Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mgbe Ịda Ogbenye Ga-akwụsị?

Ọ̀ Dị Mgbe Ịda Ogbenye Ga-akwụsị?

Ọ̀ Dị Mgbe Ịda Ogbenye Ga-akwụsị?

“LEE, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere,” ka Eze Solomọn maara ihe nke Izrel oge ochie kwuru. (Eklisiastis 4:1) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ n’ime ndị ahụ o bu n’obi a na-emegbu emegbu dakwara ogbenye.

Ọ bụghị nanị n’ego ka a na-agbakwasị ụkwụ ekpebi onye dara ogbenye. Dị ka ihe ndekọ nke Ụlọ Akụ̀ Ụwa nyere na June 2002 si dị, “e mewo atụmatụ na, na 1998, ijeri mmadụ 1.2 n’ụwa nile na-akpata ihe na-erughị $1 n’ụbọchị . . . ijeri mmadụ 2.8 na-akpatakwa ihe na-erughị $2 n’ụbọchị.” E kwuru na ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ahụ dị ala karịa atụmatụ ndị e mere n’oge gara aga, “ahụhụ ndị nọ n’ọnọdụ ahụ na-ata ka nọgidere bụrụ ihe karịrị akarị.”

Ọ̀ dị mgbe ịda ogbenye ga-akwụsị? Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu na ndị ogbenye nọ mgbe nile.” (Jọn 12:8) Ma nke a ọ̀ pụtara na ịda ogbenye na ihe ndị dị mwute ọ na-akpata ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi? Ee e, n’ihi na ọ bụ ezie na Jizọs ekweghị ụmụazụ ya nkwa na ha nile ga-aba ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe, anyị ekwesịghị ikwubi site n’okwu ya na ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ogbenye.

N’agbanyeghị mgbalị ndị ụmụ mmadụ na-eme na eziokwu ahụ bụ́ na nkwa ndị e kwere ime ka ịda ogbenye kwụsị akụwo afọ n’ala mgbe mgbe, Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-emesi anyị obi ike na n’oge na-adịghị anya, a gaghịzi enwe ndị nọ ná mkpa. N’ezie, Jizọs kpọsaara “ndị ogbenye ozi ọma.” (Luk 4:18) Ozi ọma a na-agụnye nkwa bụ́ na a ga-ekpochapụ ịda ogbenye. A ga-eme nke a mgbe Alaeze Chineke ga-eweta ọnọdụ ndị ziri ezi n’ụwa.

Lee ka ụwa ga-esi dị iche n’oge ahụ! Eze eluigwe ahụ bụ́ Jizọs Kraịst “ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.” N’ezie, “Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.”—Abụ Ọma 72:13, 14.

Banyere oge ahụ, Maịka 4:4 na-ekwu, sị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu nile na-emekpa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ́, ọbụna na-eme ka ọrịa na ọnwụ kwụsị. Chineke “[ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:8.

Ị pụrụ ịtụkwasị obi ná nkwa ndị a n’ihi na ha sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Gịnị ma i nyochaa ihe àmà ndị na-egosi na amụma Bible kwesịrị ntụkwasị obi?

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

FAO photo/M. Marzot