Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị Nwayọọ—Àgwà Dị Oké Mkpa nke Ndị Kraịst

Ịdị Nwayọọ—Àgwà Dị Oké Mkpa nke Ndị Kraịst

Ịdị Nwayọọ—Àgwà Dị Oké Mkpa nke Ndị Kraịst

“Yikwasịnụ onwe unu . . . ịdị nwayọọ.”—NDỊ KỌLỌSI 3:12.

1. Gịnị na-eme ka ịdị nwayọọ bụrụ àgwà dị ịrịba ama?

MGBE mmadụ bụ onye dị nwayọọ, ọ na-abụ ihe obi ụtọ ịnọnyere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Eze Solomọn maara ihe kwuru na ‘ire nro na-anyaji ọkpụkpụ.’ (Ilu 25:15) Ịdị nwayọọ bụ àgwà dị ịrịba ama nke na-agụnye ma ịdị mma ma ike.

2, 3. Olee njikọ ịdị nwayọọ na mmụọ nsọ nwere, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Pọl onyeozi gụnyere ịdị nwayọọ ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” bụ́ ndị a na-achọta ná Ndị Galeshia 5:22, 23. A na-asụgharịkarị okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ịdị nwayọọ” n’amaokwu 23 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ịbụ “ịdị umeala n’obi” ma ọ bụ “ịdị nro” ná nsụgharị Bible ndị ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na o siri ike ịchọta okwu ya na okwu Grik ahụ kwekọrọ kpọmkwem n’ihe ka ọtụtụ n’asụsụ ndị ọzọ n’ihi na okwu Grik mbụ ahụ na-akọwa, ọ bụghị ịdị nro ma ọ bụ umeala n’elu ahụ́, kama ọ bụ ịdị nwayọọ n’obi na ime amara; ọ bụghị otú mmadụ si akpa àgwà, kama ọnọdụ nke uche na obi ya.

3 Iji nyere anyị aka ịghọta nke ọma ihe ịdị nwayọọ pụtara na uru ọ bara, ka anyị tụlee ihe atụ anọ ndị e dekọrọ na Bible. (Ndị Rom 15:4) Ka anyị na-atụle ha, anyị ga-amụta ọ bụghị nanị ihe àgwà a bụ kamakwa otú anyị pụrụ isi zụlite ma na-egosipụta ya n’ihe nile anyị na-eme.

“Nke Bara Oké Uru n’Anya Chineke”

4. Olee otú anyị si mara na Jehova ji ịdị nwayọọ kpọrọ ihe?

4 Ebe ịdị nwayọọ so ná mkpụrụ nke mmụọ Chineke, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na anyị ga-ahụta ya dị ka ihe ya na àgwà Chineke ndị dị ịtụnanya nwere njikọ chiri anya. Pita onyeozi dere na “mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ” bụ ihe “bara oké uru n’anya Chineke.” (1 Pita 3:4) N’ezie, ịdị nwayọọ bụ àgwà Chineke; Jehova ji ya kpọrọ ihe nke ukwuu. Eziokwu a nanị zuru ime ka ndị ohu Chineke nile na-azụlite ịdị nwayọọ. Otú ọ dị, olee otú Chineke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Onye nwere ikike kasị elu n’eluigwe na ala, si egosipụta ịdị nwayọọ?

