Ndị Ntorobịa—Ùnu Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ?
Ndị Ntorobịa—Ùnu Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ?
“Ọ BỤ ezie na m na-aga nzukọ Ndị Kraịst, enweghị m ọchịchọ siri ike ijere Jehova ozi,” ka Hideo na-ekwu ka ọ na-echeta mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. “Ana m ejikarị anya nke uche ahụ onwe m dị ka onye ndị klas ya ma ama na onye kpọ enyi ya nwanyị na-ekoga n’okporo ámá. Ihe mgbaru ọsọ m edoghị anya, enweghịkwa m ọchịchọ inwe ọganihu ime mmụọ ọ bụla.” Dị ka Hideo, ọtụtụ ndị ntorobịa dị nnọọ ka ha na-akpagharị n’enweghị nzube, n’enweghị ọchịchọ iru ihe mgbaru ọsọ ọ bụla kwesịrị ekwesị ma ọ bụ inwe ọganihu ọ bụla.
Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, eleghị anya ị na-enwe obi ụtọ mgbe ị na-egwu egwuregwu ma ọ bụ na-enwe ntụrụndụ. Otú ọ dị, o nwere ike ọ gaghị adị gị otú ahụ mgbe a bịara n’ihe ime mmụọ. Ò kwere omume inwe obi ụtọ banyere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ? Tụlee ihe a ọbụ abụ ahụ kwuru: “Ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. . . . Ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè.” (Abụ Ọma 19:7, 8) Okwu Chineke pụrụ iduzi “onye na-enweghị uche” iji amamihe na-eme ihe, ‘na-enye anya ya ìhè.’ Ee, ihe ime mmụọ pụrụ ime ka i nwee obi ụtọ na ọṅụ. Ma gịnị ka a chọrọ ka o wee nwee ike ịdị gị otú ahụ? Ebee ka i kwesịrị ịmalite?
Bụrụ Onye A Kpaliri Ijere Chineke Ozi
Nke mbụ, ị ghaghị ịbụ onye a kpaliri ime ihe. Tụlee ihe banyere Eze Josaịa na-eto eto nke Juda. Mgbe a chọtara akwụkwọ Iwu Jehova n’ụlọ nsọ ahụ, Josaịa kwuru ka a gụọ ya, ihe ọ nụkwara metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. N’ihi ya, “Josaịa wee si n’ala nile nke ụmụ [Izrel] nwere wezụga ihe arụ nile.” (2 Ihe E Mere 34:14-21, 33) Ọgụgụ a gụrụ Okwu Chineke kpaliri Josaịa imekwu ihe n’ịkwalite ofufe dị ọcha.
Gị onwe gị pụkwara ịzụlite ọchịchọ ijere Jehova ozi ma ọ bụrụ na ị na-agụchi Bible anya ma na-atụgharị uche n’ihe ị na-agụ. Nke ahụ bụ ihe kpaliri Hideo ime ihe. Ọ malitere iso otu onye kataworo ahụ́ bụ́ ọsụ ụzọ, onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, na-akpachi anya. Onye ọsụ ụzọ ahụ bụ onye na-amụchi Bible anya ma na-agbalịsi ike itinye ozizi Bible n’ọrụ ná ndụ ya. N’ịbụ onye ihe nlereanya nke onye ọsụ ụzọ ahụ kpaliri n’ụzọ dị ukwuu, Hideo malitere ime otu ihe ahụ ma malite inwe ọchịchọ siri ike ijere Chineke na ndị ọzọ ozi. Ọganihu ime mmụọ ya mere ka ọ malite ibi ndụ nwere nzube.
Ịgụ Bible kwa ụbọchị pụrụ ịkpali ndị na-eto eto ime ihe. Takahiro na-akọwa, sị: “Mgbe ọ
bụla m lakpuru ụra ma cheta na agụbeghị m Bible m n’ụbọchị ahụ, ana m ebilite ma gụọ ya. N’ihi ya, enwere m mmetụta nke ịbụ onye Jehova na-eduzi. Ịgụ Bible kwa ụbọchị nyeere m aka nke ukwuu inwe ọganihu ime mmụọ. N’ịbụ onye kpebisiri ike ikerekwu òkè dị ukwuu n’ozi Jehova, eweere m ọrụ ọsụ ụzọ oge nile n’oge na-adịghị anya ka m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ na-atọkwa m ụtọ nke ukwuu.”Tụkwasị n’ịgụ Bible, olee ihe ọzọ pụrụ inyere gị aka ime ka mkpali i nwere ito Jehova sikwuo ike? Ọ bụ mama Tomohiro kụziiri ya eziokwu Bible. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ nanị mgbe m mụrụ akwụkwọ bụ́ Life Does Have a Purpose nke ọma mgbe m dị afọ 19 ka ịhụnanya Jehova na àjà mgbapụta Jizọs metụrụ m n’ahụ́ nke ukwuu. Obi ekele ahụ m nwere maka ịhụnanya Chineke kpaliri m imekwu ihe n’ozi Jehova.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Dị ka Tomohiro, ọtụtụ ndị ntorobịa na-abụ ndị a kpaliri inwe ọganihu ime mmụọ site n’inwechi ọmụmụ Bible onwe onye anya.
