Na-egosipụta “Ịdị Nwayọọ Nile n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”
Na-egosipụta “Ịdị Nwayọọ Nile n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”
“Nọgide na-echetara ha . . . ka ha nwee ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—TAỊTỌS 3:1, 2.
1. Gịnị mere na ọ naghị adị mfe mgbe nile igosipụta ịdị nwayọọ?
“BỤRỤNỤ ndị na-eṅomi m,” ka Pọl onyeozi dere, “ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) Ndị ohu Chineke nile taa na-agbalịsi ike ịṅa ntị na ndụmọdụ a. N’eziokwu, ọ dịghị mfe, n’ihi na anyị eketawo ọchịchọ onwe onye na àgwà ndị na-ekwekọghị n’ihe nlereanya Kraịst site n’aka nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ. (Ndị Rom 3:23; 7:21-25) Otú o sina dị, a bịa n’igosipụta ịdị nwayọọ, anyị nile pụrụ inwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị. Ma ịdabere nanị ná mgbalị nke aka anyị ezughị. Olee ihe ọzọ a chọrọ?
2. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta “ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ”?
2 Ịdị nwayọọ nke yiri nke Chineke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ka anyị na-agbaso nduzi nke ike Chineke nọ n’ọrụ, otú ahụ ka mkpụrụ ya ga na-apụtakwu ìhè n’ahụ́ anyị. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka anyị ga-enwe ike igosipụta “ịdị nwayọọ nile” n’ebe mmadụ nile nọ. (Taịtọs 3:2) Ka anyị tụlee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs ma mee ka ndị anyị na ha na-emekọ ihe nwee ike ‘inweta ume ọhụrụ.’ —Matiu 11:29; Ndị Galeshia 5:22, 23.
N’ime Ezinụlọ
3. Olee ọnọdụ e nwere n’ezinụlọ nke na-egosipụta mmụọ nke ụwa?
3 Otu ebe ịdị nwayọọ dị oké mkpa bụ n’ime ezinụlọ. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na ihe ike ezinụlọ na-etinye ahụ́ ike nke ndị inyom n’ihe ize ndụ karịa ka ma ihe ọghọm okporo ụzọ ma ọrịa ịba si etinye ya. Dị ka ihe atụ, na London, England, otu ụzọ n’ụzọ anọ nke mpụ ihe ike nile a kọrọ banyere ha bụ ndị e mere n’ebe obibi. Ndị uwe ojii na-ezutekarị ndị na-eji “iti mkpu na okwu mkparị” egosipụta mmetụta ha. Nke kakwa njọ bụ na ụfọdụ ndị di na nwunye ekwewo ka “obi ilu” metụta mmekọrịta ha. Ihe a nile na-egosipụta “mmụọ nke ụwa” n’ụzọ dị mwute, n’ihi ya kwa, ha enweghị ọnọdụ ọ bụla n’ezinụlọ Ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 4:31; 1 Ndị Kọrint 2:12.
4. Mmetụta dị aṅaa ka ịdị nwayọọ pụrụ inwe n’ebe ezinụlọ dị?
4 Mmụọ Chineke dị anyị mkpa iji guzogide ọchịchọ nke ụwa. “Ebe ọ bụla mmụọ Jehova [dị], n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ịhụnanya, obiọma, njide onwe onye, na ogologo ntachi obi na-eme ka ndị di na nwunye na-ezughị okè na-adịkwu n’otu. (Ndị Efesọs 5:33) Ịdị nwayọọ n’obi na-eme ka ebe obibi na-adị mma ọnụnọ ma na-eme ka e nwee ọnọdụ dị nnọọ iche pụọ n’esemokwu na nkewa nke na-etisasị ọtụtụ ezinụlọ. Ihe mmadụ na-ekwu dị mkpa, ma, ọ bụ otú o si ekwu ya na-egosi ihe o bu n’obi. Mmadụ iji olu dị nro kwupụta nchegbu na ihe ndị na-enye ya nsogbu n’obi na-eme ka a ghara inwe esemokwu. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.”—Ilu 15:1.
5. Olee otú ịdị nwayọọ pụrụ isi na-enye aka n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe?
5 Ịdị nwayọọ dị mkpa karịsịa n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Ọ bụrụ na a na-egosipụtakọ ya na obiọma, ọ pụrụ inye aka dọtara Jehova ndị na-adịghị ekwenye ekwenye. Pita dụrụ ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi. Unu ekwekwala ka ịchọ mma unu bụrụ nke ịkpa isi efu na nke iyikwasị ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke.”—6. Olee otú igosipụta ịdị nwayọọ pụrụ isi mee ka nkekọ dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha sikwuo ike?
