Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nwee Obi Ike, Nweekwa Ume!’

‘Nwee Obi Ike, Nweekwa Ume!’

‘Nwee Obi Ike, Nweekwa Ume!’

“Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”—JỌN 16:33.

1. N’ihi ihe nọ na-eche ụmụ Izrel na Kenan, agbamume dị aṅaa ka ha nwetara?

MGBE ụmụ Izrel na-achọ ịgafe Osimiri Jọdan ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis gwara ha, sị: “Dịnụ ike [“nweenụ obi ike,” NW], nweekwanụ ume, unu atụla egwu, unu amakwala jijiji n’ihu ha; n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, Ya onwe ya bụ onye gị na Ya na-eje.” Mgbe ahụ, Mozis kpọrọ Jọshụa, bụ́ onye gaje iduru ụmụ Izrel banye Kenan ma nyeghachi nanị ya ndụmọdụ ahụ nke inwe obi ike. (Deuterọnọmi 31:6, 7) Mgbe e mesịrị, Jehova n’onwe ya gbara Jọshụa ume, na-asị: “Dị ike [“nwee obi ike,” NW], nweekwa ume . . . Nanị, dị ike [“nwee obi ike,” NW], nweekwa ume nke ukwuu.” (Joshua 1:6, 7, 9) Okwu ndị ahụ bịara n’oge ha. Ọ ga-adị ụmụ Izrel mkpa inwe obi ike iji chee ndị iro dị ike bụ́ ndị nọ na-eche ha n’akụkụ nke ọzọ nke Jọdan ihu.

2. Olee ọnọdụ anyị nọ na ya taa, gịnịkwa dị anyị mkpa?

2 Taa, ezi Ndị Kraịst na-aga ịbanye n’ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa n’isi nso, dịkwa ka Jọshụa, ọ dị ha mkpa inwe obi ike. (2 Pita 3:13; Mkpughe 7:14) Otú ọ dị, ọnọdụ anyị dị iche na nke Jọshụa. Jọshụa ji mma agha na ube lụọ ọgụ. Anyị na-alụ agha ime mmụọ, anyị adịtụghịkwa eji ngwá agha nkịtị alụ ya. (Aịsaịa 2:2-4; Ndị Efesọs 6:11-17) Ọzọkwa, Jọshụa aghaghị ịlụ ọtụtụ agha ndị kpụ ọkụ n’ọnụ ọbụna mgbe ọ banyesịrị n’Ala Nkwa ahụ. Ma, ọ bụ ugbu a—mgbe anyị na-abanyebeghị n’ụwa ọhụrụ ahụ—ka anyị na-alụ ọgụ kasị kpụrụ ọkụ n’ọnụ. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ọnọdụ ndị na-achọ ka anyị nwee obi ike.

N’ihi Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Iji Na-agbasi Mbọ Ike?

3. Gịnị ka Bible na-ekpughe banyere onye mmegide ukwu anyị?

3 Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị maara na anyị sitere na Chineke, ma ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Okwu ndị ahụ na-egosi isi ihe mere Ndị Kraịst na-aghaghị iji na-agbasi mbọ ike iji nọgide na-enwe okwukwe. Mgbe Onye Kraịst nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ na-eme ka Setan bụ́ Ekwensu kụọ afọ n’ala ruo n’ókè ụfọdụ. N’ihi ya, Setan na-ejegharị dị ka “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” na-anwa ịmaja na iripịa Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi. (1 Pita 5:8) N’ezie, ọ na-alụso Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ibe ha agha. (Mkpughe 12:17) N’agha a, ọ na-eji ụmụ mmadụ eme ihe, bụ́ ndị kpachaara anya ma ọ bụ na-akpacharaghị anya na-emezu nzube ya. Ọ na-achọ obi ike iji guzogidesie Setan na ndị ozi ya nile ike.

4. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jizọs nyere, ma olee àgwà ezi Ndị Kraịst gosipụtaworo?

