Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Ji Obi Ụtọ Na-akpọ Gị Òkù

E Ji Obi Ụtọ Na-akpọ Gị Òkù

E Ji Obi Ụtọ Na-akpọ Gị Òkù

NRI Anyasị Ikpeazụ ahụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst guzobere ihe dị ka afọ 2,000 gara aga karịrị ememe nkịtị mere ihe akụkọ. O nwewo mmetụta dị ike n’ahụ́ ụmụ mmadụ kemgbe e guzobere ya. N’ịbụ ndị ihe ha gụtara n’ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ banyere ihe mere n’abalị ahụ kpaliri, ọtụtụ ndị agbalịsiwo ike ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụzọ dịgasị iche iche.

Ihe ndị a nile kwere nghọta, ebe ọ bụ na Jizọs Kraịst n’onwe ya nyere iwu ka ụmụazụ ya na-eme ememe a nakwa ka ha na-eme ya mgbe nile. Ọ gwara ha kpọmkwem, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.”—Luk 22:19; 1 Ndị Kọrint 11:23-25.

N’ezie, ka ememe ahụ wee bụrụ nke na-akwụghachi ụgwọ n’ezie, mmadụ aghaghị ịghọta ihe ọ pụtara nke ọma, dị ka e gosiri n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị mkpa ịma ihe Bible nwere ikwu banyere mgbe na otú a ga-esi na-eme ememe ahụ.

N’irube isi n’iwu Jizọs, Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ga-agbakọta n’uhuruchi Wednesday, April 16, 2003, iji mee ememe ncheta ọnwụ Jizọs. Ọ ga-abụrụ ha oge iji nyochaa Akwụkwọ Nsọ na nke iji wusie okwukwe na ịhụnanya ha nwere n’ebe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ ike, bụ́ onye sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù iso ha gbakọta n’uhuruchi ahụ ka gị onwe gị wee nwee ike iwusikwu okwukwe na ịhụnanya i nwere n’ebe Jizọs Kraịst na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, nọ ike.