe.

Ịzụlite ezinụlọ—nakwa ilekọta nne Jenny na-arịa ọrịa—chọrọ ihe dị ukwuu n’oge na ume nke di na nwunye ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nọgidere na-azụlite mmụọ ịsụ ụzọ. Gịnị nyeere ha aka ime nke a? Jenny na-akọwa, sị: “Anyị na ndị ọsụ ụzọ biri, anyị na-akpọ ndị ọsụ ụzọ òkù iso anyị rie nri, anyị na-enyekwa ndị nlekọta sekit ụlọ n’ebe obibi anyị.” Dries na-agbakwụnye, sị: “Anyị mere ka ndụ anyị dị mfe ma zere ịba n’ụgwọ. Anyị kpebiri ịghara itinye aka ma ọlị n’achụmnta ego buru ibu ma ọ bụ zụọ ụlọ, ka ihe ndị dị otú ahụ wee ghara ikegide anyị n’ọdịnihu.”

Mkpebi Dries na Jenny mere idoziri onwe ha ọnọdụ ndị ga-enyekwu ha oge maka ihe ndị metụtara Alaeze rụpụtara ihe ndị dị mma. Ụmụ ha nwoke abụọ na-eje ozi ugbu a dị ka ndị okenye, otu n’ime ha na nwunye ya na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ. Dries na Jenny rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, e mesịakwa Jenny sonyeere Dries n’ọrụ sekit. Ugbu a, ha bụ ndị ọrụ afọ ofufo na Betel, bụ́ ebe Dries na-eje ozi dị ka onye so na Kọmitii Alaka.

Ịla Ezumike Nká n’Oge

Dị ka Dries na Jenny, Otto na nwunye ya, bụ́ Judy, rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ tupu ha amụọ ụmụ ha nwanyị abụọ. Mgbe Judy dị ime nwa mbụ ha, Otto chọtara ọrụ dị ka onye nkụzi ụlọ akwụkwọ.

Ka ụmụ ha nọ na-etolite, Otto na Judy na-adị akpọ ndị ọsụ ụzọ ka ha bịa n’ebe obibi ha maka nnọkọ ntụrụndụ ka ụmụ ha nwanyị wee nwee ike ịhụ ọṅụ Ndị Kraịst na-eje ozi oge nile na-enwe. Ka oge na-aga, ada ha banyere ozi ọsụ ụzọ. Mgbe e mesịrị, ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ya na di ya na-ejekwa ozi ala ọzọ ugbu a n’otu ala dị n’Africa. Nwa ha nwanyị nke nta malitere ịsụ ụzọ na 1987, Judy sonyekwaara ya.

Mgbe ọnọdụ ndị gbanwere agbanwe nyere Otto ohere ibelata awa o ji arụ ọrụ n’ụlọ akwụkwọ, ọ na-eji oge ahụ fọdụrụnụ arụ ọrụ ọsụ ụzọ. N’ikpeazụ, ọ kwụsịrị ọrụ ya kpam kpam. Taa, ka Otto na-arụ ọrụ njegharị, ọ na-eji nkà ya dị ka onye nkụzi ewusikwu ọgbakọ dị iche iche ike n’ụzọ ime mmụọ.

Olee ndụmọdụ Otto na-enye ndị lara ezumike nká n’oge? “Mgbe ị lara ezumike nká, ekpebila ịga zuru nnọọ ike ruo otu afọ ma ọ bụ ihe dị ka ya. ‘Izuru ike’ ịmara mmadụ ahụ́ adịghị esi ike. Tupu ị mata ihe na-aganụ, i chefuola ọrụ ọsụ ụzọ. Kama ime otú ahụ, malite ịmụba ozi gị ozugbo.”

Iji Ahụmahụ Onwe Onye Eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya

N’eziokwu, ụmụnna ndị dị ka Pum, Jan, Dries, na Otto enweghịzi ume na ike ha nwere mgbe ha bụ okorobịa. Ma ha tozukwuru okè, nwekwuo ahụmahụ, na amamihe. (Ilu 20:29) Ha maara ihe ịbụ nna pụtara, sitekwa n’isoro ndị nwunye ha na-arụkọ ọrụ, ha matụụrụ ihe ịbụ nne na-ewe. Ha esorowo ndị nwunye ha dozie nsogbu ezinụlọ ma setịpụrụ ụmụ ha ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Otto na-ekwu, sị: “Mgbe m na-enye ndụmọdụ dị ka onye nlekọta sekit n’ihe ndị metụtara ezinụlọ, ahụmahụ m nwere n’ịzụlite ezinụlọ na-eme ka ndụmọdụ m dị irè.” N’otu aka ahụ, ahụmahụ Dries nwere dị ka nna mere ka ọ baara ezinụlọ Betel, bụ́ nke e nwere ọtụtụ ndị ọrụ na-eto eto na ya, uru.