4 Ebe Jizọs maara na Setan na ndị ozi ya ga-eguzogidesi ozi ọma ahụ ike, Ọ dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) Okwu ndị ahụ mezuru na narị afọ mbụ, ha na-emezukwa taa. N’ezie, mkpagbu ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova n’oge a tachiworo obi na ya atawo akpụ karịa nke ọ bụla ọzọ e nwetụworo kemgbe ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ezi Ndị Kraịst ji obi ike na-anagide nrụgide dị otú ahụ. Ha maara na “egwu mmadụ na-eweta ọnyà,” ha achọghịkwa ịma n’ọnyà.—Ilu 29:25.

5, 6. (a) Olee ọnọdụ ndị na-achọ obi ike n’aka anyị? (b) Olee otú Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi si emeghachi omume mgbe a nwalere obi ike ha?

5 E wezụga mkpagbu, e nwere ihe ịma aka ndị ọzọ na-achọ obi ike n’aka anyị. Ọ bụụrụ ụfọdụ ndị ihe ịma aka izi ndị ha na-amabughị ozi ọma. A na-anwale obi ike nke ụfọdụ ụmụ akwụkwọ mgbe a kpọrọ ha ka ha kwee ukwe e ji eto mba ma ọ bụ nke e ji ekele ọkọlọtọ. Ebe okwu ndị e ji eme ihe n’ukwe dị otú ahụ bụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, okwu ndị e ji eme ihe n’okpukpe, ụmụ Ndị Kraịst ejiriwo obi ike kpebisie ike ime ihe n’ụzọ na-atọ Chineke ụtọ, omume ọma ha abụrụwokwa ihe na-enye obi ụtọ.

6 Ọ dịkwa anyị mkpa inwe obi ike mgbe ndị mmegide ji usoro mgbasa ozi na-agbasa akụkọ ọjọọ banyere ndị ohu Chineke ma ọ bụ mgbe ha nwara igbochi ezi ofufe site ‘n’iji ụkpụrụ na-akpụzi mmegbu.’ (Abụ Ọma 94:20) Dị ka ihe atụ, olee otú obi kwesịrị ịdị anyị mgbe a kọrọ ihe na-abụchaghị eziokwu ma ọ bụkwanụ ihe bụ́ ụgha chara acha banyere Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ akụkọ, redio, ma ọ bụ na telivishọn? Ò kwesịrị iju anyị anya? Ee e. Anyị na-atụ anya ihe ndị dị otú ahụ. (Abụ Ọma 109:2) Ọ dịghịkwa eju anyị anya mgbe ụfọdụ mmadụ kweere akụkọ ụgha na ndị na-abụchaghị eziokwu e biri n’akwụkwọ, ebe ọ bụ na “onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla.” (Ilu 14:15) Ma, Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe adịghị ekwere ihe ọ bụla e kwuru banyere ụmụnna ha, ha adịtụghịkwa ekwe ka akụkọ ọjọọ mee ka ha kwụsị ịga nzukọ Ndị Kraịst, mee ka ha ghara ịdị na-agachi ozi ubi anya, ma ọ bụ mee ka okwukwe ha daa. N’ụzọ dị iche, ha “na-eme ka a mata [ha] dị ka ndị ozi Chineke . . . site n’otuto na ihe ihere, site n’akụkọ ọjọọ na akụkọ ọma; dị ka [n’okwu nke ndị mmegide] ndị nduhie ma [nke bụ́ eziokwu abụrụ na ha] bụ ndị na-ekwu eziokwu.”—2 Ndị Kọrint 6:4, 8.