5. Olee atụmanya anyị nwere n’ihi ịdị nwayọọ nke Jehova?

5 Mgbe mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụrụ isi n’iwu doro anya Chineke nyere ha ịghara iri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, ha ma ụma mee ya. (Jenesis 2:16, 17) Isi ahụ ha ma ụma nupụ kpataara ha na ụmụ ha mesịrị mụọ mmehie, ọnwụ, na ịbụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ezie na Jehova nwere ezi ihe mere o ji maa ha ikpe, o jighị obi ọjọọ kachapụ ezinụlọ mmadụ dị ka ndị na-agatụghị ekwe mmekwata na ndị a na-apụtụghị ịgbapụta agbapụta. (Abụ Ọma 130:3) Kama nke ahụ, n’ihi amara ya na ọchịchọ ya ịghara ịchọ ihe gabiga ókè—ngosipụta nke ịdị nwayọọ—Jehova wepụtara ụzọ ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie pụrụ isi bịakwute ya ma nweta ihu ọma ya. Ee, site n’inye anyị onyinye bụ́ àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, Jehova mere ka o kwe anyị omume ịbịaru n’ocheeze ya dị elu n’atụghị egwu ma ọ bụ ụjọ.—Ndị Rom 6:23; Ndị Hibru 4:14-16; 1 Jọn 4:9, 10, 18.

6. Olee otú ịdị nwayọọ si pụta ìhè n’ụzọ Chineke si mesoo Ken ihe?

6 Ogologo oge tupu Jizọs abịa n’ụwa, Jehova gosipụtara ịdị nwayọọ ya mgbe Ken na Ebel, bụ́ ụmụ Adam, chụụrụ Chineke àjà. N’ịbụ onye ghọtara ọnọdụ obi ha, Jehova jụrụ ịnara onyinye ịnata ihu ọma Ken ma lee Ebel na onyinye ịnata ihu ọma ya “anya ọma.” Anya ọma Chineke lere Ebel kwesịrị ntụkwasị obi na àjà ya kpaliri Ken imeghachi omume n’ụzọ dị njọ. “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ,” ka ihe ndekọ Bible ahụ na-ekwu. Olee otú Jehova si meghachi omume? Àgwà ọjọọ Ken ọ kpasuru ya iwe? Ee e. O ji olu dị nro jụọ Ken ihe mere o ji na-ewe iwe dị ọkụ. Ọbụna Jehova kọwara ihe Ken pụrụ ime iji nwee “mgbasa ihu.” (Jenesis 4:3-7) N’ezie, Jehova bụ ịdị nwayọọ n’onwe ya.—Ọpụpụ 34:6.

Ịdị Nwayọọ Na-adọrọ Adọrọ Ma Na-enye Ume Ọhụrụ

7, 8. (a) Olee otú anyị pụrụ isi ghọta ịdị nwayọọ Jehova? (b) Gịnị ka ihe ndị e kwuru na Matiu 11:27-29 na-ekpughe banyere Jehova na Jizọs?

7 Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi ghọta àgwà ndị na-enweghị atụ nke Jehova bụ ịmụ banyere ndụ na ije ozi Jizọs Kraịst. (Jọn 1:18; 14:6-9) Ka Jizọs nọ na Galili n’ime afọ nke abụọ nke ọrụ nkwusa ya, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ike na Korezin, Betseida, Kapaniọm, na n’ógbè ndị gbara ha gburugburu. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ bụ ndị mpako na ndị na-enweghị mmasị, ha ekweghịkwa na ya. Olee otú Jizọs si meghachi omume? Ka o chetasiiri ha ike ihe ekwesịghị ntụkwasị obi ha ga-akpatara ha, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ʽam ha·ʼaʹret, bụ́ ndị nkịtị dị ala nọ n’etiti ha, n’ihi ọnọdụ ime mmụọ jọgburu onwe ya ha nọ na ya.—Matiu 9:35, 36; 11:20-24.

8 Ihe ndị Jizọs mere mgbe nke ahụ gasịrị gosiri na ọ “maara Nna ahụ n’ụzọ zuru ezu” ma ṅomie ya. Jizọs kpọrọ ndị nkịtị òkù a na-ekpo ọkụ, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ.” Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ ihe nkasi obi na ihe na-enye ume ọhụrụ nye ndị e wedara n’ala na ndị a na-emegbu emegbu! Ọbụna ha na-emetụkwa anyị n’ahụ́ taa. Ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi na-eyikwasị onwe anyị ịdị nwayọọ, mgbe ahụ, anyị ga-eso ná ndị “Ọkpara [ahụ] chọrọ ikpughere” Nna ya.—Matiu 11:27-29.