Ee, ihe ọmụma ụmụnna ndị dị otú ahụ nwere site n’ahụmahụ ha na-enyere ha aka igbo mkpa dịgasị iche iche a na-enwe n’ọgbakọ. Ahụmahụ ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, emewo ka ngwá ọrụ ha ji eme ihe dị nkọ, nke mere na ha na-eji ume ha eme ihe n’ụzọ kasị baa uru. (Eklisiastis 10:10) N’ezie, n’oge ụfọdụ, ha pụrụ ịbụ ndị na-arụpụtakarị ihe karịa ndị ka ha dị ike ọkpụkpụ aka ma bụrụ ndị na-enwechaghị ahụmahụ.

Ụmụnna ndị dị otú ahụ, tinyere ndị nwunye ha, bụụrụ ndị na-eto eto nọ n’etiti ndị Jehova ezi ihe nlereanya. Ndị na-eto eto na-achọpụta na ndị di na nwunye dị otú a enwetawo ọtụtụ n’ime ihe ịma aka na ngọzi ndị a na-akọ banyere ha ná mbipụta Ndị Kraịst anyị. Ọ bụ ihe na-agba ume ịhụ ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị na-egosipụta mmụọ yiri nke Keleb bụ́ onye, n’agbanyeghị na ọ katawo ahụ́, kwuru ka e nye ya ọrụ tara akpụ.—Joshua 14:10-12.

Ṅomie Okwukwe Ha

Ị̀ pụrụ ma eleghị anya iṅomi okwukwe na omume nke di na nwunye ndị ahụ e kwuru banyere ha n’isiokwu a? Cheta, ha mere ka eziokwu ahụ bụrụ ụzọ ndụ ha. Ha mere ka ụmụ ha nwee ọchịchọ ịsụ ụzọ. Ha mere nke ahụ, dị ka Jan si kwuo ya, “site n’isetịpụ ihe nlereanya n’ịhụ Jehova na nzukọ ya n’anya, site n’ime ndokwa maka nnọkọ ntụrụndụ dị mma, na site n’ịkụziri ụmụ anyị otú ha ga-esi na-akwado onwe ha.” Ha rụkọkwara ọrụ ọnụ ma gwukọọ egwuregwu ọnụ dị ka ezinụlọ. “N’oge ezumike,” ka Pum na-echeta, “ezinụlọ anyị dum na-agakarị ọrụ nkwusa n’ụtụtụ ma na-anọkọ ọnụ n’ehihie iji tụrụ ndụ.”

Tụkwasị na nke ahụ, Ndị Kraịst a bu ụzọ mee atụmatụ, nke mere na mgbe ọ bụla ọnọdụ ha gbanwere, ha dị njikere iji ọnọdụ ọhụrụ ahụ eme ihe n’ụzọ dị mma. Ha setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ma mee mkpebi ndị mere ka ha nwee ike iru ihe mgbaru ọsọ ha ngwa ngwa. Ha chọpụtara ụzọ isi kwụsịlata ọrụ ego ha na-arụ ma dị njikere iji ego pekwuru mpe ha na-akpata na-ebi ndụ. (Ndị Filipaị 1:10) Ndị nwunye ha nyere ndị di ha nkwado siri ike. Ha nile chọsiri ike ịbanye ‘n’ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ,’ n’ihi ya kwa, ha na-enweta ngọzi bara ụba site n’aka Jehova.—1 Ndị Kọrint 16:9; Ilu 10:22.

Ì nwekwuru ọchịchọ ịmụba òkè ị na-ekere n’ozi ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, iji ọnọdụ ndị gbanwere agbanwe na-eme ihe n’ụzọ dị mma pụrụ ịbụ ụzọ ị ga-esi mee nke ahụ kpọmkwem.

[Foto dị na peeji nke 20]

Pum na Anny ka ha na-elekọta Ụlọ Mgbakọ

[Foto dị na peeji nke 20]

Jan na Woth ka ha na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa

[Foto dị na peeji nke 21]

Dries na Jenny ka ha na-eje ozi na Betel

[Foto dị na peeji nke 21]

Otto na Judy ka ha na-ejikere ịga leta ọgbakọ ọzọ