7. Olee ajụjụ nnyocha echiche ndị anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?

7 Ka Pọl na-edegara Timoti akwụkwọ, o kwuru, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike . . . Ya mere, abụla onye ihere nke àmà banyere Onyenwe anyị na-eme.” (2 Timoti 1:7, 8; Mak 8:38) N’ịbụ ndị gụworo okwu ndị ahụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihere okpukpe m ọ̀ na-eme m, ka m̀ nwere obi ike? N’ebe m na-arụ ọrụ (ma ọ bụ na-aga akwụkwọ), m̀ na-eme ka ndị nọ m gburugburu mara na abụ m Onyeàmà Jehova, ka m̀ na-anwa izochi nke bụ́ eziokwu? Ihere ọ̀ na-eme m ịdị iche n’ebe ndị ọzọ nọ, ka obi ọ̀ na-adị m ụtọ ịgbapụ iche n’ihi mmekọrịta mụ na Jehova?’ Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enwe nkụda mmụọ n’ihe banyere ikwusa ozi ọma ahụ ma ọ bụ n’ihi ịbụ onye ndị mmadụ na-adịghị ele anya ọma, ya cheta ndụmọdụ Jehova nyere Jọshụa: “Dị ike [“nwee obi ike,” NW], nweekwa ume.” Ka anyị ghara ichefu ma ọlị na ihe dị mkpa abụghị echiche nke ndị ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị kama ọ bụ echiche Jehova na Jizọs Kraịst.—Ndị Galeshia 1:10.

Otú E Si Azụlite Obi Ike

8, 9. (a) N’otu oge, olee otú e si nwalee obi ike nke Ndị Kraịst oge mbụ? (b) Olee otú Pita na Jọn si meghachi omume mgbe e yiri ha egwu, ahụmahụ dịkwa aṅaa ka ha na ụmụnna ha nwetara?

8 Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ụdị obi ike ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’oge ndị a tara akpụ? Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si zụlite obi ike? Tụlee ihe mere mgbe ndị isi nchụàjà na ndị okenye nọ na Jeruselem gwara Pita na Jọn ka ha kwụsị ime nkwusa n’aha Jizọs. Ndị ahụ na-eso ụzọ jụrụ, e yikwara ha egwu ma mesịa hapụ ha. Ozugbo nke ahụ gasịrị, ha gakwuuru ụmụnna ha, ha nile wee kpekọọ ekpere ọnụ, na-asị: “Jehova, leba anya n’iyi egwu ha, nyekwa ndị ohu gị ikike ịnọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.” (Ọrụ 4:13-29) Ná nzaghachi, Jehova ji mmụọ nsọ wusikwuo ha ike, dịkwa ka ndị ndú ndị Juu mesịrị gbaa akaebe ya, ha ji ozizi ha ‘mejupụta Jeruselem.’—Ọrụ 5:28.

9 Ka anyị nyochaa ihe mere n’oge ahụ. Mgbe ndị ndú ndị Juu yiri ndị ahụ na-eso ụzọ egwu, ihe batara ha n’uche abụghị ịkwụsị ime nkwusa n’ihi nrụgide. Kama nke ahụ, ndị ahụ na-eso ụzọ kpere ekpere maka obi ike iji nọgide na-eme nkwusa. Mgbe ha mesịrị, ha mere ihe kwekọrọ n’ekpere ha, Jehova jikwa mmụọ nsọ ya wusikwuo ha ike. Ahụmahụ ha na-egosi na ihe Pọl dere afọ ụfọdụ ka e mesịrị mgbe ọ na-ekwu ihe ọzọ, metụtara Ndị Kraịst mgbe a na-akpagbu ha. Pọl kwuru, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.

10. Olee otú ahụmahụ Jeremaịa si enyere ndị bụ́ ndị ihere site n’ọmụmụ aka?

10 Otú ọ dị, ka e were ya na mmadụ bụ onye ihere site n’ọmụmụ. Ọ̀ ga-enwe ike iji obi ike na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị mmegide? Eenụ! Cheta otú Jeremaịa si meghachi omume mgbe Jehova họpụtara ya ịbụ onye amụma. Nwa okorobịa ahụ kwuru, sị: “Nwata ka m bụ.” N’ụzọ doro anya, ọ dị ya ka o rughị eru. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ji okwu ndị a gbaa ya ume: “Asịla, Nwata ka m bụ: n’ihi na ọ bụ onye ọ bụla M ga-ezi gị ka ị ga-ejekwuru, ọ bụkwa ihe ọ bụla M ga-enye gị n’iwu ka ị ga-ekwu. Atụla egwu ihu ha: n’ihi na gị ka M nọnyeere ịnapụta gị.” (Jeremaịa 1:6-10) Jeremaịa nwere obi ike n’ebe Jehova nọ, n’ihi ya kwa, site n’ike Jehova, ọ bịara kwụsị ịla azụ ma ghọọ onye àmà nwere obi ike a ma ama n’Izrel.