9. Olee àgwà ya na ịdị nwayọọ nwere njikọ, oleekwa otú Jizọs si bụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a?

9 Àgwà ya na ịdị nwayọọ nwere njikọ chiri anya bụ obi umeala, ịdị “umeala n’obi.” N’aka nke ọzọ, mpako na-eduga n’ibuli onwe onye elu, ọ pụkwara ime mgbe mgbe ka mmadụ jiri aka ike na obi ọjọọ na-emeso ndị ọzọ ihe. (Ilu 16:18, 19) Jizọs gosipụtara obi umeala n’oge nile o jere ozi n’ụwa. Ọbụna mgbe ịnyịnya buuru ya banye Jeruselem ụbọchị isii tupu ọ nwụọ, e keleekwa ya dị ka Eze ndị Juu, Jizọs mere ihe dị nnọọ iche n’ihe ndị ọchịchị ụwa na-eme. O mezuru amụma Zekaraịa buru banyere Mezaịa, sị: “Lee! Eze gị na-abịakwute gị, bụ́ onye dị nwayọọ n’obi, ọ na-anọkwasịkwa n’ịnyịnya ibu, ee, nwa ịnyịnya ibu, nwa nke anụ na-ebu ibu.” (Matiu 21:5; Zekaraịa 9:9) Daniel onye amụma hụrụ ọhụụ nke Chineke nọ na ya nyefee Ọkpara ya ike ọchịchị. N’agbanyeghị nke ahụ, n’amụma o buru tupu nke a, ọ kọwara Jizọs dị ka “onye dị ala karịa mmadụ nile.” N’ezie, ịdị nwayọọ na obi umeala na-aga ụkwụ na ụkwụ.—Daniel 4:17; 7:13, 14.

10. Gịnị mere ịdị nwayọọ nke Ndị Kraịst na-ejighị apụta adịghị ike?

10 Ịdị nwayọọ na-akpali mmasị nke Jehova na Jizọs gosipụtara na-enyere anyị aka ịbịaru ha nso. (Jems 4:8) N’ezie, ịdị nwayọọ adịghị apụta adịghị ike. Mbanụ! Jehova, bụ́ Chineke pụrụ ime ihe nile, nwere ume n’ike ma dị ike. Ọ na-ewe iwe nke ukwuu megide ajọ omume. (Aịsaịa 30:27; 40:26) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jizọs gosipụtara mkpebi siri ike o mere ịghara imebi okwukwe ya, ọbụna mgbe Setan bụ́ Ekwensu wakporo ya. Ọ jụrụ ịnabata achụmnta ego iwu na-akwadoghị nke ndị ndú okpukpe nke oge ya. (Matiu 4:1-11; 21:12, 13; Jọn 2:13-17) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-adị nwayọọ n’obi mgbe ọ na-anagide amaghị eme nke ndị na-eso ụzọ ya, o jikwa ndidi nagide adịghị ike ha. (Matiu 20:20-28) Otu ọkà mmụta Bible kọwara ịdị nwayọọ n’ụzọ dabara adaba otú a, sị: “E nwere ike yiri nke ígwè n’azụ ịdị nro ahụ.” Ka anyị na-egosipụta àgwà a yiri nke Kraịst—ịdị nwayọọ.

Onye Kasị Dịrị Umeala n’Obi n’Oge Ya

11, 12. N’iburu n’uche otú e si zụlite ya, gịnị mere ịdị nwayọọ Mozis ji dị ịrịba ama?

11 Onye nke atọ anyị ga-atụle ihe nlereanya ya bụ Mozis. Bible na-akọwa ya dị ka onye “dị umeala n’obi [“dị nwayọọ n’obi,” ihe odide ala ala peeji nke NW] nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) E dere nkọwa a n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ịdị nwayọọ dị ịrịba ama nke Mozis mere ka ọ nabata nduzi Jehova.