6 Mmekọrịta dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha pụrụ imebi, karịsịa ma ọ bụrụ na ha ahụghị Jehova n’anya. Ma n’ezinụlọ nile nke Ndị Kraịst, ọ dị mkpa ịdị na-egosipụta ịdị nwayọọ. Pọl dụrụ ndị bụ́ nna ọdụ, sị: “Unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Mgbe ịdị nwayọọ bụ àgwà a kasị egosipụta n’ime ezinụlọ, ndị nne na nna na ụmụ ha na-enwe nkekọ chikwuru anya. Dean, bụ́ otu n’ime ụmụ ise, na-echeta banyere nna ya, sị: “Papa m dị nwayọọ n’obi. Apụghịdị m icheta mgbe mụ na ya bara mba—ọbụna mgbe m dị afọ iri na ụma. Ọ dị nnọọ nwayọọ mgbe nile, ọbụna mgbe iwe were ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-achụba m n’ọnụ ụlọ m ma ọ bụ napụ m ihe ụfọdụ, ma anyị abatụbeghị mba. Ọ bụghị nanị nna ka ọ bụụrụ anyị. Ọ bụkwa enyi anyị, anyị achọghịkwa imechu ya ihu.” N’ezie, ịdị nwayọọ na-enye aka eme ka nkekọ dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha sikwuo ike.
N’ozi Anyị
7, 8. N’ihi gịnị ka igosipụta ịdị nwayọọ n’ozi ubi ji dị mkpa?
7 Ebe ọzọ ịdị nwayọọ dị mkpa bụ n’ozi ubi. Ka anyị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ, anyị na-ezute ndị àgwà ha dịgasị iche iche. Ụfọdụ na-eji obi ụtọ ege ntị n’ozi olileanya anyị na-ezi ha. Ndị ọzọ, n’ihi ihe ndị dịgasị iche iche, pụrụ imeghachi omume n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ bụ ebe a ka àgwà ịdị nwayọọ na-enyere anyị aka nke ukwuu n’ịrụzu ọrụ anyị nke ịbụ ndị àmà ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.—Ọrụ 1:8; 2 Timoti 4:5.
8 Pita onyeozi dere, sị: “Doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu, na-adịnụ njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ dị n’ime unu, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.” (1 Pita 3:15) Ebe anyị ji Kraịst kpọrọ ihe dị ka Onye Nlereanya anyị, anyị na-eji nlezianya egosipụta ma ịdị nwayọọ ma nkwanye ùgwù mgbe anyị na-agbara ndị na-eji olu ike ekwu okwu àmà. Omume a na-arụpụtakarị ihe ndị dị ịrịba ama.
9, 10. Kọọ otu ahụmahụ iji gosi uru ịdị nwayọọ bara n’ozi ubi.
9 Mgbe nwunye Keith gara ịmara onye kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ha, Keith nọgidere n’ime ụlọ. Mgbe nwunye Keith matara na onye bịara na nke ha bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o ji iwe boo Ndịàmà ebubo na ha na-emekpọ ụmụaka ọnụ. Nwanna nwoke ahụ gbachiri nnọọ nkịtị. Nwanna nwoke ahụ jizi olu dị nro zaghachi, sị: “O wutere m na obi dị gị otú a. Biko ọ̀ bụ m gosi gị ihe Ndịàmà Jehova kweere?” Keith anọwo na-ege ihe ha na-ekwu, ọ bịaziri n’ọnụ ụzọ ma gwa nwanna nwoke ahụ ka ọ laa.
10 Mgbe e mesịrị, di na nwunye ahụ malitere ịkwa ụta na ha mesoro onye bịara na nke ha ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Omume ịdị nwayọọ ya metụrụ ha n’obi. N’ụzọ tụrụ ha n’anya, otu izu ka e mesịrị, nwanna nwoke ahụ lọghachiri, Keith na nwunye ya kwekwara ka ọ kọwaara ha ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ihe ndị o kweere. “N’ime afọ abụọ sochirinụ, anyị gere
ntị nke ukwuu n’ihe Ndịàmà ndị ọzọ kwuru,” ka ha mesịrị kwuo. Ha kweere ka a mụọrọ ha Bible, n’ikpeazụkwa, e mere ha abụọ baptizim ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova. Lee ka nke a si bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ nye Onyeàmà ahụ bu ụzọ kpọtụrụ Keith na nwunye ya! Onyeàmà ahụ zutere di na nwunye ahụ ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị ma chọpụta na ha bụzi ụmụnna ime mmụọ ya. Ịdị nwayọọ rụpụtara ezi ihe.11. N’ụzọ dị aṅaa ka ịdị nwayọọ pụrụ isi mee ka ọ dịkwuoro mmadụ mfe ịnakwere eziokwu Ndị Kraịst?
