Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ndụ Ya Gbanwere Kpam Kpam

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ndụ Ya Gbanwere Kpam Kpam

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Ndụ Ya Gbanwere Kpam Kpam

LEE ka ndụ siworo bụrụ ihe na-adịghị ụtọ na ihe na-enweghị isi nye Matsepang! Ọ bụ nwa agbọghọ bi na Lesotho, bụ́ mba nke dị n’etiti South Africa. A zụlitere Matsepang dị ka onye Katọlik. Otú ọ dị, kama inyere ya aka ịbịaru Chineke nso, ruo ọtụtụ afọ, ndị nọn bụ́ ndị ji ego rata ya iso ha mee omume rụrụ arụ metọrọ ya.

N’ihi ya, Matsepang bịara nwee ndakpọ olileanya n’ebe okpukpe dị, ọ pụghịkwa ikwere n’Onye Okike na-ahụ n’anya bụ́ onye ji ezi obi elekọta ihe o kere eke bụ́ mmadụ. N’ihi anya e leghaara ya na mmetọ e metọrọ ya, Matsepang bịara nwee obi mgbawa na mmetụta nke ịbụ onye na-abatụghị uru. O tolitere bụrụ onye na-eme ihe ike na onye ọgụ na mgba. Nke a dugara ya n’ime mpụ.

Matsepang mesịrị sonye n’òtù nke na-ezu ndị mmadụ ohi n’ụgbọ okporo ígwè. E jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ na South Africa. Mgbe e mesịrị, a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi laghachi n’obodo ya, bụ́ Lesotho, bụ́ ebe ọ nọgidere na-ebi ndụ ime mpụ, ịṅụbiga mmanya ókè, ime ihe ike, na nke omume rụrụ arụ.

N’oge ndụ ya na-enweghịzi isi, Matsepang kpekusiri Chineke ekpere ike maka enyemaka. O kwere nkwa, sị, “Chineke, ọ bụrụ na m adị ndụ, aga m eme ihe nile m pụrụ ime iji jeere gị ozi.”

N’oge na-adịghị anya, ndị ozi ala ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova bịakwutere Matsepang. Ha gwara ya ka ha mụọrọ ya Bible. Site n’ọmụmụ ihe ya, ọ bịara ghọta na Chineke abụghị onye na-achọghị ịma na onye na-adịghị eche banyere ya. N’ezie, ọ ghọtara na Setan, bụ́ “nna nke ụgha,” na-eji ụzọ akọ na nke aghụghọ eme ka ụfọdụ ndị na-enwe mmetụta na ha abaghị uru ma na-eme ka ha kwere na Jehova apụtụghị iwere ha dị ka ndị e kwesịrị ịhụ n’anya.—Jọn 8:44; Ndị Efesọs 6:11.

N’ụzọ dị iche, lee ihe nkasi obi ọ bụụrụ Matsepang mgbe ọ mụtara na anyị pụrụ inwe ezi ùgwù onwe onye ma ọ bụrụ na anyị echegharịa ná mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga, chọọ mgbaghara Chineke, ma na-agbalịsi ike ime ihe na-atọ ya ụtọ! E nyeere ya aka ịghọta na “Chineke karịrị obi anyị” ma na-ele anyị anya n’ụzọ pụrụ ịdị nnọọ iche n’otú anyị si ele onwe anyị anya.—1 Jọn 3:19, 20.

Obi tọrọ Matsepang ụtọ ịgụ okwu ndị a ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Dị ka otu n’ime ndị “a zọpịaworo n’ime mmụọ ha,” ọ bịara ghọta na Jehova adịghị agbahapụ ndị ohu ya, ọbụna ma a sị na ụfọdụ n’ime ha enwee nkụda mmụọ ma ọ bụ na-eche na ha adịghị mkpa. Obi tọrọ ya ụtọ ịmara na Chineke na-eche banyere atụrụ ya nile ma na-akwagide ha mgbe ihe na-esiri ha ike. (Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:6, 7) Okwu a metụrụ ya n’obi karịsịa: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

N’oge na-adịghị anya, a bịara hụwa ike Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-akpa ná ndụ Matsepang. Ọ malitere ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya ma kwụsị omume ya ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Gịnị si na ya pụta? O nweghịzi mmetụta nke ịbụ onye na-erughị ka Chineke hụ ya n’anya ma nwee ihu ọma n’ebe ọ nọ. Kemgbe e mere ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, o jiriwo ọtụtụ puku awa jee ozi Ndị Kraịst dị ka onye na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. N’agbanyeghị obi mgbawa ndị o nwere n’oge gara aga, Matsepang na-ebizi ndụ obi ụtọ na nke nwere nzube. Lee ka nke a si egosipụta ike Bible nwere imeziwanye ndụ!—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Chineke, ọ bụrụ na m adị ndụ, aga m eme ihe nile m pụrụ ime iji jeere gị ozi”

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ụkpụrụ Bible Ndị Nọ n’Ọrụ

Ụkpụrụ Bible ndị kasiworo ndị e megburu emegbu obi na-agụnye ndị a:

“Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị [Chineke] nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 94:19) “Nkasi obi” Jehova nke a na-ahụ n’Okwu ya bụ ihe na-eme nnọọ ka obi jụrụ mmadụ. Ịtụle ha mgbe a na-atụgharị uche ma na-ekpe ekpere na-enye aka ebelata nchegbu ma na-eme ka a malite ịtụkwasị Chineke obi dị ka Enyi nke na-egosi nghọta.

“Ọ [Jehova] bụ onye na-eme ka ndị obi ha tiwara etiwa dịrị ndụ, Ọ na-ekechikwa ihe mgbu nile ha.” (Abụ Ọma 147:3) Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ebere Jehova na ndokwa o mere ikpuchi mmehie anyị site n’àjà mgbapụta Jizọs, obi pụrụ isi anyị ike ịbịakwute Chineke n’enweghị obi amamikpe ọzọ. Nke a pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị a kasiri obi na ndị obi ruru ala n’ụzọ na-enweghị atụ.

“Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m [Jizọs Kraịst] ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya; m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 6:44) Site ná mmụọ nsọ ya nakwa site n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, Jehova ji aka ya adọta anyị n’ebe Ọkpara ya nọ ma na-enye anyị olileanya nke ndụ ebighị ebi.