12 Ụzọ e si zụlite Mozis pụrụ iche. Jehova hụrụ na e chebere ndụ nwa nwoke a nne na nna bụ́ ndị Hibru kwesịrị ntụkwasị obi mụrụ n’oge aghụghọ na igbu ọchụ jupụtara n’ógbè ha. Nne Mozis, bụ́ onye ji nlezianya kụziere ya banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, lekọtara ya n’afọ ndị mbụ nke ndụ ya. Mgbe e mesịrị, e si n’ebe Mozis bi kpọga ya n’ebe dị nnọọ iche. “A kụziiri Mozis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt,” ka Onye Kraịst oge mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya bụ́ Stivin kwuru. “N’eziokwu, [Mozis] dị ike n’okwu na n’omume.” (Ọrụ 7:22) O gosipụtara okwukwe ya mgbe ọ hụrụ ọtụtụ ikpe na-ezighị ezi ndị na-elekọta ndị ohu Fero na-ekpe ụmụnne ya. N’ihi igbu onye Ijipt ọ hụrụ ka ọ na-eti onye Hibru ihe, Mozis aghaghị isi n’Ijipt gbaga ala Midian.—Ọpụpụ 1:15, 16; 2:1-15; Ndị Hibru 11:24, 25.

13. Olee mmetụta afọ 40 Mozis nọrọ na Midian nwere n’ahụ́ ya?

13 Mgbe Mozis dị afọ 40, ọ bịara bụrụ na ọ ghaghị ilekọta onwe ya n’ọzara. Na Midian, o zutere ụmụ ndị inyom asaa Reuel ma nye aka sepụtara ha mmiri maka nnukwu ìgwè ewu na atụrụ nna ha. Mgbe ụmụ agbọghọ ahụ lọtara n’ebe obibi ha, ha ji obi ụtọ kọwaara Reuel na “otu onye Ijipt” napụtara ha n’aka ndị ọzụzụ atụrụ na-enye ha nsogbu. Ka Reuel kpọrọ ya, Mozis bịara binyere ezinụlọ ahụ. Ahụhụ nile ọ tara emeghị ka o nwee obi ilu; ha emeghịkwa ka ọ ghara ịmụta ime mgbanwe iji mee ka ụzọ ndụ ya kwekọọ n’ebe ọhụrụ o bi. Ọchịchọ o nwere ime uche Jehova kwụ chịm mgbe nile. N’ime ogologo afọ 40, bụ́ nke o ji lekọta atụrụ Reuel, lụọ Zipora, ma zụlite ụmụ ya nwoke, Mozis zụlitere ma nụchaa àgwà e ji bịa mara ya. Ee, site n’ịtachi obi n’ahụhụ, Mozis mụtara ịdị nwayọọ.—Ọpụpụ 2:16-22; Ọrụ 7:29, 30.

14. Kọọ otu ihe mere n’oge Mozis na-edu Izrel nke gosiri na ọ dị nwayọọ.

14 Mgbe Jehova họpụtasịrị Mozis ịbụ onye ndú mba Izrel, àgwà ịdị nwayọọ ya ka pụtara ìhè. Otu nwa okorobịa kọọrọ Mozis na Eldad na Midad na-eme ka ndị amụma n’ọmụma ụlọikwuu—ọ bụ ezie na ha anọghị ya mgbe Jehova wụsara mmụọ ya n’isi ndị okenye 70 bụ́ ndị gaje ije ozi dị ka ndị inyeaka Mozis. Jọshụa kwuru, sị: “Onye nwe m Mozis, gbochie ha.” Ma Mozis ji olu dị nro zaghachi, sị: “Ọ̀ bụ onye na-ekwo ekworo ka ị bụụrụ m? ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ndị Jehova nile bụ ndị amụma, ka Jehova wee tinyekwasị ha Mmụọ Ya!” (Ọnụ Ọgụgụ 11:26-29) Ịdị nwayọọ nyere aka mejụọ ọnọdụ ahụ gaara akpata esemokwu.

15. Ọ bụ ezie na Mozis ezughị okè, n’ihi gịnị ka ihe nlereanya ya ji bụrụ nke a ga-agbaso?