11 Ahụmahụ Harold nwere dị ka onye agha mere ka o nwee obi ilu ma nwee obi abụọ ma Chineke ọ̀ dị. N’ime ka nsogbu ya kakwuo njọ, ihe ọghọm okporo ụzọ nke ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu kpatara mere ka Harold nwee nkwarụ na-adịgide adịgide. Mgbe Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya, Harold gwara ha ka ha kwụsị ịbịa na nke ya. Ma otu ụbọchị, otu Onyeàmà aha ya bụ Bill biliri ịga leta otu onye nwere mmasị nke bi nnọọ n’ọnụ ụlọ nke abụọ ma a gafee nke Harold. N’amaghị ama, Bill kụrụ aka n’ọnụ ụzọ Harold. Mgbe Harold, bụ́ onye ji mkpara abụọ aga ije, meghere ọnụ ụzọ ya, Bill rịọrọ ya mgbaghara ozugbo, na-akọwara ya na ọ bụ n’ọnụ ụlọ dịdewere nke ya ka ya bu n’obi ịga. Olee otú Harold si meghachi omume? Bill amaghị na Harold ekiriwo akụkọ ụwa na telivishọn bụ́ nke gosiri ebe Ndịàmà gbakọrọ aka jiri nnọọ obere oge wuchapụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. N’ịbụ onye ọ masịrị ịhụ nnọọ ọtụtụ mmadụ ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu, ọ gbanwewo àgwà ya n’ebe Ndịàmà nọ. N’ịbụ onye mgbaghara Bill ji obiọma rịọ nakwa àgwà ọma na ịdị nwayọọ ya metụrụ n’obi, Harold kpebiri ka Ndịàmà bịawazie na nke ya. Ọ mụrụ Bible, nwee ọganihu, ma ghọọ ohu Jehova e mere baptizim.
N’ime Ọgbakọ
12. Olee àgwà ndị e ji mara ụwa bụ́ ndị ndị so n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị iguzogide?
12 Ebe nke atọ ịdị nwayọọ dị mkpa bụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Esemokwu abụghị ihe ọhụrụ n’etiti ọha mmadụ taa. Arụmụka na ịba mba bụ ihe a na-ahụkarị n’etiti ndị na-ele ndụ anya n’ụzọ anụ ahụ́. Mgbe ụfọdụ, omume ndị dị otú ahụ e ji mara ụwa na-egbebata n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma na-akpata nkewa na arụmụka. Ọ na-ewute ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ mgbe ha na-aghaghị idozi ọnọdụ ndị a. Otú o sina dị, ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova na ụmụnna ha nọ na-akpali ha ịgbalị ime ka ndị ahụ na-agahie agahie chegharịa.—Ndị Galeshia 5:25, 26.
13, 14. Gịnị pụrụ isi n’iji “ịdị nwayọọ na-ezi ndị na-adịghị ekwenye ekwenye ihe” pụta?
13 Na narị afọ mbụ, Pọl na onye ibe ya bụ́ Timoti nwetara ọtụtụ ihe isi ike site n’aka ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ. Pọl dọrọ Timoti aka ná 2 Timoti 2:20, 21, 24, 25) Rịba ama na Pọl jikọtara ịdị nro na ịchịkwa onwe onye na ịdị nwayọọ.
