Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị

NRI Anyasị nke Onyenwe Anyị ọ̀ baara gị uru ma nwee ihe na-adịgide adịgide ọ pụtara nye gị? Iji chọpụta nke ahụ, ka anyị buru ụzọ chọpụta ihe Jizọs Kraịst weere na ọ bụ ihe ihe omume a pụtara.

N’anyasị Naịsan 14, 33 O.A., Jizọs so ndịozi 12 ya zukọọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem iji mee Ememe Ngabiga a na-eme otu ugboro n’afọ. Mgbe ha risịrị nri Ememe Ngabiga ahụ, onye sabo ahụ bụ́ Judas si n’ọnụ ụlọ ahụ pụọ ịga rara Jizọs nye. (Jọn 13:21, 26-30) Jizọs guzobeere ndịozi 11 fọrọ afọ “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 11:20) A na-akpọkwa ya Ememe Ncheta, ebe ọ bụ na Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” Nke a bụ nanị ememe e nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-eme.—1 Ndị Kọrint 11:24.

N’ọtụtụ ebe, ndị mmadụ na-akpụ ihe ncheta ma ọ bụ wepụta otu ụbọchị pụrụ iche iji na-echeta otu onye ma ọ bụ otu ihe dị mkpa. Na nke a, Jizọs guzobere oriri ncheta—nri nke ga-enye aka iji na-echeta ihe, bụ́ nke ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka iji na-echeta ihe ndị dị nnọọ ịrịba ama mere n’ụbọchị ahụ dị oké mkpa. Ruo ọtụtụ ọgbọ ndị ga-abịa n’ihu, ememe ncheta a ga na-echetara ndị na-eme ya ihe gbara ọkpụrụkpụ ihe Jizọs mere n’abalị ahụ pụtara, karịsịa ihe ihe nnọchianya ndị ahụ o ji mee ihe pụtara. Olee ihe nnọchianya ndị Jizọs ji mee ihe, gịnịkwa ka ha pụtara? Ka anyị tụlee ihe ndekọ Bible banyere ihe mere n’abalị ahụ na 33 O.A.

Ihe Nnọchianya Ndị Dị Nsọ

“O weere otu ogbe achịcha, nye ekele, nyawaa ya, ma were ya nye ha, na-asị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m bụ́ nke a gaje inye n’ihi unu. Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.’”Luk 22:19.

Mgbe Jizọs weere ogbe achịcha ahụ ma kwuo sị, “nke a pụtara ahụ́ m,” ọ na-ekwu na achịcha ahụ na-ekoghị eko na-anọchi anya, ma ọ bụ na-ese onyoonyo, anụ ahụ́ ya na-enweghị mmehie, bụ́ nke o nyere “n’ihi ndụ nke ụwa.” (Jọn 6:51) Ọ bụ ezie na nsụgharị Bible ụfọdụ na-asị “nke a bụ [Grik, es·tinʹ] ahụ́ m,” akwụkwọ bụ́ Greek-English Lexicon of the New Testament nke Thayer dere na-ekwu na ngwaa a na-apụtakarị “igosi, ịpụta, inye echiche.” Ọ na-enye echiche nke ịnọchi anya ihe.—Matiu 26:26.

Otú ahụ ka ọ dịkwa iko mmanya ahụ. Jizọs sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke na-adabere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.”Luk 22:20.

N’ihe ndekọ Matiu, Jizọs kwuru banyere iko ahụ, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.” (Matiu 26:28) Jizọs ji mmanya dị n’ime iko ahụ na-eme ihe dị ka ihe nnọchianya nke ọbara ya. Ọbara ya a wụsịrị gaje ịbụ ihe ndabere nke “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” nke ga-adị n’etiti ya na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe.—Jeremaịa 31:31-33; Jọn 14:2, 3; 2 Ndị Kọrint 5:5; Mkpughe 1:5, 6; 5:9, 10; 20:4, 6.

Mmanya dị n’iko ahụ bụkwa ihe ncheta na ọbara Jizọs a wụsịrị ga-abụ ihe ndabere maka “mgbaghara mmehie,” si otú ahụ na-emeghe ụzọ maka ndị na-ekere òkè na ya ịbụ ndị a kpọrọ ibi ndụ n’eluigwe dị ka ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe. N’ụzọ kwere nghọta, ọ bụ nanị ndị nwere ọkpụkpọ eluigwe a—ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè—na-ekere òkè n’achịcha ahụ na mmanya ahụ n’oge Ememe Ncheta.—Luk 12:32; Ndị Efesọs 1:13, 14; Ndị Hibru 9:22; 1 Pita 1:3, 4.

Otú ọ dị, gịnịkwanụ banyere ụmụazụ Jizọs nile na-anọghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Ndị a bụ “atụrụ ọzọ” nke Onyenwe anyị, bụ́ ndị na-atụ anya, ọ bụghị iso Kraịst chịa n’eluigwe, kama inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jọn 10:16; Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4) Dị ka “oké ìgwè mmadụ” nke Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ‘na-ejere Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị,’ obi dị ha ụtọ ịbụ ndị ji ekele na-ekiri ihe na-emenụ n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’okwu ọnụ na n’omume ha, ha na-asị: “Nzọpụta anyị sitere n’aka Chineke anyị, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sitekwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpughe 7:9, 10, 14, 15.