15 N’otu oge, o yiri ka Mozis adịghịzi nwayọọ. Na Meriba, nke dị nso na Kidesh, o nyeghị Jehova, bụ́ Onye Ọrụ Ebube, otuto. (Ọnụ Ọgụgụ 20:1, 9-13) Ọ bụ ezie na Mozis ezughị okè, okwukwe ya na-adịghị ada ada kwadoro ya ná ndụ ya nile, ịdị nwayọọ ya nke pụtara ìhè na-emetụkwa anyị n’ahụ́ ọbụna taa.—Ndị Hibru 11:23-28.

Aka Ike na Ịdị Nwayọọ

16, 17. Olee ịdọ aka ná ntị anyị na-enweta site n’ihe ndekọ banyere Nebal na Abigail?

16 E nwere otu ihe atụ ịdọ aka ná ntị n’oge Devid, n’oge na-adịghị anya mgbe ọnwụ onye amụma Chineke bụ́ Samuel, gasịrị. Ọ bụ banyere otu di na nwunye, bụ́ Nebal na nwunye ya, bụ́ Abigail. Lee ka mmadụ abụọ a si dịrịta nnọọ iche! Ebe Abigail nwere “ezi uche,” di ya “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile.” Nebal ji enweghị nsọpụrụ jụ arịrịọ ndị ikom Devid, bụ́ ndị nyere aka chebe nnukwu ìgwè atụrụ Nebal pụọ n’aka ndị ohi, rịọrọ ya maka ihe oriri. N’ịbụ ndị iwe were n’ụzọ ziri ezi, Devid na ìgwè ndị ikom ya buliri mma agha ha ma gawa ịlụso Nebal ọgụ.—1 Samuel 25:2-13.

17 Mgbe Abigail nụrụ ihe merenụ, o mere ngwa ngwa buru achịcha, mmanya vaịn, anụ, na ụyọkọ mkpụrụ vaịn a mịrị amị na mbadamba fig ma gawa izute Devid. “Onye nwe m, ka ajọ omume ahụ dịkwasị mụ onwe m,” ka ọ rịọrọ ya. “Biko, ka ohu gị nwanyị kwuo ná ntị gị, gị nụrụkwa okwu nile nke ohu gị nwanyị.” Obi jụụrụ Devid n’ihi arịrịọ Abigail ji olu dị nro rịọ ya. Mgbe o gesịrị ntị n’ihe Abigail kọwara, Devid kwupụtara, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke [Izrel], bụ, Onye zitere gị taa izute m: ihe a gọziri agọzi ka ezi uche gị bụkwa, onye a gọziri agọzi ka ị bụkwa, onye gbochiworo m taa ka m ghara ịba n’ikpe ọmụma ọbara.” (1 Samuel 25:18, 24, 32, 33) Aka ike Nebal mesịrị kpatara ya ọnwụ. Àgwà ọma Abigail mesịrị wetara ya ọṅụ nke ịghọ nwunye Devid. Ịdị nwayọọ ya bụụrụ ndị nile na-ejere Jehova ozi taa ihe nlereanya.—1 Samuel 25:36-42.

Chụsoo Ịdị Nwayọọ

18, 19. (a) Olee mgbanwe ndị na-apụta ìhè ka anyị na-eyikwasị onwe anyị ịdị nwayọọ? (b) Gịnị pụrụ inyere anyị aka inyocha onwe anyị n’ụzọ dị irè?