Gịnị ma ọ bụrụ na, ka i mesịrị ihe ndị a, i nwebeghịkwa ọchịchọ sitere n’obi ijere Jehova ozi? Ọ̀ dị onye ị pụrụ ijekwuru maka enyemaka? Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihi na Chineke . . . na-arụ ọrụ n’ime unu . . . ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.” (Ndị Filipaị 2:13) Ọ bụrụ na i kpekuo Jehova ekpere maka enyemaka, ọ ga-enye gị mmụọ nsọ ya n’ụba, bụ́ nke ga-enye gị ike, ọ bụghị nanị ‘ime ihe’ kamakwa, ‘inwe ọchịchọ.’ Nke a na-apụta na mmụọ nsọ Chineke ga-eme ka i nwekwuo ọchịchọ ime ihe nile i nwere ike ime n’ozi Jehova, ọ ga-enyekwara gị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ọ sọkwara ya mee, tụkwasị obi n’ike Jehova ma nwee obi ike!
Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị nke Gị
Ozugbo i kpebiri ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị, ọ dị mkpa ka i setịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye iji nwee ike inwe ọganihu ime mmụọ. Mana, bụ́ nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst, sịrị: “Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nyeere m aka nke ukwuu. Kama ịdị na-ala azụ, abịara m nwee ike iji obi ike na-aga n’ihu. N’iburu ihe mgbaru ọsọ m n’uche, ekpekusiri m Jehova ekpere ike maka nduzi, abịakwara m nwee ike inwe ọganihu n’enweghị ihe ndọpụ uche.”
Ihe mgbaru ọsọ gị kwesịrị ịbụ ndị ezi uche dị na ha na ndị a pụrụ iru eru. Ịgụ otu isiakwụkwọ Bible kwa ụbọchị pụrụ ịbụ ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị na ya. Ị pụkwara ịmalite usoro ihe omume nke ime nnyocha. N’iji ihe e nwere n’asụsụ Bekee maa atụ, ị pụrụ ịmụ banyere àgwà dị iche iche nke Jehova bụ́ ndị e depụtara n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Qualities by Name” (Àgwà Ya Dị Iche Iche n’Aha n’Aha) nke dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Jehovah” (Jehova) na Watch Tower Publications Index. E nwere ihe dị ka ihe 40 ị pụrụ ịtụle, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na nnyocha ahụ ga-adọtakwu gị nso n’ebe Jehova nọ ma kpalie gị imekwuru ya ihe. Ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ a pụrụ iru eru na-agụnye ịza ajụjụ ma ọ dịkarịa ala otu ugboro ná nzukọ Ndị Kraịst ọ bụla nke chọrọ ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ, ịgbalị ịmara ma ọ dịkarịa ala otu onye nọ n’ọgbakọ nke ọma ná nzukọ ọ bụla, nakwa ịghara ikwe ka otu ụbọchị gafee n’ekpegaraghị Jehova ekpere ma gwa ndị ọzọ banyere ya.
Ọ bụrụ na i debanyebeghị aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nke ahụ ga-abụrụ gị ezigbo ihe mgbaru ọsọ. Ị̀ malitewo ikere òkè n’ikwusara ọha na eze ozi ọma? Ọ bụrụ na ị malitebeghị, ị pụrụ ịchọ ịrụ ọrụ iji ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ichebasiri mmekọrịta gị na Jehova echiche ike na ịrara onwe gị nye ya ga-abụzi nzọụkwụ ọzọ. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye ha site n’ime ihe iji ruo eruo maka ozi oge nile.