ntị ka ọ nọrọ na nche megide ụmụnna ndị yiri arịa ndị bụ́ maka “nzube nsọpụrụ na-adịghị na ya.” “Ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ,” ka Pọl kwuru, “kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro, ruo eru izi ihe, na-achịkwa onwe ya n’ọnọdụ ọjọọ, jiri ịdị nwayọọ na-ezi ndị na-adịghị ekwenye ekwenye ihe.” Mgbe anyị nọgidere na-adị nwayọọ n’obi ọbụna mgbe a kpasuru anyị iwe, ndị na-akatọ anyị na-abụkarị ndị a kpaliri ịtụleghachi nkatọ ha. N’aka nke ya, Jehova pụrụ, dị ka Pọl dekwuru, “inye ha nchegharị na-eduga n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (14 Pọl mere ihe o kwusara. Mgbe ya na “ndịozi ọkasị mma” nọ n’ọgbakọ Kọrint na-emekọ ihe, ọ gbara ụmụnna ahụ ume, sị: “Mụ onwe m, Pọl, sitere n’ịdị nwayọọ na obiọma nke Kraịst ahụ na-arịọsi unu arịrịọ ike, ọ bụ ezie na m dị ala n’ọdịdị elu ahụ́ n’etiti unu, ma mgbe m na-anọghị ya ana m enwe nkwuwa okwu n’ebe unu nọ.” (2 Ndị Kọrint 10:1; 11:5) Pọl ṅomiri Kraịst n’ezie. Rịba ama na ọ rịọrọ ụmụnna a arịrịọ site “n’ịdị nwayọọ” nke Kraịst. N’ụzọ dị otú ahụ, o zeere àgwà mpako na nke aka ike. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na agbamume ya masịrị ndị nwere obi na-anabata ihe n’ọgbakọ ahụ. O mere ka ndị ha na ibe ha na-adịghịzi ná mma dịghachi ná mma ma tọọ ntọala maka udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ ahụ. Nke a ọ́ bụghị omume anyị nile pụrụ ịgbalịsi ike iṅomi? Ọ dị mkpa karịsịa ka ndị okenye mee ka omume ha kwekọọ na nke Kraịst na Pọl.
15. N’ihi gịnị ka ịdị nwayọọ ji dị mkpa mgbe a na-enye ndụmọdụ?
15 N’ezie, ọ bụghị nanị mgbe a na-achọ itisasị udo na ịdị n’otu nke ọgbakọ ka e kwesịrị inyere ndị ọzọ aka. Ọ dị mkpa inye ụmụnna nduzi ịhụnanya ogologo oge tupu esemokwu ebilite. “Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gbalịanụ ịgbazigharị onye dị otú ahụ,” ka Pọl gbara ume ka e mee. Ma olee otú a ga-esi mee ya? “Na mmụọ nke ịdị nwayọọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-elekwasị onwe ya anya, a dịghị ama ama a nwaakwa gị.” (Ndị Galeshia 6:1) Ịnọgide na-enwe “mmụọ nke ịdị nwayọọ” anaghị adị mfe mgbe nile, karịsịa n’ihi na Ndị Kraịst nile, gụnyere ndị ikom a họpụtara ahọpụta, na-enwe ọchịchọ mmehie. Otú o sina dị, ọ bụ ịdị nwayọọ ga-enye aka mee ka ọ dịkwuoro onye ahụ na-agahienụ mfe ime mgbanwe.
16, 17. Gịnị pụrụ inye aka ime ka a ghara ịla azụ itinye ndụmọdụ n’ọrụ?
16 N’asụsụ Grik mbụ, okwu a sụgharịrị ịbụ “ịgbazigharị” pụkwara izo aka n’ịgbazi ọkpụkpụ gbajiri agbaji, nke bụ́ ihe na-egbu mgbu. Dibịa nwere olu ọma nke na-agba ọkpụkpụ na-ekwu okwu ọma banyere uru ọkpụkpụ ahụ ọ na-aga ịgbazi ga-aba. Omume ịdị nwayọọ ya na-enye nkasi obi. Okwu ole na ole o kwuru tupu ya amalite ịgba ọkpụkpụ na-enye aka Ilu 25:15.
eme ka ahụ́ rutụ onye ahụ ala. N’otu aka ahụ, ịgbazigharị mmadụ n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ịbụ ihe na-egbu mgbu. Ma ịdị nwayọọ ga-enye aka mee ka ọ dịkwuo mfe ịnabata ya, si otú ahụ na-eme ka ndị na-ese okwu dịghachi ná mma ma na-eme ka onye gahierenụ gbanwee omume ya. Ọbụna mgbe a na-anabataghị ndụmọdụ na mbụ, ịdị nwayọọ n’akụkụ nke onye ahụ na-enyere mmadụ aka pụrụ ime ka a kwụsị ịla azụ n’ịgbaso ezigbo ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.—17 Mgbe a na-enyere ndị ọzọ aka ime mgbanwe, a na-enwekarị ihe ize ndụ bụ́ na a pụrụ iwere ndụmọdụ ahụ dị ka nkatọ. Otu onye edemede si otú a kwuo ya: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ anyị na-aka anọ n’ihe ize ndụ nke igosi na anyị ka ndị ọzọ, n’ihi ya kwa, na-enwekwu mkpa nke ịdị umeala n’obi, karịa mgbe anyị na-adọ ndị ọzọ aka ná ntị.” Ịzụlite ịdị nwayọọ nke na-esite n’ịdị umeala n’obi ga-enyere Onye Kraịst na-enye ndụmọdụ aka izere ihe ize ndụ a.