11. Gịnị na-enyere Ndị Kraịst taa aka ịdị ka Jeremaịa?

11 Ndị Kraịst e tere mmanụ taa nwere ọrụ yiri nke Jeremaịa, n’ịbụkwa ndị “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-akwado, ha na-anọgide na-ekwusa nzube Jehova, ọbụna n’agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị mmasị, na-eme ha akaje, ma na-akpagbu ha. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ha na-enweta obi ike site n’okwu Jehova gwara Jeremaịa, bụ́: “Atụla egwu.” Ha adịghị echefu ma ọlị na ọ bụ Chineke zipụrụ ha nakwa na ọ bụ ozi ya ka ha na-ekwusa.—2 Ndị Kọrint 2:17.

Ndị Obi Ike Ha Kwesịrị Nṅomi

12. Olee ihe nlereanya magburu onwe ya Jizọs setịpụrụ n’ihe banyere inwe obi ike, oleekwa otú o si gbaa ụmụazụ ya ume?

12 A pụrụ inyere anyị aka ná mgbalị ndị anyị na-eme ịzụlite obi ike ma ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe nlereanya nke ndị ọzọ bụ́ ndị, dị ka Jeremaịa, gosipụtaworo obi ike. (Abụ Ọma 77:12) Dị ka ihe atụ, mgbe anyị tụlere ozi Jizọs, nkwuwa okwu o nwere mgbe Setan nwara ya nakwa mgbe ndị ndú ndị Juu megidere ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ na-amasị anyị. (Luk 4:1-13; 20:19-47) N’ihi ike Jehova nyere ya, Jizọs bụ a kwaa a kwụrụ, n’oge na-adịghịkwa anya tupu ọnwụ ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33; 17:16) Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs agbasoo ihe nlereanya ya, ha onwe ha kwa ga-enwe mmeri. (1 Jọn 2:6; Mkpughe 2:7, 11, 17, 26) Ma ọ ga-adị ha mkpa ‘inwe obi ike.’

13. Olee agbamume Pọl nyere ndị Filipaị?

13 Afọ ụfọdụ mgbe ọnwụ Jizọs gasịrị, a tụbara Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ dị na Filipaị. Mgbe e mesịrị, Pọl gbara ọgbakọ Filipaị ume ịnọgide “na-eguzosi ike n’otu mmụọ, jiri otu mkpụrụ obi na-agbakọ mbọ ọnụ maka okwukwe nke ozi ọma, gharakwa ịbụ ndị ndị na-emegide [ha] na-emenye ụjọ n’ụzọ ọ bụla.” Iji wusikwuo ha ike na nke a, Pọl kwuru, sị: “Ihe a kpọmkwem [mkpagbu a na-akpagbu Ndị Kraịst] bụụrụ [ndị mmegide] ihe àmà nke mbibi, ma bụụrụ unu nke nzọpụta; ihe ngosipụta nke a sitekwara n’aka Chineke, n’ihi na unu ka e nyere ihe ùgwù ahụ n’ihi Kraịst, ọ bụghị nanị ka unu tinye okwukwe unu na ya, kamakwa ka unu taa ahụhụ n’ihi ya.”—Ndị Filipaị 1:27-29.