18 Ya mere, ọ bụ iwu na anyị ga-adị nwayọọ. Ọ karịrị ime nwayọọ nwayọọ; ọ bụ àgwà na-adọrọ adọrọ nke na-enye ndị ọzọ ume ọhụrụ. Iji olu ike ekwu okwu na ime omume n’ụzọ obi ọjọọ pụrụ ịmarawo anyị ahụ́ n’oge gara aga. Otú ọ dị, mgbe anyị mụtara eziokwu Bible, anyị gbanwere ma bụrụkwuo ndị ihe ha na-amasị ndị ọzọ ma na-atọ ha ụtọ. Pọl kwuru banyere mgbanwe a mgbe ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Bible ji mgbanwe a atụnyere mgbanwe ndị anụ ọjọọ—anụ wolf, agụ owuru, ọdụm, anụ bear, na ubí—gbanwere ghọọ anụ ụlọ ndị na-adịghị enye nsogbu—nwa atụrụ, nwa ewu, nwa ehi, na ehi. (Aịsaịa 11:6-9; 65:25) Mgbanwe ndị a a na-eme n’àgwà na-adị nnọọ ịrịba ama nke na ọ na-atụ ndị na-ahụ ya n’anya. Otú ọ dị, anyị kweere na mgbanwe a bụ n’ihi ike mmụọ Chineke na-akpa, n’ihi na ịdị nwayọọ so ná mkpụrụ ya ndị dị ịrịba ama n’ezie.

19 Nke a ọ̀ pụtara na ozugbo anyị mere mgbanwe ndị dị mkpa ma rara onwe anyị nye Jehova, ọ dịghịzi anyị mkpa ịrụ ọrụ iji nọgide na-adị nwayọọ n’obi? Ọ dịghị ma ọlị. Leenụ, ọ dị mkpa ịnọgide na-elekọta uwe ọhụrụ ka o wee nọgide na-adị ọcha ma na-adị mma n’anya. Inyoba anya n’Okwu Chineke na ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị dị na ya na-enyere anyị aka iji obi ọcha na-elebara onwe anyị anya. Gịnị ka Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ nke yiri enyo na-ekpughe banyere gị?—Jems 1:23-25.

20. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’igosipụta ịdị nwayọọ?

20 Dị ka ọ na-adịkarị, àgwà ndị mmadụ dịgasị iche iche. Ọ na-adịrị ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke mfe igosipụta ịdị nwayọọ karịa ka ọ na-adịrị ndị ọzọ. Ka o sina dị, ọ dị Ndị Kraịst nile mkpa ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, gụnyere ịdị nwayọọ. Pọl ji ịhụnanya dụọ Timoti ọdụ, sị: “Chụsoo ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi.” (1 Timoti 6:11) Okwu ahụ bụ́ “chụsoo” na-egosi na ọ chọrọ mgbalị. Otu nsụgharị Bible sụgharịrị agbamume a ịbụ ‘tinye obi gị n’ihe.’ (New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips dere) Ọ bụrụ na i mee mgbalị iji na-atụgharị uche n’ezi ihe nlereanya ndị sitere n’Okwu Chineke, ha pụrụ ịdịgide n’obi gị, dị nnọọ ka ihe a kụnyere n’ahụ́ gị. Ha ga-akpụzi ma na-eduzi gị.—Jems 1:21.

21. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịchụso ịdị nwayọọ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ ihe na-egosi otú anyị na-emeru nke ọma n’akụkụ a. “Ònye maara ihe ma nwee nghọta n’etiti unu?” ka Jems onye na-eso ụzọ jụrụ. “Ka o site n’omume ọma ya na-egosi ọrụ ya, na-eji ịdị nwayọọ nke dịịrị amamihe.” (Jems 3:13) Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta àgwà Ndị Kraịst a n’ebe obibi, n’ozi Ndị Kraịst, nakwa n’ọgbakọ? Isiokwu na-esonụ na-enye nduzi na-enye aka.

Ná Ntụleghachi

• Gịnị ka ị mụtara banyere ịdị nwayọọ site n’ihe nlereanya nke

• Jehova?

• Jizọs?

• Mozis?

• Abigail?

• N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịchụso ịdị nwayọọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

N’ihi gịnị ka Jehova ji lee onyinye ịnata ihu ọma Ebel anya ọma?

[Foto dị na peeji nke 17]

Jizọs gosiri na ịdị nwayọọ na obi umeala na-aga ụkwụ na ụkwụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Mozis setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ịdị nwayọọ