“N’ebe Mmadụ Nile Nọ”
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji siere Ndị Kraịst ike igosipụta ịdị nwayọọ mgbe ha na ndị ọchịchị na-emekọ ihe? (b) Gịnị ga-enyere Ndị Kraịst aka igosipụta ịdị nwayọọ n’ebe ndị nọ n’ọchịchị nọ, gịnịkwa pụrụ isi na ya pụta?
18 Otu ebe igosipụta ịdị nwayọọ na-esiri ọtụtụ ndị ike bụ mgbe ha na ndị ọchịchị na-emekọ ihe. N’eziokwu, otú ụfọdụ ndị nọ n’ọchịchị si eme ihe na-egosi na ha dị aka ike ma bụrụ ndị na-enweghị mmetụta maka ndị ọzọ. (Eklisiastis 4:1; 8:9) Otú ọ dị, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka ịghọta na ikike ya bụ nke kasị elu ma doo onwe anyị n’okpuru ndị ọchịchị ụwa ruo n’ókè ruuru ha. (Ndị Rom 13:1, 4; 1 Timoti 2:1, 2) Ọbụna mgbe ndị nọ n’ọkwá dị elu chọrọ ịkpara ofufe anyị na-efe Jehova n’ihu ọha ókè, anyị na-eji obi ụtọ achọ ụzọ ndị ka gheere oghe isi na-achụ àjà otuto anyị.—Ndị Hibru 13:15.
19 Ọ dịghị ihe ọ bụla na-eme ka anyị na-enwe mmụọ ịlụ ọgụ. Anyị na-agbalịsi ike inwe ezi uche ma ghara imebi ụkpụrụ ezi omume ma ọlị. N’ụzọ dị otú a, ụmụnna anyị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ije ozi ha n’ala 234 gburugburu ụwa. Anyị na-aṅa ntị na ndụmọdụ Pọl nke “ido onwe [anyị] n’okpuru na irubere ọchịchị na ikike dị iche iche isi dị ka ndị na-achị achị, ịdị njikere maka ezi ọrụ ọ bụla, ịghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ịghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka [anyị] nwee ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:1, 2.
20. Olee ụgwọ a ga-akwụ ndị na-egosipụta ịdị nwayọọ?
20 Ngọzi bara ụba na-echere ndị nile na-egosipụta ịdị nwayọọ. “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi,” ka Jizọs kwupụtara, “ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Nye ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ịnọgide na-adị nwayọọ na-eme ka ha jide n’aka na ha ga-enwe obi ụtọ na ihe ùgwù nke ịchị ụwa n’Alaeze ahụ. Nye “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ, ha na-anọgide na-egosipụta ịdị nwayọọ ma na-atụ anya ibi ndụ na Paradaịs n’ụwa ebe a. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16; Abụ Ọma 37:11) Lee atụmanya ndị dị ebube na-echere ha n’ọdịnihu! Ya mere, ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-echefu ihe Pọl chetaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs: “Ya mere, mụ onwe m, bụ́ onye mkpọrọ n’ime Onyenwe anyị, na-arịọsi unu ike ka unu na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ọkpụkpọ ahụ nke a kpọrọ unu, n’ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu.”—Ndị Efesọs 4:1, 2.
Ná Ntụleghachi
• Olee ngọzi ndị a na-enweta site n’igosipụta ịdị nwayọọ
• n’ime ezinụlọ?
• n’ozi ubi?
• n’ime ọgbakọ?
• Olee ụgwọ e kwere nkwa ịkwụ ndị dị nwayọọ n’obi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 21]
Ịdị nwayọọ dị mkpa karịsịa n’ime ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe
[Foto dị na peeji nke 21]
Ịdị nwayọọ na-eme ka nkekọ ezinụlọ sikwuo ike
[Foto dị na peeji nke 23]
Jiri ịdị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-agbachitere ihe i kweere
[Foto dị na peeji nke 24]
Ịdị nwayọọ nke onye na-enye ndụmọdụ pụrụ inyere onye na-agahie agahie aka