Ugboro Ole?

“Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.”Luk 22:19.

Ugboro ole ka e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta ahụ iji wee na-echeta ọnwụ Kraịst? Jizọs ekwughị nke ahụ kpọmkwem. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na o guzobere ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na Naịsan 14, n’uhuruchi nke Ememe Ngabiga ahụ, bụ́ nke ndị Izrel mere otu ugboro n’afọ, ihe àmà na-egosi na Jizọs bu n’uche ka a na-eme Ememe Ncheta ahụ n’otu ụzọ ahụ. Ebe ndị Izrel mere ememe maka nnapụta a napụtara ha site n’agbụ n’Ijipt otu ugboro n’afọ, Ndị Kraịst na-eme ememe icheta nnapụta a napụtara ha site n’agbụ nke mmehie na ọnwụ otu ugboro n’afọ.—Ọpụpụ 12:11, 17; Ndị Rom 5:20, 21.

Echiche nke ime ememe otu ugboro n’afọ iji cheta ihe omume dị mkpa abụtụghị ihe ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, tụlee mgbe di na nwunye na-eme ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ ha ma ọ bụ mgbe mba na-eme ememe icheta ihe omume dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme ya. Ememe ncheta ahụ na-ewerekarị ọnọdụ otu ugboro n’afọ n’ụbọchị ihe omume ahụ gbara afọ. Ọ dị mma ịmara na ruo ọtụtụ narị afọ ka Kraịst nwụsịrị, a kpọrọ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ndị Quartodeciman, nke pụtara “Ndị Ụbọchị nke Iri na Anọ,” n’ihi na ha mere ememe ncheta ọnwụ Jizọs otu ugboro n’afọ, na Naịsan 14.

Ọ Dị Mfe Ma Dị Oké Mkpa

Pọl onyeozi kọwara na ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ga-eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee ike ‘ịnọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 11:26) N’ihi ya, ememe ncheta a ga-elekwasị anya n’òkè dị mkpa Jizọs, site n’ọnwụ ya, keere ná mmezu nke nzube Chineke.

Site n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, Jizọs Kraịst gosipụtara na Jehova Chineke bụ Onye Okike maara ihe ma na-ahụ n’anya na Ọkaaka na-eme ezi omume. N’ụzọ megidere ihe Setan kwuru, n’adịghịkwa ka Adam, Jizọs gosipụtara na o kwere omume mmadụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, ọbụna mgbe o nwere nrụgide gabigara ókè.—Job 2:4, 5.

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-emekwa ka e jiri ekele na-echeta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà nke Jizọs. N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị tara akpụ o nwetara, Jizọs nọgidere na-erubere Nna ya isi n’ụzọ zuru ezu. O si otú ahụ nwee ike inye ndụ mmadụ ya zuru okè iji kwụọ ụgwọ mfu dị ukwuu nke mmehie Adam kpatara. Dị ka Jizọs n’onwe ya kọwara, ọ bịara ‘inye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) N’ihi ya, ndị nile nwere okwukwe na Jizọs pụrụ ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha, bụrụkwa ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ikwekọ ná nzube mbụ nke Jehova maka ihe a kpọrọ mmadụ.—Ndị Rom 5:6, 8, 12, 18, 19; 6:23; 1 Timoti 2:5, 6. *

Ihe a nile na-egosipụtakwa ịdị mma bara ụba nke Jehova na obiọma ya na-erughịrị mmadụ nke o gosipụtara n’ime ndokwa maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. Bible na-asị: “Site na nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ọnọdụ anyị, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ime ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site na ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na anyị ahụwo Chineke n’anya, kama na ọ hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya dị ka àjà ime udo maka mmehie anyị.”—1 Jọn 4:9, 10.

Ee, lee ememe magburu onwe ya Ememe Ncheta ahụ bụ! Ọ dị mfe ma baa nnọọ uru nke na a na-eme ya n’ụwa nile n’agbanyeghị ọnọdụ dịgasị iche iche, ma, ọ bụ nnọọ ihe nnọchianya ruo n’ókè nke ịnọgide bụrụ ihe ncheta gbara ọkpụrụkpụ ruo ogologo oge.

Ihe Ọ Pụtara Nye Gị

Ọnwụ ịchụàjà nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nwụrụ furu ma ya ma Nna ya, bụ́ Jehova, oké ihe. Dị ka mmadụ zuru okè, Jizọs eketaghị ọnwụ dị ka anyị nile ketara. (Ndị Rom 5:12; Ndị Hibru 7:26) Ọ gaara anọgidewo na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. A pụghị ịnapụwo ya ndụ ya ọbụna n’ike ma ọ bụrụ na o kweghị. O kwuru, sị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla napụworo m [ndụ m], kama m na-atọgbọ ya n’onwe m.”—Jọn 10:18.