14. Gịnị mere na Rom n’ihi nkwuwa okwu Pọl?

14 Mgbe Pọl degaara ọgbakọ ahụ dị na Filipaị akwụkwọ, ọ nọkwa n’ụlọ mkpọrọ ọzọ, nke ugbu a bụ na Rom. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere jiri nkwuwa okwu na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma. Gịnị si na ya pụta? O dere, sị: “Agbụ m aghọwo ihe ọha mmadụ maara n’ihe metụtara Kraịst n’etiti Ndị Nche Eze nile na ndị nile ọzọ; ihe kakwa ọtụtụ n’ụmụnna n’ime Onyenwe anyị, n’inwe obi ike n’ihi agbụ ụlọ mkpọrọ m, na-egosi obi ike karị n’ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.”—Ndị Filipaị 1:13, 14.

15. Ebee ka anyị pụrụ ịchọta akụkọ banyere ndị setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke okwukwe bụ́ ndị ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike inwe obi ike?

15 Ihe nlereanya Pọl na-agba anyị ume. Otú ahụ ka ezi ihe nlereanya nke Ndị Kraịst nke oge a bụ́ ndị tachiworo obi ná mkpagbu ná mba ndị nọ n’okpuru ọchịchị aka ike ma ọ bụ ọchịchị ndị ụkọchukwu, na-agbakwa anyị ume. A kọwo banyere ọtụtụ n’ime ha na magazin Ụlọ Nche na Teta! nakwa na Yearbook of Jehovah’s Witnesses. Ka ị na-agụ akụkọ ndị a mere eme, cheta na ndị a kọrọ banyere ha bụ mmadụ nkịtị ndị dị ka anyị; ma mgbe ha nọ n’ọnọdụ ndị tara nnọọ akpụ, Jehova nyere ha ike karịrị ike nkịtị, ha atachiekwa obi. Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-emere anyị otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ọnọdụ chọrọ ka o mee otú ahụ.

Nguzosi Ike Anyị Na-atọ Jehova Ụtọ Ma Na-enye Ya Otuto

16, 17. Olee otú anyị pụrụ isi na-azụlite obi ike taa?

16 Ọ bụrụ na mmadụ eguzosie ike maka eziokwu na ezi omume, ọ pụtara na o nwere obi ike. Ọ bụrụ na mmadụ emee otú ahụ n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ ya, onye ahụ nwere obi ike ọbụna karị. N’ezie, Onye Kraịst ọ bụla pụrụ inwe obi ike ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime uche Jehova n’ezie, ma ọ bụrụ na o kpebisiri ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ma ọ bụrụ na ọ na-adabere n’ebe Chineke nọ mgbe nile, nakwa ma ọ bụrụ na ọ na-echeta mgbe nile na Jehova ewusiwo ọtụtụ ndị dị ka ya ike n’oge mbụ. Ọzọkwa, mgbe anyị ghọtara na nguzosi ike anyị na-atọ Jehova ụtọ ma na-enye ya otuto, anyị na-ekpebisikwu ike ọbụna karị ịghara ịda mbà. Anyị na-adị njikere idi akaje ma ọ bụ ihe ka ya njọ n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya nke ukwuu.—1 Jọn 2:5; 4:18.

17 Echefula ma ọlị na mgbe anyị na-ata ahụhụ n’ihi okwukwe anyị, ọ pụtaghị na anyị mere ihe ọjọọ. (1 Pita 3:17) Anyị na-ata ahụhụ n’ihi na anyị na-akwado ọbụbụeze Jehova, n’ihi na anyị na-eme ihe ọma, nakwa n’ihi na anyị abụghị akụkụ nke ụwa. Pita onyeozi kwuru banyere nke a, sị: “Ọ bụrụ na, mgbe unu na-eme ihe ọma ma na-ata ahụhụ, unu atachie obi, nke a bụ ihe dị mma n’ebe Chineke nọ.” Pita kwukwara, sị: “Ka ndị na-ata ahụhụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke nọgidekwa na-enyefe mkpụrụ obi ha n’aka Onye Okike nke na-ekwesị ntụkwasị obi ka ha nọ na-eme ihe ọma.” (1 Pita 2:20; 4:19) Ee, okwukwe anyị na-atọ Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ụtọ ma na-ewetara ya otuto. Lee ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji nwee obi ike ọ bụ!