Ọ bụ ezie na ọ dị mma ka i nwee ihe mgbaru ọsọ ná ndụ, kpachara anya ka ị ghara ịzụlite mmụọ ịsọ mpi. Ị ga-aka enwe ọṅụ n’ihe ị na-eme ma ọ bụrụ na ị dịghị eji onwe gị atụnyere ndị ọzọ.—Ikekwe ọ dị gị ka i nweghị ahụmahụ, ya ana-esikwara gị ike isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha. Ọ bụrụ otú ahụ, gbasoo ndụmọdụ Bible bụ́: “Tọọ ntị gị n’ala, nụ okwu nile nke ndị maara ihe.” (Ilu 22:17) Chọọ enyemaka nke ndị mụrụ gị ma ọ bụ nke Ndị Kraịst ọzọ tozuru okè. N’ezie, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na ndị ọzọ bụrụ ndị ji ezi uche eme ihe na ndị na-enye agbamume n’akụkụ a. Ndị na-eto eto inwe mmetụta nke ịbụ ndị a na-arụgide iru ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ setịpụụrụ ha pụrụ ime ka ha ghara inwe ọṅụ, ọ pụkwara ọbụna ime ka nzube e ji esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ghara inwe isi. Nke ahụ mere otu nwatakịrị nwanyị, bụ́ onye kwuru, sị: “Ndị mụrụ m setịpụụrụ m ọtụtụ ihe mgbaru ọsọ, dị ka idebanye aha m n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ikere òkè n’ozi ubi, ịbụ onye e mere baptizim, na ịghọ ọsụ ụzọ. Agbasiri m mbọ ike iru nke ọ bụla n’ime ha. Mgbe m ruru otu ihe mgbaru ọsọ, ndị mụrụ m adịghị aja m mma, kama nke ahụ, ha na-esetịpụrụ m ihe mgbaru ọsọ ọzọ m ga-agbalịsi ike iru. N’ihi ya, ọ bịara na-adị m mgbe nile ka a na-amanye m iru ihe mgbaru ọsọ. Ike gwụrụ m, adịghịkwa m enwe afọ ojuju n’ihe m rụzuru.” Gịnị bụ nsogbu ya? Ihe mgbaru ọsọ ahụ nile dịcha mma, ma ọ bụghị ya setịpụrụ ha n’onwe ya. Iji nwee ihe ịga nke ọma, ị ghaghị ịbụ onye a kpaliri ibute ụzọ n’isetịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ!
Chee banyere Jizọs Kraịst. Mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ maara ihe Nna ya, bụ́ Jehova, na-atụ anya ya n’aka ya. Ime uche Jehova abụghị nanị ihe mgbaru ọsọ nye Jizọs, kama ọrụ a na-aghaghị ịrụzu. Olee otú Jizọs si lee ọrụ e nyere ya anya? O kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Jizọs nwere obi ụtọ n’ime uche Jehova ma mezuo ihe Nna ya tụrụ anya ya n’aka ya. Ọ dị ka ihe oriri nye Jizọs—o nwetara obi ụtọ na afọ ojuju n’ịrụcha ọrụ a tụrụ anya ya n’aka ya. (Ndị Hibru 10:5-10) Gị onwe gị pụkwara inweta obi ụtọ mgbe a kpaliri gị n’ụzọ kwesịrị ekwesị ime ihe ndị mụrụ gị na-agba gị ume ime.
Adala Mbà n’Ime Ihe Dị Mma
Ozugbo i bu ihe mgbaru ọsọ n’obi, rụsie ọrụ ike iru ya. Ndị Galeshia 6:9 na-asị: “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ya ruru anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.” Adaberela nanị n’ike ma ọ bụ na nkà nke onwe gị. Ị pụrụ inweta ihe isi ike ma eleghị anya, mgbe ụfọdụkwa, ị pụrụ ọbụna inwe mmetụta nke ịbụ onye kụrụ afọ n’ala ruo nwa oge. Ma Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “N’ụzọ gị nile mara [Chineke], Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:6) Jehova ga-akwagide gị ka ị na-arụsị ọrụ ike iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị.
Ee, site n’ịzụlite ọchịchọ ijere Jehova ozi nakwa site n’iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, ị ga-enwe ike ime ka ‘ọganihu gị pụta ìhè nye mmadụ nile.’ (1 Timoti 4:15) Mgbe ahụ, ị ga-ebi ndụ nwere nzube nke ijere Chineke ozi.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ịgụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe ị gụworo ga-akpali gị ijere Jehova ozi
[Foto dị na peeji nke 10]
Jizọs mezuru ihe ndị Nna ya tụrụ anya ha n’aka ya