N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs ji ọchịchọ obi ya chụọ ndụ mmadụ ya zuru okè n’àjà ka o wee “site n’ọnwụ ya mee ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu; ka o wee tọhapụkwa ndị nile ji maka egwu ọnwụ bụrụ ndị e doro ịnọ n’ohu ná ndụ ha nile.” (Ndị Hibru 2:14, 15) Ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà nke Kraịst pụtakwuru ìhè n’ụdị ọnwụ ọ nakweere. Ọ maara nke ọma otú ọ ga-esi taa ahụhụ ma nwụọ.—Matiu 17:22; 20:17-19.

Ememe Ncheta ahụ na-echetakwara anyị ngosipụta kasịnụ nke ịhụnanya nke Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. Lee ka o si bụụrụ ya, bụ́ onye “nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere,” ihe mwute ịhụ na ịnụ “mkpu ákwá siri ike na anya mmiri” nke Jizọs n’ogige Getsemeni, ihe e ji obi ọjọọ pịa ya, obi ịta mmiri e ji kpọgide ya n’elu osisi, na ọnwụ ihe mgbu o ji nwayọọ nwayọọ nwụọ. (Jems 5:11; Ndị Hibru 5:7; Jọn 3:16; 1 Jọn 4:7, 8) Nanị icheta ya ọbụna ugbu a, ka ọtụtụ narị afọ gasịworo, na-agbawa ọtụtụ ndị obi.

Cheedị banyere ya na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst kwụrụ ihe dị ukwuu otú ahụ maka anyị bụ́ ndị mmehie! (Ndị Rom 3:23) Kwa ụbọchị, anyị na-eche ihe ndị na-egbu mgbu ọdịdị mmehie na nke ezughị okè anyị na-akpata ihu. Otú ọ dị, ná ndabere nke okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jizọs, anyị pụrụ ịrịọ Chineke mgbaghara. (1 Jọn 2:1, 2) Nke a mere ka o kwe omume anyị inwe nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ nakwa inwe akọ na uche dị ọcha. (Ndị Hibru 4:14-16; 9:13, 14) Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ inwe atụmanya nke ịdị ndụ na paradaịs elu ala ruo mgbe nile ebighị ebi. (Jọn 17:3; Mkpughe 21:3, 4) Ngọzi ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ bụcha n’ihi omume ịchụ onwe onye n’àjà kasịnụ nke Jizọs.

Igosi Ekele Maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ ngosipụta magburu onwe ya nke “oké obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke.” Ndokwa àjà mgbapụta ahụ kwa nke Jehova Chineke mere—nke ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà nke Jizọs mere ka o kwe omume—bụ n’ezie, “onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.” (2 Ndị Kọrint 9:14, 15) Ọ̀ bụ na ngosipụta ndị a nke ịdị mma Chineke site n’aka Jizọs Kraịst adịghị akpali gị inwe ekele miri emi na nke na-adịgide adịgide?

Obi siri anyị ike na ha na-eme otú ahụ. N’ihi ya, anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka i soro Ndịàmà Jehova gbakọta ime Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs. N’afọ a, a ga-eme Ememe Ncheta ahụ na Wednesday, April 16, mgbe anyanwụ dasịrị. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ ime ka ị mara kpọmkwem oge na ebe a ga-anọ mee ihe omume a kasị mkpa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Iji nweta nkọwa ka zuo ezuo banyere ihe mgbapụta ahụ, biko lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ọ̀ BỤ “NKE A BỤ AHỤ́ M” KA Ọ̀ BỤ “NKE A PỤTARA AHỤ́ M”?

Mgbe Jizọs sịrị, “Abụ m ọnụ ụzọ” na, “Abụ m ezi osisi vaịn ahụ,” ọ dịghị onye chere na ọ bụ ọnụ ụzọ nkịtị ma ọ bụ osisi vaịn nkịtị. (Jọn 10:7; 15:1) N’otu aka ahụ, mgbe The New Jerusalem Bible kwuru na Jizọs sịrị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ,” anyị adịghị ekwubi na iko ahụ n’onwe ya bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ụzọ nkịtị. Ya mere, n’otu aka ahụ, mgbe ọ sịrị na achịcha ahụ ‘bụ’ ahụ́ ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na achịcha ahụ pụtara, ma ọ bụ na-anọchi anya, ahụ́ ya. N’ihi ya, nsụgharị nke Charles B. Williams na-asị: “Nke a na-anọchi anya ahụ́ m.”—Luk 22:19, 20.

[Foto dị na peeji nke 5]

Achịcha ahụ na-ekoghị eko na mmanya ahụ bụ ihe nnọchianya dabara adaba nke ahụ́ Jizọs na-enweghị mmehie na ọbara ya a wụsịrị

[Foto dị na peeji nke 7]

Ememe Ncheta ahụ bụ ihe na-eme ka e cheta ịhụnanya dị ukwuu nke Jehova Chineke na Jizọs Kraịst gosipụtara