Ịgwa Ndị Na-achị Achị Okwu

18, 19. Mgbe anyị guzosiri ike n’ihu ọkàikpe, olee ozi anyị na-ezi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya?

18 Mgbe Jizọs gwara ụmụazụ ya na a ga-akpagbu ha, o kwukwara, sị: “[Ndị mmadụ] ga-enyefe unu n’ụlọikpe obodo, ha ga-apịakwa unu ihe n’ụlọ nzukọ ha. N’ezie, a ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.” (Matiu 10:17, 18) Ọ na-achọ obi ike iji pụta n’ihu ọkàikpe ma ọ bụ onye ọchịchị n’ihi ebubo ụgha. Ma, mgbe anyị ji obi ike jiri oge ndị ahụ gbaara ndị ahụ àmà, anyị na-eme ka ọnọdụ tara akpụ ghọọ ohere nke anyị ji rụpụta ihe dị mkpa. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị na-agwa ndị na-ekpe anyị ikpe okwu Jehova, bụ́ nke e dekọrọ n’Abụ Ọma nke abụọ, sị: “Ugbu a, ndị eze, nweenụ uche: ka a dọọ unu aka ná ntị, ndị ikpe nke ụwa. Werenụ egwu fee Jehova ofufe.” (Abụ Ọma 2:10, 11) Ọtụtụ mgbe e boworo Ndịàmà Jehova ebubo ụgha n’ụlọikpe, ndị ọkàikpe akwadowo nnwere onwe ife ofufe, anyị nwekwara ekele maka nke ahụ. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkàikpe ekwewo ka ndị mmegide metụta mkpebi ha. Akwụkwọ Nsọ na-agwa ndị dị otú ahụ, sị: “Ka a dọọ unu aka ná ntị.”

19 Ndị ọkàikpe kwesịrị ịmara na iwu kasịnụ bụ nke Jehova Chineke. Ha kwesịrị icheta na mmadụ nile, gụnyere ndị ikpe, ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova Chineke na Jizọs Kraịst. (Ndị Rom 14:10) Ma ọkàikpe bụ́ mmadụ ò kpere anyị ikpe ziri ezi ma ọ bụ na o kpeghị anyị, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike n’ihi na Jehova na-akwado anyị. Bible na-ekwu, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ha bụ, bụ́ ndị nile na-agbaba n’ime ya.”—Abụ Ọma 2:12.

20. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị atachie obi ná mkpagbu na n’ebubo ụgha?

20 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na n’ụzọ dị otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Matiu 5:11, 12) N’ezie, mkpagbu n’onwe ya adịghị atọ ụtọ, ma anyị iguzosi ike n’agbanyeghị mkpagbu, gụnyere ebubo ụgha ndị a na-ebo anyị n’usoro mgbasa ozi, bụ ihe na-enye ọṅụ. Ọ pụtara na anyị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ nakwa na anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ. Anyị iguzosi ike na-egosi na anyị nwere ezi okwukwe ma na-emesi anyị obi ike na anyị nwere nkwado Chineke. N’ezie, ọ na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi kpam kpam. Ntụkwasị obi dị otú ahụ dị oké mkpa nye Onye Kraịst, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee ọnọdụ ndị na-achọ obi ike taa?

• Olee otú anyị pụrụ isi zụlite obi ike?

• Olee ụfọdụ ndị setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’inwe obi ike?

• N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ọchịchọ iji obi ike na-eme ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Simone Arnold (ọ na-azazi Liebster) onye nọ na Germany, Widdas Madona onye nọ na Malawi, nakwa Lydia na Oleksii Kurdas bụ́ ndị nọ na Ukraine gosipụtara obi ike ma guzogide ajọ onye ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme anyị

[Foto dị na peeji nke 11]

Obi ike Pọl gosipụtara n’ụlọ mkpọrọ nyere aka mee ka ozi ọma ahụ gaa n’ihu

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ike kọwaara ọkàikpe nguzo anyị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-ezi ozi dị mkpa